Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ol akụkụ 8 p. 25-28
  • Jụ Okpukpe Ụgha; Kpee Ezi Okpukpe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jụ Okpukpe Ụgha; Kpee Ezi Okpukpe
  • Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kewapụ Onwe Gị n’Okpukpe Ụgha
  • Bibisie Ihe Ndị E Ji Eme Ihe n’Ofufe Ụgha
  • Soro Ndị Jehova Na-akpakọrịta
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-efe Chineke
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Jeere Jehova Ozi, Ọ Bụghị Setan
    Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
  • Ofufe Chineke Na-anakwere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Jụ Okpukpe Ụgha!
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
ol akụkụ 8 p. 25-28

AKỤKỤ NKE 8

Jụ Okpukpe Ụgha; Kpee Ezi Okpukpe

1. N’ihe banyere ofufe, olee nhọrọ na-eche ndị mmadụ ihu taa?

JIZỌS sịrị: “Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m.” (Matiu 12:30) Ma ànyị anọghị n’akụkụ Jehova, anyị anọrọ n’akụkụ Setan. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-eche na ha na-ejere Chineke ozi n’ụzọ ọ na-anara, ma Bible na-ekwu na Setan “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ọtụtụ nde mmadụ kwenyere na ha na-efe Chineke ofufe, ma ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu ka ha na-ejere ozi n’ezie! Otu nhọrọ na-eche ndị mmadụ ihu taa: Ha aghaghị ijere Jehova, bụ́ “Chineke nke eziokwu” ozi, ma ọ bụ jeere Setan, bụ́ “nna nke ụgha,” ozi.​—Abụ Ọma 31:5; Jọn 8:44.

Kewapụ Onwe Gị n’Okpukpe Ụgha

2. Olee otu ụzọ Setan si agbalị igbochi ndị mmadụ ife Jehova ofufe?

2 Ikpebi ijere Jehova ozi bụ nhọrọ amamihe dị na ya ime, nhọrọ nke na-eweta nnwapụta Chineke. Ma Setan adịghị enwe obi ụtọ n’ebe onye ọ bụla nke na-ejere Chineke ozi nọ; ọ na-eme ka ihe siere ndị na-eme otú ahụ ike. Otu ụzọ o si eme nke a bụ site n’iweta ịkwa emo ma ọ bụ mmegide site n’aka ndị ọzọ, ọbụna site n’aka ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ. Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “N’ezie, ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ nke ya.”​—Matiu 10:36.

3. Ọ bụrụ na ezinụlọ ma ọ bụ ndị enyi gị na-emegide ofufe ị na-efe Chineke, gịnị ka ị ga-eme?

3 Ọ bụrụ na nke ahụ emee gị, olee otú ị ga-esi meghachi omume? Ọtụtụ ndị maara na ụzọ ha si efe ofufe ezighị ezi, ma ha na-ala azụ ikewapụ onwe ha na ya. Ha na-eche na ime otú ahụ ga-abụ eguzosighị ike n’ihe nye ndị ezinụlọ ha. Ezi uche ọ̀ dị na nke ahụ? Ọ bụrụ na ị mara na ndị ezinụlọ gị ji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe, ị́ gaghị adọ ha aka ná ntị na ọgwụ ọjọọ ahụ ga-emerụ ha ahụ́? Ị gaghị eso ha jiri ọgwụ ọjọọ na-eme ihe, ka ị̀ ga-esonyere ha?

4. Gịnị ka Jọshụa gwara ndị Izrel banyere ofufe n’oge ya?

4 Jọshụa gbara ndị Izrel ume ka ha kwụsị ihe omume okpukpe na ọdịnala ndị na-ezighị ezi nke ndị nna nna ha. Ọ sịrị: “Ma ugbu a, na-atụnụ egwu Jehova, na-efekwanụ Ya ofufe n’izu okè na n’eziokwu: wezụgakwanụ chi nile nke nna unu hà fere ofufe n’ofe Osimiri ahụ, na n’Ijipt; ma feenụ Jehova.” (Joshua 24:14) Jọshụa guzosiri ike n’ihe nye Jehova, Jehova gọzikwara ya. Ọ bụrụ na anyị eguzosie ike n’ihe nye Jehova, ọ ga-agọzikwa anyị.​—2 Samuel 22:26.

Nkụzi Okpukpe​—Ndị Bụ́ Eziokwu na Ndị Na-abụghị Eziokwu

  • Ebe otu Onyeàmà Jehova na-amụrụ otu nwaanyị na ụmụ ya Baịbụl

    Atọ n’Ime Otu: Ọtụtụ okpukpe na-akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Ha na-ekwu na “Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ahụ [Jizọs] bụ Chineke, Mmụọ Nsọ bụkwa Chineke, ma ha abụghịkwa Chineke atọ kama otu Chineke.”

    Bible akpọtụdịghị okwu ahụ bụ́ “Atọ n’Ime Otu” aha, ọ dịghịkwa akụzi na Jehova dị atọ ma bụrụ otu onye. Nanị Jehova bụ Chineke. Ndị Kọrint nke Mbụ 8:6 na-asị: “Nye anyị e nwere n’ezie otu Chineke bụ́ Nna.” Jehova bụ Onye Kasị Elu. Jizọs abụghị Chineke kama ọ bụ “Ọkpara Chineke.” (1 Jọn 4:15) N’otu aka ahụ, mmụọ nsọ abụghị Chineke. Mmụọ nsọ abụdịghị onye. Ọ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ.​—Ọrụ 1:8; Ndị Efesọs 5:18.

  • Mkpụrụ Obi: Ọtụtụ okpukpe na-akụzi na mkpụrụ obi bụ ihe dị n’ime mmadụ nke na-apụghị ịnwụ anwụ. Bible na-akụzi na mkpụrụ obi bụ onye ahụ, anyị makwa na mmadụ pụrụ ịnwụ anwụ.​—Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4.

  • Ọkụ Ala Mmụọ: Okpukpe ụgha dị iche iche na-akụzi na a na-emekpa mkpụrụ obi nke ndị ajọ omume ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi na hel. Bible na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Bible na-akụzikwa na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Jehova, bụ́ Chineke nke na-ahụ n’anya, enweghị mgbe ọ ga-eji ọkụ mekpaa ndị ọzọ ahụ́.

Igbe: Gịnị ka Bible na-akụzi banyere Atọ n’Ime Otu, mkpụrụ obi, na ọkụ ala mmụọ?

Bibisie Ihe Ndị E Ji Eme Ihe n’Ofufe Ụgha

Ebe otu nwaanyị na-akpọ ihe ndị o ji eme anwansi ọkụ

5. Gịnị mere anyị kwesịrị iji bibie ihe nile metụtara ime anwansi?

5 Ikewapụ onwe anyị n’okpukpe ụgha pụtakwara na anyị kwesịrị ibibi ihe ọ bụla metụtara anwansi ndị anyị pụrụ inwe, dị ka ọgwụ nchebe, mgbaaka na ọla aka ndị nwere ike mgbaasị, na ihe ndị yiri ha. Nke a dị mkpa n’ihi na ọ na-egosi na ọ bụ Jehova ka anyị tụkwasịrị obi anyị nile.

6. Olee ihe Ndị Kraịst oge mbụ mere akwụkwọ ha ndị na-ekwu banyere ime anwansi?

6 Tụlee ihe ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ mere mgbe ha kpebiri ikpe ezi okpukpe. Bible na-asị: “Ọnụ ọgụgụ dịtụ ukwuu nke ndị na-eme [anwansi] chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ nile.”​—Ọrụ 19:19.

7. Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ndị mmụọ ọjọọ na-enyegharị anyị nsogbu?

7 Ndị mmụọ ọjọọ nwere ike ịdị na-enyegharị ụfọdụ ndị malitere ijere Jehova ozi nsogbu, bụ́ ndị tinyeburu aka kpọmkwem n’ịta amoosu, ime mgbaasị, ma ọ bụ n’ime anwansi. Ọ bụrụ na nke ahụ emee gị, kpọkuo Jehova n’olu dara ụda n’ekpere, kpọọ aha ya. Ọ ga-enyere gị aka.​—Ilu 18:10; Jems 4:7.

8. Olee otú Ndị Kraịst si ele arụsị, ihe oyiyi, na foto ndị e ji eme ihe n’ofufe ụgha anya?

8 Ndị chọrọ ijere Jehova ozi agaghị enwe arụsị, ihe oyiyi, ma ọ bụ ihe oyiyi okpukpe ọ bụla nke e ji efe ofufe ụgha, ma ọ bụ jiri ha na-eme ihe. Ezi Ndị Kraịst “na-eje ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ.” (2 Ndị Kọrint 5:7) Ha na-asọpụrụ iwu Chineke nke na-amachibido iji ihe oyiyi ọ bụla na-efe ofufe iwu.​—Ọpụpụ 20:​4, 5.

Soro Ndị Jehova Na-akpakọrịta

Ebe otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị na-esi nri

9. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Bible na-enye banyere ịbụ onye maara ihe?

9 Bible na-asị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe.” (Ilu 13:20) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị maara ihe, ọ dị anyị mkpa iso Ndịàmà Jehova na-eje ije ma ọ bụ na-akpakọrịta. Ọ bụ ha bụ ndị na-eje ije n’okporo ụzọ nke na-eduba ná ndụ.​—Matiu 7:14.

10. Olee otú Ndịàmà Jehova pụrụ isi nyere gị aka ijere Chineke ozi?

10 Ndịàmà nwere ezi mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. Ọrụ ha bụ inyere ndị nwere obi eziokwu aka ịghọta eziokwu Bible ndị na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Ha pụrụ inyere gị aka site n’iduziri gị ọmụmụ Bible n’efu. Ha ga-aza ajụjụ gị ma gosi gị ụzọ isi tinye ihe ọmụma Bible n’ọrụ ná ndụ gị.​—Jọn 17:3.

11. Olee otú nzukọ Ndị Kraịst ga-esi nyere gị aka?

11 Ná nzukọ ha dị iche iche, bụ́ ndị a na-enwekarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị ga-amụtakwu banyere ụzọ Jehova. A ga-ewusikwu ọchịchọ i nwere ikpe ezi okpukpe ike. Ị ga-enwetakwa ọzụzụ n’ụzọ isi nyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu Bible.​—Ndị Hibru 10:​24, 25.

Ebe otu ọgbakọ na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze

12. Olee otú ekpere pụrụ isi nyere gị aka ijere Chineke ozi?

12 Ka ị na-amụtakwu ihe banyere uche Jehova na nzube ya, o yikarịrị ka ị ga-eji ụzọ ịhụnanya ya kpọrọ ihe karị. I kwesịkwara ito eto n’ọchịchọ i nwere ime ihe na-atọ ya ụtọ na izere ihe ndị na-adịghị amasị ya. Cheta na ị pụrụ ịgakwuru Jehova n’ekpere iji rịọ ya ka o nyere gị aka ime ihe ziri ezi ma na-ezere ihe ọjọọ.​—1 Ndị Kọrint 6:​9, 10; Ndị Filipaị 4:6.

Ebe otu ezinụlọ na-amụkọ Baịbụl ọnụ

Olee otú ị pụrụ isi na-efe ezi ofufe?

13. Olee otú ị pụrụ isi mee ka obi Jehova ṅụrịa?

13 Ka oge na-aga, ka ị na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ, obi abụọ adịghị ya na ị ga-ahụ mkpa ọ dị ịghọ Onyeàmà Jehova raara onwe ya nye, nke e mere baptizim. Site n’ịghọ otu n’ime ndị Jehova, ị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ị ga-eso ná ndị obi ụtọ bụ́ ndị Chineke na-ekwu banyere ha, sị: “M ga-ebi n’etiti ha, jegharịakwa n’etiti ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.”​—2 Ndị Kọrint 6:16.

Enweere M Onwe M Pụọ n’Aka Ndị Mmụọ Ọjọọ

Ebe Nwanna nwaanyị Josephine Ikezu na ụfọdụ ụmụ ya nọ

N’otu abalị ka mụ na di m dina n’àkwà na-ehi ụra, anụrụ m ka otu olu kpọrọ aha m ugboro atọ. Ahụziri m ka uko ụlọ kewara abụọ, ihe yiri bọl nke na-acha ka ọkụ wee dakwasị m n’afọ. Ma di m ahụghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a. Ka o sina dị, enwere m oké ahụ́ ikpo ọkụ nke dịruru ọtụtụ ọnwa.

Ọnwa isii ka e mesịrị, olu ahụ kpọrọ m ọzọ. Ozugbo ahụ, o yiri ka ụlọ anyị dum ọ̀ dị n’ime mmiri dị ogbu. Otu nnukwu eke si n’ime mmiri ahụ pụta ma gbakụọ m n’aka. Agbalịrị m ifechapụ ya ma efechapụlighị m ya. Egwu jidere m. Mgbe ahụ ahụkwaghị m mmiri ahụ na agwọ ahụ, e wee tụọ m n’ala n’ụzọ siri ike. Amaghị m onwe m ruo ọtụtụ awa. Olu ahụ wee gwa m ka m laghachi n’ụlọ mgbaasị dị n’ime obodo bụ́ ebe a na-agwọ ọrịa. Mgbe m jụrụ mmụọ ahụ aha ya, ọ gwara m aha nke pụtara “onye nwere akụ̀ na ụba ma o nweghị nwa.” O kwere m nkwa na ya ga-eme ka m baa ọgaranya site n’ikike ịgwọ ọrịa.

Ndị ọrịa si n’ebe nile na-abịakwute m. Tupu ha abịarute n’ụlọ m, m ga-ahụ ha n’enyo pụrụ iche m nwere. Mgbe ahụ, mgbe mmadụ bịara, m ga-akụ ọbụ aka m na nke ya, a ga-ekpughekwara m ozugbo ahụ ụdị ihe na-arịa ya ma ọ bụ nsogbu ya na ihe ga-agwọ ya. Mmụọ ahụ na-agwakwa m ego ole ndị mmadụ ga-akwụ.

Ego na onyinye na-ezo ka mmiri n’ihi ịdị irè nke ọgwụgwọ ahụ. M wee ghọọ “onye nwere akụ̀ na ụba,” ma amatakwara m ihe ọ pụtara bụ́ na “o nweghị nwa.” Oge ọ bụla m mụrụ nwa, nke tọrọ nke ahụ ga-anwụ. Nke a wetaara m obi ilu dị ukwuu. N’ime afọ 12 m jeere mmụọ a ozi, ụmụ m isii nwụrụ.

Amalitere m ikpegara Chineke ekpere maka enyemaka. Ekpesiri m ekpere ike. Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m. Ọ bụ ezie na m na-adị achụpụ ha, ekpebiri m ige ntị n’ụbọchị ahụ. Ná mkparịta ụka ndị sochirinụ, m mụtara na ọ bụ mmụọ ọjọọ ka m na-ejere ozi! Ekpebiri m isepụ aka ná mgbaasị.

Mgbe m gwara ya mmụọ ahụ, ọ dọrọ m aka ná ntị banyere mkpebi m. Otú ọ dị, asịrị m: “Nke mụ na gị ebiela.”

Akpọrọ m ihe nile m ji na-agba afa ọkụ. Mụ na Ndịàmà mụrụ Bible, m wee ghọọ ohu Jehova, e meekwa m baptizim na 1973. Ugbu a, enwere m ụmụ ise ahụ́ dị mma. Di m ghọkwara Onyeàmà e mere baptizim.​—Dị ka Josephine Ikezu si kọọ.

Igbe: Olee otú otu nwanyị si nwere onwe ya pụọ n’aka ndị mmụọ ọjọọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya