Olee Banyere “Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Ndị Na-akwado” Atọ n’Ime Otu?
E KWURU na akụkụ ụfọdụ nke Bible na-enye ihe àmà nke na-akwado Atọ n’Ime Otu. Otú ọ dị, mgbe anyị na-agụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị otú ahụ, anyị kwesịrị iburu n’uche na ihe àmà Bible na akụkọ ihe mere eme adịghị akwado Atọ n’Ime Otu.
A ghaghị ịghọta akụkụ Bible nke ọ bụla e zoro aka na ya dị ka ihe nkwado n’ụzọ kwekọrọ n’ozizi nile nke Bible. Mgbe mgbe, a na-eme ka ezi nghọta nke ihe akụkụ akwụkwọ nsọ dị otú ahụ pụtara n’ezie doo anya site ná nghọta e nwere n’amaokwu ndị dị ya gburugburu.
Atọ n’ime Otu
AKWỤKWỌ bụ New Catholic Encyclopedia na-enye atọ n’ime ‘akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị otú a na-akwado’ atọ n’ime otu ma na-ekwetakwa, sị: “A kụzighị ozizi nke Atọ n’Ime Otu Dị Nsọ n’A[gba] O[chie]. N’A[gba] Ọ[hụrụ] ihe àmà kasị mee ochie e nwere dị n’akwụkwọ ozi ndị ahụ Pọl dere, karịsịa, 2 Kọr 13.13 [amaokwu 14 na Bible ụfọdụ], na 1 Kọr 12.4-6. N’Oziọma ndị ahụ, a na-ahụ ihe àmà nke Atọ n’Ime Otu n’ụzọ doro anya nanị n’usoro ime baptism nke Mat 28.19.”
N’amaokwu ndị ahụ, e depụtara “ndị” atọ ahụ n’ụzọ ndị a sonụ na The New Jerusalem Bible. Ndị Kọrint nke Abụọ 13:13 (14) na-ejikọ atọ ahụ ọnụ n’ụzọ dị otú a: “Ka amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ịhụnanya nke Chineke na mmekọ nke Mmụọ Nsọ nọnyere unu nile.” Ndị Kọrint nke Mbụ 12:4-6 na-asị: “E nwere ọtụtụ onyinye dịgasị iche iche, ma ọ bụ otu Mmụọ mgbe nile; e nwere ọtụtụ ụzọ dị iche iche nke ije ozi, ma ọ bụ otu Onyenwe anyị mgbe nile. E nwere ọtụtụ ụdị ọrụ dị iche iche, ma n’ime mmadụ nile ọ bụ otu Chineke ahụ na-arụ ọrụ n’ime ha nile.” Matiu 28:19 na-agụkwa, sị: “Ya mere, gaanụ mee mba nile ka ha bụrụ ndi na-eso ụzọ m; mee ha baptism n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke Mmụọ Nsọ.”
Amaokwu ndị a hà na-asị na Chineke, Kraịst, na mmụọ nsọ na-emejupụta Chineke nke dị Atọ n’Ime Otu, na ha atọ hà nhata n’ọdịdị, ike na enweghị mmalite? Ee e, ha adịghị ekwu otú ahụ, dịkwa ka idepụta aha mmadụ atọ dị ka Okeke, Okafor, na Okonkwo na-apụtaghị na ha bụ atọ n’ime otu.
Akwụkwọ ahụ bụ Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature, nke McClintock na Strong dere kwetara na ụdị ntụaka dị otú a, “na-egosi nanị na e nwere ihe atọ ndị ahụ a kpọrọ aha, . . . ma ọ dịghị egosi n’onwe ya na ihe atọ ndị ahụ nwere ọdịdị nke Chineke n’ezie, nweekwa nsọpụrụ nke Chineke n’ụzọ hà nhata.”
Ọ bụ eziokwu na ọ na-akwado Atọ n’Ime Otu, akwụkwọ ahụ na-ekwu banyere 2 Ndị Kọrint 13:13 (14), sị: “Anyị apụghị izi ezi n’ịghọta na ha nwere ikike hà nhata, ma ọ bụ otu ọdịdị.” Banyere Matiu 28:18-20, ọ na-ekwu, sị: “Otú ọ dị, ọ bụrụ na e lee akụkụ akwụkwọ nsọ nke a anya nanị ya, ọ gaghị egosi ụdịdị nke ihe atọ ahụ a kpọrọ aha, ma ọ bụ ịha nhata ma ọ bụ ịbụ Chineke ha n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị na ya.”
Mgbe Jisọs mere baptism, a kpọtụrụ aha Chineke, Jisọs na mmụọ nsọ na gburugburu otu ebe ahụ. Jisọs “wee hụ mmụọ nke Chineke ka ọ na-efeda dị ka nduru, na-ebekwasịkwa ya.” (Matiu 3:16) Otú ọ dị, nke a adịghị ekwu na ha atọ bụ otu. Ọtụtụ ugboro, a kpọkọrọ aha Abraham, Aịsak na Jekọb ọnụ, ma nke ahụ adịghị eme ka ha bụrụ otu onye. A kpọkọkwara aha Pita, Jemes, na Jọn ọnụ, nke ahụ n’otu aka ahu emeghịkwa ka ha bụrụ otu onye. Ọzọkwa, mmụọ Chineke si n’elu bekwasị Jisọs mgbe e mesịrị ya baptism, na-egosi na e jibeghị mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ tupu oge ahụ. Ebe ọ dị otú a, olee otú ọ pụrụ isi bụrụ akụkụ nke Atọ n’Ime Otu ebe ya na mmụọ nsọ nọgideworo na-abụ otu mgbe nile?
A na-achọta ntụaka ọzọ kwuru okwu banyere ha atọ n’otu ebe n’ụfọdụ nsụgharị ochie nke Bible na 1 Jọn 5:7. Otú ọ dị, ndị mmụta maara na okwu ndị a adịbughị na Bible, kama na e tinyere ha ka oge na-aga. Ọtụtụ nsụgharị nke oge a n’ụzọ ziri ezi ewebataghị amaokwu ụgha nke a.
‘Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ na-akwado’ atọ n’ime otu na-ekwu banyere mmekọrịta dị n’etiti ndị abụọ—Nna ahụ na Jisọs. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.
“Mụ Onwe M na Nna M Bụ Otu”
A NA-AKPỌTỤKARỊ uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ dị na Jọn 10:30 iji kwado Atọ n’Ime Otu, ọ bụrịị eziokwu na ọ dịghị onye atọ e hotara n’ebe ahụ. Ma Jisọs n’onwe ya gosiri ihe o bu n’uche site n’ikwu na ya na Nna ya bụ “otu.” Na Jọn 17:21, 22, o kpegaara Chineke ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya “wee bụrụ otu; dị ka gị onwe gị dị n’ime m, dị ka mụ onwe m dịkwa n’ime gị, Nna, ka ha onwe ha wee dịkwa n’ime anyị: . . . ka ha wee bụrụ otu, dị ka anyị onwe anyị bụ otu.” Jisọs ọ̀ na-ekpe ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya nile ghọọ otu onye? Ee e, o doro anya na Jisọs na-ekpe ekpere ka e jikọọ ha ọnụ n’echiche na ná nzube, dị ka e jikọrọ ya na Chineke.—Leekwa 1 Ndị Kọrint 1:10.
Ná 1 Ndị Kọrint 3:6, 8, Pọl na-asị: “Mụ onwe m kụrụ osisi, Apolọs kwọsara ya mmiri . . . ma onye na-akụ na onye na-akwọsa mmiri bụ otu.” Pọl adịghị ekwu na ya na Apọlọs bụ ndị abụọ dị n’ime otu onye; ihe ọ na-ekwu bụ na ha nwere otu nzube. Okwu Grik nke Pọl ji mee ihe n’ebe a maka “otu” (hen) na-egosi ihe efu, n’ụzọ nkịtị, ọ bụ “otu (ihe),” na-egosi ịdị n’otu n’inyerịta nkwado. Ọ bụ otu okwu ahụ ka Jisọs ji mee ihe na Jọn 10:30 iji kọwaa mmekọrịta nke ya na Nna ya. Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka Jisọs ji mee ihe na Jọn 17:21, 22. Ya mere mgbe o ji okwu ahụ bụ “otu” (hen) mee ihe n’ọnọdụ ndị a, ọ na-ekwu banyere ịdị n’otu n’echiche na ná nzube.
Banyere Jọn 10:30, John Calvin (bụ́ onye na-akwado Atọ n’Ime Otu) kwuru n’akwụkwọ ahụ bụ Commentary on the Gospel According to John, sị: “Ndị oge ochie ji akụkụ okwu nke a mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji gosipụta na Kraịst . . . na Nna ya bụ otu ihe ahụ. N’ihi na Kraịst adịghị ekwu banyere ịbụ otu ihe, kama banyere nkwekọrịta nke ya na Nna ahụ nwere.”
Kpọmkwem n’amaokwu ndị na-eso Jọn 10:30, Jisọs rụsiri ụka ike na okwu ya adịghị egosi na ya bụ Chineke. Ọ jụrụ ndị Juu bụ́ ndị ruru nkwubi okwu dị otú ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi ma chọọ iji nkume tụgbuo ya, sị: “N’ihi gịnị ka unu ji na-asị na m na-ekwu okwu nkwulu n’ihi na mụ, onye Nna m doro nsọ ma zite n’ụwa, sịrị, ‘Abụ m ọkpara Chineke’?” (Jọn 10:31-36, NE) Ee e, Jisọs asịghị na ya bụ Chineke Ọkpara, kama Ọkpara nke Chineke.
Ọ̀ “Na-eme Ka Ya Onwe Ya na Chineke Hara”?
AKỤKỤ akwụkwọ nsọ ọzọ a na-enye dị ka nke na-akwado Atọ n’Ime Otu bụ Jọn 5:18. Ọ na-asị na ndị Juu (dị ka ọ dị na Jọn 10:31-36) chọrọ igbu Jisọs n’ihi na “ọ na-akpọkwa Chineke Nna nke aka ya, na-eme ka ya onwe ya na Chineke hara.”
Ma ònye sịrị na Jisọs na-eme ka ya na Chineke hara nhata? Ọ bụghi Jisọs. Ọ gọọrọ onwe ya pụọ n’ebubo ụgha nke a n’amaokwu nke na-esochi (19), sị: “N’ebubo nke a, Jisọs zaghachiri: . . . ‘Ọkpara ahụ apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya; ọ pụrụ ime nanị ihe ọ hụworo ka Nna ahụ na-eme.’”—JB.
Site na nke a, Jisọs gosiri ndị Juu ahụ na ya na Chineke ahaghị nhata, n’ihi nke a kwa, na ya apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya. Ànyị pụrụ iche echiche banyere onye ya na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile hà nhata ikwu na ya “apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya”? (Tụlee Daniel 4:34, 35.) N’ụzọ na-akpali mmasị, ihe ndị e kwuru na gburugburu Jọn 5:18 na 10:30 na-egosi na Jisọs gọọrọ onwe ya pụọ n’ebubo ụgha ahụ nke ndị Juu boro ya, bụ́ ndị, dịkwa ka ndị kwere n’Atọ n’Ime Otu, ha na-erute ná nkwubi okwu ndị na-ezighị ezi!
‘Ya na Chineke Hà Hà Nhata’?
NÁ NDỊ FILIPAỊ 2:6, Douay Version (Dy) ndị Katọlik nke 1609 na-ekwu banyere Jisọs, sị: “Onye, ebe ọ dị n’ụdị nke Chineke, lere ya anya dị ka ihe na-abụghị ịpụnara ihe bụ́ ịha ka Chineke.” Nsụgharị King James Version (KJ) nke 1611 na-agụkwa n’ụzọ yiri nnọọ nke ahụ. Ndị ụfọdụ ka na-ejikwa ụfọdụ n’ime nsụgharị ndị dị otú ahụ na-eme ihe iji kwado echiche ahụ bụ na Jisọs na Chineke hà nhata. Ma rịba ama ụzọ nsụgharị ndị otú si dee amaokwu nke a:
1869: “onye, ebe ọ dị n’ụdị nke Chineke, eleghị ya anya dị ka ihe a ga-achụso ime ka ya na Chineke hara.” The New Testament, nke onye dere ya bụ G. R. Noyes.
1965: “Ya onwe ya—onye nọ n’ụdị nke Chineke n’ezie!—adịghị mgbe o ji mpako mee ka ya na Chineke hara.” Das Neue Testament, mbipụta a hazigharịrị, site n’aka Friedrich Pfäfflin.
1968: “onye, ọ bụrịị eziokwu na ọ nọ n’ụdị nke Chineke, o leghị ịha ka Chineke anya dị ka ihe a ga-eji anyaukwu mee ka ọ bụrụ nke ya.” La Bibbia Concordata.
1976: “O nwere ụdị nke Chineke mgbe nile, ma o cheghị na ọ ga-eji aka ike nwaa ime ka ya na Chineke hara.” Today’s English Version.
1984: “onye, ọ bụrịị eziokwu na ọ dịrị n’ụdị nke Chineke, echeghị echiche banyere ịnara ihe n’ike, ya bụ, ka ya na Chineke hara nhata.” New World Translation of the Holy Scriptures.
1985: “Onye, n’ịdị n’ụdị nke Chineke, eleghị ịha ka Chineke anya dị ka ihe a ga-achụsosi ike.” The New Jerusalem Bible.
Otú ọ dị, ụfọdụ na-asị na ọbụna nsụgharị ndị a ka zie ezi na-egosi na (1) Jisọs enwetaworị iha nhata ma ọ chọghị iji ya mee ihe, ma ọ bụ na (2) ọ dịghị ya mkpa ịchụso ịha nhata n’ihi na ọ dịworị mbụ nwee ya.
N’akụkụ nke a, Ralph Martin, n’akwụkwọ bụ The Epistle of Paul to the Philippians, na-ekwu banyere asụsụ Grik mbụ ahụ, sị: “Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi abụọ dị na ya ma ihe ngwaa ahụ pụtara n’ezie ọ̀ pụrụ ịgbanwe site ‘n’ịpụnara,’ ‘ịnara n’ike,’ gaa ‘n’ijigidesi ike.’” Akwụkwọ bụ The Expositor’s Greek Testament na-ekwukwa, sị: “Anyị apụghị ịchọta akụkụ okwu ọ bụla ebe ἁρπάζω [har·paʹzo] ma ọ bụ okwu ọ bụla e nwetara na ya nwere echiche nke ‘inwe ihe,’ ‘ijigide ihe’. N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị na ya, o yiri ka ọ pụtara ‘ịpụnara,’ ‘ịnara n’ike’. Ya mere e nyeghị ohere isi n’ihe ahụ bụ ezi echiche ya nke bụ ‘ịchụso’ pụọ gaa n’ihe dị nnọọ iche kpam kpam, nke bụ ‘ijigidesi ike.’”
Site n’ihe e kwuworo, o doro anya na ndị sụgharịrị nsụgharị ndị ahụ dị ka Douay na King James na-agbagọ ụkpụrụ ndị ahụ iji kwado nzube Atọ n’Ime Otu. N’ịdị nnọọ iche pụọ n’ịsị na Jisọs chere na ọ bụ ihe ziri ezi ịha ka Chineke, asụsụ Grik nke e ji mee ihe na Ndị Filipaị 3:6, mgbe e ji ezi obi gụọ ya, na-egosi nnọọ ihe dị iche kpam kpam, na Jisọs echeghị na ọ bụ ihe ziri ezi.
Ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị dị gburugburu (3-5, 7, 8, Dy) na-eme ka ụzọ e kwesịrị isi ghọta amaokwu 6 doo anya. A gbara ndị Filipaị ume, sị: “N’ịdị umeala n’obi, ka onye ọ bụla lee ndị ọzọ anya dị ka ndị ka ha onwe ha mma.” Mgbe ahụ Pọl jiri Kraịst mee ihe dị ka ihe nlereanya pụtara ìhè nke omume dị otú a, sị: “Ka unu nwee uche nke a, bụ́ nke Kraịst Jisọs nwekwara.” “Uche” dị aṅaa? Ọ̀ bụ ‘iche na ọ bụghị ịpụnara ihe, bụ́ ịha ka Chineke’? Ee e, nke ahụ ga-abụ nnọọ ihe megidere isi ihe a na-achọ ime ka ọ pụta ìhè! Kama nke ahụ, Jisọs, bụ́ ‘onye lere Chineke anya dị ka onye ka ya onwe ya mma,’ adịghị mgbe ọ ‘ga-achụso ime ka ya na Chineke hara,’ kama nke ahụ, o “weturu onwe ya ala, na-erube isi ruo ọnwụ.”
N’ezie, nke ahụ apụghị ịdị na-ekwu banyere akụkụ ọ bụla nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ọ na-ekwu banyere Jisọs Kraịst, bụ́ onye kwesịrị ihe atụ nke Pọl na-achọ ime n’ebe ahụ kpọmkwem—ya bụ ịdị mkpa nke ịdị umeala n’obi na irube isi nye Onye Ka mmadụ Elu na Onye Okike ya, bụ́ Jehova Chineke.
“Abụ M”
NA JỌN 8:58 nsụgharị ụfọdụ, dị ka ihe atụ, The Jerusalem Bible, na-ekwu na Jisọs sịrị: “Tupu Abraham adị, Abụ M.” N’ebe ahụ, Jisọs ọ̀ na-akụzi dị ka ndị na-akwado Atọ n’Ime Otu na-ekwu, na e ji utu aha ahụ bụ “Abụ M” mara ya? Dịkwa ka ha na-ekwu, ọ̀ pụtara na ọ bụ Jehova nke akụkụ Akwụkwọ nsọ Hibru, ebe ọ bụ na King James Version na-ekwu n’Ọpụpụ 3:14, sị: “Chineke gwara Moses, sị, ABỤ M IHE M BỤ”?
N’Ọpụpụ 3:14 (KJ) ahịrị okwu ahụ bụ “ABỤ M” bụ nke e ji mee ihe dị ka utu aha maka Chineke iji gosi na ọ dị adị n’ezie, na ọ ga-emekwa ihe o kwere ná nkwa. Akwụkwọ bụ The Pentateuch and Haftorahs, nke Dr. J. H. Hertz haziri mbipụta ya na-ekwu banyere ahịrị okwu ahụ, sị: “Nye ndị Israel nọ n’ohu, ihe ọ pụtara ga-abụ, ‘Ọ bụ ezie na O gosipụtabeghị ike Ya n’ebe unu nọ, Ọ ga-eme otú ahụ; Ọ na-adịru ebighị ebi, Ọ ghaghịkwa ịnapụta unu.’ Ihe ka ukwuu ná ndị ọgbara ọhụrụ na-agbaso Rashi [bụ́ onye France na-akọwa Bible na Talmud] n’ide [Ọpụpụ 3:14] ‘Aga m abụ ihe m ga-abụ.’”
Okwu ahụ dị na Jọn 8:58 dị nnọọ iche pụọ na nke e ji mee ihe n’Ọpụpụ 3:14. Jisọs ejighị ya mee ihe dị ka aha ma ọ bụ utu aha, kama dị ka ụzọ nke ịkọwa ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ. Otú a, rịba ama ụzọ nsụgharị ụfọdụ nke Bible si dee Jọn 8:58:
1869: “Site n’oge Abraham na-akadịghị, adịwo m.” The New Testament, nke G. R. Noyes dere.
1935: “Adịwo m tupu a mụọ Abraham!” The Bible—An American Translation, nke J. M. P. Smith na E. J. Goodspeed dere.
1965: “Tupu a mụọ Abraham, abụrụwo m onye m bụ.” Das Neue Testament, nke Jörg Zink dere.
1981: “Adị m ndụ tupu a mụọ Abraham!” The Simple English Bible.
1984: “Tupu Abraham amalite ịdị adị, adịwo m.” New World Translation of the Holy Scriptures.
Otú a, echiche ziri ezi nke okwu Grik ahụ e ji mee ihe n’ebe a bụ na “onye e buru ụzọ mụọ” n’ihe Chineke kere eke, bụ́ Jisọs adịwo ogologo oge tupu a mụọ Abraham.—Ndị Kọlọsi 1:15; Ilu 8:22, 23, 30; Mkpughe 3:14.
Ọzọkwa, ihe ndị e kwuru na gburugburu ebe ahụ na-egosi nke a ịbụ nghọta ziri ezi. N’oge a ndị Juu ahụ chọrọ ịtụ Jisọs nkume n’ihi ikwu na ‘ya ahụwo Abraham,’ ọ bụrịị eziokwu na dị ka ha kwuru, ọ gbabeghị 50 afọ. (Amaokwu 57) Nzaghachi kwesịrị ekwesị Jisọs ga-enye bụ ịgwa ha eziokwu banyere afọ ndụ ya. Ya mere, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ gwara ha na ya ‘dị ndụ tupu a mụọ Abraham!’—The Simple English Bible.
“Okwu ahụ Bụkwa Chineke”
NA JỌN 1:1, King James Version na-agụ, sị: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị, Okwu ahụ na Chineke dịkwara, Okwu ahụ bụkwa Chineke.” Ndị na-akwado Atọ n’Ime Otu na-asị na nke a pụtara na “Okwu ahụ” (Grik, ho loʹgos) nke bịara n’ụwa dị ka Jisọs Kraịst bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’onwe ya.
Otú ọ dị, rịba ama na ọzọkwa n’ebe a, ihe ndị e kwuru na gburugburu ebe ahụ na-enye ntọala maka ezi nghọta. Ọbụna King James Version na-asị, “Okwu ahụ na Chineke dịkwara.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị di iche.) Onye ya “na” onye ọzọ nọ na onye nke ọzọ ahụ apụghị ịbụ otu onye. N’ikwekọ na nke a, akwụkwọ bụ Journal of Biblical Literature, nke onye Jesuit bụ Joseph A. Fitzmyer haziri na-asị na ọ bụrụ na a sụgharịa akụkụ ikpeazụ nke Jọn 1:1 ịpụta Chineke “ahụ,” mgbe ahụ nke a “ga-emegide ahịrị okwu nke bu ụzọ,” bụ́ nke sịrị na Okwu ahụ na Chineke dịkwara.
Rịbakwa ama otú nsụgharị ndị ọzọ si dee akụkụ nke a nke amaokwu ahụ:
1808: “okwu ahụ bụkwa chi.” The New Testament in an Improved Version, Upon the Basis of Archbishop Newcome’s New Translation: With a Corrected Text.
1864: “chi ka okwu ahụ bụkwa.” The Emphatic Diaglott, ihe ọgụgụ nke e dere n’okpuru ahịrị, site n’aka Benjamin Wilson.
1928: “Okwu ahụ bụkwa onye dị ka chi.” La Bible du Centenaire, L’Evangile selon Jean, nke Maurice Goguel dere.
1935: “Okwu ahụ dịkwa ka chi.” The Bible—An American Translation, nke J. M. P. Smith na E. J. Goodspeed dere.
1946: “n’ụdị nke chi ka Okwu ahụ dị.” Das Neue Testament, nke Ludwig Thimme dere.
1950: “Okwu ahụ bụkwa chi.” New World Translation of the Christian Greek Scriptures.
1958: “Okwu ahụ bụkwa Chi.” The New Testament, nke James L. Tomanek dere.
1975: “Chi (ma ọ bụ onye dị ka chi) ka Okwu ahụ bụ.” Das Evangelium nach Johannes, nke Siegfried Schulz dere.
1978: “n’ụdị nke chi ka Logos ahụ dịkwa.” Das Evangelium nach Johannes, nke Johannes Schneider dere.
Na Jọn 1:1 mkpọaha Grik ahụ bụ the·osʹ (chi) pụtara ugbo abụọ. Mpụta nke mbụ ya zoro aka n’ebe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nọ, bụ́ onye Okwu ahụ nọnyeere (“Okwu ahụ [loʹgos] na Chineke [bụ́ otu ụdị nke the·osʹ] dịkwara”). E bu ụzọ dee okwu ahụ bụ ton (ahụ), bụ́ otu ụdị nke okwu Grik nke na-ezo aka kpọmkwem n’onye dị iche, tupu the·osʹ mbụ nke a, nke bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’ọnọdụ nke a (“Okwu ahụ na Chineke [ahụ] dịkwara”).
N’aka nke ọzọ, ọ dịghị okwu na-ezo aka n’ihe kpọmkwem nke na-esochi the·osʹ nke abụọ ahụ na Jọn 1:1. Ya mere a sụgharịa ya n’ụzọ nkịtị, ọ ga-agụ, sị “chi ka Okwu ahụ bụkwa.” Ma anyị ahụwo na ọtụtụ nsụgharị kọwara the·osʹ nke abụọ ahụ (bụ́ mkpọaha nkọwa) dị ka “onye nwere ụdị nke chi,” “onye dị ka chi,” ma ọ bụ “chi.” Gịnị nyere ha ikike ime otú ahụ?
Asụsụ Koine nke Grik nwere okwu na-ezo aka n’ihe kpọmkwem (“ahụ”), ma o nweghị okwu nke na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem. Ya mere mgbe okwu na-ezo aka n’ihe kpọmkwem na-esochighị mkpọaha nkọwa ahụ, ọ pụrụ ịbụ nke na-adịghị ezo aka kpọmkwem n’ihe, na-adabere ná nghọta dị ya gburugburu.
Akwụkwọ bụ Journal of Biblical Literature na-asị na okwu ndị “nwere nkọwa na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem nke sochiri ngwaa ahụ, na-apụtakarị ụdịdị ihe n’ụzọ bụ isi.” Dị ka Journal ahụ mere ka a mara, nke a na-egosi na a pụrụ iji loʹgos ahụ tụnyere chi. Ọ na-ekwukwa banyere Jọn 1:1, sị: “Ihe na-egosi ụdịdị ihe bụ́ nke nkọwa ahụ nwere, pụtara ìhè nke ọma nke na a pụghị ile mkpọaha ahụ [the·osʹ] anya dị ka nke na-ezo aka n’ihe kpọmkwem.”
Ya mere, Jọn 1:1 na-egosi ụdịdị nke Okwu ahụ, na ọ bụ “onye nwere ụdị nke chi,” “onye dị ka chi,” “chi,” ma ọ bụghị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Nke a na-ekwekọ n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible, bụ́ ndị na-egosi na Jisọs, bụ́ onye a kpọrọ “Okwu ahụ” n’ebe a n’ọkwá ọrụ ya dị ka Ọnụ Na-ekwuru Chineke, bụ onye nọ n’okpuru nke na-erube isi, nke Onye Ka ya Elu, bụ́ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, zitere n’ụwa.
E nwere ọtụtụ amaokwu ndị ọzọ nke Bible n’ebe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile sụgharịrị Bible gaa n’asụsụ ndị ọzọ tinyechara okwu ahụ na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem mgbe ha na-asụgharị ahịrị okwu dị iche iche nke Grik ndị e dere n’otu ụzọ ahụ. Dị ka ihe atụ, na Mak 6:49, mgbe ndị na-eso ụzọ ahụ hụrụ ka Jisọs na-aga ije n’elu mmiri, King James Version na-asị: “Ha chere na ọ bụ mmụọ.” N’asụsụ Koine nke Grik, e nweghị okwu ahụ na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem tupu “mmụọ.” Ma ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile mere nsụgharị gaa n’asụsụ ndị ọzọ tinyere okwu ahụ na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem iji mee ka ọ daba nke ọma ná nghọta nke ihe ndị e kwuru na gburugburu ya. N’otu ụzọ ahụ, ebe Jọn 1:1 na-egosi na Okwu ahụ na Chineke dịkwara, ọ pụghị ịbụ Chineke, kama ọ bụ “chi” ma ọ bụ “onye nwere ụdị nke chi.”
Joseph Henry Thayer, bụ́ onye ọkà mmụta okpukpe nke rụrụ ọrụ n’ibipụta American Standard Version, kwuru n’ụzọ dị mfe, sị: “Logos ahụ dị n’ụdị nke chi, ọ bụghị Chineke ahụ n’onwe ya.” Onye Jesuit bụ John L. McKenzie dere n’akwụkwọ ya bụ Dictionary of the Bible, sị: “Jọn 1:1 kwesịrị ka a sụgharịa ya kpọmkwem ịbụ . . . ‘okwu ahụ bụ onye nwere ụdị chi.’”
Ọ̀ Bụ Imebi Ụkpụrụ?
OTÚ ọ dị, ụfọdụ ndị na-asị na ide ya n’ụzọ dị otú ahụ na-emebi ụkpụrụ nke na-achị ụtọ asụsụ Koine nke Grik, bụ́ nke onye mmụta Grik bụ E. C. Colwell bipụtara laa azụ na 1933. O kwuru na n’asụsụ Grik, mkpọaha nkọwa “na-enwe okwu [na-ezo aka n’ihe kpọmkwem] mgbe ọ na-esochi ngwaa; ọ dịghị enwe okwu ahụ [na-ezo aka n’ihe kpọmkwem] mgbe ọ na-ebute ngwaa ụzọ.” Site n’ụkpụrụ nke a, ọ na-asị na mkpọaha nkọwa nke na-ebute ngwaa ụzọ kwesịrị ka a ghọta ya dị ka à ga-asị na o nwere okwu na-ezo aka n’ihe kpọmkwem (“ahụ”) n’ihu ya. Na Jọn 1:1, mkpọaha nke abụọ ahụ (the·osʹ), bụ́ okwu nkọwa, na-ebute ngwaa ahụ ụzọ—“[the·osʹ] ka Okwu ahụ bụkwa.” Ya mere, Colwell sịrị na e kwesịrị ịgụ Jọn 1:1 n’ụzọ dị otú a, “Chineke [ahụ] ka Okwu ahụ bụkwa.”
Ma tụlee nanị ihe atụ abụọ ndị e nwere na Jọn 8:44. N’ebe ahụ, Jisọs na-ekwu banyere Ekwensu, sị: “Onye ahụ bụ ogbu mmadụ” na “ọ bụ onye ụgha.” Dịkwa ka ọ dị na Jọn 1:1, mkpọaha nkọwa ndị ahụ (“ogbu mmadụ” na “onye ụgha”) na-ebute ngwaa (“bụ”) ndị ahụ ụzọ n’asụsụ Grik. E nweghị okwu nke na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem n’ihu nke ọ bụla n’ime mkpọaha ndị ahụ n’ihi na e nweghị okwu nke na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem n’asụsụ Koine nke Grik. Ma ọtụtụ nsụgharị tinyere okwu nke na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem n’ihi na ụtọ asụsụ Grik na ihe ndị e kwuru na gburugburu ebe ahụ mere ka ọ dị mkpa.—Leekwa Mak 11:32; Jọn 4:19; 6:70; 9:17; 10:1; 12:6.
Colwell ghọtara nke a banyere mkpọaha nkọwa ahụ, n’ihi na o kwuru, sị: “Ọ bụ okwu na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem n’ọnọdụ nke a nanị mgbe ihe ndị e kwuru na gburugburu ya mere ka ọ dị mkpa.” Ya mere o kwetara ọbụna na mgbe ihe ndị e kwuru na gburugburu ya mere ka ọ dị mkpa, ndị nsụgharị pụrụ itinye okwu na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem n’ihu mkpọaha ahụ n’ụdị ahịrị okwu nke e si otú a hazie.
Ihe ndị e kwuru na gburugburu ebe ahụ ò mere ka ọ dị mkpa itinye okwu na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem na Jọn 1:1? Ee, n’ihi na àmà Bible gbara n’ozuzu ya bụ na Jisọs abụghị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Otú a, ọ bụghị ụkpụrụ ụtọ asụsụ a na-ejighị n’aka nke Colwell guzobere kwesịrị iduzi onye na-eme nsụgharị n’ọnọdụ ndị dị otú a, kama ọ bụ ihe ndị e kwuru na gburugburu ebe ahụ. Ọ pụtakwara ìhè site n’ọtụtụ nsụgharị ndị tinyere okwu ahụ na-adịghị ezo aka n’ihe kpọmkwem na Jọn 1:1 nakwa n’ebe ndị ọzọ na ọtụtụ ndị mmụta ekwenyeghị n’ụkpụrụ dị otú a nke mmadụ mebere, otú ahụkwa ka Okwu Chineke na-ekwenyeghị.
Ọ Dịghị Emegide
IKWU na Jisọs Kraịst bụ “chi” ọ̀ na-emegide ozizi nke Bible na e nwere nanị otu Chineke? Ee e, n’ihi na mgbe ụfọdụ Bible na-eji okwu ahụ na-eme ihe iji zoo aka n’ebe ihe e kere eke nke dị ike nọ. Abụ Ọma 8:5 (NW) na-agụ, sị: “I wee mee ya [mmadụ] ka o jiri nke nta dị ala n’okpuru ndị dị ka chi [Hibru, ʼelo·himʹ],” ya bụ, ndị mmụọ ozi. N’ịgọrọ onwe ya pụọ n’ebubo ndị Juu, nke bụ na ọ na-ekwu na ya bụ Chineke, Jisọs mere ka a mara na “Iwu ahụ jiri okwu ahụ bụ chi mee ihe banyere ndị ahụ a gwara okwu Chineke,” ya bụ, ndị ọkàikpe bụ mmadụ. (Jọn 10:34, 35, JB; Abụ Ọma 82:1-6) A kpọrọ ọbụna Setan “chi nke oge a” ná 2 Ndị Kọrint 4:4.
Jisọs nwere ọnọdụ dị elu nke ukwuu karị nke ndị mmụọ ozi, ndị mmadụ na-ezughị okè, ma ọ bụ Setan. Ebe ọ bụ na a kpọrọ ndị a “chi,” ndị dị ike, n’ezie Jisọs pụrụ ịbụ “chi,” ọ bụkwa. N’ihi ọnọdụ ya pụrụ iche n’ebe Jehova nọ, Jisọs bụ “Chineke nke Bụ Dike.”—Jọn 1:1; Aịsaịa 9:6.
Ma ọ̀ bụ na “Chineke nke Bụ Dike” nke e ji mkpụrụ akwụkwọ ukwu malite adịghị egosi na Jisọs na Jehova Chineke hà nhata n’ụzọ ụfọdụ? Ọ dịghị ma ọlị. Aịsaịa buru amụma banyere nke a ịbụ nanị otu n’ime aha anọ ndị a ga-akpọ Jisọs, n’asụsụ Igbo, a ga-ejikwa mkpụrụ akwụkwọ ukwu malite aha ndị ahụ. Ọzọkwa, ọ bụrịị eziokwu na a kpọrọ Jisọs “Dike,” e nwere nanị otu onye nke bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” Ịkpọ Jehova Chineke “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” agaghị aba uru ma ọ bụrụ na e nweghị ndị ọzọ dị adị bụ́ ndị a kpọkwara chi, kama bụrụ ndị nọ n’ọnọdụ dị ala.
Akwụkwọ bụ Bulletin of the John Rylands Library n’England na-ekwu na dị ka onye ọkà mmụta Katọlik bụ Karl Rahner si kwuo, ọ bụ eziokwu na e ji the·osʹ mee ihe n’akụkụ akwụkwọ nsọ ụfọdụ dị ka na Jọn 1:1 n’izo aka n’ebe Kraịst nọ, “ọ dịghị ebe ọ bụla n’ọnọdụ ndị nke e ji ‘theos’ mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ iji gosipụta Jisọs ịbụ onye ahụ nke e kwuru banyere ya n’ebe ndị ọzọ n’Agba Ọhụrụ dị ka ‘ho Theos,’ ya bụ, Chineke Onye Kachasị Ihe Nile.” Akwụkwọ Bulletin ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na ndị dere Agba Ọhụrụ weere ya dị ka ihe dị mkpa na ndị kwere ekwe kwesịrị ikwupụta Jisọs dị ka ‘Chineke,’ à pụrụ inye nkọwa banyere ọdịdị ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ụdị nkwupụta dị otú a adịghị ma ọlị n’ime Agba Ọhụrụ?”
Ma olee banyere ihe Tọmas onyeozi kwuru na-asị, “Onyenwe m na Chineke m” gwa Jisọs na Jọn 20:28? Nye Tọmas, Jisọs bụ onye dị ka “chi,” karịsịa n’ọnọdụ ọrụ ebube ndị kpaliri ya ikwu okwu dị otú ahụ. Ndị mmụta ụfọdụ na-asị na ọ pụrụ ịbụworị na Tọmas kwuru okwu jupụtara ná mmetụta n’ihi ihe ijuanya, gwa Jisọs, kama bụrụ na o bu Chineke n’uche kpọmkwem. Na nke ọ bụla n’ọnọdụ ndị ahụ, Tọmas echeghị na Jisọs bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’ihi na ya na ndị ozi ndị ọzọ nile maara na ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs sịrị na ya bụ Chineke, kama ọ kụziri na ọ bụ nanị Jehova bụ “ezi Chineke.”—Jọn 17:3.
Ọzọ, ihe ndị e kwuru na gburugburu ebe ahụ na-enyere anyị aka ịghọta nke a. Ụbọchị ole na ole tupu mgbe ahụ, Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie agwawo Meri Magdalini ka ọ gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m arịgo lakwuru Nna m na Nna unu, na Chineke m na Chineke unu.” (Jọn 20:17) Ọ bụrịị eziokwu na a kpọlitewo Jisọs n’ọnwụ dị ka mmụọ dị ike, Jehova ka bụkwa Chineke ya. Jisọs ka nọgidekwara na-ekwu banyere Ya n’ụzọ dị otú ahụ ọbụna n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, mgbe e nyesịrị ya ebube.—Mkpughe 1:5, 6; 3:2, 12.
Nanị amaokwu atọ mgbe Tọmas kwusịrị okwu ahụ, na Jọn 20:31, Bible gara n’ihu ime ka okwu ahụ doo anya na-asị: “E dewo ihe ndị a n’akwụkwọ, ka unu wee kwere na Jisọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke,” ọ bụghị na ọ bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ọ pụtakwara “Ọkpara” n’ụzọ nkịtị, dị ka ọ dị n’ọnọdụ nke onye bụ nna na diọkpara ya, ọ bụghị dị ka akụkụ nke Chineke Atọ n’Ime Otu dị omimi.
Ọ Ghaghị Ikwekọ Na Bible
ANA-EKWU na ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke akwụkwọ nsọ na-akwadọ Atọ n’Ime Otu. Ma ndị a yikwara ndị ahụ e kwuworo okwu ha n’elu n’ihi na, mgbe e lebara anya na ha nke ọma, ha adịghị enye nkwado ọ bụla n’ezie. Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị otú ahụ na-egosi nanị na mgbe a na-atụle ihe ọ bụla a sịrị na ọ na-akwado Atọ n’Ime Otu, mmadụ aghaghị ịjụ onwe ya, sị: Nkọwa ahụ ò kwekọrọ n’ihe a kụziri n’akụkụ nile nke Bible—na ọ bụ nanị Jehova Chineke bụ Onye Kachasị Ihe Nile? Ọ bụrụ na ọ dịghị otú ahụ, mgbe ahụ, ọ ghaghị ịbụ na nkọwa ahụ ezighị ezi.
Anyị kwesịkwara iburu n’uche na e nweghị ọbụna otu n’ime “akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-akwado” atọ n’ime otu nke na-asị na Chineke, Jisọs, na mmụọ nsọ bụ otu n’ime Chineke nke ihe omimi ahụ. Ọ dịghị otu akụkụ akwụkwọ nsọ ọ bụla n’ime Bible nke na-asị na atọ ndị ahụ bụ otu n’ụdịdị, ike, na n’enweghị mmalite na ọgwụgwụ. Bible nwere nkwekọ n’ikpughe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, dị ka nanị Onye Kachasị Ihe Nile Elu, Jisọs dị ka Ọkpara ya o kere eke, na mmụọ nsọ dị ka ike ọrụ Chineke.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]
“Ndị oge ochie ji [Jọn 10:30] mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji gosipụta na Kraịst . . . na Nna ya bụ otu ihe ahụ.”—Commentary on the Gospel According to John, nke John Calvin dere
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]
Onye ya “na” onye ọzọ nọ, apụghị ịbụkwa onye nke ọzọ ahụ
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]
“Logos ahụ dị n’ụdị chi, ọ bụghị Chineke ahụ n’onwe ya.”—Joseph Henry Thayer, Onye mmụta Bible
[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
Jisọs kpegaara Chineke ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya “wee bụrụ otu,” dị nnọọ ka ya na Nna ya “bụ otu”
[Foto dị na peeji nke 26]
Jisọs gosiri ndị Juu na ya na Chineke ahaghị nhata, na-asị na ya ‘apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya ma ọ bụghị ihe ya hụrụ ka Nna ya na-eme’
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Ebe Bible na-akpọ ụmụ mmadụ, ndị mmụọ ozi, ọbụna Setan, “chi,” ma ọ bụ ndị dị ike, a pụrụ n’ụzọ ziri ezi ịkpọ Jisọs ahụ ka ha dị elu nke nọ n’eluigwe “chi”