Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 7/8 p. 29-30
  • Ikiri ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri ụwa
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịda Ogbenye na Gburugburu Ebe Obibi
  • Ihe Ize Ndụ nke Obi Nkoropụ
  • Ọtụtụ Afọ n’Ime Njem
  • Oge nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa
  • Egwu Maka Asụsụ French
  • Ịchọ Ịkwụsị Inye Aka Azụ
  • Egú Iwu Ewu
  • Mmebi Ise Siga Kpatara Ọ̀ Bụ Ihe A Na-apụghị Imegharị?
  • Ihu A Na-arụzighị
  • Ịṅụ Sịga Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Ịṅụ Sịga?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
Teta!—1998
g98 7/8 p. 29-30

Ikiri ụwa

Ịda Ogbenye na Gburugburu Ebe Obibi

N’agbanyeghị uto ọnọdụ akụ̀ na ụba, ihe karịrị ijeri mmadụ 1.3 gburugburu ụwa ka na-eji ihe na-erughị dollar abụọ ebi ndụ kwa ụbọchị. Ịda ogbenye, ka otu akụkọ nke òtù UN na-ekwu, abụghị nanị na ọ ka dị kama ọ na-aka njọ. Ihe karịrị otu ijeri mmadụ taa na-akpata ihe na-erughị ihe a kpatara n’afọ 20, 30, ma ọ bụ ọbụna 40 gara aga. Nke a kwa na-atụnye ụtụ ná mbibi nke gburugburu ebe obibi, ebe “ịda ogbenye na-achọ iji ihe ndị sitere n’okike eme ihe ozugbo bụ́ nke na-akpaghasị atụmatụ nchekwa ọ bụla na-adịte anya,” ka magazin bụ́ UNESCO Sources na-ekwu. “N’ọ̀tụ̀tụ̀ ọ dị ugbu a, oké ọhịa ndị dị na Caribbean ga-apụworị n’anya kpam kpam n’ihe na-erughị afọ 50 . . . Ọnọdụ ahụ ka njọ ọbụna ná mba ná mba: Philippines nwere oké ọhịa fọdụrụnụ nke ga-adịru afọ 30, Afghanistan afọ 16, Lebanọn kwa afọ 15.”

Ihe Ize Ndụ nke Obi Nkoropụ

“Ndị ọkà mmụta sayensị . . . na-ekwu na obi nkoropụ pụrụ imebiru obi ka ise siga 20 kwa ụbọchị,” ka The Times nke London na-akọ. “Otu nnyocha were afọ anọ e mere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ikom Finland 1,000 katatụrụ ahụ chọpụtara na obi nkoropụ dugara n’ihe ize ndụ rịworo elu n’ụzọ dị ukwuu nke inwe ọrịa atherosclerosis, ma ọ bụ mgbasi ike nke akwara nkesa ọbara.” Nnyocha ahụ gosiri na ọnọdụ uche mmadụ pụrụ inwe mmetụta buru ibu n’ahụ ike ya. “Anyị nọgidere na-achọpụta na ọnọdụ uche na nke mmetụta uche na-emetụta ahụ ike,” ka Dr. Susan Everson kwuru, bụ́ onye duziri nnyocha ahụ. “Ọ dị ndị dibịa mkpa ịmata na enweghị olileanya na-enwe mmetụta dị njọ ma na-atụkwasị ihe n’ibu arọ nke ọrịa. Ọ dị ndị mmadụ mkpa ịghọta na mgbe ha na-enweghị olileanya ma nwee mmetụta nke obi nkoropụ ha kwesịrị ịgbalị ịchọ enyemaka.”

Ọtụtụ Afọ n’Ime Njem

Ndị bi n’obodo ukwu ndị bụ́ isi n’Itali na-etinye oge dị ukwuu n’ime njem site n’ụlọ ha gaa ọrụ ma ọ bụ gaa ụlọ akwụkwọ ma laghachị. Oge hà aṅaa? Dị ka Legambiente, bụ́ òtù na-ahụ maka gburugburu ebe obibi Itali si kwuo, ụmụ amaala bi na Naples na-etinye minit 140 n’ime njem kwa ụbọchị. Ka e were ya na nkezi oge ndụ bụ afọ 74, onye Naples ga-esi otú a tụfuo afọ 7.2 nke ndụ ya n’ime njem. Onye Rom, nke na-etinye minit 135 n’ime njem kwa ụbọchị, ga-atụfu afọ 6.9. Ọnọdụ ahụ fọrọ nke nta ka ọ dị njọ otú ahụ n’obodo ukwu ndị ọzọ. Ndị bi na Bologna ga-atụfu afọ 5.9, ndị bikwa na Milan afọ 5.3, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ La Repubblica na-akọ.

Oge nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa

Mgbanwe nke oge pụrụ isi ike nghọta n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Otu ihe atụ bụ Iran, bụ́ nke kemgbe ọtụtụ afọ ‘hịziworo klọọkụ ya iji hour atọ na ọkara gafee oge Greenwich Mean Time (nkezi ngụkọ oge ụwa) kama ịbụ otu hour zuru ezu, bụ́ otú ihe ka n’ọtụtụ mba na-eme,” ka The New York Times na-ekwu. “Dị ka ihe atụ, iji gee akụkọ ụwa n’elekere anya 5 nke ụtụtụ ná Ngalaba BBC Na-ezipụ Ozi n’Ụwa Nile, ị ghaghị ịgbanye redio gị n’elekere anya 8:30 nke ụtụtụ ma gbalịa ike gị ileghara ụda mgbịrịgba ndị ahụ nke na-eme elekere mgbanaka gị onye ụgha anya.” Ebe omenala ógbè bụkwa ime mgbanwe n’otu hour ha na-eji agafe oge ụwa ná ngwụsị izu ikpeazụ na September, n’afọ gara aga Israel mere mgbanwe ahụ na September 13. Ịmata ngwụsị izu sikwara ike. Ihe ka ọtụtụ ná mba ndị dị n’ógbè Persian Gulf na-ewere Thursday na Friday dị ka ngwụsị izu. Otú ọ dị, n’Ijipt na n’ihe ka ọtụtụ ná mba ndị dị ya nso, Friday na Saturday bụ ngwụsị izu ha, ebe ọ bụ Saturday na Sunday na Lebanọn. “Dị ka ihe atụ, onye njem nke mere atụmatụ irute n’Abu Dhabi n’ehihie Wednesday, jirizie ụgbọelu gawa Beirut ná mgbede Friday ga-ejide n’aka inwe ngwụsị izu dị ụbọchị anọ. Nanị ihe dị onye ọrụ riri ahụ mkpa bụ ichegharị njem ahụ ihu,” ka Times na-ekwu.

Egwu Maka Asụsụ French

Ndị nnọchiteanya si ná mba ndị na-asụ French gara otu nnọkọ nkwurịta okwu were ụbọchị atọ e nwere na nso nso a na Hanoi, Vietnam, iji mee ememe “French ịbụ ihe a na-asụ n’ebe nile,” ka akwụkwọ akụkọ Paris a na-ebipụta kwa ụbọchị bụ́ Le Figaro kọrọ. N’oge ọ bụla ihe karịrị nde mmadụ 100 na-asụ French. Mgbe ọ kasị ewu ewu na narị afọ nke 17, French bụ asụsụ maka mmekọrịta mba na mba. “Na Europe kewasịrị ekewasị, nkwekọrịta udo ndị e ji asụsụ French dee kwụsịrị agha na esemokwu dị iche iche,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Otú ọ dị, ugbu a asụsụ French “na-achọ ọnọdụ ya achọ n’ụwa.” Ọdịda e nwere n’ịsụ French pụrụ ịbụ n’ihi ịrị elu nke Bekee, karịsịa dị ka asụsụ azụmahịa. Ná mgbalị ibelata akwụsighị ike a, president France gbara ume ịkwalite asụsụ French n’ụzọ awara awara ihe ọmụma nke kọmputa. Otú ọ dị, otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n’ikwupụta egwu ya maka ihe ga-abụ ọdịnihu nke asụsụ French, kwuru, sị: “Ịsụ French n’ụwa nile adịghị adọrọ mmasị ọha na eze, usoro mgbasa ozi, ma ọ bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ikekwe enweghị mmasị a na-apụta ìhè na France ọbụna karịa ná mba ndị ọzọ.”

Ịchọ Ịkwụsị Inye Aka Azụ

Na China ọ bụ huilu; na Kenya, kitu kidogo. Mexico na-eji okwu bụ́ una mordida eme ihe; Russia, vzyatka; Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa kwa, baksheesh. N’ọtụtụ mba, inye aka azụ bụ ụzọ ndụ, mgbe ụfọdụ ọ bụkwa nanị ụzọ isi achụ nta ego, isi nweta ihe ụfọdụ, ma ọ bụ ọbụna inweta ikpe ziri ezi. Otú ọ dị, na nso nso a mba 34 abịanyewo aka n’akwụkwọ nkwekọrịta e zubere iji kpochapụ inye aka azụ ná mmekọrịta achụmnta ego mba nile. Ha gụnyere mba 29 ndị so n’Òtù Maka Njikọ Aka Akụ̀ na Ụba na Mmepe, tinyere Argentina, Brazil, Bulgaria, Chile, na Slovakia. Ndị ọzọ na-emekwa mgbalị megide ịkpa àgwà na-ezighị ezi nke ndị isi bụ ụlọ ọrụ ego ndị bụ́ isi n’ụwa—Ụlọ Akụ̀ Ụwa na Òtù Ego Mba Nile. E weere nzọụkwụ ndị a mgbe nnyocha nke Ụlọ Akụ Ụwa mere gosiri na pasent 40 nke achụmnta ego nile ná mba 69 na-enye aka azụ. Òtù abụọ ahụ na-enye ohere ugbu a maka ịkwụsị ego a na-enye mba ndị na-eleghara ịkpa àgwà na-ezighị ezi anya.

Egú Iwu Ewu

Egú mopane abụwo akụkụ nke ihe oriri nke ndị ogbenye n’ime obodo South Africa eri ogologo oge, bụ́ ebe a dabeere na ha ịbụ ihe na-enye protein. Ụmụ nke nla bụ́ emperor, ha nwetara aha ha site n’osisi mopane nke ha na-eri. N’April na December, ndị inyom na-achịkọta egú ndị ahụ, mgbe e wepụsịrị ihe dị n’ime ha, e sie ha ma mịkpọzie ha n’anwụ. Protein, abụba, vitamin, na calorie ha na-enye hà ka nke anụ na azụ̀ na-enye n’ụzọ dị mma. Otú ọ dị, ugbu a egú mopane ahụ na-aghọ ihe oriri na-ewu ewu n’ụlọ nri ndị dị na South Africa. Iwu ewu a agbasaruwokwa Europe na United States, nke a emenyewokwa ndị ime obodo nke Africa egwu. N’ihi gịnị? “Ka a na-achọwanye ya, e nwere nchegbu ma ụdị ha ọ̀ ga-adịgide,” ka The Times nke London na-ekwu. “Mopane apụworị n’anya n’ebe buru ibu nke Botswana na Zimbabwe dị ya nso.”

Mmebi Ise Siga Kpatara Ọ̀ Bụ Ihe A Na-apụghị Imegharị?

Mmebi nke akwara nkesa ọbara nke sitere n’ise siga pụrụ ịdịgide adịgide, ka otu nnyocha e mere na nso nso a na-ekwu. Na The Journal of the American Medical Association, ndị nnyocha kọrọ na ma ise siga ma ikuru anwụrụ ọkụ siga onye ọzọ pụrụ imebi akwara nkesa ọbara n’ụzọ na-enweghị mmegharị. Nnyocha ahụ metụtara ndị ikom na ndị inyom 10,914 nọ n’agbata afọ 45 na 65. Ìgwè ahụ gụnyere ndị na-ese siga, ndị na-esebu siga, ndị na-adịghị ese siga na-ekurukarị anwụrụ ọkụ siga onye ọzọ, na ndị na-adịghị ese siga na-adịghị ekurukarị anwụrụ ọkụ siga onye ọzọ. Ndị nnyocha na-eji ụda ime ahụ eme ihe tụrụ mgbasi ike nke akwara olu n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. A tụghachiri ihe ndị a n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ka afọ atọ gasịrị.

Dị ka a tụrụ anya ya, ndị na-esekarị siga nwere ịrị elu dị ịrịba ama ná mgbasi ike nke akwara nkesa ọbara ha—pasent 50 n’ọnọdụ nke ndị mmadụ ndị, ná nkezi, seworo otu paket siga kwa ụbọchị ruo afọ 33. Akwara nkesa ọbara nke ndị na-esebu siga jikọlatakwara, n’iji pasent 25 dị ngwa ngwa karịa nke ndị na-adịghị ese siga—ụfọdụ ọbụna afọ 20 mgbe ha kwụsịchara. Ndị na-adịghị ese siga bụ́ ndị na-ekuru anwụrụ ọkụ siga onye ọzọ gosiri ịkpọ nkụ nke akwara nkesa ọbara nke ji pasent 20 karịa nke ndị ahụ a na-ekpughepụghị otú ahụ. Dị ka nnyocha ahụ si kwuo, ihe e mere atụmatụ ya ịbụ mmadụ 30,000 ruo 60,000 na-anwụ kwa afọ na United States nanị pụrụ ịbụ n’ihi ikuru anwụrụ ọkụ siga onye ọzọ.

Ihu A Na-arụzighị

Mgbe afọ asaa nke nrụzigharị gasịrị, ihe oyiyi Sphinx dị n’Ijipt enweghịzi ihe e ji arị elu gbara ya gburugburu. “E jiri otu narị puku nkume mee ihe n’ịrụghachi Sphinx n’agbata 1990 na 1997,” ka Ahmad al-Haggar, bụ́ onye nduzi nke ihe oge ochie maka ógbè ahụ kwuru. Otú ọ dị, ọ gbakwụnyere na nrụzigharị ahụ e ji nlezianya rụọ agụnyeghị ihu e mebiri emebi nke “nnukwute ihe ọkpụkpụ ọkara ọdụm ọkara mmadụ ahụ e ji okwute limestone kpụọ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya