Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kp p. 20-21
  • Ịṅa Ntị Zọpụtara Ndụ Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịṅa Ntị Zọpụtara Ndụ Ha
  • Nọrọ na Nche!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-eji Ịdọ Aka ná Ntị Ndị Sitere n’Aka Ndị E Kwesịrị Ịṅa Ntị Akpọrọ Ihe?
  • Ị̀ Mụ Anya Banyere Oge Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ikwere n’Amụma Bible Na-echebe Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • À Ga-azọpụta Gị Mgbe Chineke Mere Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Mgbapụ Maka Nchebe Tupu “Mkpagbu Ukwu” Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nọrọ na Nche!
kp p. 20-21

Ịṅa Ntị Zọpụtara Ndụ Ha

JIZỌS KRAỊST bu ụzọ nye ịdọ aka ná ntị banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu bụ́ nke hiwere isi n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. O kwughị ụbọchị ọ ga-abụ. Ma ọ kọwara ihe omume ndị ga-eduga ná mbibi ahụ. Ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ịnọ na nche nakwa isi n’ebe ahụ dị ize ndụ gbapụ.

Jizọs buru amụma, sị: “Mgbe unu hụrụ Jeruselem ka usuu ndị agha mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso.” O kwukwara, sị: “Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu . . . ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ, . . . mgbe ahụ ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.” Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ghara ịgaghachi iji bupụta ihe onwunwe ha. Ha kwesịrị ịgbapụ ngwa ngwa iji bụrụ ndị a zọpụtara ndụ ha.—Luk 21:20, 21; Matiu 24:15, 16.

Iji kwụsị nnupụisi dịruworo ogologo oge, Cestius Gallus duuru ndị agha Rom wakpoo Jeruselem na 66 O.A. Ọ banyere ọbụna n’ime obodo ahụ ma jiri ndị agha ya gbaa ụlọ nsọ ahụ gburugburu. Obodo ahụ malitere ịgba aghara. Ndị nọ na nche hụrụ na ọdachi eruola ka mmiri. Ma mgbapụ ọ̀ ga-ekwe omume? N’ụzọ a na-atụghị anya ya, Cestius Gallus kpọọrọ ndị agha ya laa. Ndị Juu ahụ na-enupụ isi chụsoro ha. Ugbu a bụ oge isi na Jeruselem na Judia nile gbapụ!

N’afọ na-esonụ, Vespasian na nwa ya bụ́ Titus kpọọrọ ndị agha Rom gaghachi. Agha biiri ọkụ ná mba ahụ dum. Ná mmalite afọ 70 O.A., ndị Rom jiri osisi a pịrị ọnụ wuo ogige siri ike gburugburu Jeruselem. E mechiri ụzọ mgbapụ nile. (Luk 19:43, 44) Òtù ndị na-emegiderịta ibe ha n’obodo ahụ gburịtara ibe ha. Ndị Rom gburu ndị fọdụrụ n’ime ndị ahụ ma ọ bụ dọrọ ha n’agha. E bibiri obodo ukwu ahụ na ụlọ nsọ ya kpam kpam. Dị ka onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ bụ́ Josephus si kwuo, ihe karịrị otu nde ndị Juu hụjuru anya ma nwụọ. E wughachibeghị ụlọ nsọ ahụ.

A sị na Ndị Kraịst ahụ ka nọ na Jeruselem na 70 O.A., a gaara egbu ha ma ọ bụ kpụrụkọta ha na ndị nile nọ n’ebe ahụ dị ka ndị ohu. Otú ọ dị, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme n’oge ochie kọrọ na Ndị Kraịst ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke ma si na Jeruselem nakwa Judia dum gbaga n’ugwu ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. Ụfọdụ gara biri na Pela, nke dị n’ógbè Piria. Ha hapụrụ Judia, ha alaghachighịkwa. Ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs zọpụtara ndụ ha.

Ị̀ Na-eji Ịdọ Aka ná Ntị Ndị Sitere n’Aka Ndị E Kwesịrị Ịṅa Ntị Akpọrọ Ihe?

Mgbe ha nụsịrị banyere ọtụtụ ịdọ aka ná ntị na-emezughị, ọtụtụ ndị anaghịzi eji ịdọ aka ná ntị ọ bụla akpọrọ ihe. Otú ọ dị, ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị pụrụ ịzọpụta ndụ gị.

Na China na 1975, a dọrọ aka ná ntị na ala ọma jijiji ga-eme. Ndị ọchịchị mere ihe banyere ya. Ndị mmadụ meghachiri omume. A zọpụtara ndụ ọtụtụ puku mmadụ.

N’April 1991, na Philippines, ndị bi n’ime obodo nke dị ná mkpọda Ugwu Pinatubo kọrọ na ugwu ahụ na-agbọpụta uzu ọkụ na ntụ. Mgbe Ụlọ Ọrụ Na-amụ Banyere Ugwu Mgbawa na Ala Ọma Jijiji na Philippines nyochasịrị ọnọdụ ahụ ruo ọnwa abụọ, ha dọrọ aka ná ntị na agwọ nọ n’akịrịka. A kpọpụrụ ọtụtụ iri puku mmadụ n’ógbè ahụ n’egbughị oge. N’ụtụtụ June 15, mgbe ugwu ahụ si n’otu ebe gbawaa, ntụ ga-eju ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ibu ibu ya karịrị kilomita asatọ kpobanyere n’ikuku ma wụkwasị n’obodo ahụ. Ịṅa ntị zọpụtara ndụ ọtụtụ puku mmadụ.

Bible na-adọ aka ná ntị banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nke dị ugbu a. Anyị na-ebi ugbu a na mgbe ikpeazụ. Ka ọgwụgwụ na-eru nso, ị̀ nọ na nche? Ị̀ na-eme ihe iji ghara ịnọ n’ebe ahụ dị ize ndụ? Ị̀ na-eji echiche nke ịdị ngwa adọ ndị ọzọ aka ná ntị ka ha meekwa otú ahụ?

[Ihe osise dị na peeji nke 20]

Ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị zọpụtara ndụ ọtụtụ ndị mgbe Ugwu Pinatubo gbọpụtara ntụ ọkụ

[Ihe osise dị na peeji nke 21]

A zọpụtara ndụ Ndị Kraịst bụ́ ndị ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs mgbe e bibiri Jeruselem na 70 O.A.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya