Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/13 p. 14-15
  • Paradaịs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Paradaịs
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Paradaịs?
  • Ebee Ka Paradaịs Ga-adị?
  • Ole ndị ga-ebi na Paradaịs?
  • Olee ebe Paradaịs Baịbụl kwuru okwu ya dị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • “Anyị Ga-ahụ na Paradaịs!”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụwa Anyị A?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Ikwu na Ụwa Ga-aghọọ Paradaịs, Ọ̀ Bụ Ịmụ Anya Arọ Nrọ Ka Ọ̀ Bụ Eziokwu?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2013
g 1/13 p. 14-15

IHE BAỊBỤL KWURU

Paradaịs

[Foto dị na peeji nke 14]

Gịnị Bụ Paradaịs?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekwu na akụkọ Baịbụl kọrọ banyere Paradaịs bụ akụkọ ifo. Ebe ndị ọzọ na-ekwu na o yiri ebe mmadụ mụ anya na-arọ nrọ ebe mara mma. Ná nrọ ahụ, ya ana-ahụ ebe ndị ezigbo mmadụ dị ndụ ebighị ebi ma na-arụ ọrụ ndị na-atọ ha ụtọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ihe ndị mmadụ na-akpọ ogige Iden ebe Adam na Iv biri bụ Paradaịs. (Jenesis 2:7-15) Baịbụl kwuru na e nwere ebe bụ́ ogige Iden n’eziokwu, ebe ọrịa na ọnwụ na-adịghị. (Jenesis 1:27, 28) Chineke mechara chụpụ Adam na Iv n’ebe ahụ n’ihi na ha nupụụrụ ya isi. Ma, ọtụtụ amụma ndị dị na Baịbụl kwuru na Chineke ga-eme ka e nwee Paradaịs n’ụwa a ọzọ.

GỊNỊ MERE I JI KWESỊ ỊMỤ GBASARA PARADAỊS?

Baịbụl kwuru na Chineke hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị kwetara na nke a bụ eziokwu, anyị ga-ekweta na ọ ga-eme ka ezigbo ndị na-efe ya biri na Paradaịs. Anyị ga-atụkwa anya na ọ ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ibi na ya. Baịbụl kwuru na gị na Chineke ga-adị ná mma ma ị na-amụ Okwu ya ma na-eme ihe ị na-amụta.—Jọn 17:3; 1 Jọn 5:3.

‘Jehova bụ́ Chineke kụrụ ubi n’Iden, ọ bụ n’ebe ahụ ka o mere ka mmadụ ahụ ọ kpụrụ nọrọ.’—Jenesis 2:8.

Ebee Ka Paradaịs Ga-adị?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ n’eluigwe ka Paradaịs dị, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ n’ụwa a ka a ga-enwe Paradaịs.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọ bụ n’ụwa ebe a ka Paradaịs ahụ e tinyere Adam na Iv mgbe e kere ha dị. Chineke kere ụwa ka ụmụ mmadụ biri na ya. Baịbụl kwuru na Chineke kere ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 104:5) O kwukwara na “eluigwe bụ eluigwe Jehova, ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.”—Abụ Ọma 115:16.

N’ihi ihe ndị a, o kwesịghị iju anyị anya na ọ bụ n’ụwa a ka Baịbụl sị na Paradaịs ga-adị. Na Paradaịs, Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi. Mmadụ niile ga-adị n’otu, dịrịkwa n’udo. Ihe mgbu na ịta ahụhụ agaghịzi adị. Ụmụ mmadụ ga-ebikwa n’ụwa nke mara ezigbo mma.—Aịzaya 65:21-23.

“Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, . . .  ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:3, 4.

Ole ndị ga-ebi na Paradaịs?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ okpukpe na-akụzi na ọ bụ naanị ndị ezi omume ga-ebi na Paradaịs. Ma, ha amaghị ihe mmadụ ga-eme ka ọ bụrụ onye ezi omume. Ụfọdụ chere na ihe mmadụ ga-eme ka ọ bụrụ onye ezi omume bụ iso na-eme ihe dị iche iche a na-eme n’okpukpe ha.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na ọ bụ ndị ezi omume ga-ebi na Paradaịs. Ma, ole ndị bụ ndị ezi omume? Ọ bụghị ndị na-eme ihe dị iche iche a na-eme n’okpukpe ha ma ha anaghị eme uche Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà nkịtị hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka irube isi n’ihe Jehova kwuru? Lee! Irube isi dị mma karịa àjà.” (1 Samuel 15:22) Nke a pụtara na ndị ezi omume ahụ Baịbụl kwuru na ha ga-ebi na Paradaịs bụ ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru.

IHE Ị GA-EME

Ihe na-egosi na ị na-erubere Chineke isi abụghị ime ihe dị iche iche a na-eme n’okpukpe gị. Ọ bụ otú i si akpa àgwà kwa ụbọchị ka e ji ama ma ị̀ na-eme ihe dị Chineke mma ma ọ̀ bụ na ị naghị eme. Ọ bụrụ na gị ana-amụ Baịbụl, ị ga-amụta otú ị ga-esi na-eme ihe dị Chineke mma. Irubere ya isi agaghị esiri gị ike. Baịbụl kwuru na “ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” (1 Jọn 5:3) Ọ bụrụ na i rubere Chineke isi, ọ ga-eme ka i biri na Paradaịs.

“Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya