Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 5/8 p. 31
  • Ise Siga Abụghị Maka m!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ise Siga Abụghị Maka m!
  • Teta!—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Obiọma Ha Mere Ka Obi Ọjọọ Laa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Mmadụ Ịṅụ Sịga Ọ̀ Dị Chineke Mma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Teta!—2004
g04 5/8 p. 31

Ise Siga Abụghị Maka m!

I HE a bụ isiokwu e nyere ọtụtụ narị ụmụ akwụkwọ ndị na-ekere òkè n’edemede zuru steeti ọnụ bụ́ nke Òtù Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na Steeti Missouri nke dị na United States hụrụ maka ya. Ihe dị ka ụmụ akwụkwọ 675 si n’ụlọ akwụkwọ 42 keere òkè n’edemede ahụ. Ihe nrite ahụ gaara Breanna, bụ́ onye dị afọ 12, e bikwara uri mmeri ya n’akwụkwọ bụ́ Missouri Medicine nke Òtù Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na Steeti Missouri na-ebipụta. E nyekwara Breanna ohere ịgụrụ ndị bịara mgbakọ nke òtù ahụ na-enwe kwa afọ uri ya. Tupu ọ gụọ uri ya, Breanna gwara ndị na-ege ya ntị, sị:

“Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova, ihe nile dị n’uri a sikwa na magazin bụ́ Teta! Nke bụ́ eziokwu bụ na esi m n’ihu [magazin] nke a nweta ihe m dere n’otu n’ime ahịrịokwu ndị kasị masị m n’uri a. E sere ya okpokoro isi mmadụ nke kpụ siga n’ọnụ, ma dee sị: ‘Ọnwụ A Na-ere Ere.’ Kemgbe ọtụtụ afọ, magazin bụ́ Teta! ebipụtawo ọtụtụ isiokwu kwuru banyere ihe ize ndụ dị n’ise siga.”

Ndịàmà Jehova na-ezere iji ụtaba eme ihe. Ha kweere na ilezi anya na-eji ihe ọ bụla pụrụ imetọ ahụ́ mmadụ eme ihe, na-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka onyinye nke ndụ nakwa Onye Okike. (Ọrụ 17:24, 25) N’ihi ya, ha na-agbaso ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ́: “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ.”—2 Ndị Kọrint 7:1.

Dị ka ndị ntorobịa ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà, Breanna na-agbalịsi ike ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. N’eziokwu, ndị na-eto eto nile dị otú ahụ na-eme ka obi Onye Okike ha ṅụrịa.—Ilu 27:11.

[Foto dị na peeji nke 31]

Breanna (onye dị afọ 14 ugbu a) ebe o ji uri ya n’aka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya