“Ka Unu Wee Ghara Ịbanye n’Ọnwụnwa”
“[Nọrọnụ na] nche ma na-ekpe ekpere mgbe nile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.”—MATIU 26:41.
ỌNỌDỤ ahụ sibigara ike ókè—ọ dịghị ka nsogbu ọ bụla o nwetụworo. Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, nọ na nso ngwụsị nke ndụ elu ala ya. Jizọs ghọtara na a ga-ejide ya n’oge na-adịghị anya, maa ya ikpe ọnwụ, kpọgidekwa ya n’osisi ịta ahụhụ. Ọ maara na mkpebi ya na ihe ọ bụla o mere ga-emetụta aha Nna ya. Jizọs makwaara na ọ ga-ekpebi ihe ga-abụ ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ịbụ onye nchegbu ndị a nile chere ihu, gịnị ka o mere?
2 Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gara n’ogige Getsemeni. Ọ bụ ebe Jizọs na-enwekarị mmasị ịga. N’ebe ahụ, ọ nọpụtụrụ iche n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ. Mgbe nanị ya nọ, ọ kpọkuru Nna ya nke eluigwe maka ume, na-ekwupụta mmetụta ya n’ekpere sitere n’ala ala obi—ọ bụghị nanị otu ugboro kama ugboro atọ. Ọ bụ ezie na o zuru okè, Jizọs echeghị na ya pụrụ ịnagide nchegbu ahụ n’onwe ya.—Matiu 26:36-44.
3 Taa, anyị onwe anyị kwa na-enwe nsogbu. Ná mmalite nke broshuọ a, anyị tụlere ihe àmà na-egosi na anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a. Ọnwụnwa na nsogbu nke ụwa Setan na-esiwanye ike. Mkpebi na omume nke onye ọ bụla n’ime anyị nke na-azọrọ na ya na-ejere ezi Chineke ahụ ozi na-emetụta aha Ya, ọ na-emetụtakwa nke ukwuu atụmanya anyị maka ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ya. Anyị hụrụ Jehova n’anya. Anyị chọrọ ‘ịtachi obi ruo ọgwụgwụ’—ọgwụgwụ nke ndụ anyị ma ọ bụ ọgwụgwụ nke usoro ihe a, nke ọ bụla bu ụzọ bịa. (Matiu 24:13) Ma, olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe echiche nke ịdị ngwa, nọrọkwa na nche?
4 N’ịmata na ndị na-eso ụzọ ya—ma ndị nke oge gara aga ma ndị nke taa—ga-enwekwa nsogbu, Jizọs gbara ume, sị: “[Nọrọnụ na] nche ma na-ekpe ekpere mgbe nile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.” (Matiu 26:41) Gịnị ka okwu ndị ahụ pụtara nye anyị taa? Olee ọnwụnwa ị na-eche ihu taa? Oleekwa otú ị pụrụ isi ‘nọrọ na nche’?
Ọnwụnwa Ime Gịnị?
5 Kwa ụbọchị, a na-anwa anyị nile ịdaba “n’ọnyà nke Ekwensu.” (2 Timoti 2:26) Bible na-adọ anyị aka ná ntị na Setan elekwasịwo ndị na-efe Jehova anya karịsịa. (1 Pita 5:8; Mkpughe 12:12, 17) Gịnị bụ nzube ya? Ọ bụchaghị iji gbuo anyị. Setan agaghị enwe mmeri ma anyị nwụọ n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke. Setan maara na Jehova, n’oge ọ kara aka, ga-ewepụ mmetụta nke ọnwụ site ná mbilite n’ọnwụ.—Luk 20:37, 38.
6 Setan chọrọ imebi ọbụna ihe bara uru karịa ndụ anyị dị ugbu a—nguzosi ike anyị n’ezi ihe nye Chineke. Setan na-agbalị igosi na ya pụrụ ime ka anyị si n’ebe Jehova nọ chigharịa. N’ihi ya, ọ bụrụ na a pụrụ ime ka anyị kwụsị ikwesị ntụkwasị obi—kwụsị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ hapụ ụkpụrụ Ndị Kraịst—nke ahụ ga-abụrụ Setan mmeri! (Ndị Efesọs 6:11-13) N’ihi ya, “Onye Ọnwụnwa ahụ” na-eche anyị ọnwụnwa n’ihu.—Matiu 4:3.
7 “Ụzọ aghụghọ” Setan dịgasị iche iche. (Ndị Efesọs 6:11, Jewish New Testament) Ọ pụrụ iji ịhụ ihe onwunwe n’anya, egwu, inwe obi abụọ, ma ọ bụ ịchọ ihe ụtọ nwaa anyị. Ma otu n’ime ụzọ ndị kasị dị irè ọ na-eji eme ihe bụ nkụda mmụọ. N’ịbụ onye nrigbu dị aghụghọ, ọ maara na enweghị olileanya pụrụ ime ka anyị daa mbà, na-eme ka ọ dị mfe anyị ịdaba n’ọnwụnwa. (Ilu 24:10) Karịsịa, mgbe anyị nwere mmetụta nke ịbụ ndị ‘e gwepịara,’ ọ na-anwa anyị ịda mbà n’obi.—Abụ Ọma 38:8.
8 Ka anyị na-eruwanye nso n’ọgwụgwụ nke ụbọchị ikpeazụ, o yiri ka ihe ndị na-akpata nkụda mmụọ hà na-amụba amụba, ha na-emetụtakwa anyị. (Lee igbe bụ́ “Ihe Ụfọdụ Na-akpata Nkụda Mmụọ.”) N’agbanyeghị ihe kpatara ya, nkụda mmụọ pụrụ ịmịkọrọ ike anyị. ‘Ịzụpụta oge kwesịrị ekwesị’ maka ibu ọrụ ime mmụọ—gụnyere ịmụ Bible, ịga nzukọ Ndị Kraịst, na ikere òkè n’ozi—pụrụ ịbụ ihe ịma aka ma ọ bụrụ na ike gwụ gị n’ụzọ anụ ahụ́, n’uche nakwa n’ụzọ mmetụta uche. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Cheta na Onye Ọnwụnwa ahụ chọrọ ka ị kwụsị. Ma, ugbu a abụghị oge ibelata aka ma ọ bụ ịkwụsị inwe echiche nke ịdị ngwa banyere oge anyị nọ na ya! (Luk 21:34-36) Olee otú ị pụrụ isi guzogide ọnwụnwa ma nọrọ na nche? Tụlee aro anọ ndị pụrụ inye aka.
“Na-ekpe ekpere mgbe nile”
9 Dabere n’ebe Jehova nọ site n’ekpere. Cheta ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ n’ogige Getsemeni. Mgbe o nwere nchegbu dị ukwuu, gịnị ka o mere? O chigharịkwuuru Jehova maka enyemaka, na-ekpe ekpere sitere n’ala ala obi nke na ‘ọsụsọ ya bịara dị ka ntapụ ọbara nke na-atapụsị n’ala.’ (Luk 22:44) Cheedị banyere ya. Jizọs maara Setan nke ọma. Mgbe Jizọs nọ n’eluigwe, ọ hụrụ ọnwụnwa ndị Setan na-eji eme ihe iji mata ndị ohu Chineke n’ọnyà. Ma, Jizọs echeghị na ya pụrụ n’ụzọ dị mfe ịnagide ọnwụnwa ọ bụla Onye Ọnwụnwa ahụ pụrụ iche ya n’ihu. Ọ bụrụ na Ọkpara Chineke zuru okè hụrụ mkpa ọ dị ikpe ekpere maka enyemaka na ume sitere n’aka Chineke, lee ka anyị si kwesị ime otú ahụ karị!—1 Pita 2:21.
10 Chetakwa na mgbe ọ gbasịrị ndị na-eso ụzọ ya ume ‘ikpe ekpere mgbe nile,’ Jizọs kwuru, sị: “N’ezie, mmụọ na-anụ ọkụ, ma anụ ahụ́ adịghị ike.” (Matiu 26:41) Anụ ahụ́ ònye ka Jizọs na-ezo aka na ya? O doro anya na ọ bụghị nke ya; ọ dịghị ihe na-adịghị ike n’anụ ahụ́ ya zuru okè. (1 Pita 2:22) Ma ọnọdụ ndị na-eso ụzọ ya dị iche. N’ihi ezughị okè e ketara eketa na mkpali ime mmehie, enyemaka ga-adị ha oké mkpa iji guzogide ọnwụnwa. (Ndị Rom 7:21-24) Ọ bụ ya mere o ji gbaa ha—nakwa ezi Ndị Kraịst nile e nwere mgbe ha nwụsịrị—ume ikpe ekpere maka enyemaka n’iguzogide ọnwụnwa. (Matiu 6:13) Jehova na-aza ekpere ndị dị otú ahụ. (Abụ Ọma 65:2) N’ụzọ dị aṅaa? Ya dịkarịa ala n’ụzọ abụọ.
11 Nke mbụ, Chineke na-enyere anyị aka ịmata mgbe ọnwụnwa bịara. Ọnwụnwa Setan dị ka ọnyà e siri aghara aghara n’okporo ụzọ gbara ọchịchịrị. Ọ bụrụ na ị hụghị ha, ha pụrụ ịma gị. Site na Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible, Jehova na-ekpughe ọnyà Setan, si otú a na-enyere anyị aka izere ịdaba n’ọnwụnwa. N’ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, akwụkwọ ndị e biri ebi na usoro ihe omume mgbakọ ukwu na ndị nta anọwo na-eme ka anyị mata ihe ize ndụ ndị dị ka egwu mmadụ, mmekọahụ rụrụ arụ, ịhụ ihe onwunwe n’anya, na ọnwụnwa ndị ọzọ Setan na-eweta. (Ilu 29:25; 1 Ndị Kọrint 10:8-11; 1 Timoti 6:9, 10) Í nweghị ekele n’ebe Jehova nọ maka ime ka anyị mara atụmatụ Setan? (2 Ndị Kọrint 2:11) Ịdọ aka ná ntị nile dị otú ahụ bụ azịza nye ekpere i kpere maka enyemaka n’iguzogide ọnwụnwa.
12 Nke abụọ, Jehova na-aza ekpere anyị site n’inye anyị ume iji nagide ọnwụnwa. Okwu ya na-asị: ‘Chineke agaghị ekwe ka a nwaa gị gabiga ihe ị pụrụ ịnagide, kama mgbe ọnwụnwa ahụ bịara ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ.’ (1 Ndị Kọrint 10:13) Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa rikpuo anyị nke na anyị agaghị enwe ume n’ụzọ ime mmụọ iji guzogide ya—ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-adabere n’ebe Ọ nọ. Olee otú ọ na-esi emere anyị ‘ụzọ mgbapụ’? Ọ ‘na-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’ (Luk 11:13) Mmụọ ahụ pụrụ inyere anyị aka icheta ụkpụrụ Bible ndị pụrụ ime ka anyị kpebisie ike ime ihe ziri ezi ma nyere anyị aka ime mkpebi ndị ezi uche dị na ha. (Jọn 14:26; Jems 1:5, 6) Ọ pụrụ inyere anyị aka igosipụta àgwà ndị dị anyị mkpa iji merie mkpali ime ihe ọjọọ. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Mmụọ Chineke pụrụ ọbụna ịkpali ndị kwere ekwe ibe anyị ‘ịghọ ndị enyemaka na-eme ka anyị dị ike.’ (Ndị Kọlọsi 4:11) Í nweghị ekele na Jehova na-eji ụzọ ndị dị otú ahụ na-egosi ịhụnanya aza ekpere anyị na-ekpe maka enyemaka?
Na-enwe Ezi Uche n’Ihe Ndị Ị Na-atụ Anya Ha
13 Iji nọrọ na nche, ọ dị anyị mkpa inwe ezi uche n’ihe ndị anyị na-atụ anya ha. N’ihi nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ, anyị nile na-enwe ike ọgwụgwụ mgbe ụfọdụ. Ma anyị aghaghị icheta na ọ dịtụghị mgbe Chineke kwere nkwa na anyị ga-ebi ndụ nke nsogbu na-adịghị na ya n’usoro ihe ochie a. Ọbụna n’oge Bible, ndị ohu Chineke chere ihe isi ike ihu, gụnyere mkpagbu, ịda ogbenye, ịda mbà n’obi, na ọrịa.—Ọrụ 8:1; 2 Ndị Kọrint 8:1, 2; 1 Ndị Tesalonaịka 5:14; 1 Timoti 5:23.
14 Taa, anyị na-enwekwa nsogbu nke anyị. Anyị pụrụ inweta mkpagbu, inwe nsogbu ego, ịda mbà n’obi, ịrịa ọrịa, nakwa inwe nsogbu n’ụzọ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na Jehova na-echebe anyị n’ụzọ ọrụ ebube pụọ n’ihe nile na-emerụ ahụ́, nke ahụ ọ́ gaghị enye Setan ihe ọ ga-eji taa Jehova ụta? (Ilu 27:11) Jehova na-ekwe ka a nwaa ndị ohu ya ọnwụnwa ma lee ha ule, n’ọnọdụ ụfọdụ ruo n’ókè nke ha ịnwụchu ọnwụ n’aka ndị mmegide.—Jọn 16:2.
15 Oleezi ihe Jehova kwere ná nkwa? Dị ka anyị kwuworo na mbụ, o kwewo nkwa na ya ga-eme ka anyị nwee ike ịnagide ọnwụnwa ọ bụla pụrụ ịbịara anyị, ma ọ bụrụhaala na anyị atụkwasị ya obi kpam kpam. (Ilu 3:5, 6) Site n’Okwu ya, mmụọ ya, na nzukọ ya, ọ na-echebe anyị n’ụzọ ime mmụọ, na-enyere anyị aka ichekwa mmekọrịta anyị na ya. Mmekọrịta ahụ dịrịhaala otú o kwesịrị, ọ bụrụgodị na anyị anwụọ, ọ bụ anyị meriri. Ọ dịghị ihe ọ bụla—ọbụna ọnwụ—nke pụrụ igbochi Chineke ịkwụghachi ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ. (Ndị Hibru 11:6) N’ụwa ọhụrụ kwa nke dị nso ugbu a, Jehova ga-emezurịrị nkwa ngọzi ndị dị ebube fọdụrụnụ, bụ́ ndị o kwere ndị hụrụ ya n’anya.—Abụ Ọma 145:16.
Cheta Ihe Iseokwu Ndị Ahụ
16 Iji tachie obi ruo ọgwụgwụ, anyị aghaghị icheta ihe iseokwu ndị dị mkpa bụ́ ndị mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị. Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na nsogbu anyị eyie ka ọ̀ na-akarị ike anyị, anyị achọọkwa ịkwụsị, ọ ga-adị mma ka anyị cheta na Setan amawo oruru o ruuru Jehova ịbụ eze aka. Onye Nduhie ahụ agbaghawokwa nraranye na ikwesị ntụkwasị obi nke ndị na-efe Chineke ofufe. (Job 1:8-11; 2:3, 4) Ihe iseokwu ndị ahụ na ụzọ Jehova họrọwooro isi dozie ha dị mkpa karịa onye nke ọ bụla n’ime anyị. N’ụzọ dị aṅaa?
17 Nkwere Chineke kwere ka ihe isi ike dịrị ruo nwa oge enyewo ohere ka ndị ọzọ nata eziokwu ahụ. Chee banyere nke a: Jizọs tara ahụhụ ka anyị wee dị ndụ. (Jọn 3:16) Ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele maka nke ahụ? Ma, ànyị dị njikere idi ihe isi ike ruo nwa oge ka ndị ọzọkwa nwee ike inweta ndụ? Iji tachie obi ruo ọgwụgwụ, anyị aghaghị ịghọta na amamihe Jehova karịrị nnọọ nke anyị. (Aịsaịa 55:9) Ọ ga-akwụsị ajọ omume n’oge kasị mma maka idozi ihe iseokwu ahụ kpam kpam maka ọdịmma ebighị ebi anyị. N’ezie, ọ̀ dị ụzọ ọzọ ka mma isi mee ya? Chineke adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi!—Ndị Rom 9:14-24.
‘Bịaruo Chineke Nso’
18 Iji nọgide na-enwe echiche nke ịdị ngwa, ọ dị anyị mkpa ịnọrọ Jehova nso. Echefula na Setan na-eme ihe nile o nwere ike ime iji mebie ezi mmekọrịta anyị na Jehova. Setan ga-achọ ka anyị kwere na ọgwụgwụ ahụ agaghị abịa ma ọlị, nakwa na ọ baghị uru ikwusa ozi ọma ma ọ bụ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. Ma “ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna nke ụgha.” (Jọn 8:44) Anyị aghaghị ikpebisi ike ‘iguzogide Ekwensu.’ Anyị ekwesịghị iji mmekọrịta anyị na Jehova gwurie egwu. Bible ji ịhụnanya na-agba anyị ume, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:7, 8) Olee otú ị pụrụ isi bịaruo Jehova nso karị?
19 Ọ dị oké mkpa iji ekpere na-atụgharị uche. Mgbe nsogbu nke ndụ yiri ka hà na-akarị ike gị, gwa Jehova mmetụta ị na-enwe. Ọ bụrụ na ị kpọọ okwu aha, ọ ga-akara gị mfe ịhụ azịza ya nye arịrịọ gị. Ọtụtụ mgbe, azịza ya nwere ike ọ gaghị abụ kpọmkwem ihe i bu n’uche, ma, ọ bụrụ na ọchịchọ gị bụ ịsọpụrụ ya na ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, ọ ga-enye gị nkwado dị gị mkpa ka i wee nwee ihe ịga nke ọma n’ịtachi obi. (1 Jọn 5:14) Ka ị na-ahụ nduzi ya ná ndụ gị, ị ga-abịarukwu ya nso. Ịgụ banyere na ịtụgharị uche n’àgwà nakwa n’ụzọ Jehova, dị ka e kpughere ha na Bible, dịkwa oké mkpa. Ntụgharị uche dị otú ahụ ga-enyere gị aka ịmata ya nke ọma karị; ọ na-akpali obi gị ma mee ka ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ mikwuo emie. (Abụ Ọma 19:14) Karịa ihe ọ bụla ọzọ, ịhụnanya dị otú ahụ ga-enyere gị aka iguzogide ọnwụnwa na ịnọ na nche.—1 Jọn 5:3.
20 Iji nọrọ Jehova nso, ọ dịkwa mkpa ka anyị nọrọ ndị kwere ekwe ibe anyị nso. A ga-atụle nke a ná nkebi ikpeazụ nke broshuọ a.
AJỤJỤ MAKA IHE ỌMỤMỤ
• Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ nọ n’oké nchegbu na nso ngwụsị nke ndụ ya, gịnịkwa ka ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ime? (Para. 1-4)
• N’ihi gịnị ka Setan ji lekwasị ndị na-efe Jehova anya, oleekwa ụzọ ndị ọ na-esigasị anwa anyị ọnwụnwa? (Para. 5-8)
• Iji guzogide ọnwụnwa, n’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-ekpe ekpere mgbe nile (Para. 9-12), nwee ezi uche n’ihe ndị anyị na-atụ anya ha (Para. 13-15), na-echeta ihe iseokwu ndị ahụ (Para. 16-17), ‘na-abịarukwa Chineke nso’ (Para. 18-20)?
[Igbe nke dị na peeji nke 25]
Ihe Ụfọdụ Na-akpata Nkụda Mmụọ
Ahụ́ ike/afọ ndụ. Ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala ma ọ bụ ime agadi kpaara ihe anyị pụrụ ime ókè, anyị pụrụ ịda mbà n’obi n’ihi na anyị apụghị ijekwuru Chineke ozi.—Ndị Hibru 6:10.
Ndakpọ olileanya. Anyị pụrụ inwe mwute ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị adịghị emeghachi omume ná mgbalị anyị na-eme n’ikwusa Okwu Chineke.—Ilu 13:12.
Mmetụta nke abaghị uru. N’ihi ịbụ onye e mekpọrọ ọnụ ruo ọtụtụ afọ, mmadụ pụrụ ikwenyesi ike na ọ dịghị onye ọ bụla hụrụ ya n’anya, ọbụna na Jehova ahụghị ya n’anya.—1 Jọn 3:19, 20.
Mwute. Mmadụ pụrụ inwe nnọọ mwute nke na ọ ga-achọ ịkwụsị ịga nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ ikere òkè n’ozi ubi ma ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe ya emejọọ ya nke ukwuu.—Luk 17:1.
Mkpagbu. Ndị ọzọ, bụ́ ndị na-ekweghị n’ihe i kweere pụrụ imegide gị, ịkpagbu gị, ma ọ bụ ịkwa gị emo.—2 Timoti 3:12; 2 Pita 3:3, 4.
[Ihe osise dị na peeji nke 26]
Jizọs gbara anyị ume ‘ikpe ekpere mgbe nile’ maka enyemaka n’ịlụso ọnwụnwa ọgụ