Disemba
Tọzdee, Disemba 1
Onye nwere obi abụọ dị ka ebili mmiri nke oké osimiri nke ifufe na-akwagharị, na-enugharịkwa.—Jems 1:6.
Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ịghọta ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru. Ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na Jehova azaghị anyị ekpere anyị otú anyị tụrụ anya ya. Ihe a nwere ike ime ka anyị nwewe obi abụọ. Ọ bụrụ na o nweghị ihe anyị mere gbasara ya, o nwere ike ime ka okwukwe anyị ghara isi ike, kpaakwa adịm ná mma anyị na Jehova aka ọjọọ. (Jems 1:7, 8) O nwedịrị ike ime ka anyị kwụsị inwe olileanya maka ọdịnihu. Pọl onyeozi ji olileanya anyị tụnyere arịlịka. (Hib. 6:19) Arịlịka na-ejide ụgbọ mmiri n’oge oké ifufe, meekwa ka ifufe ahụ ghara iburu ya gaa kụọ na nkume. Ma, naanị ihe na-eme ka arịlịka baa uru bụ ma ọ bụrụ na agbụ ígwè e ji kegide ya n’ụgbọ mmiri ahụ adọbighị. Otú ahụ nchara si eme ka agbụ ígwè ghara isi ike ka obi abụọ nwere ike isi mee ka okwukwe anyị gharakwa isi ike. Mkpagbu nwere ike ime ka onye nwere obi abụọ kwụsị inwe okwukwe na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere. Ọ bụrụ na anyị akwụsị inwe okwukwe, anyị ga-akwụsị inwe olileanya. Onye kwụsịrị inwe olileanya nwere ike ọ gaghị na-enwe ọṅụ ma otu. w21.02 30 ¶14-15
Fraịdee, Disemba 2
Ebreham nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ.—Jems 2:23.
O nwere ike ịbụ na Ebreham akarịala afọ iri asaa mgbe ya na ezinụlọ ya hapụrụ Ọọ. (Jen. 11:31–12:4) Ruokwa ihe dị ka otu narị afọ, o biri n’ụlọikwuu, na-akwaga ọtụtụ ebe na Kenan. Ebreham nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri asaa na ise. (Jen. 25:7) Ma, ọ hụghị mgbe Jehova nyere ụmụ ya ala ahụ o kwere ha ná nkwa. Ọ hụghịkwa mgbe e wuru obodo ahụ, ya bụ, Alaeze Chineke. N’agbanyeghị ya, Baịbụl kwuru na Ebreham nwụrụ mgbe “ọ kara nká ma nwee afọ ojuju.” (Jen. 25:8) N’agbanyeghị nsogbu niile bịaara Ebreham, okwukwe ya siri ike, obi adịkwa ya ụtọ ichere Jehova. Gịnị mere o ji nwee ike ịtachi obi? Ọ bụ n’ihi na Jehova chebere ya ná ndụ ya niile, mesokwa ya ka enyi ya. (Jen. 15:1; Aịza. 41:8; Jems 2:22) Dị ka Ebreham, anyịnwa na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala. (Hib. 11:10) Ma, anyị anaghị echere ka e wuo ya. E hiwere Alaeze Chineke n’afọ 1914, ya ana-achịkwa n’eluigwe kemgbe ahụ. (Mkpu. 12:7-10) Ma, anyị na-eche ka ọ chịwa ụwa a. w20.08 4 ¶11-12
Satọdee, Disemba 3
Echiche nke dị n’obi mmadụ yiri mmiri miri emi, ma, ọ bụ onye nwere nghọta ga-esepụta ya.—Ilu 20:5.
Iji gee ndị ọzọ ntị nke ọma, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma na-enwe ndidi. E nwere ihe atọ mere anyị ji kwesị ime ihe ndị a. Nke mbụ, o nwere ike ime ka anyị ghara ikpebi ihe na-abụghị eziokwu gbasara ndị mmadụ. Nke abụọ, o nwere ike ime ka anyị na-aghọta ụmụnna anyị na otú obi dị ha, nke ga-eme ka anyị na-enwekwuru ha ọmịiko. Nke atọ, anyị nwere ike isi otú ahụ nyere mmadụ aka ịmụta gbasara onwe ya. Mgbe ụfọdụ, anyị anaghị aghọtacha otú ihe dị anyị n’obi ruo mgbe anyị kwupụtara ya. Ọ na-esiri ụfọdụ ụmụnna anyị ike ikwu otú obi dị ha n’ihi ihe ndị merela ha ná ndụ, omenala ha ma ọ bụkwanụ ụdị mmadụ ha bụ. O nwere ike iwe oge tupu ahụ́ eruo ha ala ịkọrọ anyị otú ọ dị ha n’obi. Ma, ọ bụ ya ga-eme ka anyị ghọta otú obi dị ha n’eziokwu. Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi ka Jehova, o nwere ike ime ka obi sie ụmụnna anyị ike ịkọrọ anyị otú obi dị ha. Ha gwawakwanụ anyị otú obi dị ha, anyị kwesịrị ige ha ntị nke ọma. w20.04 15-16 ¶6-7
Sọnde, Disemba 4
Ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.—Luk 5:10.
N’oge Jizọs, onye Izrel na-akụ azụ̀ na-ama ụdị azụ̀ o nwere ike ịkụta. Ọ na-amakwa ebe o nwere ike ịhụ ụdị azụ̀ ahụ. Azụ̀ na-anọkarị ná mmiri dị ya mma n’ahụ́ nakwa n’ebe ọ ga na-enweta nri mgbe niile. Oge onye na-akụ azụ̀ ji aga ịkụ azụ̀ dịkwa ezigbo mkpa. Otu onye ozi ala ọzọ bi n’agwaetiti Pasifik matara na e nwere oge kacha mma e ji aga ịkụ azụ̀. Otu nwanna nọ n’obodo ahụ gwara ya ka ha gaa kụọ azụ̀, ya asị nwanna ahụ, “M ga-abịa ma ọ kụọ elekere anya itoolu nke ụtụtụ echi.” Nwanna ahụ gwara ya, sị: “Anyị ga-aga mgbe anyị ga-akụta azụ̀, ọ bụghị mgbe dị anyịnwa mma.” Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị rụrụ ọrụ ịkụta mmadụ n’oge ndịozi. Ha gara n’ebe e nwere ike ịhụ ndị mmadụ nakwa n’oge e nwere ike inweta ha. Dị ka ihe atụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara ozi ọma n’ụlọ nsọ na n’ụlọ nzukọ, n’ụlọ n’ụlọ nakwa n’ọma n’ahịa. (Ọrụ 5:42; 17:17; 18:4) Anyịnwa kwesịkwara ịma mgbe anyị ga-enweta ndị mmadụ n’ụlọ n’ókèala anyị. Anyị kwesịrị ịhazigharị ihe ndị anyị na-eme ka anyị nwee ike izi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe na n’oge anyị ga-enweta ha.—1 Kọr. 9:19-23. w20.09 4 ¶8-9
Mọnde, Disemba 5
N’ikwu eziokwu, ka anyị site n’ịhụnanya tolite n’ihe niile n’ime onye ahụ bụ́ isi, ya bụ, Kraịst.—Efe. 4:15.
Otu ihe anyị ga-eme ka anyị na Jizọs burụ enyi bụ ịna-akwado ihe ndị nzukọ Jehova haziri. Anyị na-eme ka anyị na Jizọs, bụ́ onyeisi ọgbakọ, dịkwuo ná mma ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere ndị a họpụtara ịna-elekọta anyị isi. (Efe. 4:16) Dị ka ihe atụ, anyị na-agba mbọ ịhụ na mmadụ ole na-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla amụ ihe na-eru ole e bu n’obi rụọ ya. N’ihi ya, e kpokọtala ụfọdụ ọgbakọ na ibe ha. Ihe a emeela ka nzukọ Jehova gharazie ịna-emefu ego buru ibu. O meekwala ka ụfọdụ ụmụnna gbanwee ihe ụfọdụ. O nwere ike ịbụ na ụmụnna ndị a anọọla n’ọgbakọ ha ọtụtụ afọ, ha na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ abụrụkwa nnu na mmanụ. Ma ugbu a, a gwala ha ka ha gaa ọgbakọ ọzọ. Obi na-atọ Jizọs ụtọ ma ọ hụ ka ndị a na-eso ụzọ ya na-akwado nhazi ndị a. w20.04 24 ¶14
Tuzdee, Disemba 6
Ya na eze ndịda ga-asọrịta mpi.—Dan. 11:40.
Eze ugwu na eze ndịda ga na-amarịta aka n’ihi na nke ọ bụla n’ime ha chọrọ ịbụ ọchịchị kacha ike n’ụwa. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe mere mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe Sọviet Yuniọn na mba ndị na-akwado ya chịwara ọtụtụ mba na Yurop. Ihe a mere ka eze ndịda na mba ndị ọzọ kwekọrịta ijikọ ndị agha ha iji megide eze ugwu. A kpọrọ ha NATO. Eze ugwu na eze ndịda na-emefu nnukwu ego iji mee ka ndị agha ha ka nke ibe ha. Eze ugwu lụsoro eze ndịda agha. Otú o si mee ya bụ na ọ kwadoro ndị iro eze ndịda n’Afrịka, Eshia, nakwa na Latịn Amerịka n’agha ha lụrụ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya esiela ezigbo ike n’ụwa. Ha na-ejikwa kọmputa alụso eze ndịda ọgụ. Ndị eze abụọ ahụ na-ebo ibe ha ebubo na ha na-eji kọmputa eme ka ibe ha na-emefu ego, na-ejikwa ya etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha. Eze ugwu na-alụsokwa ndị Chineke ọgụ otú ahụ Daniel buru n’amụma.—Dan. 11:41. w20.05 13 ¶5-6
Wenezdee, Disemba 7
Mụ onwe m ga-achọta atụrụ m wee lekọta ha.—Ezik. 34:11.
N’oge Aịzaya onye amụma, Jehova jụrụ, sị: “Nwaanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara?” Jehova kwuziri, sị: “Ọbụna ndị inyom a nwere ike ichefu, ma mụ onwe m agaghị echefu gị.” (Aịza. 49:15) Jehova anaghị ejikarị onwe ya atụnyere nne. Ma, o ji onwe ya tụnyere nne na nke ugbu a. Jehova ji otú nne na nwa ya si adị ná mma tụnyere otú o si hụ ndị ya n’anya. Ọtụtụ ndị nne ga-ekweta ihe a otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jasmin kwuru. Ọ sịrị: “Inye nwa ara na-eme ka gị na ya dịrị ná mma ná ndụ unu niile.” Jehova ma mgbe nwa ya nke ọ bụla kwụsịrị ikwusa ozi ọma na ịga ọmụmụ ihe. Ọtụtụ ụmụnna anyị ndị a anyị hụrụ n’anya kwụsịrị ije ozi na-emecha lọghachi n’ọgbakọ. Obi na-adịkwa anyị ụtọ ma ha lọghachi. Jehova chọrọ ka ha lọghachi, anyịnwa chọkwara.—1 Pita 2:25. w20.06 18 ¶1-3
Tọzdee, Disemba 8
[Lekwasịnụ] anya . . . n’ihe a na-adịghị ahụ anya. N’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge, ma ihe a na-adịghị ahụ anya na-adịru mgbe ebighị ebi.—2 Kọr. 4:18.
Ọ bụghị ihe niile Chineke nyere anyị ka anyị nwere ike ịhụ anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na a naghị ahụ onyinye ndị kachanụ Chineke nyere anyị anya. Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, o kwuru gbasara onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa karịa akụnụba. O kwuziri, sị: “N’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.” (Mat. 6:19-21) Anyị na-agbalị inweta ihe ndị anyị weere ka ihe ndị bara ezigbo uru. Ọ bụrụ na anyị na Jehova adịrị ná mma, ‘anyị na-akpakọbara onwe anyị akụ̀ n’eluigwe.’ Jizọs kwuru na o nweghị ihe nwere ike imebi ụdị akụ́ a, a gaghịkwanụ ezuruli ya n’ohi. Pọl onyeozi gwara anyị ka anyị na-elekwasị anya “n’ihe a na-adịghị ahụ anya.” (2 Kọr. 4:17, 18) Ihe ndị so n’ihe ndị a na-adịghị ahụ anya bụ ihe ọma ndị Chineke ga-emere anyị n’ụwa ọhụrụ. Obi ọ̀ dị anyị ụtọ maka onyinye ndị a a na-anaghị ahụ anya? w20.05 26 ¶1-2
Fraịdee, Disemba 9
Ntụziaka m ga na-atasị dị ka mmiri ozuzo.—Diut. 32:2.
Ihe Mozis kụziiri ụmụ Izrel gbara ha ume, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike otú ahụ mmiri nke na-avụsị n’elu ahịhịa na-eme ka ahịhịa na-eto nke ọma. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ihe anyị na-akụziri ndị mmadụ dị otú ahụ? Anyị nọrọ n’ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, anyị nwere ike iji Baịbụl gosi ndị mmadụ aha Chineke bụ́ Jehova. Anyị nwere ike inye ha ọmarịcha akwụkwọ anyị, gosi ha vidio, nakwa ihe ndị ọzọ dị na jw.org ndị ga-eme ka ha mata gbasara Jehova. Anyị nọrọ n’ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụkwanụ mewe njem, anyị nwere ike iji ohere ahụ gwa ndị mmadụ gbasara Chineke anyị anyị hụrụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ndị mmadụ gbasara nzube Jehova maka ụmụ mmadụ na ụwa, anyị na-eme ka ha mata ụdị onye Jehova bụ, nke nwekwara ike ịbụ nke mbụ ha na-anụ ya. Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ndị ọzọ gbasara Nna anyị hụrụ anyị n’anya, anyị so eme ka e doo aha ya nsọ. Anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịmata na ọtụtụ ihe a na-akụziri ha banyere Chineke bụ ụgha. Ihe anyị si na Baịbụl akụziri ndị mmadụ bụ ihe kacha eme obi ụtọ ha nwere ike ịmụta.—Aịza. 65:13, 14. w20.06 10 ¶8-9
Satọdee, Disemba 10
Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu.—Mal. 3:7.
Olee àgwà ndị anyị kwesịrị inwe ma anyị chọọ inyere ndị chọrọ ịlọghachikwute Jehova aka? Ka anyị lee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu ahụ pụrụ n’ụlọ. (Luk 15:17-24) Nwa ahụ mechara ghọta onwe ya ma kpebie ịlaghachi n’ụlọ ha. Nna ya gbaara ọsọ gaa makụọ ya otú mere ka ọ ghọta na ọ hụrụ ya n’anya. Obi nwa ahụ na-ama ya ikpe, ya echee na o rughịzi eru ka nna ya were ya ka nwa ya. Nna ya meteere ya ebere mgbe ọ na-akọrọ ya otú obi dị ya. Nna ya meziri ihe ụfọdụ iji gosi ya na ọ nabatala ya ka nwa ya ọ hụrụ n’anya. O meere ya oriri ma yiwe ya uwe mara ezigbo mma. Jehova yiri nna ahụ e ji mee ihe atụ. Ọ hụrụ ụmụnna anyị kwụsịrịla ije ozi n’anya, chọọkwa ka ha lọghachikwute ya. Anyịnwa kwesịkwara inyere ha aka ka ha lọghachi n’ọgbakọ, otú ahụ Jehova na-eme. Iji nwee ike ime ya, anyị kwesịrị inwere ha ndidi, nweere ha ọmịiko, hụkwa ha n’anya. w20.06 25-26 ¶8-9
Sọnde, Disemba 11
Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.—Jọn 8:31, 32.
Jizọs kwuru na ụfọdụ nwere ike iji “ọṅụ” nabata eziokwu ahụ. Ma ọ bụrụ na nsogbu abịara ha, okwukwe ha anyụọ ka ọkụ. (Mat. 13:3-6, 20, 21) O nwere ike ịbụ n’ihi na ha amaghị na nsogbu na-abịara ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Mat. 16:24) O nwekwara ike ịbụ na ha chere na ebe ha bụ Ndị Kraịst, nsogbu ọ bụla agaghị abịara ha ma ọ bụ na Chineke ga-ewepụrụ ha nsogbu ha niile. Ma ebe anyị ka bi n’ụwa Ekwensu, nsogbu ga na-abịara anyị. Ihe nwere ike ịgbanwere anyị, mee ka anyị gharazie ịna-enwe obi ụtọ. (Ọma 6:6; Ekli. 9:11) Ọtụtụ ụmụnna anyị na-egosi na obi siri ha ike na ihe ha kweere bụ eziokwu. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ? Ha anaghị amalite inwe obi abụọ ọ bụrụgodị na nwanna akpasuo ha iwe ma ọ bụ mee ihe ọjọọ. (Ọma 119:165) Nsogbu ọ bụla bịaara ha na-eme ka okwukwe ha sikwuo ike kama ime ka ọ nyụọ ka ọkụ. (Jems 1:2-4) Anyị kwesịrị inwe ụdị okwukwe ahụ. w20.07 8 ¶1; 9 ¶4-5
Mọnde, Disemba 12
Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke.—Jems 1:5.
Tupu gị amalite ịgụ Baịbụl, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịhụ ihe ndị ga-abara gị uru n’ihe ahụ ị na-agụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-achọ otú ị ga-esi die otu nsogbu i nwere, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịchọta amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme. (Fil. 4:6, 7) Jehova kere anyị otú anyị nwere ike iji uche anyị na-ahụ ihe anyị na-eche n’echiche. Iji nwee ike ịghọta ihe ị na-agụ na Baịbụl nke ọma, gbalịa were ya na ị na-ahụ ka ihe a kọrọ na Baịbụl na-eme, werekwa ya na ọ bụ gịnwa ka ihe ahụ na-eme. Gbalịa na-ahụ ihe onye ahụ hụrụ. Meekwa ka obi dị gị otú ọ dị onye ahụ. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ichebara ya echiche. Anyị gụwa Baịbụl, anyị kwesịrị iche gbasara otú ihe anyị na-agụ si gbasa anyị. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọta isiokwu ahụ nke ọma. Ịgụ Baịbụl n’echebaraghị ya echiche dị ka ebe mmadụ nwere ihe ndị e ji esi nri ma na-ele ha naanị n’anya n’anya. Ọ bụrụ na o jighị ihe ndị ahụ sie nri, ọ gaghị eri nri dị ụtọ. Ichebara ihe anyị gụrụ echiche ga-enyere anyị aka ịghọta ya nke ọma. w21.03 15 ¶3-5
Tuzdee, Disemba 13
Ana m ekele Chineke, . . . [ọ dịbeghịkwa] mgbe m kwụsịrị icheta gị n’arịrịọ m na-arịọsi ike, abalị na ehihie.—2 Tim. 1:3.
Ọ bụrụ na Pọl onyeozi chọrọ, ọ gaara na-eche gbasara ihe ndị gara aga, na-eche na a garaghị atụ ya mkpọrọ ma a sị na ọ bụghị Onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi. Ọ gaara ewewere ụmụ nwoke ndị bi n’ógbè Eshia iwe na ha gbahapụrụ ya. O nwekwara ike ime ka ọ kwụsị ịtụkwasị ndị enyi ya ndị ọzọ obi. Mana, Pọl emeghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a. N’agbanyeghị na Pọl ma na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya, o chefughị na o kwesịrị ịna-eme ihe ga-eme ka e too Jehova. Ọ nọgidekwara na-eche otú o nwere ike isi na-agba ndị ọzọ ume. Ọ na-ekpe ekpere mgbe niile iji gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Kama ịnọ na-eche mgbe niile gbasara ndị gbahapụrụ ya, o gosiri na obi dị ya ezigbo ụtọ gbasara ndị enyi ya ndị na-enyere ya aka ma na-akwado ya. Ihe ọzọ bụ na Pọl nọgidere na-amụ Okwu Chineke. (2 Tim. 3:16, 17; 4:13) Ihe kacha mkpa bụ na obi siri ya ike na Jehova na Jizọs Kraịst hụrụ ya n’anya. w21.03 18 ¶17-18
Wenezdee, Disemba 14
Dị nnọọ ka a na-achịkọta ata ma suo ha ọkụ, otú ahụ ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.—Mat. 13:40.
Mgbe afọ 100 gachara, Ndị Kraịst adịgboroja batara n’ọgbakọ ezigbo Ndị Kraịst. Ha kụziwere ozizi ụgha ma mee ka ndị mmadụ ghara ịma eziokwu dị n’Okwu Chineke. Si mgbe ahụ ruo n’ihe dị ka afọ 1870, Chineke enweghị nzukọ ya n’elu ụwa. Ndị Kraịst adịgboroja toro n’ike n’ike ka ata a ghara n’ubi a kụrụ ezi mkpụrụ ma mee ka a ghara ịmata ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst. (Mat. 13:36-43) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mata ihe a? Ọ bụ n’ihi na o gosiri na amụma ahụ e buru gbasara eze ugwu na eze ndịda na Daniel isi iri na otu agbasaghị ndị eze ma ọ bụ ọchịchị ndị chịrị n’agbata afọ 100 na afọ 1870. E nweghị ndị bụ́ ndị ohu Chineke ha ga-akpagbu n’oge ahụ. Ma, obere oge afọ 1870 gachara, a matara ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda. w20.05 3 ¶5
Tọzdee, Disemba 15
Ọ dị mba . . . nke gbagotere wee bata n’ala m.—Joel 1:6.
Joel buru amụma na igurube ga-ala ihe niile dị n’ala Izrel n’iyi. (Joel 1:4) Ruo ọtụtụ afọ, anyị ghọtara na amụma ahụ na-ekwu gbasara otú ndị Jehova si ekwusa ozi ọma n’akwụsịghị akwụsị ka igurube a na-agaghị akwụsịli akwụsị. Anyị ghọtara na ozi ọma ahụ na-emekpa “ala” ahụ ma ọ bụ ndị ndị ndú okpukpe na-eduzi ahụ́. Ma, ọ bụrụ na anyị emeda obi leba anya n’ihe niile gbasara amụma ahụ, anyị ga-achọpụta na anyị kwesịrị ịgbanwe ihe anyị ghọtara. Legodị ihe Jehova kwuru gbasara igurube ahụ. Ọ sịrị: “M ga-emekwa ka ndị si n’ebe ugwu [ya bụ, igurube] si n’ebe unu nọ pụọ gaa n’ebe dị anya.” (Joel 2:20) Ọ bụrụ na igurube ahụ nọchiri anya Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ndị na-eso ụzọ otú ahụ Jizọs gwara ha na-eme, olee ihe mere Jehova ji sị na ọ ga-achụpụ ha? (Ezik. 33:7-9; Mat. 28:19, 20) O doro anya na Jehova anaghị achụpụ ndị ji obi ha na-efe ya, kama, ọ na-achụpụ ihe ma ọ bụ onye na-emegide ndị ya. w20.04 3 ¶3-5
Fraịdee, Disemba 16
Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke.—Jems 1:5.
Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị chee na Jehova azaghị anyị ekpere anyị ozugbo? Jems kwuru na anyị kwesịrị ‘ịna-arịọ Chineke.’ Jehova anaghị ewe iwe ma anyị nọgide na-arịọ ya ka o nye anyị amamihe. Nna anyị nke eluigwe “na-eji mmesapụ aka” enye anyị amamihe ma anyị rịọ ya maka ya iji die ọnwụnwa ndị na-abịara anyị. (Ọma 25:12, 13) Ọ na-ahụ ọnwụnwa ndị na-abịara anyị, na-enwere anyị ọmịiko, dịrịkwa njikere inyere anyị aka. Nke a na-eme ka anyị na-enwe ezigbo ọṅụ. Ma, olee otú Jehova si enye anyị amamihe? Ọ na-esi n’Okwu ya enye anyị amamihe. (Ilu 2:6) Iji nweta amamihe ahụ, anyị ga na-amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ma, ihe dị anyị mkpa abụghị naanị ịna-amụ Baịbụl. Anyị ga na-emekwa ihe anyị mụtara na ya. Jems dere, sị: “Bụrụnụ ndị na-eme okwu Chineke, unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ.” (Jems 1:22) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru, anyị ga na-eme udo, nwee ezi uche, na-emekwa ebere. (Jems 3:17) Àgwà ndị a na-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị ma ka na-enwe ọṅụ. w21.02 29 ¶10-11
Satọdee, Disemba 17
Akụkụ ahụ́ nke ọ bụla n’otu n’otu . . . na-eme ka ahụ́ na-eto eto.—Efe. 4:16.
O yiri ka onye a na-amụrụ ihe ọ̀ ga-aka eme nke ọma ma ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-enyere ya aka. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike inyere ndị ọhụrụ aka ịbata n’ọgbakọ. Otu ọsụ ụzọ sịrị: “A na-ekwukarị na ọ bụghị otu onye na-azụ nwa. M chekwa na ihe a bụ eziokwu ma a bịa n’ime ndị na-eso ụzọ. Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-enye aka mee ka mmadụ bata n’ọgbakọ.” Nne na nna, ndị ikwu, ndị enyi, na ndị nkụzi na-enye aka azụ nwatakịrị ka ọ bụrụ dimkpa. Otú ha si eme ya bụ ịgba ya ume na ịkụziri ya ihe ndị dị ezigbo mkpa. Otú ahụkwa ka ndị nkwusa nwere ike ịna-enye onye a na-amụrụ ihe ndụmọdụ, na-agba ya ume, na-akpakwa àgwà ndị ha chọrọ ka ọ mụta. Ha ga-esi otú a nyere ya aka iru eru ime baptizim. (Ilu 15:22) Gịnị mere onye na-amụrụ mmadụ Baịbụl kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ ma ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-enyere onye ọ na-amụrụ ihe aka? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị nwere ike inyere ya aka ịna-eme nke ọma. w21.03 8 ¶1-3
Sọnde, Disemba 18
Ọ bụrụ na anyị asị: “Anyị enweghị mmehie,” anyị na-eduhie onwe anyị.—1 Jọn 1:8.
Ndị Kraịst niile, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịna-ebi ndụ ihu abụọ. Jọn onyeozi kwuru na anyị agaghị na-eje ije n’eziokwu ahụ, na-ebikwa ndụ rụrụ arụ. (1 Jọn 1:6) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe anyị dị Jehova mma ma ugbu a ma n’ọdịnihu, anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na ọ na-ahụ ihe niile anyị na-eme. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụgodị na ndị mmadụ anaghị ahụ ihe anyị na-eme na nzuzo, Jehova na-ahụ ya. (Hib. 4:13) Anyị ekwesịghị ịna-ele mmehie anya ka ndị ụwa. N’oge Jọn, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu na mmadụ nwere ike kpachara anya na-eme mmehie, ya na Chineke aka dịrịkwa ná mma. Taa, ndị anyị na ha bi n’ụwa na-echekwa otú ahụ. Ọtụtụ ndị na-ekwu na ha kweere na Chineke, ma ha ekweghị ihe Chineke kwuru gbasara mmehie, karịchaa ma a bịa n’ihe gbasara mmekọahụ. E nwere ụdị mmekọahụ ndị Jehova sị na ha dị njọ, ma ndị mmadụ ana-ekwu na ọ bụrụhaala ihe mmadụ chọrọ ime, na ọ dịghị njọ. w20.07 22 ¶7-8
Mọnde, Disemba 19
Hụ ụmụnna anyị n’anya . . . n’omume nakwa n’eziokwu.—1 Jọn 3:18.
Ị̀ na-agbachitere ụmụnna nwaanyị mgbe ọ dị ha mkpa? Chegodị gbasara ihe a. Ụmụnna na-ahụ na otu nwanna nwaanyị di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova na-abịa ọmụmụ ihe n’azụ oge ma na-ala ozugbo a gbasara. Ha chọpụtakwara na ọ naghị akpọkarị ụmụ ya abịa ọmụmụ ihe. N’ihi ya, ha na-akatọ ya, na-asị na o kweghị eme ka di ya kweta ka ọ na-akpọ ụmụ ya abịa ọmụmụ ihe. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na nwanna nwaanyị a na-eme ihe niile o nwere ike ime. Ọ bụghị ya ka ihe niile ọ na-eme dị n’aka. Ọ bụghịkwa ya ga-ekpebi ihe niile banyere ụmụaka ahụ. Ọ bụrụ na ị jaa nwanna nwaanyị ahụ mma ma gwa ndị ọzọ na ọ na-eme nke ọma, o nwere ike ime ka ha kwụsị ikwu ihe na-adịghị mma banyere ya. Ndị okenye ma na Jehova ejighị otú e si emeso ụmụnna nwaanyị egwu egwu. (Jems 1:27) Ndị okenye kwesịrị ịna-echebara ụmụnna nwaanyị echiche ka Jizọs. Ha ekwesịghị ịna-eme iwu mgbe ha kwesịrị ime ebere ma ghọta otú ihe si dịrị ha. (Mat. 15:22-28) Ọ bụrụ na ndị okenye ana-enyere ụmụnna nwaanyị aka, ọ ga-eme ka ụmụnna nwaanyị mata na Jehova na ọgbakọ ya ji ha kpọrọ ihe. w20.09 24-25 ¶17-19
Tuzdee, Disemba 20
[Chineke] emewo ka Eze Nebukadneza mara ihe gaje ime.—Dan. 2:28.
Daniel onye amụma dị umeala n’obi. Ọ na-achọkarị ka Jehova na-eduzi ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova ji ya kọwaara Nebukadneza nrọ ya, o kweghị ka e too ya maka ya. Kama, o ji obi umeala kwuo na ọ bụ Jehova ka e kwesịrị ito. (Dan. 2:26-28) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ bụrụ na okwu anyị kwuru n’ọmụmụ ihe atọọ ụmụnna ụtọ ma ọ bụ na o nwere ihe ọma ndị mere n’ozi anyị, anyị kwesịrị ito Jehova maka ha. Anyị kwesịrị ịmata na ọ bụ Jehova nyeere anyị aka ime ihe ndị ahụ. (Fil. 4:13) Anyị na-eme otú a, anyị na-emekwa ka Jizọs. Jizọs tụkwasịrị Jehova obi. (Jọn 5:19, 30) O nweghị mgbe ọ chọrọ ịnara Nna ya nke eluigwe ọkwá n’ike. Ndị Filipaị 2:6 sịrị: “O cheghị echiche ịnara ọkwá n’ike, ya bụ, ka ọ hara ka Chineke.” Jizọs ma ebe ike ya ruru ma na-erubere Nna ya isi. w20.08 11 ¶12-13
Wenezdee, Disemba 21
Na-agbanụ ọsọ n’ụzọ ga-eme ka unu nweta ya.—1 Kọr. 9:24.
Nsogbu na-abịara ụfọdụ ndị na-agba ọsọ nke ndụ ahụ bụ nsogbu ndị anyị na-enweghị ike ịhụ na ndị nke anyị na-enweghị ike ịghọta. Ọ bụrụ na e nwere nsogbu i nwere i chere na ndị mmadụ anaghị aghọta, ihe mere Mefiboshet nwere ike inyere gị aka. (2 Sam. 4:4) Ọ dara ngwọrọ. Eze Devid chere ihe na-adịghị mma gbasara ya, mejọọkwa ya. Ma, o kweghị ka ihe ahụ wewe ya iwe. Kama, obi dị ya ụtọ maka ihe ọma ndị meere ya. Obi dịkwa ya ụtọ maka ihe ọma ndị Devid meere ya n’oge gara aga. (2 Sam. 9:6-10) N’ihi ya, mgbe Devid mejọrọ ya, o chebaara ihe niile merenụ echiche. O kweghị ka ihe Devid mejọrọ mee ka obi na-ajọ ya njọ. Ọ takwanụghị Jehova ụta maka ihe Devid mere ya. Mefiboshet mere ihe o nwere ike ime iji kwadoo eze Jehova họpụtara. (2 Sam. 16:1-4; 19:24-30) Jehova mere ka e dee ihe Mefiboshet mere n’Okwu ya ka anyị mụta ihe na ya.—Rom 15:4. w20.04 26 ¶3; 30 ¶18-19
Tọzdee, Disemba 22
Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.—1 Kọr. 3:9.
E nwere ike ịhọpụta ụfọdụ ụmụnna ka ha bụrụ ndị ozi ala ọzọ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ma ọ bụkwanụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ha ekpebiela ịna-eje ozi oge niile. Ọ bụ eziokwu na ụmụnna ndị a enweghị nnukwu ego ma ọ bụ ọtụtụ ihe, Jehova ejirila ọtụtụ ihe gọzie ha. (Mak 10:29, 30) Anyị ejighị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị a egwu egwu. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị na ha nọ n’ọgbakọ a. Ọ̀ bụ naanị ụmụnna ndị a e ji mmụọ nsọ họpụta na ndị nọ n’ozi oge niile bara uru n’ọgbakọ? Mba. Onye nkwusa ọ bụla baara Chineke na ọgbakọ uru. (Rom 10:15; 1 Kọr. 3:6-8) Nke bụ́ eziokwu bụ na otu n’ime ihe ndị kacha mkpa mere e ji hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ime ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:19, 20; 1 Tim. 2:4) Ndị niile na-ekwusa ozi ọma, ma ndị merela baptizim ma ndị nkwusa na-emebeghị baptizim na-ewere ọrụ a ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha.—Mat. 24:14. w20.08 21 ¶7-8
Fraịdee, Disemba 23
M nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.—Mat. 28:20.
Dị ka e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa, Jizọs ga-enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị. N’eziokwu, ihe a Jizọs kwuru na-agba anyị ume. N’ihi gịnị? N’ihi na e nwere mgbe ụfọdụ nsogbu na-abịara anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ anwụnahụ anyị, ọ bụghị naanị ụbọchị ole na ole ka anyị na-eru uju ya. Anyị nwedịrị ike iru uju ọnwụ onye ahụ ruo ọtụtụ afọ. Ụfọdụ ndị na nká na-alụ. E nwekwara ndị nsogbu nke ha bụ ịda mbà n’obi. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị na-edi ya n’ihi na anyị ma na Jizọs nọnyeere anyị “ụbọchị niile,” ma ụbọchị ndị nke ihe kacha siere anyị ike ná ndụ. (Mat. 11:28-30) Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya enyere anyị aka. (Hib. 1:7, 14) Dị ka ihe atụ, ndị mmụọ ozi na-akwado anyị ma na-eduzi anyị ka anyị na-ekwusara ndị si ná “mba niile na ebo niile na asụsụ niile” “ozi ọma nke a nke alaeze.”—Mat. 24: 13, 14; Mkpu. 14:6. w20.11 13-14 ¶6-7
Satọdee, Disemba 24
Echiche nke dị n’obi mmadụ yiri mmiri miri emi, ma, ọ bụ onye nwere nghọta ga-esepụta ya.—Ilu 20:5.
Anyị chọrọ ka o doo onye anyị na-amụrụ ihe anya na ihe ọ na-amụta si n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee. (1 Tesa. 2:13) Olee otú anyị ga-esi eme ya? Gbaa onye ị na-amụrụ Baịbụl ume ka ọ na-ekwu ihe ndị ọ na-amụta. Kama ịna-akọwara ya amaokwu Baịbụl mgbe niile, gwa ya ka ọ kọwaara gị ụfọdụ n’ime ha. Nyere ya aka ka ọ chọpụta otú Okwu Chineke si gbasa ya. Jụọ ya ajụjụ ndị ga-eme ka o kwuo ihe o chere ma ọ bụ otú obi dị ya gbasara ebe ndị unu gụrụ na Baịbụl. (Luk 10:25-28) Dị ka ihe atụ, jụọ ya, sị: “Olee àgwà Jehova amaokwu Baịbụl a na-akọrọ gị banyere ya?” “Olee uru eziokwu Baịbụl a baara gị?” “Olee otú obi dị gị gbasara ihe a ị mụtara?” Ihe kacha mkpa abụghị ihe ole onye anyị na-amụrụ Baịbụl ma, kama ọ bụ otú ndị nke ọ ma si na-atọ ya ụtọ, ya ana-emekwa ha eme. Anyị kwesịrị ikwe ka ọ bụrụ Baịbụl ga-akụziri ha ihe. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu otú e si akụzi ihe nke ọma, ị ga-adịrịrị umeala n’obi. w20.10 15 ¶5-6
Sọnde, Disemba 25
Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị.—Ekli. 11:6.
Obi kwesịrị isi anyị ike na a ga-arụcha ọrụ ikwusa ozi ọma a kpọmkwem n’oge Jehova chọrọ. Chegodị gbasara ihe mere n’oge Noa. Jehova gosiri na ọ na-eme ihe niile n’oge kwesịrị ekwesị. Ihe dị ka otu narị afọ na iri abụọ tupu Iju Mmiri ahụ, Jehova kwuru oge Iju Mmiri ahụ ga-amalite. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jehova nyere Noa ọrụ iwu ụgbọ. Noa nọgidere na-arụsi ọrụ ike ruo ihe dị ka afọ iri anọ ma ọ bụ iri ise tupu Iju Mmiri ahụ amalite. N’agbanyeghị na ndị o ziri ozi ọma ekweghị ege ya ntị, ọ nọgidere na-ezi ha ozi ịdọ aka ná ntị ruo mgbe Jehova gwara ya banye n’ụgbọ ahụ. Mgbe oge Jehova ruru, “Jehova mechiri ụzọ.” (Jen. 6:3; 7:1, 2, 16) N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka anyị mata na oge eruola ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma. Mgbe ahụ, ọ ga-ebibi ụwa Setan ma weta ụwa ọhụrụ ezi omume. Tupu mgbe ahụ, ka anyị ṅomie Noa na ụmụnna anyị ndị na-ekwebeghị ka aka ha zuo ike n’ozi Jehova. Ka anyị nọgide na-etinye uche anyị n’ikwusa ozi ọma, na-enwe ndidi ma na-enwe okwukwe siri ike n’ebe Jehova na nkwa ya nọ. w20.09 13 ¶18-19
Mọnde, Disemba 26
Ka e mee ihe niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.—1 Kọr. 14:40.
Ọ bụrụ na e nweghị onye Jehova mere onyeisi, ezinụlọ ya ga-adị ghaa ghaa ghaa, ha agaghịkwa na-enwe obi ụtọ. Ọ ga-eme ka a ghara ịma onye ga-ekpebi ihe a ga-eme nakwa onye ga-ebute ụzọ n’ime ihe ahụ e kpebiri. Ọ bụrụ na nhazi Jehova mere ka e nwee ndị isi magburu onwe ya, olee ihe mere o ji adị ọtụtụ ụmụ nwaanyị ka à na-emegbu ha emegbu? Ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ ụmụ nwoke anaghị eme ihe Jehova kwuru ka ndị isi ezinụlọ na-eme, kama ha na-eso omenala obodo ha. Ha nwekwara ike ime ndị nwunye ha ihe ọjọọ iji mee onwe ha obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, di nwere ike iji aka ike na-emeso nwunye ya ihe iji mee onwe ya obi ụtọ ma ọ bụkwanụ iji gosi ndị ọzọ na ya bụ nwoke. O nwere ike iche na ya enweghị ike ịmanye nwunye ya ka ọ hụ ya n’anya, ma o nwere ike ime ka ọ na-atụ ya egwu. O nweziri ike iji egwu ahụ ọ na-atụ ya na-achị ya. Isi otú a na-eche echiche ma ọ bụ na-akpa àgwà ga-eme ka a ghara ịna-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù ma na-asọpụrụ ha otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụghịkwa otú a ka Jehova chọrọ ya.—Efe. 5:25, 28. w21.02 3 ¶6-7
Tuzdee, Disemba 27
Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.—1 Pita 5:7.
Ọ bụrụ na Onye Kraịst enwee nsogbu, obi nwere ike iru ya ala ma o si n’ala ala obi ya rịọ Jehova ka o nyere ya aka. Otú Jehova nwere ike isi za ekpere anyị bụ inye anyị “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Fil. 4:6, 7) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya dị ike eme ka anyị gharazie ịna-echegbu onwe anyị. (Gal. 5:22) I kpewe ekpere, gwa Jehova otú obi dị gị. Gwa ya kpọmkwem ihe bụ́ mkpa gị nakwa otú ọ dị gị n’obi. Ọ bụrụ na o nwere ihe a ga-emeli gbasara nsogbu ahụ, rịọ ya ka o nye gị amamihe ka ị chọpụta ihe ị ga-eme gbasara ya, nyekwa gị ike ị ga-eji eme ya. Ọ bụrụkwanụ na e nweghị ihe a ga-emeli gbasara nsogbu ahụ, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị gbasara ya. Ọ bụrụ na ị na-akpọ okwu aha ma i kpewe ekpere, ị ga-achọpụta mgbe Jehova zara gị ekpere ahụ. Ma a zaghị gị ekpere ahụ ozugbo, akwụsịla ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka. Ihe Jehova chọrọ abụghị naanị ka ị gwa ya kpọmkwem ihe bụ́ mkpa gị n’ekpere, ọ chọkwara ka ị nọgide na-ekpe ekpere gbasara ya.—Luk 11:8-10. w21.01 3 ¶6-7
Wenezdee, Disemba 28
[Jizọs] sịrị ha: “Ọ bụghị mmadụ niile ga-emeli ihe ahụ e kwuru, kama ọ bụ naanị ndị nwere onyinye ya.”—Mat. 19:11.
Taa, e nwere ọtụtụ ndị di na nwunye na ọtụtụ ezinụlọ n’ọgbakọ, nweekwa ọtụtụ ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye? Ka anyị legodị otú Jizọs si lee ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye anya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ lụghị nwaanyị. Ọ nọ naanị ya ma jiri oge ya niile lekwasị anya n’ihe ọ bịara ime n’ụwa. Jizọs ekwughị na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na o kwesịghị ịlụ. Ma, o kwuru na ụfọdụ Ndị Kraịst ga-ekpebi ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. (Mat. 19: 12) Jizọs kwanyeere ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ùgwù. O ledaghị ha anya ma ọ bụ were ha ka ndị ihe kọrọ n’ihi na ha alụghị di ma ọ bụ nwunye. Pọl onyeozi alụghịkwa nwaanyị mgbe ọ na-eje ozi ya otú ahụ Jizọs na-alụghị. O nweghị mgbe Pọl kụziri na ọ dịghị mma Onye Kraịst ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ ma na ọ bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya. w20.08 28 ¶7-8
Tọzdee, Disemba 29
Chineke bụ ịhụnanya.—1 Jọn 4:16.
Jọn onyeozi biri ogologo ndụ. Ọtụtụ ihe mere ná ndụ ya. Ọtụtụ nsogbu ndị nwere ike ime ka okwukwe ya nyụọ ka ọkụ bịakwaara ya. Ma, o mere ike ya mgbe niile idebe iwu Jizọs nke ịhụ ụmụnna anyị n’anya so na ya. N’ihi ya, obi siri ya ike na Jehova na Jizọs hụrụ ya n’anya nakwa na ha ga-enye ya ike ọ ga-eji emeri ọnwụnwa ọ bụla bịaara ya. (Jọn 14:15-17; 15:10) O nweghị ihe Setan ma ọ bụ ụwa ya mere nke kwụsịrị Jọn ịhụ ụmụnna ya n’anya nakwa igosi ha na ọ hụrụ ha n’anya. Dị ka Jọn, anyị bikwa n’ụwa ọjọọ Ekwensu, bụ́ onye na-enweghị onye ọ hụrụ n’anya, na-achị. (1 Jọn 3:1, 10) Ọ bụ eziokwu na ọ chọrọ ka anyị kpọ ụmụnna anyị asị, ma ọ gaghị enwe ike ime ya ma ọ bụrụ na anyị ekweghị. Ka anyị kpebisie ike isi n’ihe anyị na-ekwu na n’ihe anyị na-eme na-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Anyị mee otú ahụ, obi ga-adị anyị ụtọ na anyị so n’ezinụlọ Jehova, ndụ ga na-atọkwa anyị ụtọ.—1 Jọn 4:7. w21.01 13 ¶18-19
Fraịdee, Disemba 30
Chineke . . . na-enye ntachi obi.—Rom 15:5.
Ndụ nwere ike isi ezigbo ike n’ụwa a Ekwensu na-achị. Mgbe ụfọdụ, anyị agaghị ama ihe anyị ga-eme eme. (2 Tim. 3:1) Ma, anyị ekwesịghị ichegbuwe onwe anyị ma ọ bụ tụwa ụjọ. Jehova ma ihe anyị na-agabiga. Ọ bụrụ na anyị adaa, o kwere nkwa na ya ga-eji aka nri ya dị ike jidesie anyị ike. (Aịza. 41:10, 13) Obi siri anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. Ihe anyị na-agụta na Baịbụl ga-enyekwara anyị aka idi nsogbu ọ bụla ga-abịara anyị. Vidio anyị, ihe nkiri ndị a na-egere egere, nakwa isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha” ga-enyere anyị aka ịghọta akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl. Tupu gị elee vidio ndị ahụ, ma ọ bụ gee akụkọ Baịbụl ndị ahụ, ma ọ bụkwanụ gụọ isiokwu ndị ahụ, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịchọpụta ihe ndị i nwere ike ime. Were ya na ọ bụ gị bụ onye ihe ahụ na-eme. Chee gbasara ihe ndị a niile ji obi ha fee Jehova mere nakwa otú Jehova si nyere ha aka imeri nsogbu ndị ha nwere. Mee ihe ndị ị mụtara na ha. Kelee Jehova maka otú o si nyere gị aka. Gosikwa na obi dị gị ụtọ n’ụzọ ndị a Jehova si nyere gị aka. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịchọ otú ị ga-esi na-agba ndị ọzọ ume ma na-akwado ha. w21.03 19 ¶22-23
Satọdee, Disemba 31
Ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova.—Ọma 127:3.
Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, ya abụrụkwa na unu chọrọ ịmụ ụmụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ànyị bụ di na nwunye dị umeala n’obi ma jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe, ndị Jehova ga-achọ ka ha lekọta nwa ọhụrụ?’ (Ọma 127: 4) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-akụziri ụmụ m ịrụsi ọrụ ike?’ (Ekli. 3:12, 13) ‘M̀ na-echebe ụmụ m ka ha ghara ịdaba ná nsogbu ma ọ bụ n’omume rụrụ arụ?’ (Ilu 22:3) Ị gaghị echebeli ụmụ gị ka nsogbu ghara ịbịara ha chaa chaa. Ma, i nwere ike iji nwayọọ nwayọọ na-azụ ha ka ha mụta ịna-eji Okwu Chineke achọpụta ihe ha ga-eme ma nsogbu bịara ha n’ọdịnihu. (Ilu 2:1-6) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ezinụlọ unu ahapụ Jehova, nyere ụmụ gị aka ka ha si n’Okwu Chineke chọpụta ihe mere o ji dị mkpa ka ha nọgide na-erubere Jehova isi. (Ọma 31:23) Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na mmadụ anwụnahụ unu, gosi ụmụ gị otú ha ga-esi chọta ihe ndị ga-akasi ha obi n’Okwu Chineke.—2 Kọr. 1:3, 4; 2 Tim. 3:16. w20.10 27 ¶7