Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • T-24 p. 2-6
  • Jizọs Kraịst—Ònye Ka Ọ Bụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Kraịst—Ònye Ka Ọ Bụ?
  • Jizọs Kraịst—Ònye Ka Ọ Bụ?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịhụnanya Bụ Ihe O Kwuru Ka E Nwee
  • Jizọs Gosiri na Ya Nwere Ịhụnanya
  • Olee Otú Jisọs Pụrụ Isi Gbanwee Ndụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwere na Jisọs Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ị̀ Ga-anara Ịhụnanya Jisọs?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Gịnị Ka Jizọs Mere Mgbe Ọ Nọ n’Ụwa?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Kraịst—Ònye Ka Ọ Bụ?
T-24 p. 2-6

Jizọs Kraịst—Ònye Ka Ọ Bụ?

“ỌBỤNA ọtụtụ ndị na-abụghị Ndị Kraịst kweere na ọ bụ onye ozizi ukwu nke maara ihe. N’ezie, ọ bụ otu n’ime ndị a kacha mara amara n’ime ndị niile dịtụworo ndụ.” (The World Book Encyclopedia) Ònye ka “Ọ” bụ? Ọ bụ Jizọs Kraịst, onye hiwere Iso Ụzọ Kraịst. Ị̀ ma onye ọ bụ? Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla o si emetụta ndụ gị?

E dere ihe ndị mere n’ozi Jizọs n’akwụkwọ anọ ndị na-akọ ihe mere eme a na-akpọ Matiu, Mak, Luk na Jọn. Akwụkwọ anọ a hà na-ekwu eziokwu? Mgbe ọkọ akụkọ ihe mere eme a ma nke ọma bụ́ Will Durant tụlechara akụkọ ndị ahụ, o dere, sị: “Ikwu na mmadụ ole na ole bụ́ ndị nkịtị, ndị biri n’otu ọgbọ, ga-echepụta ụdị onye dị otú ahụ nke dị ike nke ukwuu ma na-adọrọ mmasị ndị mmadụ, nweekwa ụkpụrụ omume kasị mma na echiche dị ebube banyere ụmụ mmadụ ịdị n’otu, ga-abụ ọrụ ebube siri ike nkweta nke ukwuu karịa ọrụ ebube ọ bụla e dere na Matiu, Mak, Luk na Jọn.”

Otú ọ dị, ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị na-amaghị banyere Iso Ụzọ Kraịst amaghị onye Jizọs Kraịst bụ. Ha nwere ike ikwere na o nwere mgbe ọ dịrị ndụ, ma ha adịghị eche na o nwere ihe gbasara Jizọs na otú ha si ebi ndụ. Ndị ọzọ ekwetaghị na e kwesịrị iche echiche banyere Jizọs, n’ihi ihe ndị na-asị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya mere. Ụfọdụ ndị Japan na-ekwu na ‘ọ bụ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst tụrụ bọmbụ atọm na Nagasaki, nke bụ́ obodo a kacha nwee Ndị Kraịst n’obodo niile dị na Japan.’

Ma, ị̀ pụrụ ịta dọkịta ụta ma ọ bụrụ na onye ọrịa ajụ ịṅụ ọgwụ otú dọkịta gwara ya ka o si na-aṅụ ya? Mbanụ. Ọ dịwo anya ndị na-asị na ha bụ Ndị Kraịst leghaara ntụziaka Jizọs nyere iji dozie nsogbu ndị ha na-enwe kwa ụbọchị anya. Ya mere, kama ịjụ Jizọs n’ihi ihe ndị na-asị na ha bụ Ndị Kraịst na-eme, bụ́ ndị na-adịghị eso ntụziaka o nyere, ọ́ gaghị aka mma ịmụ banyere ya n’onwe gị? Gụọ Baịbụl ma mata onye Jizọs bụ n’ezie nakwa otú ọ pụrụ isi gbanwee ndụ gị.

Ịhụnanya Bụ Ihe O Kwuru Ka E Nwee

Jizọs Kraịst bụ́ onye ozizi ukwu biri na Palestaịn ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. A machaghị ihe ndị mere n’oge ọ bụ nwata. (Matiu, isi 1 na nke 2; Luk, isi 1 na nke 2) Mgbe Jizọs gbara afọ iri atọ, ọ malitere ozi ya iji “gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37; Luk 3:21-23) Mmadụ anọ ndị dere akụkọ banyere ndụ Jizọs lekwasịrị anya n’ozi ọma o zisara n’ihu ọha, n’ime afọ atọ na ọkara nke ikpeazụ ná ndụ o biri n’ụwa.

N’oge Jizọs na-ezisa ozi ọma, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya mata ihe e ji edozi nsogbu dị iche iche ná ndụ ha. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ịhụnanya. N’otu n’ime ozizi a kacha mara amara n’akụkọ ihe mere eme, nke a kpọrọ Ozizi Elu Ugwu, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi hụ mmadụ ibe ha n’anya. Ọ sịrị: “Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) A kpọrọ iwu a Ụkpụrụ Ọma. “Ndị mmadụ” Jizọs kwuru n’amaokwu a gụnyere ọbụna ndị iro mmadụ. N’otu ozizi ahụ, ọ sịrị, “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Matiu 5:44) Ọ̀ bụ na ịhụnanya dị otú ahụ agaghị edozi ọtụtụ n’ime nsogbu anyị na-enwe taa? Onye ndú okpukpe Hindu, bụ́ Mohandas Gandhi, chere otú ahụ. E kwuru na ọ sịrị: “Ọ bụrụ na [anyị] niile emewe ihe Kraịst ziri n’Ozizi Elu Ugwu a, anyị ga-edozi nsogbu niile . . . nke ụwa dum.” A pụrụ idozi nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe ma ọ bụrụ na e mee ihe Jizọs ziri banyere ịhụnanya.

Jizọs Gosiri na Ya Nwere Ịhụnanya

Jizọs mere ihe ọ kụziri. O butere ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ ma gosi na ya nwere ịhụnanya. Otu ụbọchị, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ezi ọtụtụ ndị ihe, ha enweghịkwa ohere iri nri. Jizọs ma na ọ dị mkpa ka ndị na-eso ụzọ ya “gaa zurutụ ike.” Ha wee gawa n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị. Ma ìgwè mmadụ ahụ bu ha ụzọ ruo n’ebe ahụ, na-eche ka ha rute. Olee ihe ị gaara eme ma a sị na ị bụ Jizọs? Jizọs “nwere ọmịiko n’ebe ha nọ. . . . O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:30-34) Ọmịiko dị ukwuu o nwere kpaliri ya inyere ndị ọzọ aka.

Ihe Jizọs meere ndị ọzọ abụghị naanị izi ha otú ha ga-esi na-eme uche Chineke. O nyekwaara ha aka n’ụzọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị, o nyere puku ndị ikom ise nri (n’agụnyeghị ndị inyom na ụmụaka) bụ́ ndị nọ na-ege ya ntị ruo mgbe chi jiwere. N’oge ọzọ, o nyere puku mmadụ anọ nri. Na nke mbụ ahụ, o ji ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ nyejuo ìgwè mmadụ ahụ afọ. Na nke abụọ ahụ, o ji ogbe achịcha asaa na obere azụ̀ ole na ole nyejuo ìgwè mmadụ ahụ afọ. (Matiu 14:14-21; 15:32-38; Mak 6:35-44; 8:1-9) Ihe ahụ ọ̀ bụ ọrụ ebube? Ee, Jizọs rụrụ ọrụ ebube.

Jizọs gwọkwara ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa. Ọ gwọrọ ndị ìsì, ndị ngwọrọ, ndị ekpenta, na ndị ntị chiri. Ọ kpọlitere ọbụna ndị nwụrụ anwụ! (Luk 7:22; Jọn 11:30-45) O nwere mgbe onye ekpenta rịọrọ ya, sị: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Gịnị ka Jizọs mere? “O wee matịa aka ya bitụ ya aka, sị ya: ‘Achọrọ m. Dị ọcha.’” (Mak 1:40, 41) Ọmịiko dị ukwuu Jizọs nwere kpaliri ya inyere ha aka. O ji ọrụ ebube ndị dị otú ahụ ọ rụrụ gosi na ọ hụrụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ n’anya.

Ò siri ike ikweta na Jizọs rụrụ ọrụ ebube? Jizọs rụrụ ọtụtụ n’ime ọrụ ebube ndị ọ rụrụ n’ihu ọha. Ọbụna ndị na-emegide ya, bụ́ ndị gbalịrị mgbe niile ịchọta ihe ha ga-asị na o mere, enweghị ike ikwu na ọ rụghị ọrụ ebube. (Jọn 9:1-34) Ihe ọzọ bụ na o nwere ihe mere o ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ ọ rụrụ. Ọrụ ebube ndị ahụ nyeere ndị mmadụ aka ịmata na ọ bụ Chineke zitere Jizọs.—Jọn 6:14.

Ịtụle ozizi Jizọs na ndụ ya ná mkpirikpi na-eme ka anyị nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ na-emekwa ka anyị chọọ iṅomi ịhụnanya ya. Ma nke ahụ abụghị naanị otú Jizọs pụrụ isi metụta ndụ gị. Ọ bụghị naanị onye ozizi ukwu nke kụziri ịhụnanya. O gosiri na ya dịrị ndụ dị ka Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya tupu ya aghọọ mmadụ. (Jọn 1:14; 3:16; 8:58; 17:5; 1 Jọn 4:9) Ọ ka dị ndụ kemgbe o bichara n’ụwa, nke bụ́ ihe ga-eme ka o metụta gị ọbụna karị. Baịbụl na-ekwu na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, na e mewo ya Eze na-achị Alaeze Chineke ugbu a. (Mkpughe 11:15) Jizọs sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3; 20:31) N’ezie, ịmata Jizọs Kraịst pụrụ ime ka i nweta ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs! Olee otú nke ahụ ga-esi mee? Ọ́ gaghị adị mma ma ị mụtakwuo banyere Jizọs wee hụ otú ‘ịhụnanya nke Kraịst nwere si na-akpali anyị’ iṅomi ya? (2 Ndị Kọrịnt 5:14) Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka.—Jọn 13:34, 35.

Ọ gwụkwala ma e gosiri nsụgharị ọzọ, amaokwu Baịbụl ndị e dere n’akwụkwọ a sitere na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya