Ịlaghachi n’Ihe Ndị Bụ Isi n’Ọgụ A Na-alụso Ịba
Ka ụwa tụkwasịrị uche n’agha obodo, mpụ, enweghị ọrụ, na nsogbu ndị ọzọ, ọnwụ ndị ịba na-akpata adịghị abụkarị ihe a na-anụ n’akụkọ ụwa oge uhuruchi. Ka o sina dị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị bi n’ụwa, ka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) na-ekwu, na-ebi n’iyi egwu nke ịba, ihe dịkwa ka nde 300 ruo nde 500 ndị mmadụ na-ada ọrịa n’ihi ya kwa afọ, na-eme ka ịba bụrụ “nke kasị gbasaa agbasa n’ime ọrịa ebe okpomọkụ nile na otu n’ime ndị kasị egbu egbu.” Ruo n’ókè ha aṅaa ka ọ na-egbu egbu?
Kwa sekọnd 20 ọ bụla mmadụ na-anwụ n’ihi ịba. Ọnụ ọgụgụ ahụ na-aghọ ngụkọta ọnwụ nke ihe karịrị nde 1.5 ndị ọ na-egbu kwa afọ—ọnụ ọgụgụ nke ya na ụba mmadụ dum nke mba Africa bụ́ Botswana hà. Itoolu n’ime mmadụ iri na-anwụ n’ihi ịba bụ n’ebe okpomọkụ Africa, ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị ọ na-egbu bụ ụmụaka na-eto eto. Na kọntinent ndị dị n’America, WHO dekọrọ ntiwapụ kasịnụ nke ịba n’ógbè Amazon. Igbukpọsị oké ọhịa na mgbanwe mbara ebe obibi ndị ọzọ emewo ka e nwee ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ịba na-egbu n’akụkụ ahụ nke ụwa. N’ụfọdụ ógbè Amazon nke Brazil, nsogbu ahụ aghọwo ugbu a ihe siri oké ike nke na ihe karịrị mmadụ 500 n’ime 1,000 ọ bụla bi ebe ahụ na-arịa ya.
Ma ọ̀ bụ n’Africa, kọntinent ndị dị n’America, Esia, ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ, ịba na-emetụtakarịsị ìgwè ndị kasị daa ogbenye. Ndị a nile, ka WHO na-ekwu, “nwere ohere kasị nta inweta nlekọta ahụ ike, kasị bụrụ ndị na-apụghị ịkwụli ụgwọ maka nchebe onwe onye na ndị dịpụkarịsịrị adịpụ n’ihe omume a haziri ahazi maka ibelata ịba.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọnọdụ nke ndị ogbenye ahụ abụghị nke na-enweghị olileanya. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ka TDR News, bụ́ obere akwụkwọ akụkọ banyere nnyocha ọrịa ebe okpomọkụ na-ekwu, e nwetakwuola otu n’ime usoro yikarịsịrị ka ọ ga-aga nke ọma iji gbochie ọnwụ ndị ịba na-akpata. Gịnị bụ aha ihe ahụ na-azọpụta ndụ? Ụgbụ anwụnta nke jupụtara n’ọgwụ e ji egbu ahụhụ.
Uru nke Ụgbụ Anwụnta
Ọ bụ ezie na iji ụgbụ anwụnta bụ ihe ngwọta nke ịlaghachi n’ihe ndị bụ isi, Dr. Ebrahim Samba, onye nduzi ọfịs WHO n’Africa, gwara Panos Features, bụ́ otu obere akwụkwọ akụkọ nke Ụlọ Ọrụ Panos, na nnwale iji chọpụta ịdị irè nke ụgbụ anwụnta n’ịlụso ịba ọgụ egosiwo “ihe ndị magburu onwe ya ọ rụpụtara.” Dị ka ihe atụ, na Kenya, iji ụgbụ anwụnta ndị jupụtara n’ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ ndị pụrụ ịgbari agbari ejiriwo otu ụzọ n’ụzọ atọ gbubilata ngụkọta ndị na-anwụ, ọ bụghị nanị ọnwụ ndị ịba na-akpata, n’etiti ụmụaka ndị na-erubeghị afọ ise. E wezụga ịzọpụta ndụ, “ụgbụ pụrụ ibelata nke ukwuu ibu arọ a na-atụkwasị ije ozi ahụ ike” n’ihi na ọgwụgwọ ụlọ ọgwụ maka ịba ga-adị ndị ọrịa dị ala karị mkpa.
Otú ọ dị, a ka ga-agwọta otu nsogbu: Ònye ga-akwụ ụgwọ ụgbụ ndị ahụ? Mgbe a gwara ndị mmadụ nọ n’otu mba Africa ịtụ ụtụ, ihe ka ọtụtụ ekweghị. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya, nye ndị bi ná mba ndị na-emefu ihe na-erughị $5 (U.S.) n’isi otu onye kwa afọ ná nlekọta ahụ ike, ọbụna otu ụgbụ anwụnta—nke nwere ma ọ bụ na-enweghị ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ—bụ ihe okomoko. Otú ọ dị, ebe usoro mgbochi a ga-efu gọọmenti ihe dị ala karịa ịgwọ ndị ịba na-arịa, ndị ọkachamara UN na-ekwu na “ọ ga-abụ ụzọ kasị dịrị ọnụ ala isi jiri ego gọọmenti na-adịghị adị kesaa ma kwụọ ụgwọ ụgbụ anwụnta ndị jupụtara n’ọgwụ.” N’ezie, nye gọọmenti, iwepụta ụgbụ anwụnta pụrụ ịbụ otu ụzọ isi chekwaa ego. Otú ọ dị, nye ọtụtụ nde ndị amaala ha dara ogbenye, ọ karịrị nke ahụ—ọ bụ ụzọ isi zọpụta ndụ ha.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]
CDC, Atlanta, Ga.