Olee Ebe Ụwa A Na-eche Ihu?
Nsogbu ndị siri ike na ihe omume ndị na-awụ akpa oyi n’ahụ́ aghọwo ihe a na-anụ kwa ụbọchị n’ụwa nile! Gịnị ka ọ pụtara?
NCHEBE ONWE ONYE: Bọmbụ agbawaa n’ọma ahịa. A gbaa ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ égbè n’ụlọ akwụkwọ. A tọrọ ụmụ ọhụrụ mgbe ndị mụrụ ha lefutụrụ anya. A wakpoo ndị inyom na ndị agadi nwoke n’ehihie ọcha.
ỌNỌDỤ OKPUKPE: Chọọchị akwadoo òtù dị iche iche na-alụrịta agha. E boo ndị ndú okpukpe ebubo itinye aka ná mgbukpọ agbụrụ. Ndị ụkọchukwu edinaa ụmụaka; chọọchị ekpuchie ya. Ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị adalata; e ree ọtụtụ ụlọ chọọchị.
GBURUGBURU EBE OBIBI: E gbukpọọ oké ọhịa maka achụmnta ego. Ndị ogbenye egbutusịa osisi iji nweta nkụ. E metọọ mmiri dị n’ime ala, ọ dịghịzi mma ọṅụṅụ. Ihe mkpofu sitere n’ụlọ mmepụta ihe na ụzọ ọgbara ọhụrụ ụfọdụ e si akụ azụ emebie ọrụ ịkụ azụ. E metọọ ikuku.
ỊKPATA IHE E JI EBI NDỤ: A kọọ na ego otu onye na-akpata ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara n’otu afọ bụ $480 (U.S.). Anyaukwu nke ndị isi ọrụ eduga ná ndakpọ nke ụlọ ọrụ, na-eme ka ọtụtụ puku mmadụ gharazie inwe ọrụ. Ego ndị nwere òkè n’ụlọ ọrụ achụmnta ego kpakọbara ná ndụ ha efunahụ ha n’ihi wayo.
ỤKỌ NRI: Ihe dị ka mmadụ 800,000,000 n’ụwa nile na-ebu ọnụ alakpu ụra mgbe nile.
AGHA: Ihe karịrị 100,000,000 mmadụ nwụrụ n’agha na narị afọ nke 20. E nwee ngwá agha nuklia zuru iji bibie ihe nile a kpọrọ mmadụ ọtụtụ ugboro. Agha obodo. Iyi ọha egwu na-achọ irikpu ụwa nile.
ỌRỊA NA-EFE EFE NA NRỊANRỊA NDỊ ỌZỌ: Malite na 1918, ahụ́ ọkụ si Spen gburu mmadụ 21,000,000. Ọrịa AIDS aghọziela “ọrịa na-efe efe nke kasị mebie ihe n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.” Ọrịa cancer na ọrịa obi na-akpata oké mwute n’ụwa nile.
Elela akụkọ ndị ahụ anya n’otu n’otu. Hà bụ ihe omume ndị mere nanị n’otu ebe? Ka hà bụ akụkụ nke ihe na-eme n’ụwa nile nke nwere ihe dị mkpa ọ na-ezo aka na ya?
[Igbe na Ihe Osise dị na peeji nke 5]
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
N’ịbụ ndị ihe omume ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ma ọ bụ oké mfu onwe onye na-ewute, ọtụtụ ndị na-eche ihe mere na Chineke adịghị eme ihe ọ bụla iji gbochie ihe ndị dị otú ahụ.
Chineke na-eche banyere anyị n’ezie. Ọ na-enye nduzi a pụrụ ịdabere na ya na ezi nnwere onwe ugbu a. (Matiu 11:28-30; 2 Timoti 3:16, 17) O mewo ndokwa ime ka ime ihe ike, ọrịa, na ọnwụ kwụsị kpam kpam. Ndokwa ndị o mere na-egosi na ọ na-eche ọ bụghị nanị banyere ndị nke otu mba kama banyere ndị nke mba, agbụrụ, na asụsụ nile.—Ọrụ 10:34, 35.
Olee ókè anyị na-echeru banyere Chineke? Ị̀ maara onye Onye kere eluigwe na ala bụ? Gịnị bụ aha ya? Gịnị bụ nzube ya? Ọ zara ajụjụ ndị a na Bible. N’ebe ahụ ọ na-agwa anyị ihe ndị ọ na-eme iji kwụsị ime ihe ike nakwa ọrịa na ọnwụ. Iji rite uru, olee ihe a chọrọ n’aka anyị? Ọ dị anyị mkpa ịmụ banyere ya na nzube ya. Olee otú anyị ga-esi tụọ anya irite uru ná ndokwa ya ma ọ bụrụ na anyị egosighị okwukwe n’ebe ọ nọ? (Jọn 3:16; Ndị Hibru 11:6) Ọ dịkwa mkpa ime ihe ọ na-achọ. (1 Jọn 5:3) Ị̀ na-eche banyere Chineke ruo n’ókè nke na ị ga-achọ ime otú ahụ?
Iji ghọta ihe mere Chineke ji kwe ka ọnọdụ ndị dị ugbu a dịrị, anyị aghaghị ịghọta otu ihe iseokwu dị mkpa. Bible kọwara ya. E mere ka a mata ihe iseokwu a na peeji nke 15 nke akwụkwọ a.