Ì Kwesịrị Ikwere Ya?
Ì KWERE n’Atọ n’Ime Otu? Ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm kwere. E kwuwerị, ọ bụrụwo ozizi bụ isi nke chọọchị dị iche iche eri ọtụtụ narị afọ.
N’ihi nke a, ị pụrụ iche na a pụghị inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere ya. Ma e nwere, n’oge na-adịbeghịkwa anya, ụfọdụ ọbụna ndị na-akwado ya emewo ka ihe ise okwu ahụ kara njọ.
N’ihi gịnị ka isiokwu dị otú a kwesịrị iji bụrụ nke na-akpalị mmasị na-adịte aka? N’ihi na Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ: bụ́ ịmata gị, nanị ezi Chineke ahụ, na Jisọs Kraịst bụ́ onye i zitere.” Ya mere, ọdịnihu nile anyị nwere dabeere n’anyị ịmata ihe bụ ọdịdị Chineke n’ezie, nke ahụ pụtakwara ịgaru na mkpọrọgwụ nke ihe iseokwu nke Atọ n’Ime Otu. Ya mere, gịnị mere ị tụleghị ya n’onwe gị?—Jọn 17:3, Jerusalem Bible (JB) nke ndị Katọlik.
E nwere echiche dịgasị iche iche banyere Atọ n’Ime Otu. Ma n’ozuzu ya, ozizi Atọ n’Ime Otu bụ na n’ime Chiatọ ahụ, e nwere ndị atọ, bụ́ Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ; ma, ha nile bụ otu Chineke. Ozizi ahụ na-asị na ndị atọ ahụ hà nhata, nwee ike ime ihe nile, bụrụkwa ndị a na-ekeghị eke, ebe ọ bụ na ha adịwo ebighị ebi n’ime Chiatọ ahụ.
Otú ọ dị, ndị ọzọ na-asị na ozizi Atọ n’Ime Otu bụ ụgha, na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile dịịrị onwe ya iche dị ka onye dị adị nke pụrụ iche, na-adịru ebighị ebi, ma nwee ike nile. Ha na-asị na Jisọs, ná ndụ ọ dịrị tupu ọ ghọọ mmadụ, dịrị dị ka ndị mmụọ ozi, bụrụ mmụọ dịpụrụ iche nke Chineke kere, n’ihi nke a kwa, ọ ghaghị ịbụworị na o nwere mmalite. Ha na-akụzi na ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla Jisọs na Chineke Onye Purụ Ime Ihe Nile hà nhata n’ụdị ọ bụla e si lee ya anya; ọ bụrụwo onye nọ n’okpuru Chineke n’ọnọdụ nile, ka nọgidekwa na-abụ. Ha kwekwara na mmụọ nsọ abụghị onye kama mmụọ Chineke, bụ́ ike ọrụ ya.
Ndị nkwado nke Atọ n’Ime Otu na-asị na o nwere ntọala ọ bụghị nanị n’omenala okpukpe, kamakwa, na Bible. Ndị na-akọcha ozizi ahụ na-asị na ọ bụghị ozizi Bible, ọbụna na otu akwụkwọ akụkọ ihe mere eme na-ekwupụta, sị: “Mmalite nke [Atọ n’Ime Otu] sitere kpam kpam n’aka ndị ọgọ mmụọ.”—The Paganism in Our Christianity.
Ọ bụrụ na Atọ n’Ime Otu bụ eziokwu, ọ bụ iweda Jisọs ala bụ́ ikwu na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ya na Chineke hà nhata dị ka akụkụ nke Chiatọ ahụ. Ma ọ bụrụ na Atọ n’Ime Otu bụ ụgha, ọ bụ iweda Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ala bụ́ ikwu na ya na onye ọ bụla hà nhata, ọbụnakwa nke ka njọ, ịkpọ Meri “Nne nke Chukwu.” Ọ bụrụ na Atọ n’Ime Otu bụ ụgha, ọ na-ewetara Chineke mkparị bụ́ ikwu, dị ka e kwuru ya n’akwụkwọ ahụ bụ Catholicism, sị: “Ọ gwụla ma [ndị mmadụ] hà nakweere okwukwe nke a kpam kpam n’emerụghị ya emerụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na [ha] ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi. Nke a bụkwa okwukwe ndị Katọlik: Anyị na-efe otu Chineke dị Atọ n’Ime Otu.”
Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe ndị mere ị kwesịrị iji chọọ ịmara ihe bụ eziokwu banyere Atọ n’Ime Otu. Ma tupu anyị eleba anya ná mmalite ya na eziokwu nke a sịrị na ọ bụ, ọ ga-abụ ihe na-enye aka ịkọwa ozizi nke a n’ụzọ pụtara ìhè karị. Gịnị kpọmkwem bụ Atọ n’Ime Otu? Olee otú ndị na-akwado ya si akọwa ya?
[Foto ndị dị na peeji nke 2]
Aka Ekpe: Ihe a tụrụ atụ nke Ijipt na puku afọ nke abụọ (T.O.A.) Chi Atọ nke Amon-Ra, Ramses nke Abụọ, na Mut. Aka Nri: Narị afọ nke iri na anọ (O.A.) Ihe a tụrụ atụ nke Atọ n’Ime Otu nke Jisọs Kraịst, Nna ahụ, na mmụọ nsọ. Rịba Ama na ha dị atọ ma nwee nanị ụkwụ anọ.