Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 36 p. 92-p. 93 para. 7
  • Otu Onyeisi Ndị Agha Rom Egosi na Ya Nwere Okwukwe Dị Ukwuu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otu Onyeisi Ndị Agha Rom Egosi na Ya Nwere Okwukwe Dị Ukwuu
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Oké Okwukwe nke Onye Ọchịagha
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ọchịagha Ndị Rom ahụ Nwere Obi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Okwukwe Gị Ọ̀ Na-akwali Gị Ime Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 36 p. 92-p. 93 para. 7
Mgbe onyeisi agha na-ele ohu ya nọ n’ezigbo ọrịa anya; ebe ndị okenye ndị Juu bịakwutere Jizọs

ISI NKE 36

Otu Onyeisi Ndị Agha Rom Egosi na Ya Nwere Okwukwe Dị Ukwuu

MATIU 8:5-13 LUK 7:1-10

  • A GWỌỌ ONYE NA-EJERE OTU ONYEISI NDỊ AGHA OZI

  • A GA-AGỌZI NDỊ NWERE OKWUKWE

Mgbe ndị okenye ndị Juu bịakwutere Jizọs

Mgbe Jizọs zichara Ozizi Elu Ugwu ya, ọ gawara obodo Kapaniọm. Mgbe o ruru ebe ahụ, ụfọdụ ndị okenye ndị Juu gakwuuru ya. Onye zitere ha abụghị onye Juu. Ọ bụ onyeisi ndị agha Rom.

Onyeisi ndị agha ahụ nwere onye na-ejere ya ozi nke ọ hụrụ n’anya. Ezigbo ahụ́ na-arịa onye a na-ejere ya ozi nke na ọ nọzi n’ọnụ ọnwụ. Ọ bụ eziokwu na onyeisi ndị agha ahụ bụ onye Jentaịl, ma ọ chọrọ ka Jizọs nyere ya aka. Ndị Juu ahụ gwara Jizọs na onye na-ejere nwoke ahụ ozi ‘dina n’ụlọ n’ihi na ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ na-enwekwa mmekpa ahụ́ dị ukwuu.’ Ọ ga-abụ na ahụ́ na-egbu ya ezigbo mgbu. (Matiu 8:6) Ndị okenye ndị Juu ahụ gwara Jizọs na onyeisi ndị agha ahụ ruru eru ka e meere ya ihe a. Ha gwara ya ihe mere ha ji sị na o ruru eru ka e mere ya ihe a. Ha sịrị ya: “Ọ hụrụ mba anyị n’anya, ọ bụkwa ya wuuru anyị ụlọ nzukọ.”—Luk 7:4, 5.

Mgbe Jizọs na-abịaru nso na nke onyeisi ndị agha ahụ, ndị enyi onyeisi agha ahụ pụtara izute ya

Jizọs sooro ndị okenye ahụ ozugbo gawa n’ụlọ onyeisi ndị agha ahụ. Ka ha ruwere nso, onyeisi ndị agha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha gwa Jizọs, sị: “Nna anyị ukwu, enyela onwe gị nsogbu, n’ihi na ekwesịghị m ka ị bata n’ụlọ m.” (Luk 7:6, 7) Ị̀ hụkwara otú nwoke a na-atụrụ ndị ọzọ ihe ha ga-eme si dị umeala n’obi? Ihe a gosiri na onyeisi ndị agha a dị iche ná ndị Rom ndị ọzọ na-eji obi ọjọọ emeso ndị ohu ha ihe.—Matiu 8:9.

O doro anya na onyeisi ndị agha ahụ ma na ndị Juu anaghị achọ ka ha na ndị na-abụghị ndị Juu na-emekọ ihe. (Ọrụ Ndịozi 10:28) Ọ ga-abụ ihe a mere o ji gwa ndị enyi ya ka ha gaa gwa Jizọs, sị: “Kwuo okwu, ka a gwọọ onye na-ejere m ozi.”—Luk 7:7.

Ihe a onyeisi ndị agha ahụ kwuru juru Jizọs anya, nke mere o ji kwuo, sị: “Ana m asị unu, Ahụbeghị m okwukwe dị ukwuu otú a ọbụna n’Izrel.” (Luk 7:9) Mgbe ndị enyi onyeisi ndị agha ahụ lọghachiri, ha chọpụtara na ahụ́ adịla onye ahụ na-ejere ya ozi mma.

Ngwa ngwa Jizọs gwọchara onye ahụ na-ejere onyeisi ndị agha ahụ ozi, o ji ohere ahụ mee ka a mata na a ga-agọzi ndị na-abụghị ndị Juu nwere okwukwe na ya. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ọdịda anyanwụ ga-abịa soro Ebreham na Aịzik na Jekọb nọdụ na-eri ihe na tebụl n’alaeze eluigwe.” Gịnịkwanụ banyere ndị Juu na-enweghị okwukwe? Jizọs sịrị na ‘a ga-atụpụ ha n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ha ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.’—Matiu 8:11, 12.

Ihe ọ pụtara bụ na a ga-ajụ ndị Juu anụ ahụ́ na-anabataghị ohere e bu ụzọ nye ha iso Kraịst chịa n’Alaeze ya. Ma, a ga-anabata ndị Jentaịl ka ha soro ya rie ma ṅụọ “n’alaeze eluigwe.”

  • Gịnị mere ndị Juu ji rịọchitere onyeisi ndị agha bụ́ onye Jentaịl arịrịọ?

  • Olee ihe ọ ga-abụ ya mere na onyeisi ndị agha ahụ achọghị ka Jizọs bata n’ụlọ ya?

  • Olee olileanya Jizọs kwuru na ndị Jentaịl nwere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya