Isi 7
Olee Mgbe Mbibi Ụwa E Buru Amụma Ya Ga-abịa?
1. Oké nzube dị aṅaa ka Chineke nwere maka ụmụ mmadụ?
LEE ihe ịtụrụ ume ndụ ọ ga-abụ ịhụ ka e wetara agha, imempụ na mmetọ ụwa ná njedebe! Lee oké ihe ọṅụ ọ ga-abụ ibi ndụ n’okpuru ọchịchị ezi omume nke eziokwu, ebe mmadụ na ezinụlọ ya ga-anọ ná ntụkwasị obi zuru ezu! Bible na-egosi na Chineke ga-eme ka ihe a nile mezuo. Ma ọ̀ bụ n’ole mgbe?
2. (a) Mgbe “ụbọchị Jehova” bịara, ònye ka a ga-ejide na mberede? (b) Ànyị pụrụ isi aṅaa gbochie nke ahụ ime anyị?
2 Banyere mbibi ụwa nke ga-enye ohere maka Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke, Pọl onyeozi na-asị: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke [Jehova, NW] na-abịa.” O kwukwasịrị: “Ma unu onwe unu, ụmụnna anyị, anọghị n’ọchịchịrị, ka ụbọchị ahụ wee jide unu na mberede dị ka onye ohi.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 4) Ya mere, mgbe “ụbọchị nke [Jehova, NW]” rutere, ndị ahụ jụrụ ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ ga-adị ka anụ ọnyà matara na mberede. Ma ọ bụghị iwu na nke a aghaghị ime gị. Dị ka akwụkwọ nsọ na-ekwu, e nwere mmadụ ndị ‘na-anọghị n’ọchịchịrị.’ Nke a bụ n’ihi na ha chọpụtara ma kwerekwa ihe Okwu Chineke kwuru banyere ụbọchị anyị.—Luk 21:34-36.
3, 4. (a) N’ole ebe ka a kọwara ihe ihe ndị na-emenụ na narị afọ nke iri abụọ nke a bụ ihe àmà ya n’ụzọ zuru ezu? (b) Ọkpụrụkpụ ihe ise dị aṅaa e setịpụrụ n’ime Bible ka anyị na-aga inyocha?
3 Bible kọwara n’ụzọ doro anya ihe omume nke narị afọ iri abụọ nke a. Ma o mere nke a n’ihe dị ka puku afọ abụọ tupu oge ya! Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime ihe omume ndị a bụ ihe omume ndị a maara nke ọma, nanị Bible zoro aka n’ihe ha pụtara n’ùjú.
4 Ozi amụma dị n’ime Bible banyere ụbọchị anyị na-akọwa ihe ndị a: (1) Afọ ahụ kpọmkwem mgbe Chineke ga-enye “onye ọ bụla ọ chọrọ” “alaeze nke mmadụ.” (2) Ihe omume dị ịrịba ama ndị ga-ewere ọnọdụ n’oge a a maara dị ka “ọgwụgwụ usoro ihe dị iche iche, [NW].” (3) Ihe omume dị iche iche nke okpukpe ndị e kwesịrị ịrịba ama n’oge ahụ. (4) Nlanarị nke ma ọ dịkarịa ala ụfọdụ n’ime ọgbọ nke hụrụ mmalite nke “ọgwụgwụ usoro ihe dị iche iche, [NW].” (5) Ihe dịgasị njọ ndị na-esite n’ihe omume nile n’ụwa dị ka ihe ngosi ikpeazụ nke na mbibi ụwa dị nnọọ nso. Ka anyị nyochaa isi ihe ndị a.
(1) Afọ ahụ A Kara Aka—1914 O.A.
5. N’afọ dị aṅaa laa azụ tupu o mee ka Ndịàmà Jehova ghọtara na Bible zoro aka na 1914 O.A. dị ka afọ pụrụ iche?
5 Laa azụ na 1876, Ndịàmà Jehova ghọtara na amụma Bible kara afọ 1914 O.A. akara dị ka oge mgbe oké ihe omume dị iche iche ga-ewere ọnọdụ, bụ́ ndị ga-enwe mmetụta dị ukwuu n’ihe ndị mmadụ na-eme. Ha kpọsara ihe kpatara ihe nke a ji bụrụ eziokwu n’ebe nile.
6. (a) Gịnị ka a kọwara na Daniel 4:2, 3, 17? (b) Ònye bụ “onye” ahụ Jehova nyere “alaeze”?
6 Ọ bụrụ na ị sapeta Bible gị na Daniel isi 4, ị ga-achọpụta otu amụma nke na-ekpughe nzube Chineke metụta ọkaaka ya n’elu ala. A sịrị na nzube nke imezu amụma nke a bụ “ka ndị dị ndụ wee mara na onye ahụ nke kachasị ihe nile elu na-achị achị n’alaeze nke mmadụ, ọ bụkwa onye ọ bụla ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya.” (Amaokwu 2, 3, 17) “Onye” nke a nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu nyere “alaeze” bụ Kraịst Jisọs. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible kwukwara banyere mgbe e nyere ya “alaeze nke ụwa” dị ka Eze nke eluigwe. (Mkpughe 11:15; 12:10) Mgbe ahụ, nke a pụtara, na amụma Daniel na-emetụta oge mgbe Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ site n’inye Jisọs Kraịst “alaeze nke ụwa.” Olee mgbe amụma ahụ gosiri na nke ahụ ga-abụ?
7. (a) Nrọ amụma dị aṅaa ka a kọwara na Daniel 4:10-16? (b) Ò si aṅaa metụta Eze Nebukadneza?
7 Nrọ amụma ahụ dị na Daniel kọwara otu osisi buru ibu e gbuturu n’ala, werekwa ígwè na ọla kee ya agbụ ruo mgbe “oge asaa” ga-agafe ya n’isi. N’oge ahụ, a ga-enye ya “obi anụ ọhịa.” (Daniel 4:10-16) Nke a ọ̀ pụtara gịnị? Chineke kpaliri Daniel ịkọwa: Nebukadneza, bụ́ eze Babilọn, ga-atụfu ọgụgụ isi ya, a ga-ewepụkwa ya n’ocheeze ya ma chụpụ ya n’etiti ụmụ mmadụ ịga biri dị ka anụ ọhịa. Mgbe afọ asaa gasịrị eze ahụ ga-enweghachi ọgụgụ isi ya. Nke a mere eze ahụ n’ezie, e weghachikwara ya n’ocheeze ya dị ka onye mataworo ọkaaka nke ịchịisi Chineke. (Daniel 4:20-37) Otú ọ dị, ihe a nile nwere mmezu ka ukwuu, ọ bụkwa n’ihi ya ka e ji dekọọ ya n’ime Bible.
8. (a) Olee alaeze mmezu ka ukwu nke amụma ahụ metụtara? (b) Ná mmezu ka ukwu, gịnị ka mgbutu nke osisi ahụ nọchiri anya ya, è sikwa aṅaa ‘nye ya obi nke anụ ọhịa’?
8 Mmezu ka ukwuu metụtara ịchịisi ka elu nke ga-abara ihe nile dị ndụ n’elu ụwa uru. Site na ya, ka amụma ahụ na-ekwu, a ga-enwe “ihe oriri izuru ihe nile” na nchebe nye ọbụna anụmanụ na nnụnụ nile. (Daniel 4:12) Nanị ọchịchị ga-eweta uru ndị a bụ Alaeze Chineke. Ụkpụrụ nile nke ezi omume nke ọchịchị a ka e mere ihe atụ ya site n’akụkọ Juda, na ndị eze ya n’ime Jerusalem. Ma n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi, Jehova kwere ka Babilọn merie Juda na 607 T.O.A. Ọ bụ dị ka e gbutụrụ osisi nke nrọ ahụ keekwa úkwù ya agbụ. N’enweghị ntinye aka Chineke, gọọmenti mba dị iche iche achịwo isi n’elu ụwa kemgbe ahụ. Ebe a na-eji “anụ ọhịa” ese onyinyo alaeze ndị a n’ime Bible, ọ dị ka a ga-asị na mmụọ ozi sitere n’eluigwe amawo ọkwa, sị: “Ka e nye ya obi anụ ọhịa; ka oge asaa gabigakwa ya n’isi.” (Daniel 4:16; 8:1-8, 20-22) Ma ka oge na-aga, “oge asaa” ndị ahụ nke ịchịisi site n’aka ọchịchị ndị dị ka anụ ọhịa ga-agwụsị. Mgbe ahụ a ga-ewepụsị ‘agbụ’ ndị ahụ, “osisi” ahụ ga-etolitekwa ọzọ mgbe onye ahụ Jehova ga-enye “alaeze nke ụwa” ga-amalite ịchị achị.
9, 10. (a) N’ịchọpụta ịdị ogologo nke “oge asaa” ahụ, otu oge ọ̀ hà aṅaa n’ogologo, Bible sikwa aṅaa gosi nke a? (b) Olee mgbe “oge asaa” ahụ malitere, afọ ole ka ọ ga-abụ, oleekwa mgbe ha gwụsịrị?
9 “Oge asaa” ndị a ha hà aṅaa n’ogologo? Ha karịrị nanị afọ asaa nke ukwuu, n’ihi na mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, Jisọs Kraịst gosiri na “oge nke mba ọzọ” ka na-agakwa n’ihu. Ha anọgidewo na-achị ụwa kemgbe Babilọn merisịrị Jerusalem na 607 T.O.A., ha ga-anọgidekwa na-eme otú ahụ ruo oge ụfọdụ.—Luk 21:24.
10 Rịba ama n’onwe gị otú Bible si agụkọ “oge” amụma. Mkpughe 11:2, 3 na-egosi na 1,260 ụbọchị mejupụtara 42 ọnwa, ma ọ bụ afọ atọ na ọkara. Mkpughe 12:6, 14 zoro aka n’otu ọnụ ọgụgụ ụbọchị ahụ (1,260) ma na-akpọtụ ha uche dị ka “otu oge [1], na oge abụọ [2], na nkera otu oge,” ma ọ bụ “oge” atọ na ọkara. Nke ọ bụla n’ime “oge” ndị ahụ dị 360 ụbọchị (3 1/2 × 360 = 1,260). Nke ọ bụla n’ime ụbọchị ndị a nke “oge” amụma na-anọchi anya otu afọ zuru ezu dị ka ụkpụrụ ‘otu ụbọchị n’ọnọdụ otu afọ’ si dị. (Ọnụ Ọgụgụ 14:34; Ezikiel 4:6) Ya mere, “oge asaa” ahụ dị 2,520 afọ (7 × 360). Malite n’udu mmiri nke 607 T.O.A., mgbe e wedara ihe nnọchianya nke ọchịchị Chineke na Juda n’ala site n’aka Babilọn, 2,520 afọ ga-eburu anyị ruo n’isi ọkọchi nke 1914 O.A. (606 1/4 + 1913 3/4 = 2,520) Nke ahụ bụ afọ mgbe o ruru ka e nye Jisọs Kraịst “alaeze nke ụwa.”
11. Gịnị ka ndị ọkọ akụkọ na-ekwu banyere ihe ịrịba ama nke afọ ahụ bụ 1914?
11 Ka ha ghọtasịrị na ihe ndekọ Bible zoro aka na 1914, Ndịàmà Jehova aghaghị ichere ruo ọtụtụ iri afọ tupu ha ahụ ihe ga-esi na ya pụta. Ọnọdụ ụwa nke dị jụụ ná mmalite 1914 mere na ọ dị ọtụtụ mmadụ ka ọ bụ na ọ dịghị ihe ọ bụla ga-eme. Ma tupu oge ọkọchị ahụ agafee, e gosiri izi ezi nke obi ike Ndịàmà ahụ mgbe ụwa banyere n’agha nke na-enweghị ihe dịworo ka ya. Ná nnyocha nke akwụkwọ ahụ bụ 1914, ọkọ akụkọ bụ A. L. Rowse dere, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị mgbe e nwere afọ kara akara ọgwụgwụ nke otu ọgbọ nakwa mmalite nke ọgbọ ọzọ, ọ bụ 1914. Afọ ahụ wetara ọgwụgwụ nke ụwa ochie na nghọta ya nke ịnọ ná ntụkwasị obi, wee malite ọgbọ ọhụrụ nke ihe e ji mara ya bụ anọghị ná ntụkwasị obi nke bụ ihe anyị na-ahụ kwa ụbọchị.”44 Akụkọ banyere nwa amaala Britain bụ Winston Churchill kwuru, sị: “Mgbọ ahụ a gbapụrụ na June 28, 1914, n’ime Sarajevo, agbaghasịwo ịnọ ná ntụkwasị obi na ike nchepụta ihe nke ụwa . . . Ụwa abụghịkwa ihe ọ bụ na mbụ kemgbe ahụ. . . . Ọ bụ ebe ntụgharị, ụwa ụnyaahụ mara mma, nke dị ebube dịkwa jụụ, apụwo n’anya, ọ gaghị adịghachikwa ọzọ.”45 Afọ ahụ nke amụma Bible kara akara n’ọtụtụ narị afọ tupu o rute n’ezie ghọrọ ebe ntụgharị n’akụkọ ihe mere eme.
12. Gịnị butere oké ọgba aghara n’ihe omume ụmụ mmadụ n’afọ 1914 na mgbe ọ gasịrị?
12 Ọ pụrụ ịbụ ihe ijuanya na mbụ na agha a na-enwebeghị ihe yiri ya ga-aka ịnọdụ n’ocheeze nke Kraịst akara n’elu ala. Ma echefukwala na Setan bụ́ Ekwensu bụ “onyeisi nke ụwa.” (Jọn 14:30) Ọ chọghị ịhụ ka Alaeze Chineke na-achịkwa ihe omume nile nke ụwa. Iji chigharịa uche pụọ n’Alaeze ahụ, o tigharịrị ụmụ mmadụ anya ịbanye n’agha iji kwado nzọrọ nke onwe ha maka ịchịisi. Ọzọkwa, Bible na-egosi na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya gbalịrị ilomi ọchịchị Alaeze ahụ mgbe a mụpụtara ya. Gịnị siri na ya pụta? “Agha wee pụta n’eluigwe . . . E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.” Ebe ọ bụ na “nanị nwa oge” fọdụụrụ Setan, ọ na-ewe oké iwe. (Mkpughe 12:3-12) Narị afọ iri na itoolu tupu mgbe ya, Bible nyere ezi nkọwa nke ihe ga-esi na ya pụta.
(2) Ihe Omume Ndị Nwere Ihe Ịrịba Ama Pụrụ Iche
13. Olee ihe dubara Jisọs n’ikwu ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ oge a’?
13 N’afọ 33 O.A., Jisọs kọwara n’ùjú ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ oge a.’ E dekọrọ nke a na Matiu isi 24 na 25, Mak 13 na Luk 21. Mgbe ya na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya nọ na Jerusalem, Jisọs ekwuworị maka mbibi nke ụlọ nsọ dị ebe ahụ. Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ, sị: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-abụ? gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke [ọnụnọ NW] gị? na nke ọgwụgwụ oge a?”—Matiu 24:1-3.
14. Kpọọ aha ihe ụfọdụ pụtara ìhè nke Jisọs nyere n’ihe ịrịba ama ahụ.
14 N’azịza Jisọs sịrị: “Unu gaje ịnụ okwu agha dị iche iche na akụkọ agha dị iche iche: leenụ ka unu ghara ịtụ ụjọ: n’ihi na ihe ndị a aghaghị ịpụta; ma ọgwụgwụ ihe nile a kaerughị. N’ihi na mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche. Ma ihe ndị a nile bụ mmalite ihe mgbu.” Dị ka Luk 21:11 gosiri, ọ kpọtụkwara uche na ‘ọrịa na-efe efe dị iche iche ga-adị n’ebe dị iche iche.’ Ọ dọrọ aka ná ntị banyere ‘ịba ụba nke mmebi iwu.’ N’ihi nke a kwa, ọ sịrị na “ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.” Ọzọ, dị ka ihe ịrịba ama, o buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:4-14.
15, 16. (a) È nwere amụma ọ bụla nke Jisọs ndị mezuru tupu mbibi Jerusalem na 70 O.A.? (b) Ànyị si aṅaa mara na a ga-enwe mmezu ọzọ, bụ́ nke kakwa mkpa?
15 Ma a pụrụ ịjụ ajụjụ a, sị: ‘Ọ̀ bụ na e mezughị amụma ụfọdụ ndị a tupu mbibi nke Jerusalem site n’aka ndị Rom n’afọ 70 O.A.?’ Ee, e mezuru ụfọdụ. Ma ihe ka ukwuu ka na-abịa, dị ka amụma ndị ahụ n’onwe ha gosiri. N’ezie, Jisọs na-aza ajụjụ na-emetụta ndị na-eso ụzọ ya na mgbe ahụ kpọmkwem. Ma o jiri ohere ahụ nye ihe ọmụma nke oge dị anya banyere oge mgbe “Nwa nke mmadụ” ga-abịa ‘n’ike na ịdị ebube’ na mgbe “alaeze Chineke” ga-abịaru nso.—Luk 21:27, 31.
16 N’ezie, ihe ndị a ewereghị ọnọdụ n’oge e bibiri Jerusalem na 70 O.A. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, nke e dere na 96 O.A., na-egosi na ihe omume ndị a banyere Alaeze ahụ ka bụ n’ọdịnihu. (Mkpughe 1:1; 11:15-18; 12:3-12) N’iji ihe atụ mee ihe, Mkpughe na-egosi na agha, ụkọ nri, na ọrịa na-efe efe nke Jisọs buru amụma ya ga-abụ nke ga-eme n’ọdịnihu, na n’ụzọ na-enweghị atụ. Ha ga-aka akara oge ahụ mgbe Kraịst ga-amalite ma merizuo ndị iro nile nke Alaeze Chineke. (Mkpughe 6:1-8) Eziokwu nke bụ na akụkụ ụfọdụ nke amụma Jisọs mezuru na narị afọ nke mbụ gosiri ya dị ka eziokwu, na-enye ezi ihe mere a ga-eji tụkwasị obi n’ihe nile ọ bụla Jisọs kwuru na ọ ga-eme.
17. Ọnọdụ ụwa taa ọ̀ dị nnọọ iche n’ihe e nwere tupu 1914?
17 Amụma ndị a hà ahụwo mmezu ha ka ukwuu, nke zuru ezu na narị afọ nke iri abụọ nke a? Ndị na-amaghị ihe na-aga bụ́ ndị na-erubeghị 70 afọ pụrụ iche na oge anyị adịghị iche ọ bụla n’ihi na ha adịghị echeta oge mgbe ihe dịworo iche. Ma ndị meworo okenye karị, na ndị maara ihe ndị a kọrọ n’akụkọ ghọtara ihe na-emenụ nke ọma. Dị ka otu akwụkwọ akụkọ ihe mere eme kwuru banyere ihe ahụ mere na 1914, sị: “Nanị mba iri na ise bụ ndị na-etinyeghị aka n’agha ahụ . . . ma o nweghị oké mba n’etiti ha ga-enweworị ike ịrụ ọrụ dị ka onye ogbugbo nke udo. Nke a emetụbeghịkwa n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa; o nwebeghị agha nke ruru ókè ahụ. Amụma nke Bible Nsọ: ‘Mba ga-ebili megide mba ọzọ na alaeze megide alaeze ọzọ,’ bụ nke e mezuru n’ụzọ nkịtị.”46
18. Gịnị mere na anyị agaghị ezi ezi ma ọ bụrụ na anyị ekwubie na agha zuru ebe nile bụ nanị ihe dị ‘n’ihe ịrịba ama’ ahụ?
18 Ma ihe ndị dị otú ahụ abụghị nanị akụkụ nke ihe Jisọs kwuru ga-abụ “ihe ịrịba ama” ahụ. N’iji ihe atụ eme ihe, ọ sịrị: “Leenụ osisi fig, na osisi nile: mgbe ọ bụla ha puru epu ugbu a, unu hụrụ ya marakwa n’onwe unu na mgbe okpomọkụ dị nso ugbu a. Otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso. N’ezie asị m unu, ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe nile ga-eme.” (Luk 21:29-32) A sị na ị hụrụ otu osisi ka ọ na-agbụsị akwụkwọ na mgbe na-abụghị oge ya, ị gaghị eche na ọ bụ ọkọchị dị nso. Ma mgbe ị na-ahụ ka osisi nile na-epute akwụkwọ n’oge kwesịrịnụ, ị maara ihe ọ pụtara. Otú ahụkwa, Jisọs gosiri na ọ bụghị nanị agha kama ọtụtụ ihe ndị ga-eme n’otu oge ndụ nke otu ọgbọ ga-aka “ọnụnọ [NW]” ya na “ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, [NW]” akara.
19. (a) Dị ka e gosiri na chaatị na-esonụ, olee otú e siworo na-emezu ihe dị iche iche nke “ihe ịrịba ama” ahụ kemgbe 1914? (b) Gịnị mere agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ihe ndị ọzọ bụ ndị e nweworo na mbụ na-ejighị bụrụ akụkụ nke “ihe ịrịba ama” nke Jisọs kwuru okwu ya?
19 Ihe ndị ahụ hà emewo? Mgbe ị na-enyocha chaatị nke na-esonụ nke isiokwu ya bụ “Gịnị Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama Ahụ?” ị pụrụ icheta na ị gụwo banyere agha nke narị afọ ndị gafeworonụ. Ma Agha Ụwa nke Mbụ pụtara ìhè dị ka nke guzopụrụ iche n’ebe ndị ọzọ dị, ebe ntụgharị n’akụkọ ihe mere eme. Ị pụrụ ichetakwa na ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji, oge dị iche iche nke mmebi iwu, na mgbalị ndị pụrụ iche e mere iji kwalite udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ewerewo ọnọdụ tupu 1914. Ma, e nweghị oge ọzọ n’akụkọ ihe mere eme hụworo ihe nile ndị a ka ha bịakwasịrị otu ọgbọ n’ụzọ gafere ókè otú a. N’ikwu nnọọ eziokwu, ọ bụrụ na ihe omume kemgbe 1914 emezughị ihe ịrịba ama ahụ, gịnị ọzọ ka a chọrọ? N’enweghị obi abụọ, anyị na-ebi n’oge “ọnụnọ [NW]” nke Jisọs n’ike Alaeze.
20, 21. Olee otú ihe mere eme ndị e jikọrọ ha na Agha Ụwa nke Mbụ si gosi nanị “mmalite ihe mgbu,” dị ka Jisọs buru ụzọ kwuo?
20 Mpụta nke akụkụ dị iche iche nke “ihe ịrịba ama” ahụ apụtaghị na Alaeze Chineke ga-azachapụ ihe ọjọọ otu mgbe ahụ pụọ n’elu ụwa. Dị ka Jisọs bu ụzọ kwuo, “ihe ndị a nile bụ mmalite ihe mgbu.” (Matiu 24:8) Ihe ndị ọzọ ga-esochi. Akwụkwọ bụ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “Agha Ụwa nke Mbụ na ihe o butere dubara n’ụkọ akụ na ụba kasị njọ n’akụkọ ihe mere eme ná mmalite afọ ndị 1930. Ihe ndị agha ahụ butere na nsogbu idozigharị ihe iji nwee udo kpatara ọgba aghara n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná mba nile.”47 Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ. Ọ dị nnọọ oké njọ ọtụtụ okpukpu karịa nke mbụ. Kemgbe ahụ, ilelị ndụ na ihe onwunwe anya amụbawo, egwu maka mmebi iwu abụrụwokwa ihe mejupụtara ndụ a na-adị kwa ụbọchị. E wezugawokwa ụkpụrụ omume ọma n’ụsọ. Ntiwapụ nke ụba ọnụ ọgụgụ mmadụ na-eweta nsogbu ndị a na-adịghị elebara anya. Mmetọ mbara na-emebi ọnọdụ ndụ, na-etinyekwa ya n’ihe ize ndụ. E nwekwara iyi egwu nke mgbukpọ nuklia.
21 Olee mgbe “ihe mgbu” ndị a malitere? Star nke London na-asị: “Ndị ọkọ akụkọ ụfọdụ nke narị afọ na-esonụ pụrụ ikwubi na oge ụwa malitere ịgba ara bụ . . . [na] 1914.”48 Afọ ahụ, bụ́ 1914 abụrụworị nke amụma Bible buru ụzọ kaa akara.
(3) Ihe Omume Dị Iche Iche nke Okpukpe Ndị E Kwesịrị Ịrịba Ama
22. (a) Gịnị ka Jisọs jikọtara ya na ịba ụba nke mmebi iwu na ịjụ oyi nke ịhụnanya nke o buru amụma ya? (b) Olee otú ihe nile ndị ndú okpukpe na-ezi si tinye ihe n’ọnọdụ a?
22 Ọzọkwa, tinyere ihe omume ndị dị ịrịba ama nke Jisọs kwuru ga-aka “ọgwụgwụ oge a” akara bụ ihe ndị na-esonụ: “Ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-ebilikwa, duhiekwa ọtụtụ mmadụ. N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.” (Matiu 24:11, 12) Jisọs jikọrọ mmụba nke mmebi iwu na ịjụ oyi nke ịhụnanya ná mmetụta nke ndị amụma ụgha—ndị ozizi okpukpe ndị na-eji ụgha na-azọrọ na ha na-ekwuchitere Chineke. Ná mmalite, akwụkwọ a nyere ihe àmà na ndị ndú okpukpe akwadowo agha nke mba dị iche iche, wetuo ụkpụrụ omume Bible ala dị ka ihe mgbe ochie, werekwa akụkụ ụfọdụ nke Bible dị ka nke na-ezighị ezi. Gịnị si na ya pụta? ‘Ịjụ oyi’ nke ịhụ Chineke na iwu ya n’anya. Nke a abụrụwo ihe bụ isi butere ndakpọ nke omume ọma, tinyere inupụrụ ọchịchị isi na mmadụ enweghị nchegbu maka mmadụ ibe ya.—2 Timoti 3:1-5.
23, 24. Gịnị nọgideworo na-eme okpukpe n’afọ ndị na-adịbeghị anya?
23 N’ihi ọnọdụ ndị a, ọtụtụ nde mmadụ ahapụwo òtù okpukpe dị iche iche. Ụfọdụ na-echigharịkwuru Bible, na-ekwekọ n’ụzọ ya nile. Ndị ọzọ na-ewezuga onwe ha n’ihi mmechuihu na oké ịkpọasị. Ọtụtụ na-aghọ ndị iro nke okpukpe. Otu onye odeakụkọ sịrị: “Ọ ghaghị iju mmadụ anya na ókè dị ukwuu nke nsogbu ụwa bụ okpukpe na-akpata ha. Ọ bụkwa nanị ndị ọchịchị ụwa ole na ole bụ́ ndị na-emegiderịta onwe ha na-akpali oké ọchịchọ mwụfu ọbara nke agha okpukpe.” N’ihi nke a, ọ jụrụ, sị: “Gịnị mere na a gaghị emechi okpukpe?”49
24 E nwere ezi ihe ndekọ nke ndakpọ nke okpukpe ndị bụ isi. Dị ka ihe atụ, otu akụkọ banyere Italy na-egosi na ọ bụ ezie na 95 pasenti na-asị na ha bụ ndị Katọlik, “ọnụ ọgụgụ ndị na-aga ụka na Sunday dị ala karịa 20 pasenti.”50 Akụkọ ọzọ na-ekpughe na ọnụ ọgụgụ ndị ụkọchukwu n’ụwa nile ji 25,000 gbadaa ala n’ime afọ iri.51 N’ime United States ihe ọmụmụ e mere banyere chọọchị na-ekwu na “ndị Katọlik bụ ndị America na-echi fada ga-adalatakwa ala ruo 50 pasenti ka ọ na-eru n’afọ 2000.”52 U.S.News & World Report kwuru na e nwere “ndakpọ dị ukwuu n’ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke ndị na-abanye n’ụlọ akwụkwọ seminarị ndị Katọlik na United States, site n’ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 48,992 ruo 11,262 n’oge na-erughị 20 afọ.53 The New York Times kọrọ na gburugburu ụwa “ọnụ ọgụgụ ndị ụkọchukwu nwanyị adalatawo site 181,421 ruo 121,370” n’ime 15 afọ.54 Ọnọdụ dịkwa otú ahụ n’ọtụtụ okpukpe.
25. (a) N’ụzọ megidere nke ahụ, gịnị ka Bible na-ekwu ga-ewere ọnọdụ metụta ezi ofufe n’oge a? (b) N’okpuru nduzi ònye ka a na-eme nchịkọbata nke ndị na-efe ezi Chineke ofufe, ọ̀ bụkwa n’ihe ndabere dị aṅaa? (ch) Ihe iseokwu dị aṅaa ka mba nile na-eche ihu?
25 N’ụzọ na-emegide nke ahụ, Bible na-egosi na a ga-adọrọ “oké ìgwè mmadụ” site ná mba nile gaa n’ofufe Jehova n’oge ọgwụgwụ a. Jisọs kwuru banyere nchịkọta nke a na-asị na ya ga-ekewapụta otu onye n’ebe ibe ya nọ ma ọ̀ bụghị maka iji chebe ha gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ ọ bụrụ maka “mbipụ ebighị ebi [NW].” (Mkpughe 7:9, 10, 14; Aịsaịa 2:2-4; Matiu 25:31-33, 46) Gịnị bụ ihe na-ekewapụta ndị mmadụ maka nlanarị? Bible zara, sị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ma ndị mmadụ hà ga-esi aṅaa mata ihe bụ uche Chineke? Ọ bụ site n’ịnabata ọrụ izi ihe ahụ zuru ụwa ọnụ nke Jisọs kwuru banyere ya mgbe ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ ama nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Nkwusa nke a na-eche n’ihu ndị mmadụ nke mba nile ihe iseokwu bụ: Hà dịnyeere ịchịisi site n’aka Chineke? Ka ọ bụ, dị ka nrụgide Setan n’Iden si dị, hà chọrọ ọchịchị inwere onwe nke mmadụ? Jehova nyere ụmụ mmadụ ohere ime nhọrọ.
26, 27. (a) Ruo n’ókè hà aṅaa ka a rụrụworo ọrụ ịgba àmà nke a? (b) Gịnị mere ụzọ mmadụ si zaghachi n’ozi Alaeze ahụ ji bụrụ okwu dị mkpa?
26 Ịgba àmà zuru ụwa ọnụ banyere Alaeze ahụ na-amụbawanye n’ike n’ike. N’ihe karịrị 200 ala, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na-ejekwuru ndị mmadụ n’ebe obibi ha na-ekwerekwa isoro ha mụọ Bible, n’anaghị ha ego. Akwụkwọ ndị ha ji eme ihe bụ n’ụzọ dị ukwuu akwụkwọ Bible ndị a kasị ekesa n’ụwa. N’ezie, ha so n’akwụkwọ nke ụdị ọ bụla ndị a kasị na-ekesa gburugburu ụwa. Ndị a dịkwa n’ihe dị ka 190 asụsụ dị iche iche.
27 Ọrụ nkewapụta nke a agawo n’ihu ruo ọtụtụ afọ ugbu a. O ruwokwa ọgwụgwụ ya nso ugbu a. Dị ka Okwu Chineke kwuru, a ga-ebipụ ndị ahụ jụworo ọchịchị Alaeze ya tinyekwara ndị ahụ ji enweghị mmasị leghaara ohere ha nwere ịmụta ihe banyere ya anya. (Matiu 25:34, 41, 46; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9) Nye ndị ọzọ ndị gosipụtara onwe ha ịbụ ndị nkwado nke Alaeze Chineke, nke a ga-abụ oge maka inwere onwe dị ukwuu. Ma olee mgbe ikpe a ga-abụ?
(4) ‘Ọgbọ A Agaghị Agabiga’
28. N’ime ogologo oge dị aṅaa ka Jisọs kwuru na mbibi ụwa e kwuru okwu ya ga-abịa?
28 Banyere “ụbọchị na oge awa ahụ,” ka Jisọs sịrị, “ọ dịghị onye ọ bụla matara, . . . ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” Ma Jisọs kwuru ihe ga-enye aka ịmata oge ya mgbe ọ sịrị: “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” (Matiu 24:34, 36) Ya mere, akụkụ nile dị iche iche nke “ihe ịrịba ama” ahụ, tinyere “mkpagbu ukwu” ahụ aghaghị iwere ọnọdụ n’ime oge ndụ nke otu ọgbọ—ọgbọ nke 1914. Nke a pụtara na ụfọdụ mmadụ ndị ahụ hụrụ ihe ndị merenụ n’afọ 1914, mgbe “ọgwụgwụ nke oge a” malitere, ka ga-anọ ndụ ịhụ ọgwụgwụ ya mgbe “mkpagbu ukwu” ahụ tiwapụrụ. Ndị na-echeta ihe ndị mere na 1914 ejemiwo n’afọ ndụ ugbu a. Ọtụtụ n’ime ha anwụwo. Ma Jisọs mesiri anyị obi ike na “ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị” tupu mbibi nke usoro ihe ọjọọ nke a abịa.—Matiu 24:21.
29. Site n’ikwe ka ihe ndị na-eme eme kemgbe 1914 ruo otú ha rụworo, olee otú Chineke siworo mee ka ọ dịrị ụmụ mmadụ mfe ime ezi mkpebi?
29 Lee ka Chineke siworo nwee ntachi obi n’ikwe ka e nwekwuo ohere nke a maka nchegharị! (2 Pita 3:9) Na nke mbụ n’akụkọ ihe mere eme, nsogbu dị iche iche eruwo ókè dị oké njọ—agha, mmetọ mbara, oké mmụba mmadụ, na ihe ndị ọzọ. Nke ọ bụla n’ime ha pụrụ iweta mbibi zuru ezu. Site n’ikwere ka ihe àmà ndị a jupụta, Chineke emewo ka ọ dịrị ụmụ mmadụ mfe ịhụ na mmadụ enweghị ihe ngwọta ha. N’otu mgbe ahụ, nkwusa nke “ozi ọma nke a nke alaeze” enyeworo ndị nwere obi eziokwu aka ịmata na Alaeze Chineke bụ nanị olileanya e nwere maka ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ya mere, Chineke na-enye ha oge igosipụta onwe ha n’akụkụ ya n’oké ihe iseokwu ahụ.
(5) Ihe Àmà Ikpeazụ
30. Ihe àmà ikpeazụ dị aṅaa nke ịdị nso nke mbibi ụwa ka Bible kọwapụtara kpọmkwem?
30 Ma otu ihe ọzọkwa ga-eme dị ka ihe ama doro anya na mbibi ụwa dị nso. Banyere nke a Pọl onyeozi dere, sị: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke [Jehova, NW] na-abịa. Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, . . . ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3; Luk 21:34, 35.
31, 32. (a) “Udo na ntụkwasị obi” ahụ nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpọsa ọ̀ ga-abụ nke ezie? (b) Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ ihe ize ndụ ikwere ka nke a duhie anyị?
31 Ndị ndú nke ụwa maara na agha nuklia ga-apụta igbusịsị ihe nile. Ọzọkwa, oké nsogbu dị iche iche ndị dị ka mmetọ mbara, oké mmụba nke ọnụ ọgụgụ mmadụ, na nsogbu ezinụlọ chọrọ nlebara anya na ego. Ya mere, ha na-achọ imezighachi mmekọrịta ndị e mebiri emebi nke mba nile. Ihe àmà gosiri nke a bụ mkpọsa nke òtù United Nations kpọsara 1986 dị ka ‘Afọ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile.” Nke a, n’arụghị ụka, bụ otu nzọụkwụ n’imezu okwu Pọl ndị e hotara n’elu. N’ezie, mkparịta ụka na nkwekọrịta nile nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị adịghị akpata ezi mgbanwe ọ bụla n’ime ụmụ mmadụ iji mee ka ha na-ahụ ibe ha n’anya. Ha adịghị akwụsị imempụ, ha adịghịkwa ewepụ ọrịa na ọnwụ. Ma amụma ahụ na-egosi na oge ga-abịa mgbe mba nile ga-akpọsa na ha enwetawo ókè ụfọdụ nke “udo na ntụkwasị obi.” Mgbe nke ahụ mere, “mbibi” ga-abịa na “mberede” n’isi ndị ahụ na-eduhie ndị mmadụ, tinyere ndị nile tụkwasịrị ha obi.
32 Ma a ga-enwe ndị lanarịrị. Ị̀ ga-abụ otu n’ime ha?
Igbe dị na peeji nke 78, 79]
“Gịnị Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama ahụ?”
“Mba Ga-ebili Imegide Mba Ọzọ”—
“Agha Ụwa nke Mbụ webatara narị afọ nke Agha Zuru Ezu, nke—ná nghọta mbụ zuru ezu nke okwu ahụ—agha zuru ụwa ọnụ. . . . O nwebeghị mgbe ọ bụla tupu 1914 ruo 1918 mgbe e nwere agha . . . metụtara akụkụ buru ibu nke ụwa otú a. . . . O nwebeghị mgbe e gbukpọrọ ụmụ mmadụ otú a n’akpaghị ókè.”—World War l, nke H. Baldwin dere.
Agha Ụwa nke Mbụ gburu 14 nde ndị agha na ndị nkịtị; Agha Ụwa nke Abụọ gburu 55 nde. Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, ọtụtụ narị nkwatu ọchịchị, ịgba ọchịchị mgba okpuru, na agha ewerewo ndụ nke ihe dị ka 35 nde mmadụ.
Ya mere, kemgbe 1914 ihe karịrị 100 nde mmadụ anwụwo n’agha!
‘Ụnwụ Nri Ga-adị’—
Ụkọ nri bibiri ọtụtụ mba mgbe Agha Ụwa Mbụ na nke Abụọ gasịrị.
Ugbu a, n’agbanyeghị afọ nile nke ọganihu ọkà mmụta sayensi, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụwa nọ n’agụụ. A mara amụma na ihe ruru 12 nde ụmụntakịrị na-anwụ kwa afọ tupu ha eruo otu afọ n’ihi erighị ezigbo nri. Kwa afọ ọtụtụ nde ndị ọzọ na-anwụkwa n’ihi otu ihe ahụ.
“Ajọ Ọrịa Na-efe Efe”—
E nweghị ihe ndekọ nke ọrịa zuru ọha ọnụ nke ruru ka Spanish influenza nke 1918 ruo 1919. Ma ọ dịkarịa ala 500 nde mmadụ butere ya; ihe karịrị 20 nde nwụkwara.
Ọkà mmụta ọgwụ na ahụ ike enwebeghị ike igbochi ihe ndị dị ka ọrịa obi iru n’ókè nke zuru ọha ọnụ. Ọrịa cancer bụ ihe otiti na-abawanye ụba. Ọnụ ọgụgụ nke ndị na-arịa ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ arịwo elu nke ukwuu.
“Ala Ọma Jijiji” n’Ebe Dị Iche Iche—
Na-adabere ebe e si nweta akụkọ, ọnụ ọgụgụ ndị e chere nwụrụnụ na-adị iche. Ma iji nye ihe atụ ole na ole: 30,000 ruo 32,000 nwụrụ n’ala ọma jijiji mere n’Italy na 1915; 100,000 ruo 200,000 na China na 1920; 95,000 ruo 150,000 na Japan na 1923; 25,000 ruo 60,000 n’India na 1935; 12,000 ruo 20,000 n’Iran na 1968; 54,000 ruo 70,000 na Peru na 1970; 20,000 ruo 23,000 na Guatemala na 1976; 100,000 ruo 800,000 na China na 1976. Kemgbe 1914 ọtụtụ puku ndị ọzọ anwụwo n’ọtụtụ narị ala ọma jijiji dị ukwuu gburugburu ụwa.
Ihe ndekọ site n’ebe dị iche iche na-egosi na ná nkezi ọnụ ọgụgụ nke ala ọma jijiji dị oké njọ n’afọ ọ bụla kemgbe 1914 arịwo elu ọtụtụ okpukpu karịa nkezi nke ọnụ ọgụgụ na 2,000 afọ ndị bu ụzọ.
“Ihe Na-emebi Iwu Ga-aba Ụba”—
Ị maara ihe ndị merenụ. Ịrị elu nke imempụ na-emetụta mba ọ bụla n’elu ụwa. O metụtawo ndụ gị onwe gị. N’ógbè ebe i bi, gịnị nọworo na-eme n’ụlọ akwụkwọ nile? À na-eji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’ebe i bi? Gịnị banyere emeghị ihe n’eziokwu n’azụmahịa? Ahụ ọ̀ na-eru gị ala ịga n’okporo ụzọ n’abalị?
Mmebi iwu abụghị nanị metụta iwu ụmụ mmadụ, kama o metụtara ọbụna karị iwu nke Chineke. (Lee 2 Timoti 3:1-5, 13.)
Ikwusa Alaeze Chineke Gburugburu Ụwa—
Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova n’ihe karịrị 200 ala na-arụ ọrụ nke a mgbe nile.
Nanị n’ime afọ iri gara aga, Ndịàmà Jehova etinyewo ihe dị ka ijeri awa anọ (puku nde) ná nkwusa ihu ọha nke ozi a. N’oge nke a kwa, ha bipụtara n’ihe dị ka 190 asụsụ, ihe karịrị 5 nde akwụkwọ ọgụgụ ndị na-adọrọ uche gaa n’Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị mmadụ.
Mkpọsa nke “Udo na Ntụkwasị Obi”—
Ndị ndú matara mkpa udo dị igbochi ọdachi nuklia nakwa imezi nsogbu ndị ọzọ na-akawanye njọ. Otu nzọụkwụ n’imezu nke a bụ mkpọsa nke òtù United Nations kpọsara 1986 dị ka afọ nke “udo, nchebe nke mba nile, na ijikọ aka ọnụ na-eme ihe.”—General Assembly, Agenda item 32, nnọkọ nke 39.
Ihe ndị a nile hà bụ “ihe ịrịba ama” nke gịnị? Na anyị na-ebi ugbu a n’ime “ọgwụgwụ oge a.” Na Kraịst ewerewo ocheeze ya nke eluigwe ma na-ekewapụta site na ndị nke mba nile ndị ahụ chọrọ ime uche Chineke n’ezie. Na “mkpagbu ukwu” ahụ dị oké nso. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, gụọ Matiu isi 24 na 25, Mak 13, na Luk 21.