Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso!
Eleghị anya ọ dịtụla mgbe ị jụrụ sị, ‘Gịnị mere ọtụtụ ndị ji ata nnọọ ahụhụ?’ Ruo ọtụtụ puku afọ, ihe a kpọrọ mmadụ anọwo na-ahụsi anya n’ihi agha, ịda ogbenye, ọdachi, mpụ, ikpe na-ezighị ezi, na ọnwụ. Ụmụ mmadụ hụjuru anya n’ime otu narị afọ gara aga karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ̀ dị mgbe ihe a nile ga-akwụsị?
Azịza na-akasi obi nke ajụjụ ahụ bụ ee, ọ ga-emekwa nnọọ n’isi nso! Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ekwu, sị: “Onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” Ruo afọ ole? “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:10, 11, 29.
Mgbe Chineke wepụsịrị ajọ omume na ahụhụ, a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-enwe ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ezi ahụ́ ike na obi ụtọ. Okwu Chineke na-ebu amụma, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.
N’ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-akpọlite ọbụna ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ iso nweta ngọzi ndị a: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ọ bụ nke a mere Jizọs Kraịst ji gwa onye ajọ omume ahụ chegharịrị echegharị nke gosipụtara okwukwe na ya, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:43.
Gịnị Mere Ahụhụ Ji Malite?
Ebe ọ bụ na Chineke zubere ka ụmụ mmadụ nweta ọnọdụ ndị a magburu onwe ha n’ọdịnihu, gịnị mere o ji kwere ka a malite ịta ahụhụ? N’ihi gịnị ka o ji kwe ka ọ dịruo ogologo oge otú a?
Mgbe Chineke kere Adam na Iv, o mere ka ha zuo okè ma n’ahụ́ ma n’uche. O debere ha n’ogige bụ́ paradaịs ma nye ha ọrụ na-eju afọ ka ha na-arụ. Bible na-ekwu, sị: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) A sị na ha rubeere Chineke isi, ha gaara amụta ụmụ ndị zuru okè, ụwa gakwaara aghọ paradaịs, ebe ndị mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi n’udo nakwa n’obi ụtọ.
Chineke kenyere n’ime Adam na Iv onyinye magburu onwe ya bụ́ nnwere onwe ime nhọrọ. Ha agajeghị ịdị ka ígwè ọrụ robọt nke na-enweghị uche. Otú ọ dị, ha ịnọgide na-enwe obi ụtọ dabeere na ha iji nnwere onwe ha mee ihe n’ụzọ ziri ezi—irube isi n’iwu Chineke. Chineke kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17) Iji nnwere onwe a eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ga-akpata ọdachi, ebe ọ bụ na e keghị ụmụ mmadụ inwe ihe ịga nke ọma n’adabereghị na Chineke. Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.
N’ụzọ dị mwute, nne na nna anyị mbụ chere na ha pụrụ inwere onwe ha pụọ n’ebe Chineke nọ ma ka nwee ihe ịga nke ọma. Ma mgbe ha jụrụ ịchịisi Chineke, ha kwụsịrị inweta nkwado ya, kwụsịkwa izu okè. Ya mere, ọnọdụ ha malitere ịka njọ, n’ikpeazụkwa, ha mere agadi ma nwụọ. Dị nnọọ ka ihe agwọ mụrụ na-aghaghị ito ogologo, anyị ketara ezughị okè na ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.
Ihe Iseokwu Bụ́ Isi—Ònye Ka O Ruuru Ịchị?
Gịnị mere Chineke ebibighị Adam na Iv ma kee di na nwunye ọzọ? Ọ bụ n’ihi na a mawo ọbụbụeze eluigwe na ala nke Chineke, ya bụ, oruru o ruuru ya ịchị, aka. Ajụjụ abụrụzie, Ònye ka o ruuru ịchị, ònyekwa ka ịchịisi ya ziri ezi? Ọzọkwa, Ụmụ mmadụ hà pụrụ ime nke ọma karị ma ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke na-achị ha? Site n’inye ụmụ mmadụ oge zuru ezu ka ha jiri nnọọ nnwere onwe ha mee ihe, Chineke ga-egosipụta nnọọ ma hà ga-eme nke ọma karị n’okpuru ịchịisi ya ka ọ bụ n’okpuru ịchịisi nke ha. Oge e nyere kwesịrị izuru ụmụ mmadụ ịnwale ụdị òtù, usoro ọchịchị, nke azụmahịa, na nke okpukpe nile n’adabereghị ná nduzi Chineke.
Gịnị siworo na ya pụta? Ihe ndị mere n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ kemgbe ọtụtụ puku afọ gara aga na-egosi na ụmụ mmadụ anọwo na-ahụju anya. Ụmụ mmadụ ahụsiwo anya n’ime otu narị afọ gara aga karịa mgbe ọ bụla ọzọ. E gburu ọtụtụ nde mmadụ n’Oké Mgbukpọ ahụ e nwere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. E gbuwo ihe karịrị otu narị nde mmadụ n’agha. Mpụ na ime ihe ike jukwara ebe nile. E jizi ọgwụ ọjọọ eme ihe aghara aghara. Ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị mmadụ na-ebute ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ. Ọtụtụ iri nde mmadụ na-anwụ kwa afọ n’ihi agụụ na ọrịa. E nwere ndakpọ ezinụlọ na nretọ nke omume n’ebe nile. Ọ dịghị ọchịchị mmadụ nke nwere ike idozi nsogbu ndị a. Ọ dịbeghị nke ọ bụla n’ime ha kwụsịworo ịka nká, ọrịa, na ọnwụ.
Ọnọdụ ụmụ mmadụ dị nnọọ ka Bible buru n’amụma banyere oge anyị. Okwu Chineke na-akpọ oge anyị ‘ụbọchị ikpeazụ’ nke usoro ihe a bụ́ mgbe “oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị.” Dịkwa nnọọ ka Bible kwuru, ‘ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie anọgidewo na-ajọwanye njọ.’—2 Timoti 3:1-5, 13.
Ahụhụ Ga-akwụsị n’Isi Nso
Ihe àmà nile e nwere na-egosi na o ruwela mgbe ụmụ mmadụ ga-akwụsị nnwale ha na-anwale ịchị onwe ha n’adabereghị na Chineke, bụ́ nke kpataworo ọdachi. O dowo nnọọ anya na ụmụ mmadụ agaghị achịli onwe ha n’adabereghị na Chineke. Ọ bụ nanị ịchịisi Chineke pụrụ iweta udo, obi ụtọ, ezi ahụ́ ike, na ndụ ebighị ebi. Ya mere, nkwere Jehova kwere ka ajọ omume na ahụhụ dịrị eruwela ọgwụgwụ ya. N’isi nso, Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ site n’ibibi usoro ihe a nile nke na-erughị ihe ọ chọrọ.
Amụma Bible na-ekwu, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [ọchịchị ụmụ mmadụ bụ́ ndị dị ugbu a], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie [n’eluigwe], nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi . . . ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [ọchịchị ndị dị ugbu a] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Igosipụta oruru o ruuru Jehova ịchị, site n’Alaeze eluigwe ya, bụ ozizi bụ́ isi nke Bible. N’ibu amụma banyere akụkụ dị mkpa nke ihe àmà nke “ụbọchị ikpeazụ,” Jizọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.
Mgbe ọgwụgwụ bịara, ònye ga-alanarị? Bible na-aza, sị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” (Ilu 2:21, 22) Ndị ziri ezi bụ ndị mụtara ihe bụ́ uche Jehova ma na-eme ya. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ee, “ụwa na-agabiga . . . , ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.
Ọ gwụla ma e gosiri nsụgharị ọzọ, nsụgharị Bible e ji mee ihe maka Akwụkwọ Nsọ Grik bụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nsụgharị e jikwa mee ihe maka Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ Bible Nsọ nke Union Version. E mewo ka nsụpe okwu nke nsụgharị abụọ ahụ kwekọọ n’ụdị e ji eme ihe n’oge a.