Isi nke 19
“Anyị Anụwo na Chineke Nọnyeere Unu”
1, 2. (a) Gịnị ka Zekaraia 8:23 buru amụma ya banyere ụbọchị anyị a? (b) Ònye bụ Chineke nke e zoro aka n’ebe a, oleekwa otú Bible si mesie aha ahụ o nwere n’onwe ya ike?
ANYỊ na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anuwo na Chineke nọnyeere unu. Nke ahụ bụ ihe Bible buru amụma na ndị mmadụ si ná mba nile ga na-ekwu n’oge anyị a. (Zekaraịa 8:23) Ònyekwa bụ Chineke a nke amụma Zekaraịa na-ezo aka na ya? A hapụghị anyị ná mgbagwoju anya ọ bụla. N’akwụkwọ Bible nke a dị nnọọ nta, aha o nwere n’onwe ya pụtara 135 ugbo. Ọ bụ JEHOVA!
2 Ya onwe ya kwuru banyere aha ahụ o nwere n’onwe ya, bụ́ Jehova, sị: Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile. (Ọpụpụ 3:15) E gosipụtara ịdị mkpa nke aha ahụ site n’eziokwu nke bụ na ọ pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 7,000 ugbo n’ihe odide zuru ezu nke asụsụ Hibru—nke karịrị nnọọ ngụkọta nile nke utu aha ndị ahụ dị ka Onyenwe anyị na Chineke. Dị ka e bụru amụma ya, n’ime mgbe ikpeazu ndị a, e jiriwo aha ahụ mara otu ndị n’ụzọ pụrụ iche.
“ANYỊ NA UNU GA-AYỊKỌ JEE”
3. Dị ka e buru amụma ya na Zekaraia 8:20-23, (a) òle ndị ga-achọ Jehova? (b) ọ̀ bụkwa site n’isonyere òle ndị?
3 N’ihe banyere nke a, Chineke kpaliri Zekaraịa onye amụma, n’oge mwughachi nke ụlọ ukwu Jehova dị na Jerusalem ochie, ide, sị: Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ọ ga-erukwa ọzọ na ndị dị iche iche na ndị bi n’ọtụtụ obodo ga-abịa: ndị bi n’otu obodo ga-ejekwurukwa obodo ọzọ, sị, Ka anyị jisie ike n’ime ka ihu Jehova dajụọ, na ịchọ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, m ga-eje, ọbụna mụ onwe m. Ee, ọtụtụ ndị dị iche iche na mba dị iche iche dị ike ga-abịa ịchọ Jehova nke usuu nile nke ndị agha n’ime Jerusalem, na-eme ka ihu Jehova dajụọ. Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Na mgbe ahụ ka ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.—Zekaraịa 8:20-23.
4. N’ihi gịnị ka amụma nke a na-emetụtaghị okpukpe ndị Juu ma ọ bụ Krisendọm?
4 Mmezu a kpaara òké nke amụma nke a nwere n’ihe banyere ụlọ nsọ ahụ e wughachiri na Jerusalem, malite n’ụbọchị Zerubabel, na-ezo aka gaa ná mmezu dị ukwuu karị n’ụbọchị anyị a. N’ihe banyere òle ndị? N’ezie, ọ gaghị abụ ihe ezi uche dị na ya na ndị ’na-achọ Jehova’ ga-echigharikwuru ndị ahụ sitere na nkwe nkwe ụgha jụ ọbụna ịkpọpụta aha Chineke, dị ka ndị Juu anụ ahụ na-eme, bụ́ ndị jigidere ofufe omenala ha. Ha agaghị echi-gharikwurukwa Krisendọm, bụ́ ndị na-eṅomi omenala ndị Juu n’izere iji aha nsọ ahụ na-eme ihe. Ọ bụghị gaa na Jerusalem dị n’elu ụwa ka ndị mmadụ na-eche ihu taa iji fee Jehova. Dị ka Jisọs kwuru, Chineke gbakụtara ụlọ ukwu ya dị n’ebe ahụ azụ, e bibikwara ya n’afọ 70 O.A., ọ dịghịkwa mgbe e wughachiri ya ruo taa. Nke a na-egosi onye ọ bụla maara ihe na Chineke anọnyereghị Israel ahụ na-abụghị ndị Kraịst.—Matiu 23:37, 38; tụlee 1 Ndị Eze 9:8, 9.
5. Olee otú Akwụkwọ nsọ si gosipụta (a) Jerusalem nke na-anọchite anya Jehova taa? (b) nwoke bụ onye Juu nke Zekaraia buru amụma banyere ya?
5 A kọwara Jerusalem nke na-anọchi anya Jehova taa ná Ndị Hibru 12:22 dị ka obodo nke Chineke dị ndụ, bụ́ Jerusalem nke dị n’eluigwe.” Ọbụna dị ka Jerusalem ochie bụ ihe àmà a na-ahụ anya nke ịchị isi Jehova, Jerusalem nke dị n’eluigwe bụ Alaeze Mesaịa nke Chineke, nke e chiri Jisọs Kraịst Eze n’ime ya ná ngwụsị nke Oge ndị Jentail na 1914. (1 Ihe Emere 29:23; Luk 21:24) Ọchịchị ahụ nwere ndị nnọchianya ya n’elu ụwa ebe a, ndị na-eji ikwesị ntụkwasị obi na-akpọsa ya dị ka nanị olileanya dị ntụkwasị obi nye ụmụ mmadụ. Ndị mbụ mara ọkwa na e guzobewo Alaeze ahụ na 1914 bụ ihe ahụ fọdụrụ ‘n’ìgwè atụrụ nta.’ Ndị a bụ Israel nke Chineke, n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ. Ha bụ ’ndị Juu’ ime mmụọ nke Zekaraịa buru amụma banyere ha. (Luk 12:32; Ndị Galetia 6:16; Ndị Rom 2:28, 29) Kemgbe 1931, n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ, na mmata ha matara ibu ọru dịịrị ha ime ka a mara na Jehova bụ ezi Chineke Onye pụrụ ime ihe nile, ha ewerewo aha ahụ bụ Ndịàmà Jehova.—Aịsaịa 43:10-12.
OLEE OTÚ E SI AMATA HA?
6. (a) Gịnị meworo ka ọtụtụ nde mmadụ ghọta nke ọma ndị Chineke nọnyeere taa? (Tụlee isi ihe ndị ahụ n’otu n’otu; gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ.) (b) Olee isi ihe (ndị) masịworo gị onwe gị karịsịa?
6 Dị ka ihe si n’eziokwu ahụ bụ na ndị Juu ime mmụọ ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi na-arụzu ọrụ ha dị ka Ndịàmà Jehova, e nyeworo ọtụtụ nde ndị mmadụ nwere obi ziri ezi n’ụwa dum aka ‘ịchọ Jehova.’ Ha amatawo n’ezie na Jehova nọnyeere ndị a a kpọkwasịrị aha ya. Gịnị na-emesi ha obi ike na nke a? E nwere ọtụtụ ihe, nke isi ihe ndị a so na ha:
(1) Ihe nile Ndịàmà Jehova kweere dabeere na Bible—ọ bụghị nanị n’akụkụ ole na ole, kama n’Okwu Chineke dum. Kama ịkụzi ihe ndị sitere n’obi ha, Ndịàmà Jehova na-aza ajụjụ site n’ịkọwapụta ihe Bible kwuru. Ha na-akwanyere Jehova ùgwù site n’ikwe ka o kwuo okwu. (Tụlee Jọn 7:16-18.)
(2) Bible kwuru na Chineke onwe ya ga-esi ná mba nile wepụtara aha ya otu ndị. (Ọrụ 15:14) Ha onwe ha ga-akpọku aha ya, rusiekwa ọru ike n’ime ka a mara ya n’ụwa nile. (Aịsaịa 12:4, 5) Gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova bụ ndị e ji aha Chineke nwere n’onwe ya bụ Jehova mara nke ọma.
(3) Ndịàmà Jehova nwere ụba nke nri ime mmụọ na-eju afọ. Ihe ha na-amụta site n’Akwụkwọ nsọ na ihe ọ na-arụpụta n’ụzọ ha si ele ndụ anya na-eme ka ha bụrụ ndi nwere obi ụtọ, n’ụzọ dị iche n’ụwa dum. Nke a bụ ihe Jehova kwuru na ọ ga-eme banyere ndị na-efe ya. (Aịsaịa 65:13, 14; tụlee Matiu 4:4.)
(4) Ndịàmà Jehova na-eji Okwu Chineke na-esetipụ ụkpụrụ nke omume ha na iji na-eduzi mkpebi ha n’ihe nile ha na-eme ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị—n’ezinụlọ ha, n’ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụdị ntụrụ ndụ ha na-ahọrọ, n’ịmata omume ndị ha ga-ajụ, n’ikpebi ihe omume kasị baa uru ha ga-etinye aka na ya. Jehova kwere nkwa ’na ya onwe ya ga-eme ka ụzọ ndị na-eme nke a guzozie.’ (Ilu 3:5, 6)
(5) A haziri usoro nlekọta nke ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova dị ka nke ọgbakọ Chineke nke narị afọ mbụ, nke ndị okenye nọ na ya bụ ihe nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ, ndị sokwa na-arụ ọru maka Alaeze Chineke kama ịbụ òtù ndị ụkọchukwu e buliri elu. (1 Pita 5:2, 3; 2 Ndị Kọrint 1:24)
(6) Ndịàmà Jehova adịghị etinye aka n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa, kama ha na-arụ ọrụ ahụ Bible setipụụrụ ezi ndị Kraịst, nke bụ, ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa nile ka ọ bụrụ àmà tupu ọgwụgwụ ihe nile eruo. (Matiu 24:14; tụlee Jọn 16:16; 18:36.)
(7) Ndịàmà Jehova hụrụ onwe ha n’anya n’ezie, dị ka Jisọs kwuru na ezi ndị na-eso ụzọ ya ga-eme. Ụcha akpụkpọ ahụ, agbụrụ mmadụ si na ya, ọnọdụ akụ na ụba dị iche iche, mba, asụsụ—ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a na-eme ka onye ọ bụla lelịa onye nke ọzọ. N’agbanyeghị ezughị oké mmadụ, ha nile dị n’otu n’ezie dị ka òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, ha na-enyekwa Chineke otuto nile maka nke a. (Jọn 13:35; tụlee Ọrụ 10:34, 35.)
(8) Dị ka ndị Kraịst oge gboo, Ndịàmà Jehova nke oge ugbu a na-anọgide na-efe Chineke n’agbanyeghị mkpagbu. N’ịtụkwasị Chineke obi, ha adịghị emegwara ndị na-emegide ha. Dị ka ọ dị na mgbe gara aga, Chineke egosiwo na ya nọnyeere ndị ya ịnapụta ha. (Jeremaịa 1:8; Aịsaịa 54:17)
7. (a) Olee ndị bụ ndị ikom iri ahụ? (b) Olee otú ha si nye ihe àmà na Jehova bụ Chineke ha n’ezie?
7 dị a bụ ihe ole na ole mere, dị ka e buru n’amụma, ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile ji obi ike na-agwa ihe fọdụrụ ná ndị nketa Alaeze ahụ, sị: Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu. (Zekaraịa 8:23) Akwụkwọ nsọ na-eji iri na-eme ihe iji nọchite anya izu ezu nke ihe dị n’elu ụwa, ya mere, ndị ikom iri ndị a nọchiri anya ndị nile na-ewere ezi ofufe n’isonyere ụmụnna Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ọ bụghị nanị na ha na-esonyere ihe a fọdụrụ ná ngụkọ ha nile, kama ha na-egosipụta onwe ha dị ka ndị na-efe Chineke ha, bụ́ Jehova. Ha na-arara ndụ ha nye ya site na Jisọs Kraịst wee gosipụta nke a site na baptism ime mmiri, si otú ahụ na-egosipụta na ha chọrọ ka ha raparakwa na Jehova. Ha na-ejikwa ọṅụ na-ekere òkè n’ọrụ ndịàmà ya na-arụ n’ụwa nile.—Zekaraịa 2:11; Aịsaịa 61:5, 6.
IHE NLEREANYA NDỊ KWESỊRỊ NṄOMI
8. (a) Gịnị kpatara eze nwanyị nke Sheba ji gaa Jerusalem? (b) Gịnị ka o mere mgbe o rutere, gịnịkwa ka ọ rụpụtara? (ch) Olee otú e siworo nwee ndị yiri ya n’oge anyị a? (Abụ Ọma 2:10-12)
8 Ụfọdụ ndị na-eme nke a yiri eze nwanyị nke Sheba n’oge Solomon. Site n’ebe dị anya ka ọ na-anụ akụkọ Solomon banyere aha Jehova. Ya na Solomon ekwurịtabeghị okwu mbu, ọ gabeghịkwa ulọ ukwu Jehova dị na Jerusalem. O nwere obi abụọ ma ihe nile hà dịcha nnọọ mma otú ahu ọ nụrụ na ha dị. Ma o tinyere mgbalị ịchọpụta, wee jiri ịnyịnya ibu gaa njem ọ pụru ịbụ na o ruru 1,400 maịlụ (2,250 kilomita). O nwetara nkọwa nye ilu dị iche iche ya, wee tie mkpu, sị: Lee, egosịghị m nkera ya. Ọ dịghị ihe ọzọ ọ pụru ime ma ọ bughị ikwubi na Jehova hụrụ ndị nile na-efe ya n’anya. (1 Ndị Eze 10:1-9) Ụfọdụ ndị bụworo ndị a ma ama n’ụwa eṅomiwo ihe nlereanya ya taa, ọtụtụ ndị sitere n’ọnọdụ dị ala karị emewokwa otú ahụ. Ha na-ahụ ihe ama na-egosi na Ndịàmà Jehova adịghị elekwasị mmadụ ọ bụla anya, kama na ọ bụ Jisọs Kraist, bụ́ Solomon ahụ ka Ukwuu, dị ka Eze ha. Azịza a na-enye ha site n’Okwu Chineke na-eju uche na obi ha afọ, a na-akwalikwa ha iso welie olu ha n’ịgọzi Jehova.—Tụlee Luk 11:31.
9. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka omume Rehab si dị iche na nke eze nwanyị Sheba? (b) Gịnị pụtara ìhè n’ihe ndị merenụ nke dubara n’ichebe Rehab na ezinụlọ ya? (ch) Gịnị na-egosipụta ndị mmadụ ndị dị ka Rehab taa?
9 Ndị ọzọ dị ka Rehab onye Jeriko, onye o doworo anya site n’akụkọ ndị ha nụrụ na Chineke nke Israel bụ Chineke n’eluigwe dị n’elu na n’elu ụwa dị n’okpuru. (Joshua 2:11) Mgbe ndị nledo si Israel batara n’ala ahụ, ọ nabatara ha, zobe ha ma tinye ndụ ya n’ihe ize ndụ iji chebe ha. O nwere okwukwe, gosipụtakwa ya site n’ọrụ ya, iwere ọnọdụ ya n’akụkụ ndị Jehova. (Ndị Hibru 11:31; Jemes 2:25) O jiri nlezianya gbasoo ntụziaka nile e nyere ya maka ichebe ndụ. Rehab gosikwara nchegbu ịhụnanya n’ebe nna na nne ya nọ, ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị, na-emeghere ha ụzọ ịbụ ndị e debere ndụ ma ọ bụrụ na ha ga-aṅa ntị n’ihe a chọrọ maka nlanarị. (Joshua 2:12, 13, 18, 19) N’ihi nke a, a gbapụtara ya na ezinụlọ ya mgbe e kpochapụrụ Jeriko na ndị bi n’ime ya, ndị na-efe Beal. (Joshua 6:22, 23) Nke a nwere oké ihe ọ pụtara n’ụbọchị anyị a. Ọ na-egosi na Jehova ga-echebe ndị yiri Rehab. Gịnị na-egosi na ha yiri ya? Ha na-enwe okwukwe na Jehova, na-egosipụta onwe ha isonyere ndị òtù nke Israel ime mmụọ, na-esochi nduzi ọ na-enye site n’ụzọ nke a, na-agbalịsikwa ike inyere ndị òtù ezinụlọ na ndị ikwu ha ndị ọzọ aka ịhụta amamihe dị n’ime otu ihe ahụ.
10. (a) Dị ka amụma Zekaraịa gosiri, gịnị n’ezie na-adọrọ ndị mmadụ gaa n’isonyere Ndịàmà Jehova? (b) Ànyị pụrụ isi aṅaa gosi, site n’àgwà na n’ihe omume, na ịhụnanya n’ebe Jehova nọ jupụtara obi anyị n’ezie?
10 Otú ọ dị, ihe bụ ezie na-adọrọ ndị nke mba nile isonyere Ndịàmà Jehova, bụ Jehova Chineke n’onwe ya. Okwu ya na-adọrọ mmasị ha. Mkpụrụ mmụọ nsọ ndị pụtara ìhè ná ndụ nke ndị na-efe ya na-akpọ ha òkù. Ka ha na-amata àgwà ya nile na ụzọ o si emeso ihe a kpọrọ mmadụ karị, otú a ka ọ na-agụ ha agụụ ịhụ oge mgbe a ga-ewepụsị ịta ụta nile nke Setan na ụmụ mmadụ ndị na-enweghị okwukwe kpokwasịworo n’aha Chineke. Ha onwe ha na-agbalịkwa ka ihe omume ha nile na-aga n’ụzọ ga-atọ Onye Kere ha ụtọ, kpaliekwa ndị ọzọ ito ya otuto. (1 Pita 2:12) Site n’obi ha nile, ha na-ekpe ekpere, dị ka Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, sị: Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa. (Matiu 6:9, 10) N’ikwekọkwa n’ekpere ha, ha na-ejere Chineke ozi dị nsọ n’ịdị n’otu zuru ezu ha na ndị na-enye ihe àmà doro anya na ha bụ ’ndị ahụ dịịrị aha Jehova.’