Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 11/8 p. 4-7
  • Ọrịa AIDS—Ụzọ Isi Lụso Ya Ọgụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrịa AIDS—Ụzọ Isi Lụso Ya Ọgụ
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Isi Gbochie Ya
  • Mgbe E Kwesịrị Ije Nnyocha
  • Olee Otú Inwe Ihe Ọmụma Pụrụ Isi Nye Aka?
  • Olee Ọgwụgwọ Ndị E Nwere?
  • Ọgwụ Mgbochi Ọrịa Hà Bụ Ngwọta Ya?
  • Ọganihu Ndị E Nwere n’Ọgụ A Na-alụso Ọrịa AIDS
    Teta!—2004
  • Ọrịa AIDS Agbasaa n’Africa
    Teta!—2002
  • Ihe Ngwọta nke Ọrịa AIDS—A Chọrọ Ya Ngwa Ngwa!
    Teta!—2004
  • “Ọrịa Na-efe Efe nke Kasị Mebie Ihe n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke Mmadụ”
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 11/8 p. 4-7

Ọrịa AIDS—Ụzọ Isi Lụso Ya Ọgụ

KA Ọ dị ugbu a ọrịa AIDS enweghị ngwọta, sayensị ọgwụ na ahụ ike eyighịkwa ka ọ ga-achọta ya n’isi nso. Ọ bụ ezie na ọgwụgwọ ndị ọhụrụ e nwere na-eme ka ọrịa ahụ ghara ịga n’ihu, ọ kasị mma nke ukwuu izere ibute ya ebute. Otú ọ dị, tupu anyị atụlee banyere mgbochi ya, ka anyị tụlee otú e si na otú a na-esighị ebufe nje ọrịa AIDS (HIV) site n’otu onye gaa n’onye ọzọ.

Mmadụ pụrụ ibute ya n’ụzọ anọ ndị bụ́ isi: (1) site n’iji ntụtụ ma ọ bụ ihe a na-etinye ntụtụ ndị nje dị na ha, (2) site n’isoro onye bu ya nwee mmekọahụ (site n’ọtụ, otule, ma ọ bụ n’ọnụ), (3) site ná mmịnye ọbara na ihe ndị si n’ọbara, ọ bụ ezie na e belatawo ihe ize ndụ nke a ná mba ndị mepere emepe karị bụ́ ebe a na-enyocha ọbara ugbu a maka antibody nje HIV, na (4) site n’aka nne ya bu nje HIV, bụ́ onye pụrụ ibufe ya nwa ọhụrụ ahụ tupu ma ọ bụ mgbe a na-amụ ya ma ọ bụ mgbe a na-enye ya ara.

Dị ka Ụlọ Ọrụ Maka Nchịkwa Ọrịa nke United States (CDC) si kwuo, ihe àmà nke nkà mmụta sayensi e nwere ugbu a na-ekwu na (1) ị pụghị ibute ọrịa AIDS dị ka ị pụrụ ibute ụkwara ma ọ bụ azụ̀zụ̀ (2) ị pụghị ibute ya site n’ịnọdụ ala n’akụkụ onye bu ọrịa AIDS ma ọ bụ site n’imetụ onye bu ya ahụ ma ọ bụ ịmakụ ya, (3) ị pụghị ibute ya site n’iri nri onye bu ya metụrụ aka, siri ma ọ bụ bupụtara, (4) ị pụghịkwa ibute ya site n’iji otu ụlọ mposi, telifon, ákwà, ma ọ bụ arịa ndị e ji eri ihe ma na-aṅụ ihe na-eme ihe. Ọzọkwa, ụlọ ọrụ CDC na-ekwu na anwụnta ma ọ bụ ahụhụ ọ bụla ọzọ adịghị ebufe nje virus ahụ.

Ụzọ Isi Gbochie Ya

Nje ọrịa AIDS na-adị n’ọbara ndị bu ya. Ọ bụrụ na a gbaa onye bu ya ọgwụ, ụfọdụ ọbara na nje virus pụrụ ịfọdụ na ntụtụ ma ọ bụ n’ihe a na-etinye ntụtụ ahụ. Ọ bụrụ na e jiri ntụtụ nje virus ahụ si otú a dịrị na ya gbaa onye ọzọ ọgwụ, a pụrụ ibufe ya nje virus ahụ. Ya adịla mgbe ị ga-atụ egwu ịjụ dọkịta ma ọ bụ nọọsụ ajụjụ mgbe i nwere obi abụọ banyere ntụtụ ma ọ bụ ihe a na-etinye ntụtụ. Ọ bụ ihe ruuru gị ịmara; ndụ gị nọ n’ihe ize ndụ.

Nje ọrịa AIDS na-adịkwa n’ime mwụsị ahụ ma ọ bụ n’ime mmiri na-agbapụta n’ọtụ nke ndị bu ya. N’ihi ya, banyere igbochi ya, ụlọ ọrụ CDC na-atụ aro, sị: “Ịhapụ inwe mmekọahụ bụ nanị nchebe e ji n’aka. Ọ bụrụ na ị na-enwe mmekọahụ, chere ruo mgbe ị banyere ná mmekọrịta na-adịte anya, nke ikwesịrịta ntụkwasị obi, dị ka alụmdi na nwunye, n’etiti gị na onye na-ebughị ya.”

Rịba ama na ka i wee bụrụ onye e chebere, ị ghaghị ịnọgide na-enwe ‘mmekọrịta nke ikwesịrịta ntụkwasị obi.’ Ọ bụrụ na i kwesịrị ntụkwasị obi ma onye òtù ọlụlụ gị ekwesịghị, ị nọghị ná nchebe. Nke a na-ewetakarị nsogbu siri ike nye ndị inyom bi n’etiti ọha mmadụ ebe ndị ikom na-achịgbu ha n’ụzọ mmekọahụ na n’ụzọ akụ̀ na ụba. N’ala ụfọdụ a dịghị ekwe ndị inyom ọbụna isoro ndị ikom kwurịta ihe banyere mmekọahụ, ma ya fọdụzie ikwekọrịta banyere omume mmekọahụ ndị na-adịghị ize ndụ.

Otú ọ dị, ọ bụghị ndị inyom nile dị otú ahụ bụ ndị na-enweghị ike. Otu ihe ọmụmụ e nwere n’otu ala dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa gosiri na ndị inyom ụfọdụ bụ́ ndị nwere ego nke aka ha nwere ike ịjụ isoro di ha bu ọrịa AIDS nwee mmekọahụ, n’enweghị ime ihe ike ọ rụpụtara. Na New Jersey, U.S.A., ndị inyom ụfọdụ jụrụ inwe mmekọahụ ma ọ bụrụ na nwoke ahụ achọghị iyi condom. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na condom ndị e ji rọba mee pụrụ igbochi ibute nje HIV na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute site ná mmekọahụ, a ghaghị iji ha mee ihe otú kwesịrị ekwesị nakwa mgbe nile.

Mgbe E Kwesịrị Ije Nnyocha

Karen, bụ́ onye a kpọtụrụ uche n’isiokwu bu ụzọ, enwekebeghị ihe ọ gaara eme iji chebe onwe ya pụọ n’ibute ọrịa ahụ. Di ya butere ya ọtụtụ afọ tupu ha alụọ di na nwunye, ha lụkwara mgbe ime nnyocha ọbara n’ihi ntiwapụ ọrịa ahụ na nje HIV ka na-amalite amalite. Otú ọ dị, ugbu a ime nnyocha ọbara n’ihi nje HIV aghọwo ihe a na-eme mgbe dum ná mba ụfọdụ. Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ nwere obi abụọ ọ bụla ma o bu nje HIV ma ọ bụ na o bughị ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ibu ụzọ mee nnyocha ọbara tupu ọ na-abanye ná mbedo. Okwu ndụmọdụ Karen bụ: “Jiri amamihe họrọ onye ị ga-alụ. Nhọrọ na-ezighị ezi pụrụ ifu gị ihe dị ukwuu, ọbụna ndụ gị kpọmkwem.”

Ime nnyocha ọbara pụrụ inye aka ichebe di ma ọ bụ nwunye nke aka ya dị ọcha ma a bịa n’ihe banyere ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye. Ebe ọ bụ na a gaghị achọpụta nje HIV tupu o ruo ọnwa isii e butesịrị ya, ọ pụrụ ịdị mkpa ime ọtụtụ nnyocha ọbara. Ọ bụrụ na a maliteghachi inwe mmekọahụ (n’ụzọ dị otú a na-egosi na a gbagharawo onye ahụ kwara iko), iji condom eme ihe pụrụ inye aka chebe mmadụ pụọ n’ibute ọrịa.

Olee Otú Inwe Ihe Ọmụma Pụrụ Isi Nye Aka?

Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ọ bụ ezie na e dere Bible ogologo oge tupu ọrịa AIDS apụta, ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya na-echebe mmadụ pụọ n’ibute ọrịa ahụ. Dị ka ihe atụ, Bible na-akatọ mmekọahụ na-abụghị n’alụmdi na nwunye, na-achọ ikwesị ntụkwasị obi n’ime alụmdi na nwunye, na-ekwukwa na ndị Kraịst kwesịrị ịlụ nanị ndị na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ dị ka ha. (1 Ndị Kọrint 7:39; Ndị Hibru 13:4) Ọ machibidokwara iji ụdị ihe nile na-eri ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na iri ọbara, bụ́ ndị na-emetọ ahụ.—Ọrụ 15:20; 2 Ndị Kọrint 7:1.

Ọ bụ ihe amamihe dị na ya inwe ihe ọmụma n’onwe gị banyere ihe ize ndụ ndị dị n’iso ndị bu nje HIV emekọrịta ihe. Ịmụta ihe banyere ọrịa AIDS na-akwadebe ndị mmadụ ichebe onwe ha pụọ n’ibute ya.

Òtù Na-eme Ihe Banyere AIDS na-ekwu, sị: “N’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ, a pụrụ igbochi ọrịa AIDS. Ruo mgbe a chọtara ngwọta ya, inwe ihe ọmụma bụ ihe kasị mma, ka ọ dịkwa ugbu a ọ bụ nanị ihe nchebe [ọha mmadụ] nwere megide ibute ọrịa AIDS. (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ dị mma ka ndị nne na nna gwarịta onwe ha nakwa ụmụ ha eziokwu banyere ọrịa AIDS.

Olee Ọgwụgwọ Ndị E Nwere?

Mgbaàmà ọrịa adịghị apụtakebe ruo malite n’afọ isii ruo iri mgbe mmadụ butesịrị nje HIV. N’afọ ndị ahụ, a na-alụ ọgụ n’ime ahụ. Nje virus nke ọ bụla na-amụba ma na-egbu mkpụrụ ndụ ndị usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ. Mkpụrụ ndụ ndị usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ na-alụsoghachi ha ọgụ. N’ikpeazụ, ka ọtụtụ ijeri nje virus ndị ọhụrụ na-apụta kwa ụbọchị, ha na-emeri usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ.

E mepụtawo ọgwụ dị iche iche ịnwa inyere usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ aka, ọgwụ ndị nwere aha ndị dị mgbagwoju anya a na-eji mkpụrụ akwụkwọ amata—AZT, DDI, na DDC. Ọ bụ ezie na ụfọdụ kwenyere na ọgwụ ndị a nwere abamuru ndị dị ịrịba ama nakwa ọbụna nwee ike ịgwọta ya, olileanya ndị dị otú ahụ kụrụ afọ n’ala ngwa ngwa. Ọ bụghị nanị na ha adịghị adịzi irè ka oge na-aga kama ha na-akpatakwa nsogbu ndị dị ize ndụ n’ahụ ụfọdụ ndị—mbelata nke mkpụrụ ndụ ọbara, nsogbu nke ọbara ịkpụkọ akpụkọ, na mbibi nke akwara n’aka na n’ụkwụ.

Ugbu a ọgwụ ndị ọhụrụ apụtala: protease inhibitors. Ndị dọkịta na-edepụta ndị a site n’ijikọta ụzọ ọgwụ atọ na ọgwụ ndị ọzọ na-egbu nje virus. Nnyocha ọbara ndị e mere egosiwo na ọ bụ ezie na usoro ọgwụgwọ iji ụzọ ọgwụ atọ eme ihe a adịghị egbu nje virus ahụ, ọ na-akwụsị, ma ọ bụ fọ nke nta ka ọ kwụsị mmụba ya n’ime ahụ.

Usoro ọgwụgwọ iji ụzọ ọgwụ atọ eme ihe ewetawo ọganihu dị ịrịba ama n’ahụ ike nke ndị na-arịa ọrịa. Otú ọ dị, ndị ọkachamara kwere na ọgwụ ahụ na-arụkarịsị ọrụ mgbe e nyere ya ndị bu nje HIV n’oge tupu mgbaàmà ọrịa amalite ịpụta. Mgbe e mere nke ahụ, ọ pụrụ ikwe omume igbochi ọrịa ahụ, ikekwe kpam kpam, ịghọ ọrịa AIDS kpọmkwem. Ebe ọ bụ na ọgwụgwọ ahụ pụtara ọhụrụ, a ka ga-ahụ ogologo oge usoro ọgwụgwọ ahụ ga-abịanyụru ọrịa ahụ.

Usoro ọgwụgwọ iji ụzọ ọgwụ atọ eme ihe dị oké ọnụ. Nkezi nke ọnụ ego ọgwụ atọ na-alụso nje virus ọgụ tinyere ime nnyocha ọbara bụ $12,000 n’otu afọ. E wezuga ibu arọ ya n’ụzọ ego, onye ọrịa e ji usoro ọgwụgwọ nke iji ụzọ ọgwụ atọ eme ihe na-agwọ aghaghị ịga na friji ọtụtụ ugboro, bụ́ ebe a na-aghaghị idote ọgwụ ahụ. Dị ka ọ na-adịkarị, mmadụ na-aṅụ mkpụrụ ọgwụ ụfọdụ ugboro abụọ kwa ụbọchị, ndị ọzọkwa ugboro atọ kwa ụbọchị. E kwesịrị ịṅụ ụfọdụ mgbe a na-eribeghị nri, ndị ọzọ mgbe e rijusịrị afọ. Usoro ọgwụgwọ ahụ na-agbagwojukwu anya mgbe a na-aghaghị ịṅụ ọgwụ ndị ọzọ iji lụsoo ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ ọgụ bụ́ ndị onye ahụ na-arịa ọrịa AIDS pụrụ ibute.

Nchegbu bụ́ isi nke ndị dọkịta nwere bụ ihe pụrụ ime ma ọ bụrụ na mmadụ akwụsị usoro iji ụzọ ọgwụ atọ eme ihe. Mmụba nke nje virus ga-amaliteghachi n’akwụsịghị akwụsị, nje virus ndị lanarịrị ọgwụgwọ ahụ pụrụ iguzogide ọgwụ ndị onye ahụ ṅụwororị ná mbụ iji lụsoo ha ọgụ. Ụdị HIV ndị na-adịghị anabata ọgwụ ga-esi ike ngwọta karị. Ọzọkwa, a pụrụ ibufe ndị ọzọ nje virus ndị a siri oké ike.

Ọgwụ Mgbochi Ọrịa Hà Bụ Ngwọta Ya?

Ụfọdụ ndị nnyocha banyere ọrịa AIDS kwere na ụzọ isi kwụsị ntiwapụ nke ọrịa AIDS n’ụwa nile bụ ọgwụ mgbochi ọrịa na-adịghị emerụ ahụ, nke dị irè. E ji nje virus ndị e mere ka ike ghara ịdịkwa ha mepụta ọgwụ mgbochi ọrịa ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ịlụso ịba anya odo, ákpàtà, akpụka nti, na rubella ọgụ. Dị ka ọ na-adịkarị, mgbe e webatara ụdị nje virus e mere ka ike ghara ịdịkwa ya n’ime ahụ, usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ adịghị emeghachi omume nanị iji bibie ya kama ọ na-emepụtakwa ihe nchebe ndị ga-emeri mwakpo ọ bụla nke ezigbo nje virus.

Nchọpụta abụọ ndị e ji enwe mee na nso nso a atụwo aro na nsogbu nje HIV nwere bụ na ọbụna nje virus ndị e mere ka ike ghara ịdịkwa ha pụrụ ịghọ ndị na-egbu egbu. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọgwụ mgbochi ọrịa ahụ pụrụ ịkpata ọrịa ahụ e mepụtara ya ka o gbochie.

Ọchịchọ a na-achọ ọgwụ mgbochi ọrịa enwebeghị isi ma bụrụ nke nkụda obi. Ọtụtụ ọgwụ e ji eme nnwale bụ́ ndị gaara ebibi n’ezie nje virus ndị dị ala karị emebeghị nje HIV ihe ọ bụla. Ọzọkwa, nje HIV na-agbanwe agbanwe, na-eme ka ọ bụrụ ihe a na-apụghị ịgwọta. (Ka ọ dị ugbu a e nwere ma ọ dịkarị ala ụdị nje HIV iri gburugburu ụwa.) N’ịgbakwunye ná nsogbu ahụ, nje virus ahụ na-awakpo kpọmkwem mkpụrụ ndụ ndị usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ nke ọgwụ mgbochi ọrịa kwesịrị ijikọta aka chebe.

Ọnọdụ akụ̀ na ụba nwekwara òkè ọ na-ekere n’ime nnyocha. E nwere “ọ̀tụ̀tụ̀ nkwado dị ala site n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe nke ndị mmadụ nwe n’onwe ha,” ka Ụlọ Ọrụ Mba Nile Na-akwado Nchọpụta Ọgwụ Mgbochi Maka Ọrịa AIDS nke nwere isi ọnọdụ ha na Washington kwuru. E kwuru na nke a bụ n’ihi egwu bụ́ na ọgwụ mgbochi ọrịa agaghị eweta uru, ebe ọ bụ na a ga-ere ihe ka ọtụtụ n’ime ya ná mba ndị na-emepebechabeghị emepe.

N’agbanyeghị ihe isi ike ndị ahụ, ndị nnyocha na-aga n’ihu inyocha ọtụtụ ụzọ n’ọchịchọ a na-achọ ọgwụ mgbochi ọrịa ga-adị irè. Otú ọ dị, ka ọ dị ugbu a, o yighị ka a ga-emepụta ọgwụ mgbochi ọrịa n’isi nso. Mgbe e mepụtara ọgwụ mgbochi ọrịa yiri ka ọ ga-aga nke ọma n’ụlọ nnyocha, mgbe ahụ ọrụ siri ike, dị oké ọnụ, nakwa nke pụrụ inwe ihe ize ndụ nke ịnwale ya n’ahụ mmadụ na-esochi.

[[Igbe dị na peeji nke 5]

Olee Ndị Na-ebute Nje HIV?

Gburugburu ụwa, ihe dị ka mmadụ 16,000 na-ebute ya kwa ụbọchị. A na-ekwu na ihe karịrị pasent 90 bi ná mba ndị ka na-emepe emepe. Ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ 10 bụ nwatakịrị na-erubeghị afọ 15. Ndị ọzọ bụ ndị toruworo ogo mmadụ ndị ihe karịrị pasent 40 n’ime ha bụ ndị inyom, ihe karịkwara ọkara nọ n’agbata afọ 15 na 24.—Òtù Ahụ Ike Ụwa na Usoro Ihe Omume E Jikọrọ Ọnụ nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka HIV/AIDS.

[Igbe dị na peeji nke 7]

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mata Onye Bu Ya?

Ị pụghị ịmata ma mmadụ o bu ya site nanị n’ile ya anya. Ọ bụ ezie na ndị bu ya na-enweghị ihe mgbaàmà na-egosi na ha bu nje HIV pụrụ iyi ka ahụ ọ dị ha mma, ha pụrụ ibufe ndị ọzọ nje virus ahụ. Ị̀ pụrụ ikwere nnọọ ihe mmadụ gwara gị na ya ebughị ya? Ọ bụchaghị otú ahụ. Ọtụtụ n’ime ndị bu nje HIV adịghị ama n’onwe ha na ha bu ya. Ndị maara pụrụ izo ya, ma ọ bụ ha pụrụ ịgha ụgha. Nnyocha e mere na United States kpughere na mmadụ 4 n’ime 10 bu nje HIV agwaghị ndị ha na ha nwere mmekọahụ banyere ọnọdụ ha.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Njikọ Dị n’Etiti Nje HIV na Ọrịa AIDS

HIV pụtara “nje virus na-eme ka ikike ahụ mmadụ ji alụso ọrịa ọgụ belata,” bụ́ nje virus na-eji nke nta nke nta na-ebibi akụkụ dị iche iche nke usoro ahụ mmadụ ji alụso ọrịa ọgụ. AIDS pụtara “ọrịa e butere ebute na-emebi usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ.” Ọ bụ agba nke ikpeazụ, na-eyi ndụ egwu nke nje HIV. Aha ya na-akọwa otú nje HIV siworo mebie usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ nke ukwuu, na-eme ka onye ahụ bute ọrịa ndị usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ gaara alụso ọgụ.

[Ebe E Si Nweta Foto]

CDC, Atlanta, Ga.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ime nnyocha ọbara maka nje HIV tupu a na-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye bụ nhọrọ amamihe dị na ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya