Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • su isi 21 p. 160-166
  • Ezi Nnabata nye Ndị ahụ Lọghachiri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Nnabata nye Ndị ahụ Lọghachiri
  • Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NWA MMEFU ALỌGHACHI
  • OLEE OTÚ ILU A SI EMEZU TAA?
  • IWUKWASỊ N’ELU NTỌALA SIRI IKE
  • “Jehova, Chineke nke Nwere Obi Ebere, Onye Na-eme Amara”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Akụkọ Banyere Otu Nwa Furu Efu
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Nna nke Dị Njikere Ịgbaghara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Nwa Furu Efu Alọta
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
su isi 21 p. 160-166

Isi nke 21

Ezi Nnabata nye Ndị ahụ Lọghachiri

1. Ụdị mmadụ dị aṅaa ka a na-ekwu banyere ha n’isiokwu nke a?

E NWERE ọtụtụ mmadụ ndị mataworo eziokwu Bible n’otu mgbe ruo n’òkè zuuru ha ịmata na Jehova bụ ezi Chineke ahụ na ịghọta ihe banyere nzube ya nile. Ọ bụ ezie na ha abụghị Ndịàmà Jehova, ma ọ pụrụ ịbụ na ha na Ndịàmà ahụ amụwo Bible. Ma ọ bụ, ma eleghị anya, ndị mụrụ ha bụ Ndịàmà. Ọtụtụ n’ime ndị a ejewo nzukọ ufọdụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ pụrụ ịbụ na ha ekerewori òkè ufọdụ n’ikwusa ozi Alaeze ahụ gwa ndị ọzọ. Ma ha ararabeghị ndụ ha nye ime uche Chineke. Gịnị mere ha emebeghị nke a?

2. (a) N’ihi gịnị ka ha ji kpafuo site ná nzukọ Jehova? (b) N’ihi gịnị ka ha ji chọọkwa ilọghachita?

2 Ụwa na-eche n’ihu ha ihe na-adọrọ mmasị nke ha chere na ha chọrọ, ihe ndị ha chere na ọ ga-atukwasịrị ha ihe ụtọ ná ndụ, ha wee kpafuo site ná nzukọ Jehova mgbe ha na-achụso ihe ndị ahụ. Otú ọ dị, mgbe oge na-aga, ụfọdụ n’ime ndị a na-aghọta na ha achọtabeghị ụdị ndụ ha tụrụ anya ya. Ha na-aghọtakwa na ọ bụrụ na ha anọgide n’ọnọdụ ahụ ha nọ na ya, na a ga-ebibikọta ha na ụwa nke a. Ha echefubeghị ọnọdụ ntụkwasị obi na ùjú nri ime mmụọ dị ’n’ulọ’ Jehova, ha na-achọkwa ịlaghachi n’ebe ahụ. Ma Jehova ọ̀ ga-anabata ha?

NWA MMEFU ALỌGHACHI

3. (a) N’ilu Jisọs banyere nwa mmefu ahụ, nkọwa dị aṅaa ka o nyere banyere otu ụdị ọnọdụ ahụ? (b) Ònye ka nna ahụ sere onyinyo ya?

3 E gosipụtara azịza nke ajụjụ ahụ n’otu ilu Jisọs a maara nke ọma banyere nwa mmefu ahụ. Dị ka ihe atụ, Jisọs kọrọ banyere otu nwoke nwere ụmụ ndị ikom abụọ. Nke nta n’ime ha rịọrọ nna ya ka o nye ya ihe nketa nile ruuru ya. Mgbe o nwetara nke a, ọ gara n’otu mba dị nnọọ anya, ebe o ji ọkụ ọkụ mefusịa ihe ahụ nile ná ndụ ịla n’iyi. O si otú a mee omume dị ka nwa mmefu. Mgbe ụnwụ nri dakwasịrị ala ahụ, n’ihi ịnọ n’oké mkpa, a manyere nwa okorobia ahụ, ilekọta ézì, ma e kweghị ka o rie ọbụna nri ézì ahụ. N’ihi ihe isi ike karịrị ya nke dakwasịrị ya, ọ kwụsịrị omume nzuzu ya. O chetara otú ndụ si dịrị ọbụna ndị ikom e goro ọrụ mma n’ụlọ nna ya, o wee kpebie ịlaghachi. Ọ ga-egosipụta na ya aghọtawo na ụzọ ya gbasoworo bụ nke mmehie, rịọkwa ka a na-abataghachi ya, ọ bụghị dị ka nwa nwoke, kama dị ka onye ọrụ e goro ego. (Luk 15:11-19) Ma ebe ọ bụ na o mesịwo ihe ọjọọ ndị a nile, nna ya ọ̀ ga-ekwe ka ọ lọghachi? Olee otú Jehova, onye nna dị n’ihe atụ a nọchiri anya ya, ga-esi lee nlọghachi nke ụdị mmadụ a anya?

4. Olee otú nna ahụ si nabata nwa ya mgbe ọ lọghachiri?

4 N’igosipụta n’ụzọ doro anya mmetụta Jehova nwere banyere okwu a, Jisọs gara n’ihụ, sị: Ma mgbe [nwa nwoke nke nta ahụ] nọ n’ebe dị anya ugbu a, nna ya hụrụ ya, o wee nwee ọmiko n’ahụ ya, gbaa ọsọ, makụọ ya n’olu, sutụkwa ya ọnụ nke ukwuu. Nwa ya wee sị ya, Nna, emehiewo m megide eluigwe, megidekwa gi. Ekwesịghị m ka a kpọọkwa m nwa gi ọzọ. Were m dị ka otu n’ime ndị ikom i goro ọrụ. Ma nna ya gwara ndị ohụ ya, sị, Meenụ ngwa, chịpụta uwe mwụda nke kachasị mma, were ya yikwasị ya, tinyekwa mgbaaka n’aka ya, na akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ ya. Kpụtakwa nwa ehi a zụrụ azụ, gbuo ya ka anyị rie, ka obi tọọkwa anyị ụtọ, n’ihi na nwa m nke a nwụrụrịị anwụ wee dị ndụ ọzọ; o fururịị efu, e wee chọta ya. Ha wee malite ime ka obi tọọ ha ụtọ.—Luk 15:20-24, NW.

OLEE OTÚ ILU A SI EMEZU TAA?

5. (a) Ònye ka dịọkpara dị n’ilu Jisọs ahụ sere onyịnyo ya? (b) Ya mere, òle ndị ka nwa nwoke nke nta ahụ, bụ́ nwa mmefu ahụ, nọchiri anya ha?

5 N’ihe atụ a, nwa nwoke nke mbụ, bụ́ diọkpara, kwekọrọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị ’n’ọgbakọ nke ndị e buru ụzọ mụpụta, ndị e deworo aha ha n’akwụkwọ n’eluigwe.’ (Ndị Hibru 12:23) Oleekwanụ banyere nwa nwoke nke nta ahụ? Ọ ghaghị ịnọchi anya otu ìgwè na-abụghị ìgwè atụrụ nta ahụ ndị nwere olileanya iketa eluigwe. Ọ bụghị ndị nile so ’n’atụrụ ọzọ nke Onyenwe anyị kwekọrọ ná nkọwa nke nwa nwoke nta ahụ, ma ụfọdụ n’ime ha kwekọrọ na ya. Ọbụna tupu nchịkọta nke atụrụ ọzọ ahụ aghọọ ihe a rịbara ama n’ụzọ pụrụ iche, malite na 1935, ọ dị mmadụ ndị mataworo na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ. Ha maara banyere olileanya nke ndụ n’elu ụwa n’okpuru Alaeze ahụ, ha adịghị enwe n’ime onwe ha echiche ọ bụla nke iso n’ime [ọgbakọ] nke ndị e buru ụzọ mụpụta, bụ́ ndị nwere olileanya nke eluigwe. Ma, kama itinye onwe ha n’ijere Jehova ozi, ha mikpuru onwe ha ná nchụso dị iche iche nke ụwa. Ha weere ihe nile ha jiri biri nke Chineke nyere ha, oge na ndụ nke o kwere ka ha nwee, mere ihe iji mejuo ọchịchọ nke onwe ha nanị. Ma na 1935, bụ mgbe mbụ ndị ohu Jehova ghọtara n’ụzọ doro anya ndị bụ oké ìgwè mmadụ ahụ, ọtụtụ ndị, nke nwa nwoke nke nta ahụ nọchiri anya ha, nyefere onwe ha n’ije ozi n’ụlọ Nna ahụ. Ọ bụrịị oge nke ụdị nṅụri ọṅụ nke Jisọs kọwara n’ilu ya.

6. Ná mmezu amụma ahụ, olee otú ụfọdụ mmadụ si gosipụta ụdị omume nke dịọkpara ahụ, ma, ndị nile fọdụrụ, hà mechakwara otú ahụ?

6 Ọ bụ ezie na, n’oge ahụ, ọ bụghị mmadụ nile keere òkè ná nṅụri ọnụ ahụ banyere nlọta nke òtù ahụ, nke nwa nwoke nke nta ahụ nọchiri anya ya. N’ilu ahụ, Jisọs gosipụtara na ọ ga-adị otú ahụ. Ma ọ bụghị ndị nile fọdụrụ n’ime “ìgwè atụrụ nta” ahụ gosipụtara ụdị mmụọ ahụ, n’ihe atụ ahụ, Jisọs hapụkwara ohere ka ọbụna ndị ahụ ọ na-amasịghị na mbụ, soro kere òkè n’ọṅụ, nke Jehova n’onwe ya nwere, mgbe ụdị ndị mmehie ahụ chegharịrị n’ezie.—Luk 15:7, 10, 25-32.

7, 8. (a) N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, gịnị meworo ndị ọzọ ji jee ebe dị anya site n’ezinụlọ Jehova? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ụfọdụ siworo nwee mmetụta yiri nke nwa mmefu ahụ? (ch) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ka ha lọghachi?

7 Otú ọ dị, eri ihe ndị ahụ mesịrị n’etiti afọ ndị 1930, ndị ọzọ aghọtawokwa na n’ụzọ ụfọdụ, ha dị ka nwa mmefu ahụ. Ha maara nke ọma ihe banyere ezinụlọ ime mmụọ Jehova, bụ́ nzụkọ ya a na-ahụ anya, ma ụzọ ha si ebi ndụ ha mere ka ha dị anya n’ebe ọ dị, dị ka à ga-asị na ọ bụ ala ọzọ dị anya. Ha adịghị emegide ndị ohu Jehova, ma ụzọ ha si adị ndụ ekwekoghị n’ụkpụrụ nile nke dị n’Okwu Chineke. Ọ pụrụ ịbụ na ha ewulitewo ndụ ha nile gburugburu ọrụ ego ha na onwe ha, n’agụghị ibu ọrụ ha nwere nye Jehova n’oge dị oké egwu nke anyị nọ n’ime ya n’ihe dị oké mkpa. Ụfọdụ were iwe n’ihi ezughị òkè nke ndị ọzọ, bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ n’oge ahụ, ha ejighịkwa ndidi chere ka Jehova dozie okwu nile. Ma n’ọnọdụ dị aṅaa ka ndị ahụ nile banyere mgbe ha kewapụrụ pụọ n’ezinụlọ nke okwukwe ahụ?

8 Mgbe oge na-aga, ụfọdụ ghọtara na ha adawo ogbenye n’ime mmụọ. Ha pụrụ ịhụta na nwa mkpirikpi oge ihe ụtọ ọ bụla ha wetaworo adịghị ewetara ha obi ụtọ na-adịgide adịgide. Ha pụkwara ịchọpụta na ụzọ ha si adị ndụ na-ebibi ahụ ike ha, n’anụ ahụ, n’echiche na n’ime mmụọ. N’ime onwe ha, ha tọgbọ chakoo, dị ka ọ dị ndị nile na-amaghị Chineke, bụ́ ndị na-enweghịkwa olileanya. (Ndị Efesọs 2:12) Ha ghọtara na nanị mgbe ha nwere obi ụtọ n’ezie bụ mgbe ha nọ ’n’ụlọ’ Jehova. Ha chọrọ ịlaghachi. Ò kwesịrị ka ha laghachi? Hà pụrụ irite uru ọ bụla site n’ịnọgide n’ọnọdụ ogbenye ime mmụọ ha? Igbu oge pụrụ imebi ihe. Ọ bụrụ na ha anọgide na-arapara n’ụwa, mgbe a ga-ebibi ụwa, a ga-ebibikwa ha.

9. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji chọọ ka ụdị mmadụ ndị ahụ lọghachi? (Ezikiel 18:23) (b) Gịnị ka a chọrọ ha n’aka ime?

9 Ma, ndị dị otú ahụ hà pụrụ ịlọghachi? Jehova na-akpọku ha n’ụzọ na-ekpo ọkụ ka ha lọghachi, nzukọ ya a na-ahụ anya na-ejikwa ịhụnanya nyere ndị ahụ lọghachirinụ aka. (Zekaraịa 1:3, 4) Gịnị ka nke a chọrọ? Dị ka e gosiri n’ilu Jisọs, ha aghaghị ịkwụsị omume nzuzu ha, bụrụkwa ụzọ mee ihe banyere nlọghachi, kwupụtakwa na ha emehiewo megide Chineke. Ọ bụrụ na ha tinyere aka n’omume rụrụ arụ nke na-ekwesịghị ndị Kraist, ha aghaghị ime ihe ga-eme ka ndị okenye kweta na ha agbakụtawo ụzọ ndụ ahụ azụ ugbu a, chegharịakwa n’ezie. Ha kwesịrị inwe ọchịchọ siri ike ugbu a ife Jehova dị ka akụkụ nke nzukọ ya a na-ahụ anya. (Luk 15:18-21; Ilu 28:13) Ọ bụrụ na nke ahụ bụ n’ezie ihe dị ha n’obi, ọ pụrụ ido ha anya na ịhapụ ụzọ na echiche ọjọọ ha nile na ịlọghachikwute Jehova ga-eweta ọṅụ dị ukwuu. (Aịsaịa 55:7) Otú ọ dị, ka ọṅụ ha wee gabiga ihe ụtọ nke ịbụ ndị e ji ịnụ ọkụ n’obi nabataghachi nke ọma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ezi mwulighachi ime mmụọ dị ha mkpa.

IWUKWASỊ N’ELU NTỌALA SIRI IKE

10. (a) Omume dị aṅaa banyere ihe nile Jehova chọrọ ha n’aka ka ọ dị mkpa ka ndị nile chegharịrịnụ zụlite? (b) Olee otú ha pụrụ isi zụlite mmekọrịta onwe onye chiri anya nke ha na Jehova?

10 Ọ dị nnọọ mkpa karịsịa nye onye ọ bụla lọghachiri n’ezinulọ Jehova ịmara nke ọma akụkụ dị iche iche nke àgwà Jehova na iwulite mmekọrịta chiri anya ya na Jehova. Ọ dị ha mkpa ịghọta na ihe nile Jehova chọrọ n’aka anyị bụ n’ezie maka ọdịmma nke aka anyị. Iwu ya nile adịghị ewepụ ọṅụ ná ndụ, kama ọ na-echebe anyị megide ime ihe ndị pụrụ iweta obi ụtọ nwa oge ma duba n’ịghọta mkpụrụ dị ilu. (Aịsaịa 48:17; Ndị Galetia 6:7, 8) Mgbe ọ na-adọ anyị aka ná ntị, ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Ilu 3:11, 12) Ọmụmụ ihe onwe onye nke ntụgharị uche n’ihe a mụtara na-esochi, ekpere sitere n’ezi obi na ijechi nzukọ anya ga-enyere anyị aka ịmụta ịtụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu, ilekwasị ya anya maka nduzi n’ihe nile anyị na-eme.—Ilu 3:5, 6.

11. Olee otú a ga-esi nyere ndị ahụ kpafuru akpafu aka site na (a) ịzụlite ịkpọ ihe ọjọọ asị? (b) ịchọ nghọta? (ch) ịgbaso otu ụdị omume mgbe nile n’itinye ụkpụrụ nile nke Jehova n’omume? (d) ịmụta ịtụgharị uche n’ihe ga-esi n’ihe ọ bụla ha kpebiri ime pụta? (e) igosipụta nchegbu ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ?

11 Ọ pụrụ ịbụ na ndị ahụ kpafuru akpafu amataworị ezi ihe na ihe ọjọọ. Ma ugbu a, ha kwesịkwara iwulite ịkpọ ihe ọjọọ asị, ha aghaghị ịnọgidekwa na-eme otú ahụ ebe ọ bụ na ihe ọjọọ gbara ha gburugburu. (Abụ Ọma 97:10) A ga-enyere ha aka na nke a ma ọ bụrụ na ha achọọ, ọ bụghị nanị ihe ọmụma, kamakwa nghọta. Nke mbụ, nke a gụnyere ile ihe anya otú ha si metụta Chineke. Anyị kwesịrị ịghọta ụzọ dị iche iche o si ezi anyị ihe na otú anyị si emeghachi omume n’ebe ndụmọdụ ya dị si emetụta mmekọrịta anyị na ya. (Ilu 4:7; 9:10) Anyị kwesịrị ịghọta mkpa ọ dị ime otu ụdị omume, itinye ụkpụrụ nile nke Jehova n’omume n’oge nile, na n’ihe nile anyị na-eme. (Taịtọs 2:11, 12; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:7) E kwesịkwara ịkpachara anya chee echiche, ọ bụghị nanị banyere ihe ụtọ na-adị nwa oge, kamakwa n’ihe mkpebi nile anyị na-eme pụrụ ịmịpụta. ( Tụlee Ilu 20:21; 23:17, 18; Ndị Hibru 11:24-26.) Anyị kwesịkwara isite n’ịhụnanya chee echiche banyere ụzọ ihe anyị kwuru ma ọ bụ mee ga-esi metụta ndị ọzọ.—Ndị Rom 15:1, 2.

12. (a) Nghọta dị aṅaa banyere Setan na ụzọ o si eme ihe ga-enye aka ichebe anyị? (b) Gịnị ka a chọrọ iji merie n’agha nke a?

12 Dị ka ndị Kraịst, anyị ga-enwe agbamume dị ukwuu site n’ịghọta na anyị nọ n’etiti ọgbọ agha ime mmụọ. Onyeiro anyị bụ isi bụ Setan bụ Ekwensu, na ndị ajọ mmụọ ya. Site n’ụzọ nile pụrụ ikwe ya mee, ọ na-achọ ịkụda anyị aka n’ọrụ Alaeze a dị mkpa nke Jehova nyeworo anyị ịrụ. Nzube ya bụ ime ka anyị hapụ ụkpụrụ Jehova nile, wee ghọọ akụkụ ụwa nke ọ na-achị. Ọnyà nile ọ na-esi na-emetụta ọchịchọ ndị a na-enwekarị (maka obi ụtọ, ntụsara ahụ, ịhụnanya na igosipụta mmetụta), ma ọ na-agbakarị anyị ume inye ọchịchọ ndị ahụ ịdị mkpa nke na-agbanwe nzube ha ma ọ bụ imeju agụụ ha n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Nanị site n’iji ihe agha ime mmụọ nile nke Chineke nyere mee ihe n’ụzọ zuru ezu ka anyị pụrụ inwe ike imeri n’agha nke anyị na-alụ maka ndụ ime mmụọ anyị.—Ndị Efesọs 6:11-18.

13. (a) Olee otú anyị pụrụ isi chọta izu ike nye mkpụrụ obi anyị? (b) N’ihi gịnị ka ife Jehova ofufe site n’iṅomi Kraịst ga-eji wetara anyị obi ụtọ n’ezie?

13 Jisọs sịrị na ọ bụrụ na anyị ga-abịakwute ya, nyarakwa yoke ya, na anyị ga-achọta izu ike nye mkpụrụ obi anyị. (Matiu 11:29, 30) Mmadụ ịnyara yoke ahụ pụtara ife ofufe. Ma, ife Jehova site n’iṅomi Ọkpara ya na-eweta izu ike n’ezie. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na ọ na-eweta ezi inwe onwe. Anyị adịghị abụkwa ohu nke mmehie, bụrụ ndị mmehie kere agbụ, na-eme ihe ndị anyị maara na o kwesịghị ka anyị mee na ma eleghị anya nke na-adịghị amasị anyị ime. (Jọn 8:32, 34-36) Ọ bụrụ na anyị ewukwasị àgwà nke ndị Kraịst anyị n’elu Jisọs Kraịst dị ka ntọala, anyị ga-aghọta ụdị ọrụ ọ na-arụ n’imezu nzube Jehova, anyị ga-aṅa ya ntị, mụtakwa ihe site n’ọnụ ya. Ọ bụ ihe na-atọ ya ụtọ ime uche Nna ya. Anyị ga-amụtakwa ime otú ahụ. (Jọn 4:34; Abụ Ọma 40:8) N’ihi ịgbaso ụkpụrụ omume ọma nke Chineke, anyị ga-enwe ike inwe obi ụtọ n’ihi akọ na uche dị ọcha. Kama ịdị ndụ n’ihi nanị ọchịchọ onwe onye, anyị ga-amata obi ụtọ nke na-abịa site n’inye ihe. (Ọrụ 20:35) Ndụ ga-aghọ ihe nwere ezi nzube nye anyị. Nke kasịnụ, anyị ga-enwe ọṅụ nke ịmata na anyị nwere nnwapụta nke Jehova n’onwe ya, bụ́ nna nke ndị nile na-aghọ ụmụ ya.—Ilu 10:22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya