Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mrt isiokwu 72
  • Eziokwu Ọ̀ Ka Dị Mkpa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Ọ̀ Ka Dị Mkpa?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • È nwedịrị ihe bụ́ eziokwu?
  • Olee otú i nwere ike isi mata nke bụ́ eziokwu?
  • Olee onye ụgha si n’aka ya malite?
  • Gịnị mere ọtụtụ ndị jizi agha ụgha taa?
  • Gịnị mere eziokwu ji dị mkpa?
  • Gịnị mere Chineke ji chọọ ka m mara nke bụ́ eziokwu?
  • Chineke ọ̀ ga-emecha mee ka ụgha ghara ịdịzi?
  • Iṅomi Chineke Nke Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chọọ Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isiokwu Ndị Ọzọ
mrt isiokwu 72
Ebe onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-agwa ìgwè mmadụ okwu, ha ana-eto ya.

Eziokwu Ọ̀ Ka Dị Mkpa?

È nwere mgbe ọ na-adị gị ka ọ̀ na-esizi ezigbo ike ịmata ihe bụ́ eziokwu na ihe na-abụghị eziokwu? Ọ dịzị ka ndị mmadụ anaghịzi esi n’ihe e ji n’aka amata ihe bụ́ eziokwu, kama, ha na-ejizi otú obi dị ha na ihe ha chere ekpebi ihe bụ́ eziokwu na ihe na-abụghị eziokwu. Ọtụtụ ndị n’ụwa taa ekwetaghịzi na e nwere ihe bụ́ eziokwu.

Ọ bụghị taa ka ndị mmadụ malitere iche na e nweghị ihe bụ́ eziokwu. Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Gọvanọ ndị Rom aha ya bụ Pọntiọs Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” (Jọn 18:38) Ajụjụ a Paịlet jụrụ Jizọs dị ezigbo mkpa n’agbanyeghị na o cheghị ka Jizọs zaa ya. Baịbụl zara ya otú ga-eju gị afọ, kwuokwa ihe ga-enyere gị aka ịmata ihe bụ́ eziokwu na ihe na-abụghị eziokwu n’ụwa a ọ na-esizi ike ịmata ihe bụ́ eziokwu.

È nwedịrị ihe bụ́ eziokwu?

Eenụ, e nwere. Na Baịbụl, “eziokwu” pụtara ihe e ji n’aka na o mere eme nakwa ihe dị mma. Baịbụl na-akụzi na ihe niile bụ́ eziokwu si n’aka Jehovaa Chineke. Ọ kpọrọ ya “Chineke, onye eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Ihe dị na Baịbụl bụ eziokwu si n’aka Chineke. Baịbụl jikwa eziokwu ahụ tụnyere ìhè maka na o nwere ike inyere anyị aka izere nsogbu n’ụwa a ọgba aghara juru.​—Abụ Ọma 43:3; Jọn 17:17.

Olee otú i nwere ike isi mata nke bụ́ eziokwu?

Chineke achọghị ka anyị kweta eziokwu ndị dị na Baịbụl n’echebaraghị ha echiche. Ọ chọghịkwa ka anyị kweta ha n’ihi otú obi dị anyị, kama ọ chọrọ ka anyị jiri ike iche echiche anyị leruo ha anya iji chọpụta ma hà bụ eziokwu. (Ndị Rom 12:1) Ọ chọrọ ka anyị jiri ‘uche anyị niile’ mara ya ma hụ ya n’anya, chọọkwa ka anyị na-enyocha ihe anyị na-amụ na Baịbụl iji jide n’aka na ha bụ eziokwu.​—Matiu 22:37, 38; Ọrụ Ndịozi 17:11.

Olee onye ụgha si n’aka ya malite?

Baịbụl kwuru na ụgha si n’aka onye iro Chineke malite, ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu. Baịbụl kpọkwara ya “nna ụgha.” (Jọn 8:44) Ọ ghaara Adam na Iv ụgha gbasara Chineke. (Jenesis 3:​1-6, 13, 17-19; 5:5) Kemgbe ahụ, ọ na-ezochi ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara Chineke ma na-agbasa ụgha ebe niile.​—Mkpughe 12:9.

Gịnị mere ọtụtụ ndị jizi agha ụgha taa?

N’oge anyị a, bụ́ oge Baịbụl kpọrọ “oge ikpeazụ,” Setan na-eduhie ndị mmadụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ndị mmadụ na-aghakarị ụgha iji duhie ndị ọzọ ma ọ bụ iji rigbuo ha. (2 Timoti 3:1, 13) A na-aṅụkwa ụgha ka mmiri n’ọtụtụ okpukpe taa. Amụma Baịbụl buru gbasara oge anyị a na-emezu. O kwuru na ndị mmadụ ‘ga-akpọkọtara onwe ha ndị ga na-akụziri ha ihe ha chọrọ ịnụ’ nakwa na ‘ha ga-akwụsị ige eziokwu.’​—2 Timoti 4:​3, 4.

Ebe onye ụkọchukwu ji Baịbụl na-agwa ìgwè mmadụ okwu, ha ana-akụrụ ya aka.

Gịnị mere eziokwu ji dị mkpa?

Ndị mmadụ na-atụkwasị ndị na-ekwu eziokwu obi. Ndị na-atụkwasịghị ibe ha obi na-akwụsị ịbụ enyi. Ọgba aghara na-adịkwa n’obodo ma ọ bụrụ na ndị mmadụ atụkwasịghị ibe ha obi. Baịbụl kwuru na Chineke chọrọ ka anyị na-efe ya maka na anyị ma eziokwu gbasara ya. O kwuru, sị: “Ndị na-efe [Chineke] ofufe ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Ị chọọ ịmụta otú eziokwu dị na Baịbụl ga-esi nyere gị aka ịchọpụta ụgha ndị okpukpe na-akụzi nakwa otú ị ga-esi nwere onwe gị na ha, gụọ isiokwu ndị dị n’okpuru isiokwu bụ́ “Gịnị Mere O Ji Esiri Ụfọdụ Ndị Ike Ịhụ Chineke n’Anya?”

Gịnị mere Chineke ji chọọ ka m mara nke bụ́ eziokwu?

Chineke chọrọ ka a zọpụta gị, i kwesịkwara ịmụta eziokwu gbasara ya ka e wee zọpụta gị. (1 Timoti 2:4) Ọ bụrụ na ị mụta ihe ndị dị Chineke mma ma na-eme ha, mụtakwa ihe ndị na-adịghị ya mma ma na-ezere ha, gị na ya ga-abụ ezigbo enyi. (Abụ Ọma 15:​1, 2) Chineke zitere Jizọs n’ụwa ka o nyere ndị mmadụ aka ịmata nke bụ́ eziokwu. Chineke chọrọ ka anyị gee ntị n’ihe ndị Jizọs kụziri.​—Matiu 17:5; Jọn 18:37.

Chineke ọ̀ ga-emecha mee ka ụgha ghara ịdịzi?

Ee. Ọ na-ewute Chineke ma ndị mmadụ ghaara ndị ọzọ ụgha iji ghọgbuo ha. O kwela nkwa na ya ga-ebibi ndị na-ekweghị akwụsị ịgha ụgha n’ụwa a. (Abụ Ọma 5:6) Mgbe Chineke ga-eme ihe a, ọ ga-emezukwa nkwa o kwere anyị na “Onye na-ekwu eziokwu ga-anọru mgbe ebighị ebi.”​—Ilu 12:19.

Amaokwu ndị kwuru banyere eziokwu na ịgha ụgha

Jọn 8:44: “[Ekwensu] bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.”

Ihe ọ pụtara: Setan bụ́ Ekwensu bụ onye mbụ ghara ụgha na onye ihe niile bụ́ ụgha si n’aka.

Ilu 12:22: “Jehova kpọrọ ndị na-agha ụgha asị.”

Ihe ọ pụtara: Ndị niile hụrụ Chineke n’anya kwesịrị ịkpọ ịgha ụgha asị otú ahụ yanwa kpọrọ ya.

Jọn 4:24: “Ndị na-efe [Chineke] ofufe ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu.”

Ihe ọ pụtara: Chineke chọrọ ka anyị na-efe ya maka na anyị ma eziokwu gbasara ya.

Jọn 8:32: “Eziokwu ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”

Ihe ọ pụtara: Eziokwu ndị Jizọs kụziri ga-emeli ka anyị mara ihe, kwụsị ikwere ihe ndị na-abụghị eziokwu na nkụzi ụgha ndị okpukpe na-akụzi, meekwa ka anyị ghara ịna-agbara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ohu. Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Eziokwu Ga-esi Eme Ka I Nwere Onwe Gị?”

1 Timoti 2:4: “Ọ bụ uche [Chineke] ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha marakwa eziokwu nke ọma.”

Ihe ọ pụtara: Chineke chọrọ ka a zọpụta anyị ma ọ bụrụ na anyị amụta eziokwu gbasara ya.

a Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya