Eziokwu Banyere Mkpụrụ Obi Nwere Ihe O Mere
“Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—JỌN 8:32.
1. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa inyocha nkwenkwe anyị banyere mkpụrụ obi na ọnwụ?
NKWENKWE banyere ọnwụ na Ndụ Mgbe A Nwụsịrị na-abụ n’ụzọ dị ukwuu n’ihi okpukpe na nzụlite ọdịbendị mmadụ nwere. Dị ka anyị hụworo, ha na-esite n’ikwere na mkpụrụ obi na-enweta mgbaru ọsọ ikpeazụ ya nanị mgbe a mụghachisịrị ya ọtụtụ ugbo gaa n’echiche nke na otu ogologo ndụ na-ekpebi ọdịnihu ikpeazụ a kara aka nke mmadụ. N’ihi ya, otu onye pụrụ inwe obi ike na ya ga-emesịa jiri nwayọọ rute ịdị adị kasịnụ mgbe ya nwụrụ, onye ọzọ nke inweta Nirvana, onye ọzọkwa inweta ụgwọ ọrụ nke eluigwe. Gịnịzi bụ eziokwu? Ebe ọ bụ na nkwenkwe anyị na-emetụta àgwà, omume, na mkpebi anyị, ó kwesịghị ka anyị nwee nchegbu banyere ịchọta azịza maka ajụjụ ahụ?
2, 3. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike n’ihe Bible na-ekwu banyere mkpụrụ obi? (b) Dị ka e kwuru na Bible, gịnị bụ eziokwu banyere mkpụrụ obi?
2 Akwụkwọ kasị ochie n’ụwa, bụ́ Bible, na-akọ akụkọ ihe mere eme mmadụ laa azụ ruo n’okike nke mkpụrụ obi mbụ bụ́ mmadụ. Nkà ihe ọmụma na ọdịnala ụmụ mmadụ adịghị ná nkụzi ya. Bible na-ekwu eziokwu banyere mkpụrụ obi n’ụzọ doro anya: Mkpụrụ obi gị bụ gị, ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ ma ọlị, a ga-akpọlitekwa ndị nile nọ ná ncheta Chineke n’ọnwụ n’oge ya. Gịnị ka ịmara nke a pụrụ ịpụtara gị?
3 “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu,” ka Jisọs Kraịst gwara ụmụazụ ya. (Jọn 8:32) Ee, eziokwu na-atọhapụ atọhapụ. Ma gịnị ka eziokwu banyere mkpụrụ obi ga-eme ka anyị pụọ n’ohu ya?
Nnwere Onwe Pụọ n’Egwu na Obi Nkoropụ
4, 5. (a) Egwu dị aṅaa ka eziokwu banyere mkpụrụ obi na-ewepụ? (b) Olee otú olileanya nke mbilite n’ọnwụ si nye onye nọ n’afọ iri na ụma nke na-arịa ọrịa ga-egbu ya obi ike?
4 “Ihe ka n’ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ ọnwụ egwu ma na-agbalị izere iche banyere ya,” ka The World Book Encyclopedia na-ekwu. “Ọ fọrọ nke nta ka a ghara ịdị na-akpọ okwu ahụ bụ́ ‘ọnwụ’ aha n’Ebe Ọdịda Anyanwụ,” ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu. N’ụfọdụ ọdịbendị kwa a na-ejikarị okwu ndị na-aka mma ná ntị dị ka “hapụrụ” na “gawara” eme ihe n’ịkọwa ọnwụ mmadụ. Egwu a a na-atụ ọnwụ bụ n’ezie egwu a na-atụ ihe a na-amaghị ihe ọ bụ, ebe ọ bụ na nye ihe ka n’ọtụtụ ndị mmadụ ọnwụ bụ ihe omimi. Ihe ọmụma nke eziokwu banyere ihe na-eme mgbe anyị nwụrụ na-ewepụ egwu a.
5 Dị ka ihe atụ, tụlee ọnọdụ uche nke Michaelyn dị afọ 15. O nwere ọrịa leukemia wee chee ọnwụ dị mwute ihu. Nne ya, bụ́ Paula, na-echeta: “Michaelyn kwuru na ya adịghị echegbu onwe ya banyere ịnwụ n’ihi na ya maara na ọnwụ bụ nanị maka nwa oge. Anyị kwuru ọtụtụ ihe banyere ụwa ọhụrụ Chineke na ndị nile a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ime ya. Michaelyn nwere okwukwe dị nnọọ ukwuu na Jehova Chineke na ná mbilite n’ọnwụ—n’enweghị obi abụọ ọ bụla.” Olileanya nke mbilite n’ọnwụ mere ka nwa agbọghọ a nwere obi ike nwere onwe ya pụọ n’egwu ọnwụ nke na-erikpu erikpu.
6, 7. Site n’obi nkoropụ dị aṅaa ka eziokwu banyere mkpụrụ obi na-eme ka anyị nwere onwe anyị? Nye ihe atụ.
6 Olee otú eziokwu ahụ si metụta nne na nna Michaelyn? “Ọnwụ nwa anyị nwanyị bụ ihe kasị egbu mgbu metụworo anyị,” ka Jeff, bụ́ nna ya, na-ekwu. “Ma anyị tụkwasịrị obi kpam kpam ná nkwa Jehova banyere mbilite n’ọnwụ, anyị na-elepụkwa anya n’ihu na otu ụbọchị anyị ga-ejide Michaelyn anyị hụrụ n’anya n’aka ọzọ. Lee njikọghachi nke ahụ ga-abụ!”
7 Ee, eziokwu banyere mkpụrụ obi na-eme ka mmadụ nwere onwe ya pụọ n’obi nkoropụ na-enweghị olileanya nke ọnwụ onye a hụrụ n’anya pụrụ iweta. N’ezie, ọ dịghị ihe pụrụ iwepụ ihe mgbu na obi ilu a na-enwe mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ kpam kpam. Otú ọ dị, olileanya mbilite n’ọnwụ na-eme ka iru újú ahụ belata ma na-eme ka ọ ka nnọọ mfe idi ihe mgbu ahụ.
8, 9. Egwu dị aṅaa ka eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na-eme ka anyị pụọ n’ohu ya? Nye ihe atụ.
8 Eziokwu nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na-emekwa ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu. Kemgbe ha mụtara eziokwu a, ọtụtụ ndị e jibu ememe okpukpe na-enweghị isi banyere ndị nwụrụ anwụ kee agbụ adịghị echegbukwa onwe ha banyere ọbụbụ ọnụ, ihe àmà ọdịnihu, ọtụmọkpọ, na ihe mgbaasị dị iche iche, ha adịghịkwa achụ àjà dị oké ọnụ iji mee ka obi dị ndị nna ochie ha mma ma gbochie ha ịlọghachi ịbịa na-achụgharị ndị dị ndụ. N’ezie, ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bula,” omume ndị dị otú ahụ abaghị uru.—Eklisiastis 9:5.
9 Eziokwu banyere mkpụrụ obi, nke dị na Bible, na-atọhapụ atọhapụ ma bụrụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Ma tụleekwa olileanya pụrụ iche Bible na-enye gị.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]
Eziokwu banyere mkpụrụ obi na-eme ka ị pụọ n’ohu nke ịtụ ọnwụ egwu, ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu, obi nkoropụ n’ihi ọnwụ onye a hụrụ n’anya