Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lff isi 15
  • Ònye Bụ Jizọs?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Jizọs?
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Jisọs Kraịst Mkpịsị Ugodi nke Ihe Ọmụma Chineke
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Azịza nke Ajụjụ Ndị A Na-ajụ Banyere Jizọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
lff isi 15
Isi nke 15. Ebe Jizọs si n’otu ugbo ọka na-agafe.

ISI NKE 15

Ònye Bụ Jizọs?

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

Jizọs bụ otu n’ime ndị a ma ama dịrị ndụ n’ụwa. Ma, e wezụga aha ya, e nweghị oké ihe gbasara ya ọtụtụ ndị mmadụ ma. Ọtụtụ ndị na-ekwukwa ihe dị iche iche gbasara onye ọ bụ n’eziokwu. Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara Jizọs?

1. Ònye bụ Jizọs?

Jizọs bụ mmụọ ozi dị ike bi n’eluigwe. Jehova Chineke kere ya tupu ya ekewe ihe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:​15) Baịbụl kpọrọ Jizọs “Ọkpara [Chineke] mụrụ naanị ya” maka na ọ bụ naanị ya ka Jehova kere n’onwe ya. (Jọn 3:​16) Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova rụkọrọ ọrụ, Jizọs enyere ya aka kee ihe ọzọ niile. (Gụọ Ilu 8:​30.) Jehova na Jizọs ka na-arụkọ ọrụ ruo taa. Jizọs ji obi ya niile na-ekwuchite ọnụ Chineke, ya bụ, ọ na-akụziri ndị mmadụ ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “Okwu ahụ.”​—Jọn 1:​14.

2. Gịnị mere Jizọs ji bịa n’ụwa?

Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Jehova rụrụ ọrụ ebube mgbe o ji mmụọ nsọ ya mee ka Jizọs, bụ́ mmụọ ozi dị ike bi n’eluigwe, bụrụzie nwa ọhụrụ n’ime afọ otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Meri. Otú a ka e si mụọ Jizọs n’ụwa, ya abụrụ mmadụ. (Gụọ Luk 1:​34, 35.) Jizọs bịara n’ụwa bụrụ Mezaya Chineke kwere ná nkwa, ma ọ bụ Kraịst. Ọ bịara ka ọ zọpụta ụmụ mmadụ.a Amụma niile Baịbụl buru gbasara onye ga-abụ Mezaya mezuchara n’isi Jizọs. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji mata na ọ bụ ya bụ “Kraịst, Ọkpara Chineke dị ndụ.”​—Matiu 16:16.

3. Olee ebe Jizọs nọ ugbu a?

Mgbe Jizọs nwụrụ, Chineke kpọlitere ya, ya abụrụ mmụọ ozi laghachi n’eluigwe. N’ebe ahụ, ‘Chineke bugoro ya n’ọkwá ka elu.’ (Ndị Filipaị 2:9) Ugbu a, Jizọs bụ mmụọ ozi dị ezigbo ike. Ọ bụ naanị Jehova ka ya ike.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo onye Jizọs bụ n’eziokwu nakwa ihe mere ịmụ gbasara ya ji dị ezigbo mkpa.

Ebe Jizọs na Jọn Onye Na-eme Baptizim guzo n’ime mmiri na-ege ntị n’ihe otu olu si n’eluigwe na-ekwu ozugbo Jizọs mechara baptizim.

4. Jizọs abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile

Baịbụl kwuru na Jizọs bụ mmụọ ozi dị ike bi n’eluigwe. Ma, ọ na-erubere Jehova Chineke, bụ́ Nna ya, isi. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ihe Baịbụl kwuru gbasara otú Jizọs si dị iche na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile.

VIDIO: Jizọs Kraịst Ọ̀ Bụ Chineke? (3:​22)

Amaokwu Baịbụl ndị a na-enyere anyị aka ịmata otú Jehova si dị iche na Jizọs. Gụọnụ ebe ndị a. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ ndị na-eso ya:

Gụọnụ Luk 1:​30-​32.

  • Ònye ka mmụọ ozi ahụ kwuru na Jizọs bụ? Ònyekwa ka o kwuru na Jehova Chineke, “Onye Kacha Elu,” bụ?

Gụọnụ Matiu 3:​16, 17.

  • Mgbe Jizọs mechara baptizim, gịnị ka otu olu si n’eluigwe kwuo?

  • Ònye ka i chere na ọ bụ ya nwe olu ahụ?

Gụọnụ Jọn 14:28.

  • Nna na nwa, ònye tọrọ ibe ya? Ònyekwa ka ibe ya?

  • Jizọs kpọrọ Jehova Nna ya, gịnị ka ihe a na-akụziri anyị?

Gụọnụ Jọn 12:49.

  • Jizọs ò chere na ya na Nna ya bụ otu onye? Gịnị ka i chere?

5. Ihe gosiri na Jizọs bụ Mezaya

E nwere amụma dị iche iche dị na Baịbụl ga-enyere ndị mmadụ aka ịmata onye bụ Mezaya, ya bụ, onye Chineke họọrọ ka ọ zọpụta ụmụ mmadụ. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ụfọdụ n’ime amụma ndị mezuru n’isi Jizọs mgbe ọ bịara n’ụwa.

VIDIO: Jizọs Mezuru Amụma (3:​03)

Gụọnụ amụma ndị a dị na Baịbụl. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị na-eso ha:

Gụọnụ Maịka 5:2 ka unu hụ ebe e kwuru na a ga-amụ Mezaya.b

  • Amụma a ò mezuru mgbe a mụrụ Jizọs? ​—Matiu 2:1.

Gụọnụ Abụ Ọma 34:20 na Zekaraya 12:10 ka unu hụ amụma ndị e buru gbasara ọnwụ Mezaya.

  • Amụma ndị a hà mezuru?​—Jọn 19:​33-​37.

  • Ì chere na e nwere otú Jizọs si rụrụọ aka ka amụma a niile nwee ike imezu?

  • Gịnị ka ihe a na-akụziri gị gbasara Jizọs?

6. Ịmụ banyere Jizọs baara anyị uru

Baịbụl kwuru ihe mere ịmụ banyere Jizọs na ịmụ ihe Chineke chọrọ ka o mee ji dị ezigbo mkpa. Gụọnụ Jọn 14:6 na 17:3. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere ịmụ gbasara Jizọs ji dị mkpa?

Ebe Jizọs na-akụziri ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka ihe.

Jizọs mepere ụzọ ga-eme ka anyị na Chineke bụrụ enyi. Ọ kụziri eziokwu gbasara Jehova, anyị nwekwara ike isi n’aka ya nweta ndụ ebighị ebi

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na Ndịàmà Jehova ekweghị na Jizọs.

  • Gịnị ka ị ga-agwa onye kwuru ụdị ihe a?

NCHỊKỌTA

Jizọs bụ mmụọ ozi dị ike. Ọ bụ Ọkpara Chineke, bụrụkwa Mezaya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere e ji akpọ Jizọs “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke”?

  • Gịnị bụ ọrụ Jizọs n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa?

  • Olee otú anyị si mara na ọ bụ Jizọs bụ Mezaya?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Mụtakwuo ihe ndị ọzọ mere anyị ji kwuo na Jizọs bụ Mezaya.

“Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta ma Baịbụl ọ̀ na-akụzi na Chineke mụrụ Jizọs otú ahụ ụmụ mmadụ si amụ ụmụ.

“Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú o si bụrụ na Baịbụl anaghị akụzi na Chineke dị Atọ n’Ime Otu.

“Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?” (Ụlọ Nche, Eprel 1, 2009)

Gụọ gbasara otú ndụ otu nwaanyị si gbanwee mgbe ọ chọpụtara ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Jizọs.

“Otú Otu Nwaanyị Si Kwụsị Ikpe Okpukpe Ndị Juu” (Teta!, Mee 2013)

a N’isi nke 26 na 27 anyị ga-amụta ihe mere e ji kwesị ịzọpụta ụmụ mmadụ nakwa otú Jizọs si zọpụta anyị.

b Gụọnụ Ihe nke 2 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A ka unu hụ mgbe e buru n’amụma na Mezaya ga-abịa n’ụwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya