Chineke Ọ̀ Dị Elu Karịa Jisọs Mgbe Nile?
JISỌS adịghị mgbe ọ sịrị na ya bụ Chineke. Ihe nile o kwuru banyere onwe ya na-egosi na o leghị onwe ya anya dị ka onye ya na Chineke hà nhata n’ụzọ ọ bụla—ọ bụghị n’ịdị ike, ọ bụghị n’ihe ọmụma, ọ bụghị n’afọ ndụ.
N’oge nile nke ịdị adị ya, ma ọ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, okwu na omume ya na-egosi ịnọ n’okpuru Chineke. Chineke bụ onye ka dị elu mgbe nile, Jisọs bụ onye ka dị ala, onye Chineke kere eke.
E Gosi Ọdịiche Jisọs n’Ebe Chineke Nọ
MGBE mgbe, Jisọs gosiri na ya bụ onye e kere eke nke dị nnọọ iche pụọ n’ebe Chineke nọ nakwa na ya onwe ya, bụ́ Jisọs, nwere Chineke onye ka ya dị elu, Chineke nke ọ na-efe, Chineke nke ọ kpọrọ “Nna.” N’ekpere o kpegaara Chineke, ya bụ, Nna ahụ, Jisọs sịrị, “Gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke.” (Jọn 17:3) Na Jọn 20:17, ọ gwara Meri Magdalini, sị: “Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu, Chineke m na Chineke unu.” (RS, mbipụta nke ndị Katọlik) Ná 2 Ndị Kọrint 1:3, Pọl onyeozi mesiri mmekọrịta nke a ike, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” Ebe ọ bụ na Jisọs nwere Chineke, bụ́ Nna ya, ọ pụghị ịbụ Chineke ahụ n’otu mgbe ahụ.
Pọl onyeozi ezoghị ihe ọ bụla n’ikwu banyere Jisọs na Chineke dị ka ndị dị iche pụọ n’ibe ha, sị: “Nye anyị, e nwere otu Chineke, bụ́ Nna, . . . e nwekwara otu Onyenwenụ, bụ́ Jisọs Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 8:6, JB) Onyeozi ahụ na-egosi ịdị iche ahụ mgbe o kwuru banyere “n’ihu nke Chineke na Kraịst Jisọs na nke ndị mmụọ ozi ahụ a họpụtara ahọpụta.” (1 Timoti 5:21, RS Common Bible) Dị nnọọ ka Pọl na-ekwu banyere Jisọs na ndị mmụọ ozi dị ka ndị dị iche n’ebe ibe ha nọ n’eluigwe, otú ahụ ka Jisọs na Chineke dị.
Okwu Jisọs kwuru na Jọn 8:17, 18 dịkwa ịrịba ama. O kwuru, sị: “E dewokwa n’akwụkwọ iwu unu, na àmà nke mmadụ abụọ bụ ezie. Mụ onwe m bụ onye na-agbara onwe m àmà, Nna nke zitere m na-agbakwara m àmà.” N’ebe a Jisọs na-egosi na ya na Nna ya, ya bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, aghaghị ịbụ ndị abụọ dị iche n’ebe ibe ha nọ, n’ihi na ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa ka a gaara esi nwee ndị àmà abụọ n’ezie?
Jisọs gara n’ihu gosi na ya bụ onye dị iche n’ebe Chineke nọ site n’ikwu, sị: “N’ihi gịnị ka unu ji akpọ m onye ọma? Ọ dịghị onye bụ onye ọma ma ọ bụghị nanị Chineke.” (Mak 10:18, JB) Ya mere Jisọs na-asị na ọ dịghị onye ọ bụla bụ onye ọma dị ka Chineke, ọbụna Jisọs n’onwe ya abụghị. Chineke dị mma n’ụzọ mere ka ọ dị iche n’ebe Jisọs nọ.
Ohu Chineke nke Na-erubere Ya Isi
MGBE mgbe, Jisọs kwuru okwu ndị dị ka: “Ọkpara ahụ apụghị ime ihe ọ bụla masịrị ya, ọ pụrụ ime nanị ihe ọ hụrụ ka Nna ya na-eme.” (Jọn 5:19, The Holy Bible, nke Monsignor R. A. Knox dere) “Esiwo m n’eluigwe rịdata, ọ bụghị ka m na-eme ihe mụ onwe m na-achọ, kama ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ.” (Jọn 6:38) “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) Ọ̀ bụ na onye na-eziga adịghị elu karịa onye e zigara?
Mmekọrịta nke a pụtara ìhè n’ihe atụ Jisọs banyere ubi vine. O ji Chineke, bụ́ Nna ya, tụnyere onye nwe ubi vine, onye mere njem gaa ebe dị anya ma hapụ ya n’aka ndị na-akụ ubi vine, bụ́ ndị nọchiri anya ndị ndú okpukpe Juu. Mgbe onye ahụ nwe ubi vine mesịrị ziga otu ohu ka o weta ụfọdụ n’ime mkpụrụ osisi nke ubi vine ahụ, ndị ahụ na-akụ ubi vine tiri ohu ahụ ihe ma zilaga ya n’enyeghị ya ihe ọ bụla. Mgbe ahụ onye ahụ nwe ubi zigara ohu nke abụọ, e mesịakwa nke atọ, e mesokwara ha abụọ n’otu ụzọ ahụ. N’ikpeazụ, onye ahụ nwe ubi kwuru, sị: “M ga-eziga ọkpara m [Jisọs] m hụrụ n’anya: ma eleghị anya ha ga-asọpụrụ nwa m nke a.” Ma ndị ahụ rụrụ arụ, bụ́ ndị na-akụ ubi kwuru, sị: “Nke a bụ onye nketa: ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa ya wee bụrụ nke anyị. Ha wee tụpụ ya n’azụ ubi vine ahụ, gbuo ya.” (Luk 20:9-16) Otú a, Jisọs ji ihe atụ gosi ọnọdụ nke ya onwe ya dị ka onye Chineke zitere ime uche Chineke, dị nnọọ ka nna na-eziga nwa nke na-erubere ya isi.
Ndị na-eso ụzọ Jisọs lere ya anya mgbe nile dị ka ohu Chineke nke na-erube isi, ọ bụghị dị ka onye ya na Chineke hà nhata. Ha kpegaara Chineke ekpere banyere “ohu gị dị nsọ, bụ́ Jisọs, onye gị onwe gị tere mmanụ, . . . a na-arụkwa ọtụtụ ọrụ dị ịrịba ama na ọrụ ebube site n’aha nke ohu gị dị nsọ, bụ́ Jisọs.”—Ọrụ 4:23, 27, 30, RS, mbipụta nke ndị Katọlik.
Chineke Ka Elu Mgbe Nile
KPỌMKWEM ná mmalite nke ozi Jisọs, mgbe o siri na mmiri a nọ mee ya baptism rịgopụta, olu Chineke nke sitere n’eluigwe kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.” (Matiu 3:16, 17) Chineke ọ̀ na-ekwu na ya bụ ọkpara nke onwe ya, na ihe ya onwe ya dị ya ezi mma, na ya zitere onwe ya? Ee e, Chineke, bụ́ Onye Okike, na-asị na ya, dị ka onye ka elu, na-anwapụta onye dị ala karị, Ọkpara ya, bụ́ Jisọs maka ọrụ dị n’ihu.
Jisọs gosipụtara ịka elu nke Nna ya mgbe ọ sirị: “Mmụọ nke [“Jehova,” NW] dị n’ahụ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma.” (Luk 4:18) Ite mmanụ bụ inye ikike ma ọ bụ inye ọrụ a ga-arụ, site n’aka onye ka elu, nye onye na-enwebeghị ikike. N’ebe a, ọ pụtara ìhè na Chineke bụ onye ka elu, n’ihi na o tere Jisọs mmanụ, na-enye ya ikike nke ọ na-enwebughị.
Jisọs mere ka ịka elu nke Nna ya doo anya mgbe nne nke ndị na-eso ụzọ abụọ rịọrọ ka ụmụ ya nọdụ otu n’aka nri na otu n’aka ekpe nke Jisọs mgbe ọ batara n’Alaeze ya. Jisọs zara, sị: “Banyere ịnọdụ n’aka nri m ma ọ bụ n’aka ekpe m, ha abụghị ihe dịịrị m ikpebi; ha dịịrị ndị e nyeworo ha site n’aka Nna m,” ya bụ, Chineke. (Matiu 20:23, JB) A sị na Jisọs bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, ọnọdụ ndị ahụ gaara adị ya n’aka inye. Ma Jisọs apụghị inye ha, n’ihi na ha dị n’aka Chineke inye, Jisọs abụghịkwa Chineke.
Ekpere dị iche iche ndị Jisọs n’onwe ya kpere bụkwa ihe àmà siri ike nke ọnọdụ ya dị ala. Mgbe ọnwụ Jisọs na-eru nso, o gosiri onye ahụ dị elu karịa ya site n’ikpe ekpere, sị: “Nna, ọ bụru na ọ dị gị mma, nara m iko a: otú ọ dị, ka e mee ihe gị onwe gị na-achọ, ọ bụghị ihe mụ onwe m na-achọ.” (Luk 22:42) Ònye ka ọ na-ekpegara ekpere? Ọ̀ bụ akụkụ nke onwe ya? Ee e, ọ na-ekpegara onye dị nnọọ iche kpam kpam n’ebe ọ nọ ekpere, ya bụ Nna ya bụ́ Chineke, onye nzube ya dị elu karị ma nwee ike ịdị iche pụọ na nke ya, Onye nanị ya nwere ike ‘ịnara ya iko nke a.’
Mgbe ahụ, ka ọ na-abịaru ọnwụ nso, Jisọs tiri mkpu ákwá, sị: “Chineke m, Chineke m, n’ihi gịnị ka ị hapụworo nanị m?” (Mak 15:34, JB) Ọ̀ bụ onye ka Jisọs na-etigara mkpu ákwá? Ọ̀ bụ onwe ya ka ọ̀ bụ akụkụ nke onwe ya? N’ezie, ákwá ahụ bụ, “Chineke m,” esiteghị n’ọnụ onye lere onwe ya anya dị ka Chineke. Ọ bụrụkwa na Jisọs bụ Chineke, mgbe ahụ, ọ̀ bụ onye hapụrụ ya? Ọ̀ bụ onwe ya? Ezi uche agaghị adị na nke ahụ. Jisọs kwukwara, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enye mmụọ m idebe.” (Luk 23:46) Ọ bụrụ na Jisọs bụ Chineke, n’ihi gịnị ka ọ ga-ejiworị nyefee mmụọ ya n’aka Nna ahụ?
Mgbe Jisọs nwụsịrị, ọ nọrọ n’ime ili ruo akụkụ nke ụbọchị atọ. Ọ bụrụ na ọ bụ Chineke, mgbe ahụ Habakuk 1:12 (NW) ezighị ezi mgbe ọ sịrị: “Oo Chineke m, Onye Nsọ m, ị dịghị anwụ anwụ.” Ma Bible kwuru na Jisọs nwụrụ n’ezie na ọ maghịkwa ihe ọ bụla n’ili. Ọ̀ bụkwa onye mere ka Jịsọs si n’ọnwụ bilie? Ọ bụrụ na ọ nwụrụ anwụ n’ezie, ọ pụghị ịkpọliteworị onwe ya n’ọnwụ. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ọ nwụghị anwụ, n’ezie, ime ka a ga-asị na ọ nwụrụ anwụ agaraghị akwụ ụgwọ mgbapụta n’ihi mmehie Adam. Ma ọ kwụrụ ụgwọ ahụ n’ozuzu ya site n’ọnwụ ọ nwụrụ n’ezie. Ya mere, ọ bụ “Chineke [bụ onye] mere ka [Jisọs] si n’ọnwụ bilie, mgbe ọ tọpụsịrị ihe mgbu nke ọnwụ.” (Ọrụ 2:24) Onye ahụ ka elu, bụ́ Chineke onye pụrụ ime ihe nile, kpọlitere onye ahụ dị ala, bụ́ Jisọs ohu ya, site n’ọnwụ.
Ikike Jisọs nwere ịrụ ọrụ ebube dị iche iche dị ka ịkpọlite mmadụ site n’ọnwụ ọ̀ na-egosi na ọ bụ Chineke? Ọ dị mma, ndị ozi na ndị amụma bụ Elaịja na Elaịsha nwekwara ike ahụ, ma nke ahụ emeghị ka ha bụrụ ihe ọzọ karịrị mmadụ. Chineke nyere ndị amụma ahụ, Jisọs, na ndị ozi ikike nke ịrụ ọrụ ebube iji gosi na Ya onwe ya na-akwado ha. Ma o meghị ka nke ọ bụla n’ime ha bụrụ akụkụ nke otu Chiatọ ahụ.
Jisọs Nwere Ihe Ọmụma A Kpaara Ókè
MGBE Jisọs buru amụma ya banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a, o kwuru, sị: “Ma banyere ụbọchị ahụ ma ọ bụ hour ahụ ọ dịghị onye ọ bụla ma, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama nanị Nna ahụ.” (Mak 13:32, RS, mbipụta nke ndị Katọlik) A sị na Jisọs bụ Ọkpara nke ya na ndị ọzọ hà nhata n’ime Chiatọ ahụ, ọ gaara amaworị ihe Nna ahụ maara. Ma Jisọs amaghị, n’ihi na ya na Chineke ahaghị nhata.
N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị na-agụ ná Ndị Hibru 5:8 na Jisọs “mụtara ịṅa ntị ya site n’ahụhụ nile ọ hụrụ.” Ànyị pụrụ iche na ọ dị mkpa ka Chineke mụta ihe ọ bụla? Ee e, ma Jisọs mere otú ahụ, n’ihi na ọ maghị ihe nile Chineke maara. Ọ dịkwa mkpa na ọ mụtara ihe nke na-adịghị Chineke mkpa ịmụta—nrubeisi. Ọ dịghị Chineke mkpa mgbe ọ bụla irubere onye ọ bụla isi.
Ọdịiche dị n’etiti ihe Chineke maara na ihe Kraịst maara dịkwa mgbe a kpọlitere Jisọs n’ọnwụ ịbịa nọnyere Chineke n’eluigwe. Rịba ama okwu ndị mbụ nke akwụkwọ ikpeazụ nke Bible: “Mkpughe nke Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya.” (Mkpughe 1:1, RS, mbipụta nke ndị Katọlik) Ọ bụrụ na Jisọs n’onwe ya so bụrụ Chineke, ọ̀ gaara anataworị mkpughe site n’aka onye ọzọ so na Chiatọ ahụ—Chineke? N’ezie, ọ ghaghị ịmaworị ihe nile banyere ya, n’ihi na Chineke maara. Ma Jisọs amaghị, n’ihi na ọ bụghị Chineke.
Jisọs Nọgidere Na-anọ n’Okpuru
NÁ NDỤ ọ dịrị tupu ọ ghọọ mmadụ, nakwa mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs nọ n’okpuru Chineke. Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, ọ nọgidere na-anọ n’okpuru, bụ́ ọnọdụ nke abụọ.
Mgbe ọ na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ nke Jisọs, Pita na ndị òtù ya gwara ụlọ ikpe Sanhedrin nke ndị Juu, sị: “Chineke weliri onye a [Jisọs] elu . . . gaa n’aka nri ya.” (Ọrụ 5:31, NW) Pọl sịrị: “Chineke welikwara ya elu nke ukwuu.” (Ndị Filipaị 2:9) A sị na Jisọs bụrịị Chineke, olee otú a pụrụ isiworị welie Jisọs elu, ya bụ, iweli ya n’ọnọdụ dị elu karịa nke ọ nọbu na ya? Ọ gaara abụ onye e weliworo elu dị ka akụkụ nke Atọ n’Ime Otu. A sị na Jisọs na Chineke aharawo nhata tupu mweli elu ya, iweli ya elu ọzọ gaara eme ka ọ kara Chineke elu.
Pọl kwukwara na Kraịst banyere “n’eluigwe, ka o wee nwee ike iguzo kpọmkwem n’ihu Chineke n’ihi anyị.” (Ndị Hibru 9:24, JB) Ọ bụrụ na i guzo n’ihu onye ọzọ, olee otú ị pụrụ isi bụrụ onye ahụ? Ị pụghị. Ị ghaghị ịbụ onye dị iche na onye guzo iche.
N’otu aka ahụ, tupu e jiri nkume tụgbuo ya, onye ahụ nwụrụ n’ihi okwukwe ya, bụ́ Stifen, ‘lere anya n’eluigwe, wee hụ ebube Chineke, na Jisọs ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.’ (Ọrụ 7:55) O doro anya na ọ hụrụ ndị abụọ dị iche iche—ma ọ hụghị mmụọ nsọ, ọ hụghị Chineke Atọ n’Ime Otu.
N’ihe ndekọ ahụ dị ná Mkpughe 4:8 ruo 5:7, e gosiri Chineke ka ọ na-anọdụ n’ocheeze ya nke eluigwe, ma e gosighị Jisọs. Ọ ghaghị ịgakwuru Chineke ịnara akwụkwọ mpịakọta site n’aka nri Chineke. Nke a gosiri na n’eluigwe, Jisọs abụghị Chineke, kama ọ bụ onye dị iche n’ebe ọ nọ.
N’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị anyị kwuworo, akwụkwọ bụ Bulletin of the John Rylands Library nke dị na Manchester, England, na-ekwu, sị: “Ná ndụ ọ dịrị n’eluigwe mgbe e mesịrị ka o si n’ọnwụ bilie, e gosiri Jisọs dị ka onye nọgidere na-enwe ọdịdị nke ịbụ onye dịrị onwe ya, dị iche kpam kpam pụọ n’ebe Chineke nọ dị ka ọ dị n’oge ọ dị ndụ n’elu ụwa, dị ka Jisọs nke nọ n’ụwa. Dị ka onye nọ n’akụkụ Chineke na onye a pụrụ iji tụnyere Chineke, ọ pụtara ná nzukọ eluigwe nke Chineke n’ezie dị ka onye ọzọ dị adị n’eluigwe, dịkwa ka ndị mmụọ ozi—ọ bụ ezie na dị ka Ọkpara Chineke, ọ nọ n’ọnọdụ dị iche, ma nọrọ n’ọkwá dị elu nke ukwuu karị ha.”—Tụlee Ndị Filipaị 2:11.
Akwụkwọ Bulletin ahụ na-ekwukwa, sị: “Otú ọ dị, ihe e kwuru banyere ndụ ya na ọrụ ndị ọ rụrụ dị ka Kraịst nke nọ n’eluigwe adịghị apụta ma ọ bụ na-egosi na a bịa n’ọkwá nke ịbụ chi, ya na Chineke n’onwe ya hà nhata, na ọ bụkwa Chineke n’ụdị ya nile. Kama nke ahụ, n’ụzọ Agba Ọhụrụ si gosi ụdị onye ọ bụ na ozi ya n’eluigwe, anyị na-ahụ onye dị iche ma nọrọ n’okpuru Chineke.”
N’ọdịnihu ebighị ebi n’ime eluigwe, Jisọs ga-anọgide na-adị iche, na-abụ ohu nke nọ n’okpuru Chineke. Bible na-ekwu ya n’ụzọ dị otú a, sị: “Mgbe nke ahụ gasịrị, ọgwụgwụ ga-abịa mgbe ọ [Jisọs n’eluigwe] ga-enyeghachi alaeze ahụ n’aka Chineke bụ́ Nna . . . Mgbe ahụ, a ga-edo Ọkpara ahụ n’onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe nile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’elu ihe nile.”—1 Ndị Kọrint 15:24, 28, NJB.
Jisọs Adịghị Mgbe O Kwuru na Ya Bụ Chineke
IHE Bible na-ekwu doro anya. Ọ bụghị nanị na Chineke Onye Pụru Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, bụ onye dị iche pụọ n’ebe Jisọs nọ, kamakwa Ọ bụ onye ka ya elu mgbe nile. A na-egosi Jisọs mgbe nile dị ka onye dị iche na onye dị ala, ohu Chineke nke wedara onwe ya ala. Ọ bụ ya mere Bible ji na-ekwu n’ụzọ pụtara ìhè na “Chineke bụkwa isi nke Kraịst” dị nnọọ ka “Kraịst bụ isi nke nwoke.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Ọ bụkwa nke a mere Jisọs n’onwe ya ji kwuo, sị: “Nna ahụ ka mụ onwe m ukwuu.”—Jọn 14:28, RS, mbipụta nke ndị Katọlik.
Eziokwu dị na ya bụ na Jisọs abụghị Chineke, ọ dịghịkwa mgbe o kwuru na ya bụ. Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmụta na-amata nke a. Dị ka Bulletin nke Rylands si na-ekwu: “A ghaghị iche eziokwu ahụ ihu nke bụ na nnyocha e mere n’Agba Ọhụrụ n’ihe dị ka iri afọ atọ ma ọ bụ anọ gara aga anọgidewo na-eduje ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmụta Agba Ọhụrụ a ma ama ná nkwubi okwu bụ na Jisọs . . . n’ezie adịghị mgbe o kwere na ya onwe ya bụ Chineke.”
Akwụkwọ ahụ bụ Bulletin kwukwara banyere ndị Kraịst narị afọ mbụ, sị: “Ya mere, mgbe ọ bụla ha nyere [Jisọs] ụdị utu aha ukwu ndị ahụ dị ka Kraịst, Nwa nke mmadụ, Ọkpara Chineke na Onyenwe anyị, ndị a bụ ụzọ nke isi kwuo na ọ bụghị Chineke, kama na ọ rụrụ ọrụ Chineke.”
Otú a, ọbụna ndị mmụta okpukpe na-ekweta na echiche nke Jisọs ịbụ Chineke na-emegide àmà nile Bible na-agba. N’ebe ahụ, Chineke bụ onye ka elu mgbe nile, Jisọs bụkwa ohu nke nọ n’okpuru.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]
‘Nnyocha e mere n’Agba Ọhụrụ anọgidewo na-eduje ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmụta ná nkwubi okwu bụ na Jisọs n’ezie adịghị mgbe o kwere na ya onwe ya bụ Chineke.’—Bulletin of the John Rylands Library
[Foto dị na peeji nke 17]
Jisọs gwara ndị Juu, sị: “Esiwo m n’eluigwe rịdata, ọ bụghị ka m na-eme ihe mụ onwe m na-achọ, Kama ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ.”—Jọn 6:38
[Foto dị na peeji nke 18]
Mgbe Jisọs tiri mkpu ákwá, sị: “Chineke m, Chineke m, n’ihi gịnị ka ị hapụworo nanị m?” n’ezie, ọ dịghị ekwenye na ya onwe ya bụ Chineke