Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • su isi 24 p. 183-189
  • Ọgụgụ Oge Ikpeazụ ahụ Na-eru Nso Ọgwụgwụ Ya!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgụgụ Oge Ikpeazụ ahụ Na-eru Nso Ọgwụgwụ Ya!
  • Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NDỊ KA GA-EME EME
  • NDỊ A KPỌBATARA N’IME ỤWA ỌHỤRỤ MARA MMA
  • Olee Mgbe Mbibi Ụwa E Buru Amụma Ya Ga-abịa?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ihe Iseokwu Ndị Na-ekpebi Ọdịnihu Anyị
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Gịnị Ka Chineke Nọworo Na-eme?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Buru Ụbọchị Jehova n’Uche
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
su isi 24 p. 183-189

Isi nke 24

Ọgụgụ Oge Ikpeazụ ahụ Na-eru Nso Ọgwụgwụ Ya!

1. Dị ka ndị ọkà mmụta sayensị a maara aha ha si kwuo, ruo n’ókè ha aṅaa ka ụbọchị mbibi ahụ dị nso?

LAA azụ n’afọ 1947, ndị ọkà mmụta sayensị mepụtara klọkụ ụbọchị mbibi. A na-esepụta ya n’elu mkpò ihu nke akwụkwọ The Bulletin of the Atomic Sctentists, jirikwa ya na-eme ihe iji gosi ókè dị egwu ha chere na ụwa abịaruwo nso mkpochapụ site n’agha nuklia. A na-atụgharị aka klọkụ ahụ mgbe mgbe—mgbe ụfọdụ gaa ihu, mgbe ụfọdụ laa azụ, na-adabere otú a hụrụ na ọnọdụ dịruru egwu n’etiti mba nile. Ná mmalite 1984, a tụgharịrị aka klọkụ ahụ gaa ihu ruo na minit atọ tupu etiti abalị. Ọ bụrụ na aka ya ndị ahụ eruo etiti abalị, ọ ga-apụta na agha nuklia ahụ a na-atụ egwu amalitewo.

2. Olee mgbe Jehova malitere ọgụgụ oge ikpeazụ nke ya, gịnị ka ọgwụgwụ ya ga-apụta?

2 Ma, ọ bụ n’ihe dị ka 6,000 afọ gara aga ka Jehova malitere ogụgụ oge ikpeazu nke na-aga n’ihu n’ihu, n’adịghị mgbe ọ bụla ọ latụworo azụ. N’ọgụgụ oge ikpeazụ ahụ, ọgwụgwụ ya bụ oge nke Chineke debeworo iji mee ka ọkaaka ịchịisi ya nwee mmeri, ihe omume ọ bụ na ya ka udo na ọdịmma nke eluigwe na ala nile dabeere. O kwupụtawo nzube ya hoo haa, nyekwa anyị ihe e ji a rịba oge ama ndị pụrụ ime ka anyị ghọta otú o si na-aga. Ozugbo nnupụisi ahụ gasịrị n’Iden, Jehova kwere nkwa na ya ga-esi na nwanyị ya, bụ́ nzukọ ya nke ndị mmụọ e kere eke kwesịrị ntụkwasị obi, wepụta mkpụrụ nke ga-echipịa Setan, bụ́ agwọ ochie ahụ n’isi wee mesịa tipịa ya ka ọ ghara ịdị ndụ ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. (Jenesis 3:15; Mkpughe 12:9; Ndị Rom 16:20) Lee ka ndị ezi omume si na-enwe ọchịchọ iru oge ahụ!

3. (a) Gịnị gosiri na e leziri anya dokwaa oge maka ọbịbịa nke Mesaia ahụ? (b) Ntọala maka ihe dị aṅaa ka a tọrọ mgbe ahụ?

3 N’oge Chineke kara aka, nke e buru amụma ya eri ogologo oge gara aga, mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Mesaia ahụ, Ọkpara Chineke onwe ya, pụtara ìhè n’ụwa. Dị ka azịza nye ajọ ịma aka Setan, Jisọs nọgidere na-enwe nsọpụrụ Chineke n’ụzọ zuru okè kpọmkwem ruo n’ọnwụ ya. Site n’ịnwụ dị ka mmadụ na-enweghị mmehie, o nyekwara ihe a ga-eji gbapụta ụmụ Adam site ná mmehie na ọnwụ. E si otú a tọọ ntọala maka ’imebi ọrụ nile nke Ekwensu.’—1 Jọn 3:8; Daniel 9:25; Ndị Galetia 4:4, 5.

4. (a) Òtù dị aṅaa ka Jisọs malitere ịchịkọta mgbe ọ nọ n’ụwa? (b) N’ikwekọ n’usoro ndokwa oge nke Chineke, olee mgbe Kraịst malitere ịchị achị dị ka eze? (ch) Gịnị bụ otu n’ime ihe mbụ o mere?

4 Mgbe Jisọs ka nọ n’ụwa, ọ malitere ịchịkọta ndị ikom na ndị inyom ndị ya na ha ga-eketakọ Alaeze ya nke eluigwe. Nke a ga-agụnye nanị 144,000 ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị a họpụtara, nwapụtakwa ha. Mgbe oge maka ịchịkọta ndị òtù ikpeazụ nke ìgwè a ruru, e nyere Jisọs Kraịst n’onwe ya ọchịchị na ebube, na alaeze n’eluigwe. (Daniel 7:13, 14) Kpọmkwem n’oge ya, na 1914, ọ malitere ịrụ ọrụ dị ka Eze na-achị achị. Ozugbo ahụ, ọ chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe, wee site n’omume nke a na-eme ka isi ọnọdụ nke ọchịchị ahụ dị ọcha. (Mkpughe 12:7-12) Usoro ụwa dị ugbu a abanyewo n’oge ọgwụgwụ ya.

5. Olee ndị ga-adị ndụ wee hụ mmeri nke ọkaaka ịchị isi nke Jehova?

5 Ọgụgụ oge ikpeazụ ahụ nke gaworo n’ihu ruo ihe dị ka puku afọ isii ugbu a na-eru nso ọgwụgwụ ya. Ọ dị nnọọ oké nso na ndị mmadụ ndị dị ndụ na 1914, bụ́ ndị gamiworo n’afọ ndụ ha ugbu a, agaghị anwụchapụ kpam kpam tupu ihe omume nile na-akpali akpali, ndị ga-aka akara mmeri nke ọkaaka ịchị isi Jehova, emezuo.—Mak 13:30.

6, 7. (a) Eziokwu dị aṅaa banyere oké ìgwé mmadụ ahụ na-egosi na oké mkpagbu ahụ dị nnọọ ezi nso? (b) N’ihi gịnị ka ha ji jiri obi ụtọ na-elepụ anya n’ọdịnihụ?

6 Ezi ndị ohu Chineke ndị ọzọ ga-adịkwa ndụ iji anya ha hụ ihe nile ga-eme n’oké ụbọchị ahụ. Karịsịa, malite na 1935, mgbe a ghọtara nke ọma ndị bụ ìgwè bara ụba, ma ọ bụ oké ìgwè mmadụ ahụ, ọnụ ọgụgụ bara ụba n’etiti ndị a malitere igosipụta onwe ha. Na mbụ, ha dị ọtụtụ narị, e mesịa ọtụtụ puku, e mesịakwa ọ bụrụ ọtụtụ narị puku, ugbu a e nwekwara ọtụtụ nde gbasara n’ụwa nile. Okwu Chineke nke na-adịghị ada ada kwuru okwu banyere ìgwè a dị ka ndị ’na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta,’ ebe ha bụ ndị lanarịrị ya, dịgide ndụ baa n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ nke Chineke, n’adịghịkwa mgbe ọ bụla ha ga-anwụ anwụ. (Mkpughe 7:9, 10, 14; Jọn 11:26) Ndị òtù mbụ nke ìgwè a agbaruwo 60 ma ọ bụ 70 afọ ma ọ bụ karịakwa. Jehova ekweghị ka a malite ịchịkọta ìgwè a mgbe oge na-erubeghị. Oké ìgwé mmadụ ahụ, gụnyere ọtụtụ n’ime ndị mbụ nke òtù ahụ, ga-alanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ ahụ.

7 Olileanya nke oké ìgwẹ mmadụ ahụ agaghị abụ nke oké nrechapụ n’ọkụ nuklia ga-egbochị. Ha nwere ezi ihe kpatara ha ji nwee nchekwube na obi ike. Mgbe ihe omume nile nke mgbe ikpeazụ na-emezu, ha na-eji ezi olileanya na-ekiri ihe na-emenụ, na-echetaghachiri onwe ha ndụmọdụ nke Jisọs: Leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso. (Luk 21:28) Ma n’ime oge ahụ fọdụrụ tupu mgbapụta ahụ, ọtụtụ ihe ka ga-emezu nke ihe ga-esi na ha pụta ga-eme ka ụwa mee mkpatụ.

IHE NDỊ KA GA-EME EME

8. (a) Olee ihe omume dị oké mkpa e buru amụma ya na 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3 nke ka ga-emezu n’ọdịnihu? (b) N’ọtụtụ afọ gara aga, olee otú e si dokwaa ọnọdụ maka mmezu amụma nke a? (ch) N’afọ ndị na-adịbeghị anya, oké ihe omume dị aṅaa ka e meworo iji hụ na e nwetara udo n’ụwa?

8 N’izo aka n’otu n’ime ihe ndị a, Pọl onyeozi dere, sị: Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3) A mabeghị ụdị a ga-eji mee mkpọsa ahụ. Ma o kwesịrị ka a rịba ama na ihe nile ga-eduba n’ọnọdụ ahụ malitere ime ozugbo ụwa banyesịrị na mgbe ikpeazụ ahụ. Na 1919, a kpọsara na nzube nke òtù League of Nations bụ iweta udo na ntụkwasị obi. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, Akwụkwọ Iwu e ji guzobe òtù United Nations gosipụtakwara udo na ntụkwasị obi dị ka ebe mgbaru ọsọ bụ isi nke òtù mba nile ahụ. O mezubeghị nzube ahụ. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị mmadụ sitere n’ụdị ọnọdụ nile nke ndụ ekerewo òkè ná njegharị iwe buru ibu n’ihu ọha, na-arụgide ndị ndú ụwa ka ha kwụsị mmepụta nile, nwale nile na nguzobe nke ngwá agha nuklia. Ha chọrọ ka e mee ka ụwa dị n’udo, na-atụkwa egwu ihe ha maara na ọ ga-eme ma ọ bụrụ na ụwa adịghị n’udo.

9. N’ihi gịnị ka mbibi mberede ga-eji bịakwasị ndị nile na-akwado mkpọsa ahụ e buru n’amụma banyere Udo na ntụkwasị obi?

9 Ma ọ̀ ga-abụ n’ihi nke a ma ọ bụ site n’ọnọdụ ụfọdụ ọzọ, ndị ndú ụmụ mmadụ ga-eme mkpọsa pụtara nnọọ ìhè nke Udo na ntụkwasị obi n’oge na-adịghị anya. Ọ ga-abụ nanị okwu elu ọnụ efu. Ma ndị ahụ kwadoro ya ga-akpọsa na ha eruwo ebe mgbaru ọsọ ha site n’ụzọ nke aka ha, n’enweghị enyemaka nke Alaeze Chineke. Mgbe ha na-ajụ ọkaaka ịchị isi Jehova n’ụzọ dị otu a, na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.

10. Olee otú ọnọdụ siwororịị na-ahazi onwe ya maka mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ?

10 Ihe ndị ga-emenụ ga-eme ọsọ ọsọ. Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị bụbu ndị enyi nke Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ga-ebibi ya. Ka ọ dị ugbu a, ndị ọchịchị amatawo na okpukpe bụ ihe na-akpasu ịkpọasị, mwụfu ọbara na agha n’ụwa nịle. Nrụgide nke ndị ndú okpukpe na-agwụzi ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ike. N’akụkụ ka ukwuu nke ụwa, ọnụ ọgụgụ ndị na-aga n’ụlọ okpukpe dị iche iche na-ebelata nke ukwuu. Echiche nke ekweghị na Chineke dị, ma è mere ka ọ pụta ìhè ma ọ bụ na e meghị ya, bụ ihe na-eduzi echiche nke ọha mmadụ. Ọzọkwa, ọtụtụ mba so n’òtù United Nations nwere ukpụrụ ihe omume ndị megidere okpukpe. Mgbe oge awa Jehova kara aka ruru maka imezu ihe o kpere n’ikpe, ọ ga-enye ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ohere, n’otu ihe omume ga-ezu mba nile ọnụ, ichigharị megide Babilọn Ukwu ahụ ma bibie ya kpam kpam.—Mkpughe 17:15, 16; 19:1, 2.

11. (a) Olee ndị ọzọ mba nile ga-echigharị imegide? (b) Ihe omume dị aṅaa ka nke ahụ ga-eduba na ya?

11 N’ihi ịbụ ndị mmeri ahụ na-egbu ka mmanya, sitekwa n’ịbụ ndị onyeisi ha a na-apụghị ịhụ anya, Setan bụ Ekwensu na-akwali, mba nile ga-ebusozi ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, ndị nọ n’ụwa agha. (Ezikiel 38:14-16) Ha agaghị echetakwa eziokwu ahụ bụ na ndịàmà ndị a bụ ndị udo, ndị na-adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ na-akwado agha. Mba nile ga-achọ n’aka ha nkwado zuru ezu, na ofufe nye usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma mgbe ha ga-eme ihe iji tipịa nzukọ Jehova a na-ahụ anya, Chineke ga-eme ihe n’ụzọ doro anya maka ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, wee napụta ha. Usuu ndị agha nke eluigwe ga-ekpochapụ akụkụ nile nke nzukọ Setan a na-ahụ anya kpam kpam, bibisịa ndị nile rapagidere na ya. Mgbe ahụ, a ga-anwụde onyeiro bụ isi, Setan bụ Ekwensu, kwụsị ya ịrụ ọrụ ruo otu puku afọ, n’oge ahụ ka a ga-ewepụ mmetụta nile nke ịkpa ike ọjọọ ya kpam kpam wee mee ka ụwa ghọọ Paradaịs. Mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-atọpụ Setan nwa oge, ile ndị mmadụ nile e weghachiri n’ọnọdụ mbụ ahụ ule. A ga-ekpochapụ ndị nile họọrọ ịgbaso ya, ha na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya.—Mkpughe 19:19-21; 20:1-3, 7-10.

NDỊ A KPỌBATARA N’IME ỤWA ỌHỤRỤ MARA MMA

12. (a) Ònye ka oké ìgwè mmadụ ahụ ga-asị na nzọpụta ha sitere n’aka ya? (b) Olee ndị ga-esonyere ha n’ito Chineke?

12 Mgbe ha gabigaworo ihe omume ndị dị ebube nke ọgwụgwụ ụwa nke a, na-echekwa ihu Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst, ndị ahụ nwetara amara, bụ́ ndị lanarịrịnụ, ndị nọ n’ụwa ga-ejupụta n’obi ekele dị ukwuu mgbe ha na-eweli olu ha n’inye Chineke ekele. Site ná mmetụta dị omimi nke sitere n’ala ala obi, oké ìgwè mmadụ ahụ ga-eji oké olu tie mkpu, sị: Nzọpụta dịịrị Chineke anyị [Jehova], onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ [bụ́ Jisọs Kraịst]. N’ihi mmasị ha nwere n’ihe omume ndị a nile dị oké mkpa, ndị nọ ná nzukọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke n’eluigwe, ga-esonyere ha n’ofufe na-asị: Amen: ngọzi nile, na otuto nile, na amamihe nile, na ekele nile, na nsọpụrụ nile, na ike nile, na ume nile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi. Amen.—Mkpughe 7:10-12.

13. Olee otú Bible si kọwaa ndokwa nile e mere maka ịzụ na ịgwọ ihe a kpọrọ mmadụ?

13 N’ikpeazụ, mmadụ nile ga-aghọ agbụrụ mmadụ dị n’otu, ndị na-asọpụrụ ezi Chineke ahụ, ụwa ọhụrụ nke dị n’okpuru eluigwe ọhụrụ nke na-egosipụta ọkaaka ịchị isi ịhụnanya nke Jehova. N’iji ihe atụ okwu dị mma mee ihe, akwụkwọ ikpeazụ nke Bible kwuru okwu banyere uru dị ebube ndị ga-erudatara ihe a kpọrọ mmadụ n’oge ahụ dị ka osimiri nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ pụta, na-eruda n’etiti ámá nke Jerusalem Ọhụrụ nke dị n’eluigwe. N’akụkụ osimiri nke a ka e nwere osisi nke ndụ nke na-amịpụta mkpụrụ nke na-azụ ndị ahụ na-eri ya na ahịhịa maka ịgwọ mba nile. Ihe ndị a nọchiri anya ihe nile Chineke nyere maka ịgwọ na ịzụ ndị mmadụ kwere ekwe, ndị na-erubekwa isi na ime ka ha nwee ike inweta ndụ ebighị ebi site na Jisọs Kraịst.—Mkpughe 21:1, 2; 22:1, 2.

14. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ọnọdụ ga-adị n’ime ụwa ọhụrụ ahụ ga-esi dị iche ná ndị dị n’ụwa taa?

14 Ọnọdụ ga-adị n’ụwa n’oge ahụ ga-adị nnọọ iche n’ihe ọ bụla nke ụwa ochie nke a mepụtaworo mgbe ọ bụla. Site n’itinye uru nke àjà Kraịst n’ọrụ, sitekwa n’ịzụ ha n’ihe bụ uche Chineke, ndị rubere isi, gụnyere ndị e si n’ọnwụ kpọlite, ga-enwere onwe ha pụọ ná mmetụta nile nke mmehie, ọ ga-enyekwara ha aka inwe ọganihu n’anụ ahụ, n’uche, na ná mmetụta, nakwa n’ime mmụọ ruo mgbe ha ga-eru izu okè. Kama ịmịpụta ọrụ nile nke anụ ahụ, nke na-ebute nkewa, onye ọ bụla ga-amụta ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke n’ụba, ndị dị ka ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ na imeru ihe n’òkè. (Ndị Galetia 5:19-23) Mgbe ụdị mmụọ ahụ ga-adị n’ebe nile, a ga-eji ihe ụwa na-emepụta mee ihe n’ụzọ na-egboro ihe nile a kpọrọ mmadụ mkpa ha nke ọma. Ndụ ga-aghọ n’ezie akụ dị ukwuu karịa otú ọ dịworo mgbe ọ bụla tupu oge a ebe ndị mmadụ ga-arụkọ ọrụ n’otu iji mezuo nzube mbụ nke Onye Okike ahụ maka ụwa nke a na ndị bi n’ime ya.

15. (a) Òkù dị aṅaa nke na-adọrọ mmasị ka a maliteworo ịkpọ ihe nile a kpọrọ mmadụ? (b) N’ihi ya, gịnị ka o kwesịrị ka anyị na-eme n’otu n’otu?

15 N’iji ọṅụ na-ele anya nke a, mmụọ Chineke na nwunye Kraịst na-alụ ọhụrụ na-akpọsa ọkpụkpọ òkù sitere n’ezi obi ugbu a nye ndị nọ n’ebe nile, na-asị: Bịa, onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu. (Mkpughe 22:17) N’ihi ya, ugbu a abụghị oge ịnọ na-echere ruo mgbe ọgụgụ oge ikpeazụ ruo n’oké ụbọchị Jehova ruru ọgwụgwụ ya n’oké mkpagbụ ahụ. Ebe ị nakweere ọkpụkpọ òkù obi ọma ahụ, bụ́ ’ịnara mmiri nke ndụ ahụ n’efu,’ i nweziri ohere ọma nke ịkpọ ndị ọzọ òkù ahụ ugbu a. N’akụkụ ndị nile na-achọsi ike ịbụ ndị nlanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, ugbu a bụ oge iji ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya