Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lff isi 31
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Anyị
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Alaeze Chineke Na-achị
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
lff isi 31
Isi nke 31. Ebe Jizọs, bụ́ onye nọ n’eluigwe na-achị, nọ n’ihu Jehova.

ISI NKE 31

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

Ihe kacha gbaa ọkpụrụkpụ e kwuru okwu gbasara ya na Baịbụl bụ Alaeze Chineke. Jehova ga-eji Alaeze ahụ eme ihe niile o bu n’obi kee ụwa. Gịnị ka Alaeze ahụ bụ? Olee otú anyị si mara na ọ chịwala ugbu a? Gịnị na gịnị ka o merela? Gịnịkwa ka ọ ga-eme n’ọdịnihu? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a nakwa n’isiokwu abụọ na-eso ya.

1. Gịnị bụ Alaeze Chineke? Ònyekwa bụ Eze ya?

Alaeze ahụ bụ ọchịchị Jehova hiwere. Eze ya, bụ́ Jizọs Kraịst, nọ n’eluigwe na-achị. (Matiu 4:​17; Jọn 18:36) Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị: “Ọ ga-achị . . . ruo mgbe ebighị ebi.” (Luk 1:​32, 33) Ọ ga-achị ndị niile bi n’ụwa n’ihi na ọ bụ ya bụ Eze Alaeze Chineke.

2. Ole ndị ga-eso Jizọs chịa?

Ọ bụghị naanị Jizọs ga na-achị n’Alaeze Chineke. Ya na ndị si ‘n’ebo niile, ndị na-asụ asụsụ niile, ndị agbụrụ niile nakwa ndị mba niile ga na-achị ụwa.’ (Mkpughe 5:​9, 10) Ole ka ndị ga-eso Kraịst achị dị? Ọtụtụ nde mmadụ aghọọla ndị na-eso ụzọ Jizọs kemgbe ọ bịachara n’ụwa. Ma, ọ bụ naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-aga eluigwe ma soro Jizọs chịa n’Alaeze Chineke. (Gụọ Mkpughe 14:​1-4.) Ndị Kraịst ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa, Alaeze ahụ ana-achị ha.​—Abụ Ọma 37:29.

3. Olee otú Alaeze Chineke si kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma?

Ụfọdụ ndị ọchịchị na-agbalị ka ha rụọ ọrụ dị mma n’ọchịchị ha, ma, ike ha anaghị eru ịrụ ihe niile ha chọrọ ịrụ. Ka a na-eme ka a na-eme, ndị ọzọ anọchie ha. Ndị ahụ nọchiri ha nwere ike bụrụ ndị ọchịchị ọjọọ na-anaghị arụrụ ndị ha na-achị ọrụ. Ma, o nweghị onye ga-anọchi Eze Alaeze Chineke, bụ́ Jizọs. Chineke emeela “ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.” (Daniel 2:​44) Jizọs ga na-achị ụwa niile. Ọ gaghị na-emegbu ụfọdụ ndị, na-emenyere ndị ọzọ. Ọ hụrụ mmadụ niile n’anya, jiri obiọma na-emeso ha ihe. Ọ na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ọ ga-akụzikwara ụmụ mmadụ ka ha na-emeso ibe ha otú yanwa si emeso ha, ya bụ, ka ha hụ ibe ha n’anya, jiri obiọma na-emeso ha ihe ma na-ekpe ikpe ziri ezi.​—Gụọ Aịzaya 11:9.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe mere Alaeze Chineke ji kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma.

Ebe Jizọs Kraịst nọ n’ocheeze ya n’eluigwe na-achị ụwa. Ndị ya na ha so achị nọcha ọdụ n’azụ ya. Ìhè si n’ebe Jehova nọ na-enwukwa n’azụ ha.

4. Alaeze Chineke ga-achị ụwa

O nweghị onye ọchịchị ike ya haruru ka nke Jizọs. Gụọnụ Matiu 28:18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ike Jizọs si kara ike mmadụ ọ bụla na-achị achị?

Ndị mmadụ na-agbanwekarị ndị na-achị ha. Onye ọchịchị nke ọ bụla na-enwekwa mpaghara ụwa ebe ọ na-achị. Olee maka Alaeze Chineke? Gụọnụ Daniel 7:​14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere o ji dị mma na ‘a gaghị ebibi’ Alaeze Chineke ebibi?

  • Gịnị mere o ji dị mma na ọ ga na-achị ụwa niile?

5. Alaeze Chineke ga-anọchirịrị ọchịchị ụmụ mmadụ

Olee ihe mere Alaeze Chineke ga-eji nọchie ọchịchị ụmụ mmadụ? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

VIDIO: Vidio si na vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? (1:​41)

  • Gịnị ka ọchịchị ụmụ mmadụ kpataara anyị?

Gụọnụ Ekliziastis 8:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ì chere na Alaeze Chineke kwesịrị ịnọchi ọchịchị ndị mmadụ? Maka gịnị?

6. Ndị ọchịchị Alaeze Chineke ma otú ihe si dịrị anyị

Eze anyị, bụ́ Jizọs, nwere mgbe o biri n’ụwa. N’ihi ya, ọ ga-aghọtali “na anyị adịghị ike.” (Ndị Hibru 4:​15) Jehova si “n’ebo niile, n’asụsụ niile, n’agbụrụ niile nakwa na mba niile” họpụta ezigbo Ndị Kraịst dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze ya.​—Mkpughe 5:9.

  • Otú a ị matara na Jizọs na ndị ga-eso ya achị ma otú ihe si dịrị ụmụ mmadụ ọ̀ na-akasi gị obi? Maka gịnị?

Ndị nwoke na ndị nwaanyị e tere mmanụ, ndị dịrị ndụ n’ụwa n’oge dị iche iche, sikwa ebe dị iche iche.

Jehova na-ahọpụta ụdị ndị dị iche iche, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, ka ha na Jizọs chịa n’Alaeze ya

7. Iwu Chineke nyere ndị Alaeze ya ga-achị ka iwu ndị mmadụ na-enye ndị ha na-achị mma

Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị kwesịrị ịbara ndị ha na-achị uru ma chebe ha. Alaeze Chineke nwekwara iwu ndị ọ na-achị kwesịrị ịna-edebe. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:​9-​11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú i chere ụwa ga-adị ma mmadụ niile na-edebe iwu Chineke?a

  • Ì chere na Jehova kwesịrị ịgwa ndị Alaeze ya na-achị ka ha na-edebe iwu ndị o nyere ha? Maka gịnị?

  • Olee ihe gosiri na ndị na-anaghị edebe iwu ndị a nwere ike ịgbanwe?​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 11.

Ebe onye uwe ojii na-akwụsị ụgbọala ndị na-agba n’ụzọ na-ekwo ekwo. Ụdị ndị dị iche iche jikwa ụkwụ na-agafe n’ụzọ ahụ.

Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị ga-echebe ndị ha na-achị ma baara ha uru. Alaeze Chineke nwere iwu ndị ka iwu ụmụ mmadụ mere mma. Iwu ndị ahụ ga-echebe ndị Alaeze ahụ ga-achị, baakwara ha uru

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe bụ́ Alaeze Chineke.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe nke ga-achị ụwa niile.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Ole ndị ga-abụ ndị eze Alaeze Chineke?

  • Olee otú Alaeze Chineke si kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma?

  • Gịnị na gịnị ka Jehova chọrọ n’aka ndị Alaeze ya ga-achị?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe Jizọs kwuru gbasara ebe Alaeze ahụ dị.

“Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Obi Gị?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji akwado Alaeze Chineke kama ịkwado ọchịchị ụmụ mmadụ?

Ndị Na-akwado Alaeze Chineke (1:43)

Chọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị Jehova họpụtara ka ha na Jizọs chịa n’Alaeze ya.

“Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Gịnị mere otu nwaanyị nọ mkpọrọ ji kweta na ọ bụ naanị Chineke ga-eme ka mmegbu ghara ịdị n’ụwa?

“Otú M Si Mata Ihe Ga-ebi Mmegbu” (Teta!, Julaị 2012)

a Anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ n’ime iwu ndị ahụ ná Nkebi nke atọ n’akwụkwọ a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya