Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 5/8 p. 32
  • ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’
  • Teta!—2004
Teta!—2004
g04 5/8 p. 32

‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’

“Ngwá ọrụ a magburu onwe ya bụ nnọọ ihe dị m mkpa,” ka otu nwanyị dere mgbe ọ tụlesịrị ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ bụ́ broshuọ e bipụtara na nso nso a bụ́ nke nwere map ndị dabeere na Bible. “Ebe na ndị na ọnọdụ ndị a kọrọ banyere ha n’Akwụkwọ Nsọ aghọwo ndị na-akpali mmasị nye m.”

Broshuọ a dị peeji 36, bụ́ nke nwere ihe osise ndị tụrụ àgwà, na-enyere ndị mmụta nke Okwu Chineke aka iji anya nke uche ha hụ ihe ndị a kọrọ banyere ha na Bible. “Ịhụ na ụlọ nsọ ahụ dị n’ebe gbagotụrụ elu karịa ala ndị gbara ya gburugburu, na-eme ka a ghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwuru banyere ofufe ‘dị elu’ nke Jehova,” ka ọ gara n’ihu na-ede. “Ọ bụ nnukwu ihe enyemaka ịhụ ebe obodo mgbaba ahụ, nakwa ebe ebe ndị ọzọ a kpọtụrụ aha n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa nke Grik, dịgasị. Amalitere m iji broshuọ a magburu onwe ya na-eme ihe n’ịmụ akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndị Ozi.”

Nwanyị a mechiri akwụkwọ ozi ya site n’ide, sị: “Aga m na-eji onyinye a magburu onwe ya na-agụ Okwu Chineke mgbe nile.”

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu broshuọ a bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya