Olee Ụzọ E Si Akọwa Atọ n’Ime Otu?
CHỌỌCHỊ Roman Katọlik na-asị: “Atọ n’Ime Otu bụ okwu nke e ji mee ihe iji gosipụta ozizi bụ isi nke okpukpe ndị Kristian . . . Otú a, n’okwu ndị ahụ nke Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius: ‘Nna bụ Chineke, Ọkpara bụ Chineke, Mmụọ Nsọ bụkwa Chineke, ma ha adịghị Chineke atọ kama otu Chineke.’ N’Atọ n’Ime Otu nke a . . . Ndị ahụ bụcha ndị na-adịru ebighị ebi ma hara nhata: ọ dịghị nke ọ bụla e kere eke n’ime ha, ha nile pụkwara ime ihe nile.”—The Catholic Encyclopedia.
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ chọọchị ndị ọzọ nile dị na Krisendọm kwere. Dị ka ihe atụ, Chọọchị Orthodox nke Grik na-akpọkwa Atọ n’Ime Otu “ozizi bụ isi nke Iso Ụzọ Kraịst,” ọbụna na-asị: “Ndị Kraịst bụ ndị nabatara Kraịst dị ka Chineke.” N’akwụkwọ bụ Our Orthodox Christian Faith, otu chọọchị ahụ kwupụtakwara, sị: “Chineke dị atọ. . . . Nna ahụ bụ Chineke n’ụzọ nile. Ọkpara ahụ bụ Chineke n’ụzọ nile. Mmụọ Nsọ bụ Chineke n’ụzọ nile.”
Otú a, e lere Atọ n’Ime Otu anya ịbụ “otu Chineke nke dị n’ime Ndị atọ.” A sịrị na nke ọ bụla enweghị mmalite, ebe ọ dịworo adị n’enweghị mmalite. A sịrị na nke ọ bụla pụrụ ime ihe nile, na-adịghị nke ọ bụla ka ibe ya dị elu ma ọ bụ dị ala.
Echiche dị otú a ò siri ike ịghọta? Ọtụtụ ndị kwere ekwe bụ́ ndị nwere obi ziri ezi ahụwo ya dị ka ihe na-agbagwoju anya, ihe megidere echiche ziri ezi, nke na-adịdịghị ka ihe ọ bụla ha hụtụworo. N’ụzọ dị aṅaa, ka ha na-ajụ, ka Nna ahụ pụrụ isi bụrụ Chineke, Jisọs abụrụ Chineke, mmụọ nsọ ahụ abụrụkwa Chineke, ma ha agaghị adị Chineke atọ kama nanị otu Chineke?
“Ọ Karịrị Nghọta Mmadụ”
IHE mgbagwoju anya nke a gbasapụrụ ebe nile. Akwụkwọ bụ The Encyclopedia Americana na-eme ka a mara na a na-ele ozizi nke Atọ n’Ime Otu anya ịbụ ihe “karịrị nghọta mmadụ.”
Ọtụtụ ndị na-anakwere Atọ n’Ime Otu na-ele ya anya n’otu ụzọ ahụ. Monsignor Eugene Clark na-asị: “Chineke dị otu, Chineke dịkwa atọ. Ebe ọ bụ na e nweghị ihe dị otú a n’okike, anyị apụghị ịghọta ya, nanị ihe anyị pụrụ ime bụ ịnakwere ya.” Cardinal John O’Connor na-ekwu, sị: “Anyị maara na ọ bụ oké ihe omimi, nke anyị na-adịghị amalite inwe nghọta ya.” Pope John Paul nke Abụọ na-ekwu banyere “ihe omimi a na-apụghị ịkọwa akọwa nke Chineke Atọ n’Ime Otu.”
Otú a, akwụkwọ bụ The Dictionary of Religious Knowledge na-asị: “Ndị na-akwado Atọ n’Ime Otu enweghị nkwekọrịta n’etiti onwe ha banyere ihe ozizi ahụ bụ kpọmkwem, ma ọ bụ otú a pụrụ isi kọwaa ya kpọmkwem.”
Mgbe ahụ, anyị pụrụ ịghọta ihe mere akwụkwọ bụ New Catholic Encyclopedia ji na-ekwu, sị: “E nwere ndị ozizi ole na ole nke Atọ n’Ime Otu n’ụlọ akwụkwọ ndị ụkọchukwu Roman Katọlik bụ́ ndị ajụjụ ahụ bụ, ‘Ma olee otú mmadụ ga-esi kụzie Atọ n’Ime Otu?’ na-abụbeghịrị ihe mgbakasị ahụ. Ọ bụrụkwa na ajụjụ ahụ bụ ihe àmà nke inọ ná mgbagwoju n’akụkụ nke ụmụ akwụkwọ, ma eleghị anya, ọ ga-abụkwa ihe àmà nke ụdị mgbagwoju anya ahụ n’akụkụ nke ndị nkụzi ha.”
A pụrụ ịchọpụta eziokwu dị n’okwu ahụ site n’ịga n’ebe ndebe akwụkwọ na inyocha akwụkwọ ndị na-akwado Atọ n’Ime Otu. E dewo ọtụtụ peji a na-apụghị ịgụta ọnụ, na-agbalị ịkọwa ya. Ma, mgbe e mesịrị mgbalị nile site n’iji aha na nkọwa dị iche iche na-agbagwoju anya nke ọkà mmụta okpukpe mee ihe, ndị na-eme nchọpụta ka nọgidekwara bụrụ ndị na-enweghị afọ ojuju.
N’ọnọdụ nke a, onye Jesuit bụ Joseph Bracken kwuru n’akwụkwọ ya bụ What Are They Saying About the Trinity?, sị: “Ndị ụkọchukwu, bụ́ ndị tinyere mgbalị dị ukwuu iji mụta ihe banyere . . . Atọ n’Ime Otu n’oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ seminarị, na-ala azụ n’ụzọ kwere nghọta ịkụziri ya ndị ha na-ezi ihe site n’elu ikpo okwu ha, ọbụna n’ụbọchị Sunday nke Atọ n’Ime Otu. . . . N’ihi gịnị ka mmadụ ga-eji jiri ihe a na-agaghị aghọta nke ọma n’ikpeazụ mee ka ike gwụ ụmụ mmadụ n’ige ntị?” O kwukwara, sị: “Atọ n’Ime Otu bụ nanị nkwenkwe e ji emezu iwu, ma o nwere [mmetụta] dị nnọọ nta ma ọ bụ ghara inwe ma ọlị ná ndụ na ofufe ndị Kristian kwa ụbọchị.” Ma, ọ bụ “ozizi bụ isi” nke chọọchị dị iche iche!
Onye ọkà mmụta okpukpe ndị Katọlik bụ Hans Küng kwuru n’akwụkwọ ya bụ Christianity and the World Religions na Atọ n’Ime Otu bụ otu ihe mere chọọchị dị iche iche na-ejibeghị nwee ike inwe ọganihu ọ bụla dị ịrịba ama n’ebe ndị na-abụghị ndị Kristian nọ. O kwuru, sị: “Ọbụna ndị Alakụba maara ihe a na-akọ apụghị ịghọta ya, dị nnọọ ka ndị Juu n’otu aka ahụ na-enwebeghị ike ịghọta ya ruo ugbu a, bụ́ echiche nke Atọ n’Ime Otu. . . . Ọdịiche ndị ozizi Atọ n’Ime Otu mere n’etiti otu Chineke na ndị atọ adịghị eju ndị Alakụba afọ, bụ́ ndị nwere mgbagwoju anya kama ịbụ ndị e mere ka o doo ha anya, site n’okwu ọkà mmụta okpukpe ndị e nwetara site n’asụsụ Syriac, Grik, na Latin. Ndị Alakụba na-ahụ ya dị ka iji okwu na-egwuri egwu. . . . N’ihi gịnị ka onye ọ bụla ga-eji chọọ ịtụkwasị ihe ọ bụla n’echiche nke ịdị otu na ịdị iche nke Chineke, bụ́ nke pụrụ nanị ịgwagbu ma ọ bụ bibie ịdị otu ahụ na ịdị iche ahụ?”
‘Ọ Bụghị Chineke nke Mgbagwoju Anya’
OLEE otú ozizi dị otú a nke na-agbagwoju anya pụrụ isiworị malite? Akwụkwọ bụ The Catholic Encyclopedia na-asị: “Nkwenkwe dị omimi otú a na-egosi na ọ bụ Chineke kpughere ya.” Ndị mmụta Katọlik bụ Karl Rahner na Herbert Vorgrimler kwuru n’akwụkwọ ha bụ Theological Dictionary, sị: “Atọ n’Ime Otu bụ ihe omimi . . . n’ikwu ya kpọmkwem dị ka o si dị . . . , nke a na-apụghị ịmata ma ọ bụrụ na e kpugheghị ya, ọbụna mgbe e kpughesịrị ya, a pụghị ịghọta ya kpam kpam.”
Otú ọ dị, ikwu na ebe Atọ n’Ime Otu bụ ihe omimi dị mgbagwoju anya otú a, ọ ghaghị isiteworị ná mkpughe nke Chineke, na-eme ka e nwee nsogbu ọzọ pụtara ìhè. N’ihi gịnị? N’ihi na mkpughe nke Chineke n’onwe ya adịghị enye ohere maka ụdị echiche dị otú ahụ banyere Chineke: “Chineke abụghị Chineke nke mgbagwoju anya.”—1 Ndị Kọrint 14:33, Revised Standard Version (RS).
N’ihi okwu dị otú ahụ, ọ̀ ga-abụ Chineke hụrụ maka ozizi banyere onwe ya nke na-agbagwoju anya otú a nke na ọbụna ndị mmụta Hibru, Grik, na Latin apụghị ịkọwa ya n’ezie?
Ọzọkwa, ọ̀ pụtara na ndị mmadụ aghaghị ịbụ ndị ọkà mmụta okpukpe ‘iji mara nanị ezi Chineke ahụ na Jisọs bụ́ onye o ziteworo’? (Jọn 17:3, JB) Ọ bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị ole na ole n’etiti ndị ndú okpukpe Juu gụrụ akwụkwọ matara Jisọs dị ka Mesaịa ahụ? Kama nke ahụ, ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ ndị ọrụ ubi, ndị ọkụ azụ, ndị ọna ụtụ, ndị bụ nwunye bụ́ ndị dị ala. Ndị ahụ bụ ndị nkịtị kwenyesiri ike n’ihe Jisọs kụziri banyere Chineke nke na ha pụrụ ịkụziri ya ndị ọzọ, ọbụna dị njikere ịnwụ n’ihi ihe ha kwere na ya.—Matiu 15:1-9; 21:23-32, 43; 23:13-36; Jọn 7:45-49; Ọrụ 4:13.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ ndị nkịtị bụ́ ndị dị ala, ọ bụghị ndị ndú okpukpe