Isi 2
“Onyeisi Udo” ahụ Echee Amagedọn Ihu
1, 2. (a) Okwu ndị dị aṅaa na-akpali akpali ka Chineke ji ike mmụọ nsọ kpalie Aịsaịa ikwu? (b) Olee mgbe okwu ndị a malitere imezu?
NA NARỊ afọ nke asatọ tupu Oge Anyị, e nyere onye amụma bụ Aịsaịa ike mmụọ nsọ ịgwa ndị Chineke, sị: “N’ihi na a mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onye isi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye Ebube, Onye Ndụmọdụ, Chineke nke Bụ Dike, Nna nke Bụ́ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi, Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onye isi ya na udo ya ga-agwụ, n’elu ocheeze Devid, na n’elu alaeze ya, ime ka o guzosie ike, na ịkwagide ya n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 9:6, 7.
2 Okwu ndị ahụ na-akpali akpali malitere imezu n’akụkụ ikpeazụ nke afọ 2 T.O.A. Nke a bụ mgbe a mụrụ Jisọs dị ka nwa nke Eze Devid, onye chịworo n’obodo Jerusalem n’elu ebo 12 nke Israel.
Ọgbụgba Ndụ Maka Alaeze nke Udo Ya Na-enweghị Ọgwụgwụ
3. (a) Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Chineke na Eze Devid gbara? (b) Olee nwa Eze Devid nke Jehova kpọkwasịrị ùtú aha ahụ bụ́ “Onyeisi Udo”?
3 N’ihi ịnụ ọkụ n’obi Devid maka ofufe Chineke nke Israel, Jehova sooro ya gbaa ndụ maka Alaeze na-adịru ebighị ebi n’eriri ọmụmụ ya. (2 Samuel 7:1-16) E jiri ịṅụ iyi nke Chineke ṅụrụ mee ka ọgbụgba ndụ ahụ sie ike. (Abụ Ọma 132:11, 12) Dị ka ọgbụgba ndụ ahụ si dị, alaeze Devid aghaghị inye ihe mgbakwasị ụkwụ maka Alaeze ahụ na-abịanụ nke “Onyeisi Udo” ahụ. “Jisọs Kraịst, nwa Devid,” bụ onye Jehova kpọkwasịrị ùtú aha ahụ bụ́ “Onyeisi Udo.”—Matiu 1:1.
4. (a) Ònye ghọrọ nne elu ala nke Jisọs? (b) Gịnị ka mmụọ ozi Gebriel gwara ya banyere nke a?
4 Nne Jisọs bụ nwanyị a mụnyere n’eriri ndị eze nke Eze Devid. Ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mgbe ọ tụụrụ ime nke nwa ya ahụ e kwere ná nkwa, onye ga-abụ onye nketa na-adịgide adịgide nke ocheeze Devid. Ntụrụ ime nke a weere ọnọdụ tupu Josef akpọrọ ya dị ka nwunye ya. (Matiu 1:18-25) Mmụọ ozi Gebriel agwawo nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ Meri, sị: “Leekwa, ị ga-atụrụ ime, mụta nwa nwoke, kpọọ aha ya Jisọs. Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwuu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu: Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya Devid: ọ ga-abụkwa eze ụlọ Jekọb ruo mgbe nile ebighị ebi; alaeze ya agaghị agwụkwa agwụ.”—Luk 1:31-33.
5. Gịnị ka Aịsaịa onye amụma buru n’amụma banyere ọchịchị nke “Onyeisi Udo” ahụ?
5 Ọ bụ n’ihi nke ahụ ka Aịsaịa onye amụma ji buo amụma banyere “Onyeisi Udo” ahụ na “ịchịisi ya n’udo nke na-enweghị ọgwụgwụ bara ụba, maka ocheeze Devid na maka ike nke ịchịisi ya.” (Aịsaịa 9:6, 7, The Jerusalem Bible) Otú a, dị ka ọgbụgba ndụ ahụ nke e soro Devid guzobe, Alaeze nke a ga-abụ ọchịchị na-adịru ebighị ebi nke udo ya na-enweghị ọgwụgwụ. Ocheeze ya aghaghị ịdịru “ebighị ebi”!
6. (a) Iji mezuo ọgbụgba ndụ nke Alaeze ahụ, gịnị ka Chineke mere n’ụbọchị nke atọ nke ọnwụ Jisọs? (b) Olee mgbe Jisọs malitere ịchị dị ka “Onyeisi Udo” ahụ?
6 Iji mezuo ọgbụgba ndụ nke Alaeze nke a, Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ nke ọnwụ ọ nwụrụ n’ihi okwukwe ya. Nke a bụ n’ụbọchị nke 16 nke ọnwa ndị Juu bụ Nisan, n’afọ 33 nke Oge Anyị. Dị ka onye jiri anya ya hụ Ọkpara Chineke ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, Pita onyeozi sịrị na Jisọs bụ onye “e mere ka ọ nwụọ anwụọ n’anụ ahụ ya, ma e mere ka ọ dị ndụ ná mmụọ ya.” (1 Pita 3:18) Chineke Onye Kachasị Ihe Nile Elu buliri ya elu gaa n’aka nri nke Ya onwe ya. N’ebe ahụ, kemgbe ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl, ma ọ bụ “oge nke mba ọzọ,” ná mmalite October nke afọ 1914, ọ nọwo na-achị dị ka “Onyeisi Udo” ahụ.—Luk 21:24.
7. (a) Gịnị ka Jisọs cheworo ihu site ná mmalite nke ọchịchị ya? (b) Olee ndị na-ekwusa ọbụbụeze nke Jisọs nye mba nile, ọ̀ bụkwa ná mmezu nke gịnị?
7 Site ná mmalite nke ọchịchị eluigwe ya, o chewo ụwa nke ịkpọasị ihu, dị ka e nwere ihe àmà ya n’agha ụwa abụọ a lụrụ n’ihi ihe iseokwu nke onye ga-achị ụwa. Ugbu a ihe na-eguzo ya n’ihu bụ òtù United Nations. Site ná nkwusa ozi ọma zuru ụwa ọnụ nke Alaeze ahụ nke Ndịàmà Jehova na-ekwusa, bụ́ ndị na-ekwusa n’ihe karịrị 230 ala dị iche iche, ọbụbụeze ya dị ìrè n’eluigwe ka a na-eme ka mba nile mara maka ya. Nke a bụ ná mmezu nke ihe “Onyeisi Udo” ahụ n’onwe ya buru n’amụma, dị ka anyị na-agụ na Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”
8. N’ihi gịnị ka pụrụ iji kwuo na anyị abamiwo ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe’ nke a?
8 A ghaghị idozi ihe iseokwu nke onye ga-achị ụwa n’isi nso. Ugbu a, ihe karịrị 70 afọ mgbe “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị na 1914, anyị abamiwo ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe nile’ nke a. Ọgbọ nke 1914 hụrụ mmalite nke ihe omume ndị dị mkpa na-eme n’ụwa, bụ́ ndị Jisọs buru n’amụma. (Matiu 24:3-14) Jisọs kwuru na ọgbọ ahụ agaghị agabiga ruo mgbe ihe ndị a nile ga-emezu. Ọ dị ezi nso ugbu a iru ná njedebe ya.—Matiu 24:34.
9, 10. (a) Olee otú e si zitere anyị ozi amụma nke dị n’akwụkwọ Mkpughe? (b) Gịnị ka Mkpughe 16:13, 14, 16 buru n’amụma banyere Ha–Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn?
9 N’ihi ya, gịnị dị kpọmkwem n’ihu, gịnịkwa na-eche “Onyeisi Udo” ahụ n’ihu? E jiri ya onwe ya mee ihe ibu amụma banyere nke a n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe, ma ọ bụ Apọkalips, bụ́ nke Chineke nyere ya, nke o nyekwara Jọn onyeozi ahụ meworo agadi site n’aka otu mmụọ ozi. (Mkpughe 1:1, 2) Nke ahụ mere n’ihe dị ka n’ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ nke Oge Anyị. Ná Mkpughe 16:13, 14, 16, Jisọs mere ka Jọn onyeozi zoo aka dị mkpa na Ha–Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn:
10 “M wee hụ ndị mmụọ atọ na-adịghị ọcha, dị ka awọ, ka ha na-esi n’ọnụ dragọn ahụ, sikwa n’ọnụ anụ ọhịa ahụ, sikwa n’ọnụ onye amụma ụgha ahụ, pụta: n’ihi na ha bụ mmụọ nke ndị mmụọ ọjọọ, na-eme ihe ịrịba ama dị iche iche; ndị na-apụkwuru ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi, ime ka ha zukọọ ibu agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ha wee mee ka ha zukọọ n’ebe ahụ nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha–Magedọn.”
“Ugwu Megido” nke Ihe Atụ
11. (a) Gịnị ka aha ahụ bụ́ Amagedọn pụtara, ọ̀ dịkwa mgbe e nwere ókèala nke nwere aha dị otú ahụ? (b) N’ihi gịnị ka obodo oge ochie ahụ bụ Megido ji dịrị mkpa n’akụkọ ihe mere eme? (ch) Ihe abụọ dị aṅaa ka aha ahụ bụ́ Megido mesịrị pụta?
11 Aha Hibru ahụ bụ́ Ha–Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn, pụtara “Ugwu Megido.” Ọ dịghị ebe ọ bụla n’oge ochie ma ọ bụ n’oge a nke a kpọworo Ugwu Megido. Otú a n’ime akwụkwọ dị ka Mkpughe nke jupụtara n’okwu ihe atụ, okwu ahụ nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ ihe atụ. Gịnị ka nke ahụ na-aghaghị ịbụ? Otú ọ dị, obodo Megido ahụ nọ n’ebe dị elu, nke aha ya pụtara “nchịkọta nke ndị agha,” bụ nke dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme. N’akụkọ ihe mere eme nkịtị na nke Bible, aha ahụ na-akpali ncheta nke agha mkpebi ndị e buru. N’ihi gịnị? N’ihi na obodo ahụ nọchiri ụzọ ngafere dị mkpa nke dị n’agbata Europe, Esia, na Africa, a pụkwara ịnọ n’ọnọdụ dị mma nke ịma ndị mwakwasị aka ma kwụsị ha ịga n’ihu n’ebe ahụ site n’aka ndị bi n’ebe ahụ. Otú a Megido nwere ihe abụọ ọ pụtara—ịbụ ndị e meriri n’ụzọ ọdachi maka otu akụkụ na n’inwe mmeri dị ebube maka akụkụ nke ọzọ.
12, 13. (a) Olee otú Chineke nke Bible si nwee ihe jikọrọ ya na Megido na osimiri nke dị ya nso n’ụbọchị Onye Ikpe Berak? (b) Olee otú abụ mmeri nke Berak na Debọra si kọwaa òkè Chineke keere ná mmeri ahụ?
12 Chineke nke Bible nwere ihe jikọrọ ya na Megido na osimiri Kaịshọn nke dị nso n’ebe ahụ, n’oge ndị ikpe nke Israel. N’oge Berak Onye Ikpe na onye amụma nwanyị bụ́ Debọra, Chineke nyere ndị ya ọ họpụtara mmeri pụtara ìhè na gburugburu Megido. Berak Onye Ikpe nwere nanị 10,000 ndị ikom, ebe onye iro ahụ nọ n’okpuru Ọchịagha Sisera nwere 900 ụgbọ ịnyịnya nke ịnyịnya na-adọkpụ, e wezụgakwa ndị agha ji ụkwụ aga. Jehova tinyere aka n’agha ahụ n’ihi ndị ya ọ họpụtara ma mee ka idei mmiri gbochie ụgbọ ịnyịnya ndị iro ahụ dị ike ịgba agba. N’abụ mmeri nke Berak na Debọra bụụrụ Chineke mgbe mmeri ọrụ ebube ahụ e meriri ndị agha Sisera gasịrị, ha kpọtụrụ uche n’òkè Chineke keere ná nkwatu nke a kwaturu onye iro ahụ:
13 “Ndị eze bịara, buo agha; mgbe ahụ ndị eze Kenean buru agha, n’ime Teanak n’akụkụ mmiri Megido: ọ dịghị uru ego ha naara. N’eluigwe ka ha si buo agha, kpakpando si n’ụzọ nile ha a tụliri atụli busoo Sisera agha. Mmiri iyi Kaịshọn bupụrụ ha, mmiri iyi ochie ahụ, bụ́ mmiri iyi Kaịshọn.”—Ndị Ikpe 5:12, 19-21.
14. Okwu mmechi ndị dị aṅaa nke abụ mmeri ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ ka ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ ekpere banyere agha ahụ na-abịanụ n’Amagedọn?
14 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na okwu ndị ahụ mmụọ nsọ kpaliri nke Berak na Debọra jiri mechie abụ ha mgbe mmeri oge ochie ahụ nke e nwere na Megido gasịrị ka a pụrụ iji mee ihe dị ka ekpere banyere agha ahụ na-abịanụ n’Amagedọn. Ha bụrụ abụ, sị: “Otú a ka ndị iro gị nile ga-ala n’iyi, Jehova: ma ndị na-ahụ ya [“gị,” NW] n’anya ga-adị ka anyanwụ mgbe ọ na-apụta n’ike ya.”—Ndị Ikpe 5:31.a
Ịchịkọta Mba Nile Gaa n’Amagedọn
15. (a) Mgbe ahụ, ebe dị aṅaa ka Amagedọn bụ? (b) Gịnị bụ otu n’ime isi iyi nke okwu na-adịghị ọcha nke na-akwali mba dị iche iche ịga n’agha ahụ n’Amagedọn?
15 Ya mere Megido bụ ebe a nọrọ lụọ agha mkpebi ikpe. Mgbe ahụ, dị ka ihe ezi uche dị na ya, Amagedọn ga-abụ ọgbọ agha ebe mba dị iche iche nke ụwa taa ga-azọrọ ije jee n’okpuru ike ndị ahụ na-akpali akpali a kọwara ná Mkpughe 16:13, 14. “Mmụọ nke ndị mmụọ ọjọọ” ahụ nke na-akwali mba dị iche iche bụ okwu e ji akwali ndị mmadụ nke a na-ebepụta taa dị ka ubé awọ, bụ́ nke na-adịghị ọcha dị ka awọ na-adịghị ọcha nke Bible. Otu n’ime isi iyi ndị ahụ nke okwu ndị ahụ e ji akwali ndị mmadụ bụ “oké dragọn nke na-acha ọkụ ọkụ.” Mkpughe 12:1-9 na-eme ka a ghọta “dragọn ahụ” dị ka Setan bụ Ekwensu.
16. Ná Mkpughe 16:13, gịnị ka “anụ ọhịa ahụ” bụ ihe atụ ya?
16 Isi iyi ọzọ nke okwu nkwali ndị ahụ rụrụ arụ bụ “anụ ọhịa ahụ.” Ná Mkpughe 16:13, e jikọrọ “anụ ọhịa” ihe atụ nke a na “dragọn” ekwensu ahụ. Dị ka Mkpughe 20:10 si kwuo, a ga-ebibi “anụ ọhịa” nke a ruo mgbe ebighị ebi n’ihi nkwado ọ na-enye “dragọn” ihe atụ ahụ. “Anụ ọhịa ahụ” bụ ihe atụ nke usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị dum nke ụwa nke a, nke “dragọn ahụ” bụ chi ya. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ gụnyere ọchịchị ndọrọ ndọrọ dị iche iche nile nke ụwa nke a.—Tụlee Daniel 7:17; 8:20, 22.
17. Gịnị bụ mmetụta nke okwu nkwali ahụ dị ka awọ nke si n’ọnụ “anụ ọhịa ahụ” apụta?
17 Ụdị usoro ọchịchị ndọrọ ndọrọ dị otú ahụ nke ụwa nwere okwu nkwali nke ya dị iche. Okwu nkwali nke a nke ụda ya yiri ubé awọ bụ okwu mmụọ nke ya na okwu mmụọ nke “dragọn ahụ” na-eme ka a chịkọta “ndị eze,” ma ọ bụ ndị ọchịchị ndọrọ ndọrọ nke ụwa, ibu “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” bụ́ nke a ga-ebu n’Amagedọn.
18. (a) Gịnị ka aha ahụ bụ́ Ha–Magedọn na-egosi? (b) Gịnị ka ugwu ga-abụ ihe atụ ya?
18 Otú a, Ha–Magedọn bụ ihe atụ nke ọnọdụ ụwa nke metụtara agha mkpebi ikpe. Ọ na-egosi ọnọdụ ahụ kasị elu nke ihe omume dị iche iche nke ụwa ga-abịaru na ya, ebe ndị ọchịchị ndọrọ ndọrọ ga-ejikọ aka n’otu imegide uche Chineke, nke na Chineke aghaghị iji ike na-emegide nke ha mee ihe dị ka nzube ya si dị. Ya mere a ga-ekpebi ọdịnihu site n’ihe si ná nzute ịma aka nke a pụta. N’ókèala ebe ahụ n’onwe ya, na Megido, ọ dịghị ugwu dị ya. Ma ugwu ga-abụ ihe atụ nke ebe nzukọ na-ezoghị ezo nke ga-adịrị ìgwè ndị agha nile ga-ezukọ n’ebe ahụ mfe ịhụ site n’ebe dị anya.
19, 20. Gịnị bụ ụzọ ime ihe nke Ọchịagha ìgwè ndị agha eluigwe nke Jehova ga-eji mee ihe n’Amagedọn, gịnịkwa ga-esi n’ime ya pụta?
19 Jisọs Kraịst, Ọchịagha nke ìgwè ndị agha nke Jehova, ruo afọ ụfọdụ anọwo na-ekiri nchịkọta nke ndị ọchịchị nke ụwa na ìgwè ndị agha ha gaa n’Amagedọn. Ma ọ nwabeghị ilegide otu eze na ìgwè ndị agha ya anya itigbu ha wee si otú ahụ bibisịa ndị agha ahụ bụ ndị iro n’otu n’otu. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ na-enye ha ohere zuru ezu ịchịkọta onwe ha na ijikọta ìgwè ndị agha ha n’otu maka ihe gaje ịbụ obubu agha kasị n’ịdị ukwuu. Nzube obi ike ya bụ izute ha nile otu mgbe!
20 Site n’ime nke a, ọ ga-enwe mmeri zuru ezu n’ebe ha nọ, maka otuto nke Onyeisi Ọchịagha nke ya, bụ́ Jehova Chineke, nakwa ime ka o doo anya na ya onwe ya bụ “Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile,” n’ụzọ a na-apụghị ịrụ ụka.—Mkpughe 19:16.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A na-achọta ebe ndị ọzọ e zoro aka na Megido na 2 Ndị Eze 9:27; 23:29, 30; 2 Ihe Emere 35:22; Zekaraịa 12:11.