Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ezi Onye Hụrụ Jehova n’Anya:
Jizọs sịrị: ‘Ị ga-amara eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka i nwere onwe gị.’ (Jọn 8:32) Ihe ahụ o kwuru na-agba ume nke ukwuu! N’ezie, e nwere ike ịmara eziokwu ahụ, ọbụna “n’oge ikpeazụ” a dị oké egwu, mgbe ụgha juru ebe niile. (2 Timoti 3:1) Ì chetara mgbe mbụ ị ghọtara eziokwu ahụ a kọwara n’Okwu Chineke? Ọ tọrọ gị ụtọ n’ezie!
Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ka anyị nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ ma na-akọrọ ya ndị ọzọ mgbe niile, anyị aghaghị ịna-eme ihe eziokwu ahụ na-ekwu. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime otú ahụ, anyị kwesịrị ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke. Gịnị ka ọ pụtara? Ihe Jizọs kwuru n’abalị ikpeazụ tupu ya anwụọ zara ajụjụ ahụ. Ọ gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debere ihe Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.” —Jọn 15:10.
Buru n’uche na Jizọs nọgidere n’ịhụnanya Chineke site n’idebe ihe Nna ya nyere n’iwu. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ime taa. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, anyị kwesịrị ịna-eme ihe eziokwu ahụ na-ekwu ná ndụ anyị na-ebi kwa ụbọchị. Jizọs kwuru n’otu abalị ahụ, sị: “Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-eme ha.”—Jọn 13:17.
Anyị nwere ezigbo olileanya na akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịnọgide na-eme ihe eziokwu ahụ na-ekwu eme ná ndụ gị, si otú ahụ nọrọ “n’ịhụnanya Chineke . . . nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.”—Jud 21.
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova