Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 5 p. 7
  • Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Selata Aka n’Ịgụ Ozi Iimel, Ka Nchegbu Gị Belata
  • Azụ̀ Ejupụtakwala n’Osimiri Ndị E Gbukpọrọ Azụ̀ na Ha
  • Ime Ihe Ike na Brazil
  • Ihe Ị Ga-eme ma I Chegbuwe Onwe Gị
    Teta!—2020
  • Nrụgide Dị Mma, Nrụgide Dị Njọ
    Teta!—1998
  • Olee Otú M Ga-esi Merie Ihe Na-esiri M Ike n’Ụlọ Akwụkwọ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Nchegbu—Ihe Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe
    Teta!—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 5 p. 7
Azụ̀ nọ́ n’osimiri

IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu

Akụkọ ndị sí n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-egosi na ihe e dere na Baịbụl ka bara uru taa.

Selata Aka n’Ịgụ Ozi Iimel, Ka Nchegbu Gị Belata

Ebe otu nwoke lere ozi iimel ya ugboro atọ n’ụbọchị, ahụ́ e ruo ya ala; nwoke ọzọ elee nke ya ọtụtụ ugboro n’ụbọchị, obi e koro ya n’elu

Nchọpụta e mere na Vankuva, Kanada gosiri na mmadụ nwere ike ibelata nchegbu ya ma ọ na-ele iimel ya naanị ugboro atọ n’ụbọchị kama ịna-ele ya mgbe niile. Ọ bụ Kostadin Kushlev duziri nchọpụta a. Mgbe ọ na-ekwu banyere ihe ha chọpụtara, ọ sịrị: “Ọ na-esiri ndị mmadụ ike ịhapụ ile iimel ha mgbe niile. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ịhapụ ịna-ele ya mgbe niile ga-eme ka nchegbu ha belata.”

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ebe ọ bụ na anyị bị ‘n’oge dị oké egwu, nke takwara akpụ,’ ó kwesịghị ka anyị chọta otú anyị ga-esi na-ebelata nchegbu?​—⁠2 Timoti 3:⁠1.

Azụ̀ Ejupụtakwala n’Osimiri Ndị E Gbukpọrọ Azụ̀ na Ha

Ụlọ ọrụ Wildlife Conservation Society (WCS) kwuru, sị: “E nweela akwụkwọ ndị kwuru na eju mmiri, oporo, na azụ̀ amụbawala n’ebe ndị gọọmentị machiri ịkụ azụ̀” na Beliiz na n’ebe ndị ọzọ dị na Karịbian. Ụlọ ọrụ ahụ kwukwara, sị: “Ọ ga-esi ike ka ebe ndị a ka na-akụ azụ̀ dịghachi otú ha dị na mbụ. Ma n’agbata otu afọ na afọ isii, azụ̀ ga-adịghachịtụwa n’ebe ndị a machiri ịkụ azụ̀. Ma, ọ ga-ewe ọtụtụ afọ tupu azụ̀ ejupụta na ha.” Janet Gibson, bụ́ otu n’ime ndị isi ụlọ ọrụ ahụ, kwuru banyere Beliiz, sị: “Mmachi a a machiri ịkụ azụ̀ ná mmiri ụfọdụ dị n’obodo a ga-enye aka mee ka azụ̀ na ihe ndị ọzọ e gbụkpọrọ jupụtakwa otú ha dị ná mbụ.”

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Otú ihe ndị e kere eke si ebidoghachị ịmụba n’onwe ha ma e wepụ ihe na-akpa ha aka ọjọọ ọ́ naghị egosi na e nwere Onye Okike maara ihe?​—⁠Abụ Ọma 104:​24, 25.

Ime Ihe Ike na Brazil

Ụlọ ọrụ mgbasa ozi a na-akpọ Agência Brasil kwuru na ime ihe ike na-arị ibe ya elu na Brazil. N’afọ 2012, ọchụ e gburu ná mba ahụ karịrị puku iri ise na isii. Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụ́ ike ná mba ahụ sịrị na o nwetụbeghị afọ e gburu ọchụ ha otú ahụ. Otu onye ọrụ nchekwa obodo aha ya bụ Luís Sapori kwuru na ihe mere igbu ọchụ ji rịa elu n’obodo ahụ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị anaghịzi akpa àgwà ọma. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enweghịzi ihe ha ji iwu obodo kpọrọ, “ihe ha ga-emezi bụ ịna-eme ihe ike iji nweta ihe ha chọrọ.”

IHE Ị GA-EBURU N’OBI? Baịbụl kwuru na o nwere mgbe ịhụnanya ‘ga-ajụ oyi,’ mmebi iwu abaakwa ụba.​—⁠Matiu 24:​3, 12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya