Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wt isi 5 p. 41-49
  • Nnwere Onwe nke Ndị Na-efe Jehova Ofufe Nwere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nnwere Onwe nke Ndị Na-efe Jehova Ofufe Nwere
  • Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe A Pụrụ Inweta Nnwere Onwe
  • Ịchọ Ụdị Nnwere Onwe Ọzọ
  • Ebe Nsogbu Na-esi Amalite
  • Otú Anyị Ga-esi Enweta Ezigbo Nnwere Onwe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ndị Nweere Onwe Ha Ma Bụrụ Ndị Ga-aza Ajụjụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ekwela Ka Nzube nke Nnwere Onwe nke Chineke Nyere Funarị Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Fee Jehova, Bụ́ Chineke nke Nnwere Onwe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
wt isi 5 p. 41-49

Isi nke Ise

Nnwere Onwe nke Ndị Na-efe Jehova Ofufe Nwere

1, 2. (a) Ụdị nnwere onwe dị aṅaa ka Chineke nyere mmadụ abụọ mbụ? (b) Kwuo ụfọdụ n’ime iwu ndị chịkwara ihe Adam na Iv mere.

MGBE Jehova kere nwoke mbụ na nwanyị mbụ, ha nwere nnwere onwe nke karịrị nnọọ nnwere onwe ọ bụla ụmụ mmadụ nwere taa. Ebe obibi ha bụ Paradaịs, bụ́ Ogige Iden ahụ mara mma. Ọ dịghị ọrịa nke gbochiri ha ịnụ ụtọ ndụ, ebe ha nwere uche na ahụ́ zuru okè. Ọnwụ anọghị na-echere ha dị ka ọ nọworo na-echere mmadụ nile eri mgbe ahụ. Ọzọkwa, ha abụghị ígwè ọrụ na-eme ihe ọ bụla a chọrọ ka ha mee kama ha nwere onyinye dị ebube nke bụ́ nnwere onwe ime nhọrọ, bụ́ ikike imere onwe ha mkpebi. Otú ọ dị, iji nọgide na-enwe nnwere onwe dị otú ahụ magburu onwe ya, ha aghaghị ịdị na-akwanyere iwu Chineke ùgwù.

2 Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere iwu dị iche iche Chineke mere bụ́ ndị na-achị ihe e kere eke. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na e kwupụtaghị iwu ndị a ekwupụta, ma e mere Adam na Iv n’ụzọ nke na irube isi na ha ga-ekwekọ n’otú e si kee ha. Agụụ ịgụ ha na-egosi mkpa ọ dị iri ihe; akpịrị ịkpọ ha nkụ na-egosi mkpa ọ dị ịṅụ mmiri; anyanwụ ịda na-egosi mkpa ọ dị ihi ụra. Jehova nyekwara ha ọrụ ha ga-arụ. Ya mere, ọrụ ahụ bụ iwu n’ezie n’ihi na ọ ga-achịkwa ihe ha na-eme. Ha gaje ịmụ ụmụ, nwee ike n’ahụ́ ọtụtụ ihe dị ndụ dị n’ụwa, ma mee ka Paradaịs sakwuo mbara ruo mgbe o zuru ụwa dum. (Jenesis 1:28; 2:15) Lee iwu obiọma, nke bara uru ọ bụ! Ọ bụụrụ ha ọrụ na-enye nnọọ afọ ojuju, na-eme ka ha nwee ike iji ikike ha mee ihe ruo n’ókè zuru ezu, n’ụzọ ndị bara uru. Ọzọkwa, ha nwere nnwere onwe dị ukwuu ime mkpebi n’otú ha ga-esi arụ ọrụ e kenyere ha. Gịnị ọzọ fọrọ?

3. Olee otú Adam na Iv pụrụ isi mụta iji nnwere onwe ha nke ime mkpebi eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya?

3 Otú ọ dị, mgbe e nyere Adam na Iv ihe ùgwù nke ime mkpebi, nke a apụtaghị na mkpebi ọ bụla ha ga-eme ga-arụpụta ihe ọma. Ha gaje iji nnwere onwe ha nke ime mkpebi mee ihe n’ụzọ na-agaghị emegide iwu na ụkpụrụ Chineke. Olee otú ha pụrụ isi mụta iwu na ụkpụrụ ndị a? Site n’ige Onye Mere ha ntị na site n’ikiri ihe ndị o kere. Chineke nyere Adam na Iv ọgụgụ isi nke dị mkpa iji tinye ihe ndị ha mụtara n’ọrụ. Ebe ha bụ ndị zuru okè mgbe e kere ha, ọchịchọ ha bu pụta ụwa ga-abụ igosipụta àgwà Chineke mgbe ha na-eme mkpebi. N’ezie, ha ga-elezi anya ime nke ahụ ma ọ bụrụ n’ezie na ha nwere ekele maka ihe Chineke mewooro ha ma chọọ ime ihe ga-atọ ya ụtọ.—Jenesis 1:26, 27; Jọn 8:29.

4. (a) Iwu ahụ e nyere Adam na Iv ka ha ghara iri mkpụrụ nke otu osisi ọ̀ napụrụ ha nnwere onwe? (b) N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ ihe kwesịrị ekwesị a chọrọ n’aka ha?

4 Mgbe ahụ, n’ụzọ ziri ezi, Chineke kpebiri ịnwale otú ha rararuuru onwe ha nye ya dị ka Onye nyere ha ndụ na njikere ha dị ịnọgide na-eme ihe o nyere ha iwu ime. Jehova nyere Adam iwu a: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Mgbe e kesịrị Iv, a gwakwara ya banyere iwu a. (Jenesis 3:2, 3) Mmachibido iwu a, ọ̀ napụrụ ha nnwere onwe ha? Ọ dịghị ma ọlị. Ha nwere ụbara ihe oriri dị iche iche dị ụtọ ha ga na-eri n’erighị mkpụrụ nke sitere n’osisi ahụ. (Jenesis 2:8, 9) Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị ka ha ghọta na ọ bụ Chineke nwe ụwa, ebe ọ bụ ya kere ya. Ya mere, o nwere ikike iti iwu ndị kwekọrọ ná nzube ya, ndị ga-abakwara ihe a kpọrọ mmadụ uru.—Abụ Ọma 24:1, 10.

5. (a) Olee otú Adam na Iv si tụfuo nnwere onwe dị ebube ha nweburu? (b) Gịnị nọchiri nnwere onwe ahụ nke Adam na Iv nweburu, oleekwa otú o siworo metụta anyị?

5 Ma gịnị mere? N’ịbụ onye oké ọchịchọ maka ọdịmma onwe ya nanị kwaliri, otu mmụọ ozi jiri nnwere onwe o nwere ime nhọrọ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi wee ghọọ Setan, nke pụtara “Onye Nguzogide.” Ọ ghọgburu Iv site n’imesi ya obi ike na ọ ga-enweta ihe megidere uche Chineke. (Jenesis 3:4, 5) Adam sonyeere Iv n’imebi iwu Chineke. Site n’iwere ihe na-abụghị nke ha, nnwere onwe dị ebube ha nwere funahụrụ ha. Mmehie ghọrọ nna ha ukwu, dịkwa ka Chineke dọrọ aka ná ntị, ọnwụ sochiri ya n’ikpeazụ. Ihe nketa ha nyere ụmụ ha bụ mmehie—nke na-apụta ìhè n’ọchịchọ ebumpụta ụwa ha nwere ime mmehie. Mmehie mekwara ka e nwee adịghị ike ndị na-arụpụta ọrịa, ịka nká, na ọnwụ. Ọchịchọ ime ihe ọjọọ, bụ́ nke ịkpa ike Setan na-eme ka ọ kawanye njọ, emewo ka e nwee ọha mmadụ nke e ji ịkpọasị, ime mpụ, mmegbu, na agha bụ́ ndị taworo isi ọtụtụ nde mmadụ mara. Lee ka nke ahụ si dị iche ná nnwere onwe nke Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ ná mmalite!—Deuterọnọmi 32:4, 5; Job 14:1, 2; Ndị Rom 5:12; Mkpughe 12:9.

Ebe A Pụrụ Inweta Nnwere Onwe

6. (a) Ebee ka a pụrụ inweta ezi nnwere onwe? (b) Ụdị nnwere onwe dị aṅaa ka Jizọs kwuru maka ya?

6 N’ihi ajọ ọnọdụ dị ebe nile taa, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ na-agụsi ndị mmadụ agụụ ike inwe nnwere onwe ka ukwuu. Ma ebee ka a pụrụ inweta ezi nnwere onwe? Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:31, 32) Nnwere onwe a abụghị ụdị nnwere onwe ndị mmadụ na-atụ anya ya mgbe ha jụrụ otu onye ọchịchị ma ọ bụ otu ụdị ọchịchị ma họrọ ọzọ. Kama nke ahụ, nnwere onwe a na-emetụta nsogbu ụmụ mmadụ kpọmkwem. Ihe Jizọs na-ekwu maka ya bụ nnwere onwe pụọ n’ịbụ ohu nke mmehie. (Jọn 8:24, 34-36) N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ aghọọ ezi onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, ọ na-enwe mgbanwe pụtara ìhè ná ndụ ya, ntọhapụ!

7. (a) N’echiche dị aṅaa ka anyị pụrụ inwere onwe anyị pụọ ná mmehie ugbu a? (b) Iji nweta nnwere onwe ahụ, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?

7 Nke a apụtaghị na ugbu a ezi Ndị Kraịst adịkwaghị enwe mmetụta nke ọchịchọ ebumpụta ụwa ha nwere ime mmehie. Ebe ha ketaworo mmehie, ha ka ga na-agba mgba n’ihi ya. (Ndị Rom 7:21-25) Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmadụ ebie ndụ n’ezie n’ụzọ kwekọrọ n’ozizi Jizọs, ọ gakwaghị abụ ohu nke mmehie. Mmehie agakwaghị abụrụ ya onye ọchịchị aka ike, nke na-enye ya iwu ndị ọ na-aghaghị irube isi na ha n’ajụghị ase. Ọ gaghị abụ onye tọrọ atọ n’ụzọ ndụ nke na-enweghị nzube, nke ga-emekwa ka akọ na uche ya na-ama ya ikpe. Ọ ga-enwe akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke n’ihi na a gbaghaworo ya mmehie ndị o mere n’oge gara aga na-adabere n’okwukwe o nwere n’àjà Kraịst. Ọchịchọ ime mmehie pụrụ ịnwa iselite isi ọzọ, ma mgbe ọ jụrụ imezu ha n’ihi na ọ na-echeta ozizi dị ọcha nke Kraịst, ọ na-egosi na mmehie abụkwaghị nna ya ukwu.—Ndị Rom 6:12-17.

8. (a) Nnwere onwe dịgasị aṅaa ka ezi Iso Ụzọ Kraịst na-enye anyị? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ndị ọchịchị ụwa nọ?

8 Tụlee nnwere onwe ndị anyị nwere dị ka Ndị Kraịst. E mewo ka anyị nwere onwe anyị pụọ ná mmetụta nke ozizi ụgha na-enwe, n’agbụ nke nkwenkwe ụgha, na n’ịbụ ohu nye mmehie. Eziokwu ndị magburu onwe ha banyere ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nakwa banyere mbilite n’ọnwụ emewo ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ịtụ ọnwụ egwu n’ụzọ na-enweghị isi. Ịmara na n’isi nso, na Alaeze ezi omume nke Chineke ga-anọchi ọchịchị na-ezughị okè nke ụmụ mmadụ na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’enweghị olileanya. (Daniel 2:44; Matiu 6:10) Otú ọ dị, nnwere onwe dị otú ahụ adịghị eme ka akwanyereghị ndị ọchịchị na iwu ndị ha tiri ùgwù zie ezi.—Taịtọs 3:1, 2; 1 Pita 2:16, 17.

9. (a) Olee otú Jehova si jiri ịhụnanya na-enyere anyị aka inweta nnwere onwe kasị ukwuu ụmụ mmadụ pụrụ inweta ugbu a? (b) Olee otú anyị pụrụ isi mee mkpebi ndị amamihe dị na ha?

9 Jehova ahapụghị anyị ka anyị jiri aka anyị chọpụta ụzọ kasị mma isi bie ndụ, site n’ịkọ nkọ. Ọ maara otú e si mee anyị, ihe na-enye anyị ezigbo afọ ojuju, na ihe ga-abara anyị uru ruo mgbe ebighị ebi. Ọ maara echiche na omume ndị pụrụ imebi mmekọrịta Ya na mmadụ na nke onye ahụ na ụmụ mmadụ ibe ya, ikekwe ọbụna gbochie onye ahụ ịbanye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. N’ịhụnanya, Jehova na-agwa anyị ihe a nile site na Bible na site ná nzukọ ya a na-ahụ anya. (Mak 13:10; Ndị Galeshia 5:19-23; 1 Timoti 1:12, 13) Ọ dịziiri anyị iji nnwere onwe ime nhọrọ nke Chineke nyere anyị kpebie ihe anyị ga-eme. N’adịghị ka Adam, ọ bụrụ na anyị egewo ntị n’ihe Bible na-agwa anyị, anyị ga-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha. Anyị ga-egosipụta na anyị na Jehova inwe mmekọrịta dị mma bụ isi ihe na-echegbu anyị ná ndụ.

Ịchọ Ụdị Nnwere Onwe Ọzọ

10. Ụdị nnwere onwe dị aṅaa ka ụfọdụ ndị bụ́ Ndịàmà Jehova chọworo?

10 Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova—gụnyere ndị ọzọ toworo eto—pụrụ iche na ha chọrọ ụdị nnwere onwe ọzọ. Ụwa pụrụ iyi ihe na-adọrọ adọrọ, ka ha na-echekwa echiche karị banyere ya, otú a ka ọchịchọ ha na-enwe ime ihe ndị na-ekwesịghị Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-ewu ewu n’ụwa, ga na-esiwanye ike. E nwere ike ndị dị otú ahụ ebughị n’obi iji ọgwụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ịṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ịkwa iko. Ma ha na-amalite iso ndị na-abụghị ezi Ndị Kraịst na-akpakọrịta, na-achọ ka a nabata ha. Ha pụrụ ọbụna ịmalite iṅomi okwu ha na omume ha.—3 Jọn 11.

11. Ebee ka ndọrọ nke ime ihe ọjọọ na-esi abịa mgbe ụfọdụ?

11 Mgbe ụfọdụ, ndọrọ nke itinye aka n’àgwà na-ekwesịghị Ndị Kraịst na-esite n’aka onye sị na ya na-ejere Jehova ozi. Nke ahụ bụ ihe mere ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ, otu ihe ahụ pụkwara ime n’oge anyị. Ndị dị otú ahụ na-achọkarị ime ihe ndị ha na-eche na ọ ga-enye ha obi ụtọ, ma ihe ndị a megidere iwu Chineke. Ha na-agba ndị ọzọ ume “ikpori ndụ.” Ha ‘na-ekwe nkwa nnwere onwe, ebe ha onwe ha bụ ndị ohu nke ire ure.’—2 Pita 2:19.

12. Gịnị bụ ihe ọjọọ ndị na-esi n’omume ndị megidere iwu na ụkpụrụ Chineke apụta?

12 Ihe na-esi n’ihe ahụ a sị na ọ bụ nnwere onwe apụta na-adị njọ mgbe nile, ebe ọ pụtara inupụ isi n’iwu Chineke. Dị ka ihe atụ, mmekọahụ rụrụ arụ pụrụ ịkpata oké obi erughị ala, ọrịa, ọnwụ, ime a na-achọghị, na ikekwe ntisa nke alụmdi na nwunye. (1 Ndị Kọrint 6:18; 1 Ndị Tesalonaịka 4:3-8) Ịṅụ ọgwụ ọjọọ pụrụ ịkpata inwe ahụ́ mgbakasị, ekwupụtaghị okwu ekwupụta, ahụchaghị ụzọ nke ọma, ajụ obubu, nsogbu ekuteghị ume nke ọma, ịnụ na ịhụ ihe ndị na-adịghị adị, na ọnwụ. Ọ pụrụ iri mmadụ ahụ́, bụ́ nke pụrụ iduga n’ime mpụ iji nọgide n’omume ahụ. Ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè na-arụpụtakwa otu ihe ahụ. (Ilu 23:29-35) Ndị na-etinye aka n’ụdị omume ahụ nwere ike iche na ha nweere onwe ha, ma ha na-emesịa chọpụta mgbe oge gafeworo na ha aghọwo ndị ohu nye mmehie. Leekwa nna ukwu obi tara mmiri mmehie bụ! Ichebara okwu a echiche ugbu a pụrụ inye aka chebe anyị pụọ n’ụdị ahụmahụ ahụ.—Ndị Galeshia 6:7, 8.

Ebe Nsogbu Na-esi Amalite

13. (a) Olee otú a na-esikarị akpalite ọchịchọ ndị na-eduba ná nsogbu? (b) Iji ghọta ihe bụ́ “mkpakọrịta ọjọọ,” ụzọ ònye si ele ihe anya dị anyị mkpa? (ch) Ka ị na-aza ajụjụ ndị e depụtara na paragraf nke 13, mee ka ụzọ Jehova si ele ihe anya pụta ìhè.

13 Chee echiche ebe nsogbu na-esikarị amalite. Bible na-akọwa, sị: “A na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà. Ọchịchọ ahụkwa, mgbe ọ tụrụwooro ime, na-amụpụta mmehie; mmehie, n’aka nke ya, mgbe e mechaworo ya, na-eweta ọnwụ.” (Jems 1:14, 15) Olee otú e si akpalite ọchịchọ ahụ? Ọ bụ site n’ihe ndị na-abanye n’uche. Ọtụtụ mgbe, nke a na-esite n’iso ndị na-adịghị etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na-akpakọrịta. N’ezie, anyị nile maara na anyị kwesịrị izere “mkpakọrịta ọjọọ.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Ma olee mkpakọrịta ndị dị njọ? Olee otú Jehova si ele okwu ahụ anya? Ichebara ajụjụ ndị na-esonụ echiche na ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha kwesịrị inyere anyị aka iru ná nkwubi okwu ndị kwesịrị ekwesị.

Eziokwu ahụ bụ́ na ụfọdụ ndị yiri ndị a na-akwanyere ùgwù ọ̀ pụtara na ha bụ ezi ndị ha na mmadụ pụrụ ịkpakọrịta? (Jenesis 34:1, 2, 18, 19)

Mkparịta ụka ha, ikekwe okwu ịkpa ọchị ha, ọ̀ pụrụ igosi ma ò kwesịrị ka anyị na ha na-akpachi anya? (Ndị Efesọs 5:3, 4)

Olee otú ọ na-adị Jehova ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ isoro ndị na-ahụghị ya n’anya na-akpachi anya? (2 Ihe E Mere 19:1, 2)

Ọ bụ ezie na anyị na ndị na-ekweghị n’ihe ndị anyị kwere pụrụ ịdị na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ na-agakọ akwụkwọ, gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị kpachara anya? (1 Pita 4:3, 4)

Ikiri telivishọn na sịnịma, iji Intanet eme ihe, na ịgụ akwụkwọ, magazin, na akwụkwọ akụkọ, bụcha ụzọ isi soro ndị ọzọ na-akpakọrịta. Ụdị ihe dịgasị aṅaa sitere n’ụdị ebe ndị a ka ọ dị mkpa ka anyị nọrọ na nche maka ha? (Ilu 3:31; Aịsaịa 8:19; Ndị Efesọs 4:17-19)

Gịnị ka ụdị ndị enyi anyị na-ahọrọ na-agwa Jehova banyere ụdị mmadụ anyị bụ? (Abụ Ọma 26:1, 4, 5; 97:10)

14. Nnwere onwe dị aṅaa dị ebube na-echere ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-etinye ndụmọdụ nke Okwu Chineke n’ọrụ ugbu a?

14 Ụwa ọhụrụ Chineke dị nnọọ nso. Site n’ọchịchị Alaeze eluigwe nke Chineke, a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ya pụọ ná mmetụta Setan na ajọ usoro ihe ya dum. A ga-eji nwayọọ nwayọọ wepụ mmetụta nile nke mmehie n’ahụ́ ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi, na-eme ka e nwee izu okè n’uche na n’anụ ahụ́, ka anyị wee nwee ike ịnụ ụtọ ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. Ihe nile e kere eke ga-emesịa nwee nnwere onwe nke kwekọrọ ná “mmụọ Jehova.” (2 Ndị Kọrint 3:17) Ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya bụ́ mmadụ itinye onwe ya n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye ihe a nile funahụrụ n’ihi ejighị ndụmọdụ nke Okwu Chineke kpọrọ ihe ugbu a? Site n’iji nnwere onwe Ndị Kraịst anyị na-eme ihe taa n’ụzọ amamihe dị na ya, ka anyị nile gosi n’ụzọ doro anya na ihe anyị chọrọ n’ezie bụ “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:21.

Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu

• Ụdị nnwere onwe dị aṅaa ka mmadụ abụọ mbụ nwere? Olee otú nke ahụ dị ma e jiri ya tụnyere ihe ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụ ugbu a?

• Nnwere onwe dị aṅaa ka ezi Ndị Kraịst nwere? Olee otú nke a si dị iche n’ihe ụwa na-ewere dị ka nnwere onwe?

• N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa izere mkpakọrịta ọjọọ? N’adịghị ka Adam, mkpebi ònye banyere ihe bụ́ ihe ọjọọ ka anyị kwesịrị iwere?

[Foto ndị dị na peeji nke 46]

Okwu Chineke na-adọ aka ná ntị, sị: “Ka a ghara iduhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya