Isi 36
Oké Okwukwe nke Onye Ọchịagha
MGBE Jisọs ziri Ozizi Elu Ugwu ya, o jeruwo ihe dị ka ọkara nke ozi ihu ọha ya. Nke a pụtara na o nwere nanị otu afọ na ihe dị ka ọnwa itoolu fọdụụrụ ya iji rụzuo ọrụ ya n’ụwa.
Ugbu a, Jisọs na-abanye n’obodo Kapanaum, bụ́ nke a pụrụ ịkpọ ebe bụ isi maka ọrụ ya. N’ebe a, ndị okenye Juu ji arịrịọ bịakwute ya. Onye ọchịagha n’òtù agha ndị Rom nke bụ onye Jentaịl, bụ́ nwoke nke si n’agbụrụ ọzọ na-abụghị nke ndị Juu ezitewo ha.
Onye na-ejere ọchịagha ahụ ozi, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya, na-achọ ịnwụ n’ihi ọrịa siri ike, ọ chọkwara ka Jisọs gwọọ onye na-ejere ya ozi. Ndị Juu ahụ rịọsiri arịrịọ ike maka onye ọchịagha ahụ: “Ọ bụ onye kwesịrị ka i meere ya ihe a,” ka ha kwuru, “n’ihi na ọ na-ahụ mba anyị n’anya, ya onwe ya wukwara ụlọ nzukọ anyị nye anyị.”
N’egbughị oge, Jisọs sooro ndị ikom ahụ gaba. Otú ọ dị, mgbe ha bịaruru nso, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha kwuo, sị “Onyenwe anyị, esogbula onwe gị: n’ihi na erughị m ka ị baa n’okpuru ụlọ m: n’ihi nke a agụghị m onwe m onye kwesịrị ịbịakwute gị.”
Lee ngosipụta ịdị umeala n’obi nke a bụ n’akụkụ nke onye ọchịagha, bụ́ onye ọ ghọworo ihe maara ya ahụ ịtụrụ ndị ọzọ ọrụ! Ma eleghị anya ọ na-echekwa echiche banyere Jisọs, ebe ọ matara na omenala na-egbochi onye Juu isoro ndị na-abụghị ndị Juu nwee mmekọrịta. Ọbụna Pita kwuru, sị: “Unu onwe unu maara otú ọ bụ ihe na-ezighị ezi n’iwu ka nwoke nke bụ onye Juu were onwe ya rapara n’ahụ onye mba ọzọ ma ọ bụ ijekwuru ya.”
Ma eleghị anya n’ihi na ọ chọghị ka Jisọs taa ahụhụ nke ihe ndị ga-esi n’imebi omenala ahụ pụta, onye ọchịagha ahụ mere ka ndị enyi ya rịọchitere ya arịrịọ, sị: “Were okwu ọnụ kwuo, a ga-emekwa ka ahụ onye na-ejere m ozi dị ike. N’ihi na mụ onwe m bụkwa onye e doro n’okpuru ike, na-enwe ndị agha n’okpurụ mụ onwe m: m wee sị onye a, Gaa, ọ gaa; sịkwa onye ọzọ, Bịa, ọ bịa; sịkwa ohu m, Mee nke a, o mee ya.”
Otú ọ dị, mgbe Jisọs nụrụ nke a, ibubo nwụrụ ya. O kwuru sị, “Asị m unu, ọ dịghị mgbe m hụrụ oké okwukwe dị otú a, ọbụna n’Israel.” Mgbe ọ gwọsịrị onye na-ejere onye ọchịagha ahụ ozi, Jisọs ji ohere ahụ kọọ otú ndị na-abụghị ndị Juu, bụ́ ndị nwere okwukwe ga-esi nweta ihu ọma nke ịnara ngọzi ndị Juu na-enweghị okwukwe jụrụ.
Jisọs sịrị, “Ọtụtụ mmadụ ga-esi n’ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bịa, sookwa Abraham, na Aịzak, na Jekọb, na-anọdụ n’alaeze eluigwe: ma a ga-achụpụ ụmụ alaeze ahụ n’ọchịchịrị nke èzí: n’ebe ahụ ka ịkwa akwá na ịta ikikere eze ahụ ga-adị.”
‘Ụmụ nke alaeze ahụ, bụ́ ndị a ga-achụpụ baa n’ọchịchịrị nke èzí’ bụ ndị Juu site n’ọmụmụ, ndị na-anabataghị ohere nke e bu ụzọ nye ha isoro Kraịst chịa achị. Abraham, Aịzak, na Jekọb na-anọchite anya ndokwa nke Alaeze Chineke. Otú a, Jisọs na-akọ otú ndị Jentaịl ga-esi nabata ịnọdụ na table eluigwe ahụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, “n’alaeze eluigwe.” Luk 7:1-10; Matiu 8:5-13; Ọrụ 10:28.
▪ N’ihi gịnị ka ndị Juu ji bịa rịọchitere onye ọchịagha bụ onye Jentaịl arịrịọ?
▪ Gịnị pụrụ ịbụ ihe kpatara onye ọchịagha ahụ na-ejighị kpọọ Jisọs ka ọ bata n’ụlọ ya?
▪ Gịnị ka Jisọs bu n’uche site n’okwu mmechi ya ndị ahụ?