Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lff isi 4
  • Ònye Bụ Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Chineke?
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-akpọ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
  • Gịnị Bụ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Aha Chineke—Otú E Si Eji Ya Eme Ihe na Ihe Ọ Pụtara
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
lff isi 4
Isi nke 4. Otú mbara ígwé dị n’abalị e ji onyokomita lee ya. Kpakpando na ụyọkọ ya nọ na-enwu gbaa.

ISI NKE 04

Ònye Bụ Chineke?

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

Ndị mmadụ na-efe ọtụtụ chi kemgbe ụwa. Ma, Baịbụl kwuru na e nwere Chi “karịrị chi ọ bụla ọzọ.” (2 Ihe E Mere 2:5) Ònye bụ Chi ahụ? Oleekwa otú o si kara chi ọzọ niile ndị mmadụ na-efe? N’isiokwu a, ị ga-amụta ihe Chi a chọrọ ka ị mara gbasara ya.

1. Gịnị bụ aha Chineke? Oleekwa otú anyị si mara na ọ chọrọ ka anyị mara aha ya?

Na Baịbụl, Chineke gwara anyị onye ọ bụ. Ọ sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Gụọ Aịzaya 42:5, 8.) “Jehova” bụ aha e si n’asụsụ Hibru nweta. Ọ ga-abụ na ọ pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Jehova chọrọ ka anyị mara aha ya. (Ọpụpụ 3:15) Olee otú anyị si mara? O mere ka e dee aha ya ihe karịrị ugboro puku asaa na Baịbụl.a Jehova bụ aha onye bụ́ “ezi Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa.”—Diuterọnọmi 4:39.

2. Olee ihe Baịbụl gwara anyị gbasara Jehova?

Baịbụl gwara anyị na ọ bụ Jehova bụ naanị ezi Chineke n’ime chi niile ndị mmadụ na-efe. Maka gịnị? E nwere ọtụtụ ihe mere o ji kwuo otú ahụ. Jehova bụ Ọkaakaa. Ọ bụ naanị ya bụ “Onye Kacha Elu n’ụwa niile.” (Gụọ Abụ Ọma 83:18.) Ọ bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” n’ihi na ọ ga-emeli ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Ọ bụ ya “kere ihe niile,” ma eluigwe ma ụwa ma ihe niile dị ndụ dị n’ụwa. (Mkpughe 4:8, 11) Ọ bụ naanị Jehova bụ onye na-enweghị mgbe ọ malitere. Ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 90:2.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe dị iche n’aha ndị a na-etu Chineke na aha ya pụrụ iche. Chọpụtakwa otú o si mee ka ị mata aha ya na ihe mere o ji mee ka ị mata ya.

Ebe otu nwoke nọ na-ele anya na mbara ígwé n’abalị. Ebe e sere mbara ígwé, deekwa aha bụ́ Jehova na ya.

3. E nwere ọtụtụ aha a na-etu Chineke, ma o nwere naanị otu aha

Unu chọọ ịmata ihe dị iche n’aha mmadụ na aha a na-etu ya, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

VIDIO: O Nwere Naanị Otu Aha ma Nwee Ọtụtụ Aha A Na-etu Ya (0:41)

  • Olee ihe dị iche n’ezigbo aha Chineke na aha a na-etu ya, dị ka “Onyenwe anyị?”

Baịbụl kwuru na e nwere ọtụtụ ndị nwenụ nakwa ọtụtụ chi ndị mmadụ na-efe ofufe. Gụọnụ Abụ Ọma 136:1-3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ònye bụ “Chi kacha chi niile” na “Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile”?

4. Jehova chọrọ ka ị mara aha ya, na-akpọkwa ya

Olee otú i si mara na Jehova chọrọ ka ị mara aha ya? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

VIDIO: Vidio si na vidio bụ́ Chineke Ò Nwere Aha? (3:11)

Foto si na vidio bụ́ ‘Chineke Ò Nwere Aha?’ Otu nwoke na-eleru anya n’ebe e dere aha Chineke, bụ́ Jehova, n’Abụ Ọma 83:18 na Baịbụl ‘King James Version’ nke a sụgharịrị n’afọ 1611.
  • Ì chere na Jehova chọrọ ka ndị mmadụ mara aha ya? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

Jehova chọrọ ka ndị mmadụ na-akpọ aha ya. Gụọnụ Ndị Rom 10:13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee uru ịna-akpọ aha Chineke bụ́ Jehova bara?

  • Olee otú obi na-adị gị ma mmadụ cheta aha gị ma kpọọ gị ya?

  • Olee otú i chere obi ga-adị Jehova ma ị na-akpọ ya aha ya?

5. Jehova chọrọ ka ị bụrụ enyi ya

Otu nwaanyị onye Kambodia aha ya bụ Soten kwuru na e nweghị ihe na-eme ya obi ụtọ n’ụwa a ka aha Chineke ọ matara. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

VIDIO: Otú M Si Chọta Ezi Chineke Ahụ (8:18)

Foto abụọ si na vidio bụ́ ‘Otú M Si Chọta Ezi Chineke Ahụ.’ 1. Soten nọ ọdụ n’okpuru otu osisi dị n’oké ọhia na-ele anya na mbara ígwé ka ọ na-ekpe ekpere. 2. Herold na-akụziri Soten na aha Chineke bụ Jehova.
  • Na vidio a, olee uru ịmata aha Chineke baara Soten?

Tupu gị na mmadụ abụrụ enyi, ị ga-ebu ụzọ mara aha ya. Gụọnụ Jems 4:8a. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Jehova gwara gị ka i mee?

  • Olee otú ịmara aha Chineke na ịna-akpọ ya nwere ike isi mee ka ị bịarukwuo ya nso?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na e nwere naanị otu Chineke, n’ihi ya, na e nweghị ihe o mere ịkpọ ya aha ọ bụla ị chọrọ ịkpọ ya.

  • Ì kwetara na aha Chineke bụ Jehova?

  • Olee otú ị ga-esi akọwara mmadụ na Chineke chọrọ ka anyị na-akpọ aha ya?

NCHỊKỌTA

Jehova bụ aha onye naanị ya bụ ezi Chineke. Ọ chọrọ ka anyị mara aha ahụ, chọọkwa ka anyị na-akpọ ya iji bịaruo ya nso.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú Jehova si dị iche na chi ndị ọzọ niile ndị mmadụ na-efe?

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akpọ aha Chineke?

  • Olee otú i si mara na Jehova chọrọ ka ị bịaruo ya nso?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Lee ụzọ ihe ise na-enweghị mgbagha na-egosi na Chineke dị adị.

“Ò Nwere Onye Dị́ Adị Bụ́ Chineke?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta ihe mere ị ga-eji kwere na Chineke enweghị mmalite.

“Ònye Kere Chineke?” (Ụlọ Nche, Ọgọst 1, 2014)

Chọpụta ihe mere anyị kwesịrị iji na-akpọ aha Chineke, ọ bụrụgodị na anyị amaghị otú e si akpọ ya n’oge ochie.

“Ònye Bụ Jehova?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

È nwere ihe o mere ma anyị na-akpọ Chineke aha ọ bụla masịrị anyị? Chọpụta ihe mere anyị ga-eji kwuo na o nwere naanị otu aha.

“Aha Ole Ka Chineke Nwere?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

a Ị chọọ ịmatakwu ihe aha Chineke pụtara nakwa ihe mere ụfọdụ ndị sụgharịrị Baịbụl ji wepụ ya na Baịbụl ha sụgharịrị, gụọ Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara nke A4 na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya