Ihe Atụ Amụma na Nkọwa nke Ndị Dị Ndụ Ugbu a Ndị Ga-eketa Akụkụ Elu Ala nke Alaeze Chineke
Òtù ma ọ bụ mmadụ ndị a sonị sere onyinyo ha:
(1) Ụmụ Noa na ndị nwunye ha (Jenesis 6-9).
(2) Lọt na ụmụ ya ndị inyom (Jenesis 19).
(3) Ụmụnna iri Josef ndị nwere nchegharị (Jenesis 37, 42-45).
(4) Ndị Ijipt ụnwụ nri mekpọrọ ọnụ, ndị renyere Josef onwe ha (Jenesis 44; 47:13-26).
(5) Ìgwè gwara ọgwa ndị so Israel pụọ n’ljipt. (Ọpụpụ 12:38).
(6) Ebo iri na abụọ nke Israel na-abụghị ndị Livaị n’Ụbọchị Àjà Mkpuchi Mmehie. (Levitikọs 16; Matiu 19:28).
(7) Ndị ọbịa n’Israel (Levitikọs 19:34).
(8) Hobab, bụ́ ọgọ nwoke Moses (Ọnụ Ọgụgụ 10:29-32).
9) Rehab onye Jeriko (Joshua 2, 6).
(10) Ndị Gibeon, ndị chọrọ ka ha na Israel mee udo (Joshua 9, 10).
(11) Jael nwunye Heba onye Kenaịt (Ndị Ikpe 4, 5).
(12) Jonatan nwa Eze Sọl (1 Samuel 18; 23:16, 17).
(13) Ndị mba ọzọ ndị sonyeere Devid n’ibu agha (2 Samuel 15:18-22).
(14) Eze Nwanyị nke Sheba (1 Ndị Eze 10).
(15) Neaman onye a gwọrọ ọrịa ekpenta (2 Ndị Eze 5).
(16) Jehonadab nwa Rikab (2 Ndị Eze 10:15-28).
(17) Ndị mba ọzọ ndị chere ihu n’ụlọ nsọ Jehova wee kpee ekpere (2 Ihe Emere 6:32, 33).
(18) Ndị Netinim na ụmụ nke ndị ohu Solomon na-abụghị ndị Israel (Ezra 2, 8).
(19) Ndị Rikab (Jeremaịa 35).
(20) Ebed Melek onye Etiopia (Jeremaịa 38; 39: 16-18).
(21) Ndị Nineve ndị chegharịrịnụ (Jona 3).
Ọzọkwa, a kọwara ha otú a n’ụzọ amụma:
(1) Ezinụlọ nile nke elu ala ndị gọziri onwe ha site ná mkpụrụ nke Abraham (Jenesis 12:3; 22:18).
(2) Mba nile sonyeere ndị Jehova na-aṅụrị ọṅụ (Deuterọnọmi 32:43).
(3) Ndị ezi omume, ndị na-ele anya Jehova (Abụ Ọma 37:9, 29).
(4) Ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị na-eso nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ (Abụ Ọma 45:14).
(5) Ndị ziri ezi na ndị na-enweghị ntụpọ (Ilu 2:21).
(6) Mba nile a na-ezi ihe n’ụlọ Jehova na ndị na-eje ije n’ụzọ ya nile (Aịsaịa 2:2-4).
(7) Mba nile ndị na-ajụ ase site n’ichigharịkwuru Ọkọlọtọ ahụ (Aịsaịa 11:10).
(8) Mba nile si n’ọchịchịrị pụta (Aịsaịa 49:6, 9, 10).
(9) Mba a na-amaghị na mbụ (Aịsaịa 55:5).
(10) Ndị mba ọzọ na-ejere Jehova ozi, na-ahụkwa aha ya n’anya (Aịsaịa 56:6).
(11) Ihe bara ụba nke oké osimiri, akụ nke mba dị iche iche, ndị ahụ ’na-efe dị ka igwe ojii, ndị na-efekwa dị ka nduru’ (Aịsaịa 60:5, 6, 8).
(12) Ndị ala ọzọ na-azụ ìgwè ewu na atụrụ nke lsrael, ụmụ ala ọzọ, bụ́ ndị na-arụrụ ya ọrụ ubị na ndị ọrụ ubi vine (Aịsaịa 61:5).
(13) Ndị nwoke ahụ ji mpì ink odeakwụkwọ kara akara n’egedege ihu (Ezikiel 9).
(14) Ndị ahụ kpọkuru aha Jehova wee nwee nzọpụta n’ụbọchị oké iwe ya (Joel 2:32).
(15) Ihe a na-achọsi ike nke mba nile (Hagaị 2:7).
(16) Ọtụtụ mba ndị rapagidere na Jehova’ (Zekaraịa 2:11).
(17) ’Ndị ikom iri ndị jidere ọnụ ọnụ uwe nke nwoke bụ onye Juu’ (Zekaraịa 8:23).
(18) Mba nile nke Eze gwara okwu udo (Zekaraịa 9:10).
(19) Atụrụ ndị meere ụmụnna Eze ahụ ihe ọma (Matiu 25:31-46).
(20) Nwa mmefu ahụ nke chegharịrịnụ (Luk 15: 11-32).
(21) Atụrụ ọzọ ahụ ndị ṅara ntị n’olu Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ (Jọn 10:16).
((22) Ndị ahụ kwere na Kraịst, bụ́ ndị ’na-agaghị anwụ ma ọlị (Jọn 11:26).
(23) Ihe ahụ e kere eke nke ga-enwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe nke ụmụ Chineke (Ndị Rom 8:20, 21).
(24) Ndị nke ụwa, ndị ketara ndụ ebighị ebi n’ihi na ha kwere n’Ọkpara Chineke (1 Jọn 2:2; Jọn 9:16, 36).
(25) Òkè ìgwè mmadụ ndị na-efe ofufe ehihie na abalị n’ụlọ nsọ Jehova (Mkpughe 7:9-17).
(26) Onye ọ bụla nke na-aṅụ mmiri nke ndụ ahụ, na-agwakwa ndị ọzọ sị, Bịa! (Mkpughe 22:17).
Ihe ndị e dere n’elu ebe a bụ nanị ndị a kọwara ma ọ bụ hota n’ime akwụkwọ a.