Ì Nwere Mmụọ Na-adịghị Anwụ Anwụ?
À NA-ADỊ ndụ mgbe a nwụsịrị? Ajụjụ ahụ agbagwojuwo ihe a kpọrọ mmadụ anya ruo ọtụtụ puku afọ. N’ime ọgbọ nile, ndị mmadụ n’obodo ọ bụla atụgharịwo uche n’okwu ahụ ma chepụta nkwenkwe dị iche iche.
N’ụwa nile, tinyere ógbè Pacific bụ́ Polynesia, Melanesia, na Micronesia, ọtụtụ ndị kwere na “mmụọ” na-adịgide ndụ ma mmadụ nwụọ. Ò nwere ihe dị n’ime mmadụ bụ́ nke na-esi n’ahụ pụọ n’ezie ma nọgide na-adị ndụ ma mmadụ nwụọ? Gịnị bụ mmụọ ahụ nke dị n’ime onye dị ndụ? Gịnị na-eme ya mgbe anyị nwụrụ? Okwu Chineke, bụ́ Bible, e dere n’ike mmụọ nsọ na-enye azịza bụ́ eziokwu ma na-eju afọ maka ajụjụ ndị a.
Gịnị Bụ Mmụọ?
Na Bible, okwu ndị a sụgharịrị ịbụ “mmụọ” pụtara n’ụzọ bụ́ isi “ume.” Ma nke a na-enye echiche karịrị nnọọ iku ume. Dị ka ihe atụ, Jemes, onye so dee Bible, kwuru, sị: “Ahụ bụ ihe nwụrụ anwụ ma mmụọ adịghị ya.” (Jemes 2:26) N’ihi ya, mmụọ bụ ihe ahụ na-eme ka ahụ dị ndụ.
Ike a nke na-eme ka a dị ndụ apụghị ịbụ nanị ume, ma ọ bụ ikuku, bụ́ nke na-abanye ma na-esi n’akpa ume apụta. N’ihi gịnị? N’ihi na mgbe iku ume kwụsịrị, mkpụrụ ndụ nke ahụ na-anọgide na-adị ndụ ruo obere oge—“ruo ọtụtụ minit,” dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo. N’ihi nke a mgbalị ndị e mere iji tụtee mmadụ pụrụ ịga nke ọma, a pụkwara itinyere mmadụ akụkụ ahụ onye ọzọ. Ma ozugbo ike ji ndụ na-adịkwaghị n’ime mkpụrụ ndụ nke ahụ, mgbalị nile a na-eme iji weghachi ndụ na-akụ afọ n’ala. Ume nile dị n’ụwa apụghị ịtụte ọbụna otu mkpụrụ ndụ. Ebe ọ dị otú ahụ, mmụọ bụ ike ndụ a na-adịghị ahụ anya—ike ji ndụ—nke na-eme ka mkpụrụ ndụ dịgide ndụ. Iku ume na-eme ka ike ndụ a dịgide.—Job 34:14, 15.
Mmụọ ahụ ọ̀ na-arụ ọrụ nanị n’ahụ ụmụ mmadụ? Bible na-enyere anyị aka iru nkwubi okwu ziri ezi n’ihe banyere nke a. Eze Solomọn nwere amamihe dere, sị: “Ònye maara mmụọ nke ụmụ mmadụ, ma nke ahụ nà-arịgo arịgo, na mmụọ nke anụmanụ, ma nke ahụ nà-arịda n’okpuru ruo ala?” (Eklisiastis 3:21) Ya mere a na-ekwu banyere ụmụ anụmanụ nakwa ụmụ mmadụ dị ka ndị nwere mmụọ. Olee otú nke ahụ pụrụ isi dị otú ahụ?
A pụrụ iji mmụọ, ma ọ bụ ike ndụ tụnyere ike eletrik na-abanye n’ígwè ọrụ ma ọ bụ ngwá eletrik. A pụrụ iji ike a na-adịghị ahụ anya nke eletrik rụọ ọrụ dịgasị iche, na-adabere n’ụdị ngwá ọ na-enye ike. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ime ka stovu nwuo ọkụ, ka kọmputa hazie ihe ọmụma ma gbakọọ ihe, nakwa ka telivishọn wepụta onyinyo na ụda olu. Ma, ọ dịghị mgbe ọ bụla ike eletrik ga-enwe ọdịdị nke ngwá ndị ọ na-enye ike nwere. Ọ na-anọgide na-abụ nanị ike. N’otu aka ahụ, ike ndụ adịghị enwe ọdịdị ọ bụla nke ihe e kere eke ndị ọ na-eme ka ha dịrị ndụ nwere. O nweghị àgwà, o nweghị ikike iche echiche. Ma ụmụ mmadụ ma ụmụ anụmanụ nwere “otu mmụọ.” (Eklisiastis 3:19) N’ihi ya, mgbe mmadụ nwụrụ, mmụọ ya adịghị adịgide ndụ n’ógbè ọzọ dị ka mmụọ e kere eke.
Gịnịzi bụ ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ? Gịnị na-emekwa mmụọ mgbe mmadụ nwụrụ?
“Ọ Bụkwa Ájá Ka Ị Ga-alọta”
Mgbe mmadụ mbụ, bụ́ Adam, kpachaara anya nupụ isi n’iwu Chineke, Jehova gwara ya, sị: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alọta n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) Olee ebe Adam nọ tupu Jehova ejiri ájá kee ya? Ọ dịghị ebe ọ bụla ọ nọ! Ọ dịghị adị n’ezie. Ya mere ihe Jehova Chineke na-ekwu mgbe ọ sịrị na Adam “ga-alọta n’ala” bụ na Adam ga-anwụ. Adam agaghị agafe n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. Ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-alaghachi n’ọnọdụ nke adịghị ndụ na adịghị adị. Ntaramahụhụ ya bụ ọnwụ—ọnọdụ nke adịghị ndụ—ọ bụghị ịgafe n’ógbè ọzọ.—Ndị Rom 6:23.
Gịnị banyere ndị ọzọ nwụworo anwụ? E mere ka ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ pụta ìhè n’Eklisiastis 9:5, 10, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla . . . Nchụso, atụmatụ, ihe ọmụma ma ọ bụ ọgụgụ isi adịghị n’ime ili.” (Moffatt) N’ihi ya, ọnwụ bụ ọnọdụ nke adịghị ndụ. Ọbụ abụ ahụ dere na mgbe mmadụ nwụrụ, “mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”—Abụ Ọma 146:4.
O doro anya na ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ha adịghị emeli ihe ọ bụla. Ọ dịghị ihe ha maara. Ha apụghị ịhụ gị, ịnụ ihe ị na-ekwu, ma ọ bụ ịgwa gị okwu. Ha apụghị inyere gị aka ma ọ bụ imerụ gị ahụ. N’ezie, ọ dịghị gị mkpa ịtụ ndị nwụru anwụ egwu. Ma olee otú o si bụrụ na ‘mmụọ na-apụ’ site n’ahụ mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nwụọ?
Mmụọ ‘Alaghachikwuru Chineke’
Bible kwuru na mgbe mmadụ nwụrụ, “mmụọ alaghachikwurukwa Chineke Onye nyere ya.” (Eklisiastis 12:7) Nke a ọ̀ pụtara na mmụọ na-agabiga mbara igwe n’ụzọ nkịtị ma gaa n’ihu Chineke? Ọ dịghị ma ọlị! Ụzọ Bible si jiri okwu ahụ bụ́ ‘alaghachikwuru’ mee ihe adịghị egosi na a ga-esi n’otu ebe ruo ebe ọzọ n’ezie. Dị ka ihe atụ, a gwara ụmụ Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi, sị: “Laghachikwutenụ m, Mụ onwe m ga-alaghachikwutekwa unu, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” (Malakaị 3:7) ‘Nlaghachikwute’ ụmụ Israel ga-alaghachikwute Jehova pụtara ichigharị hapụ ụzọ ọjọọ ma mee ka ụzọ ha kwekọọ ọzọ n’ụzọ ezi omume nke Chineke. ‘Nlaghachikwute’ Jehova ga-alaghachikwutekwa ụmụ Israel pụtara iji ihu ọma lebara ndị ya anya ọzọ. N’ọnọdụ abụọ ndị a ‘nlaghachikwute’ metụtara àgwà, ọ bụghị isi n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ n’ụzọ nkịtị.
N’otu aka ahụ, mgbe mmadụ nwụrụ, ọ dịghị esi n’ụwa gaa n’ógbè dị n’eluigwe n’ezie mgbe mmụọ ‘na-alaghachikwute’ Chineke. Cheta, mmụọ bụ ike ndụ. Mgbe ọ bụla ike ahụ na-adịkwaghị n’ahụ mmadụ, ọ bụ nanị Chineke nwere ike nke inyeghachi ya onye ahụ. Ya mere mmụọ ‘na-alaghachikwuru Chineke’ n’ọnọdụ nke na olileanya ọ bụla nke onye ahụ nwere ịdị ndụ n’ọdịnihu dị kpam kpam n’aka Chineke.
Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ọnwụ Jisọs. Luk bụ́ onye so dee oziọma ndị ahụ, na-akọ, sị: “Mgbe Jisọs tisịrị mkpu n’oké olu, Ọ sị, Nna, n’aka Gị ka M na-enye mmụọ m idebe: mgbe O kwusịrị nke a, O we kubie ume.” (Luk 23:46) Ka mmụọ Jisọs si n’ahụ ya na-apụ, ọ bụghị n’eluigwe ka ọ gawara n’ụzọ nkịtị. A kpọliteghị Jisọs n’ọnwụ ruo n’ụbọchị nke atọ. A ka nwekwara ụbọchị 40 tupu ya arịgoro n’eluigwe. (Ọrụ 1:3, 9) Otú ọ dị, mgbe Jisọs nwụrụ, o jiri obi ike nyefee Nna ya mmụọ ya, na-enwe ntụkwasị obi zuru ezu n’ike Jehova nwere ime ka ọ dịghachi ndụ.
Ee, ọ bụ nanị Chineke pụrụ ime ka mmadụ dịghachi ndụ. (Abụ Ọma 104:30) Lee atụmanya dị ebube nke a na-eme ka e nwee!
Olileanya E Ji n’Aka
Bible na-ekwu, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu [Jisọs], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Ee, Jisọs Kraịst kwere nkwa na a ga-akpọlite ndị nile nọ n’ike ncheta Jehova n’ọnwụ, ma ọ bụ mee ka ha dịghachi ndụ. Kama ịma ọkwa ndị dị mwute na ndị mmadụ anwụọla, a ga-enwe akụkọ ndị na-enye ọṅụ banyere ndị e meworo ka ha dịghachi ndụ. Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụ ịnabata ndị a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ site n’ili!
Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu otú ị pụrụ isi rite uru n’olileanya a Chineke nyere? Kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu ka ha nye gị broshuọ bụ́ Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
Ọ gwụlakwa ma e gosiri nsụgharị ọzọ, nhota Bible nile sitere na Bible Nsọ nke Union Version, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a.