Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es23 p. 118-128
  • Disemba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Disemba
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2023
  • Isiokwu Nta
  • Fraịdee, Disemba 1
  • Satọdee, Disemba 2
  • Sọnde, Disemba 3
  • Mọnde, Disemba 4
  • Tuzdee, Disemba 5
  • Wenezdee, Disemba 6
  • Tọzdee, Disemba 7
  • Fraịdee, Disemba 8
  • Satọdee, Disemba 9
  • Sọnde, Disemba 10
  • Mọnde, Disemba 11
  • Tuzdee, Disemba 12
  • Wenezdee, Disemba 13
  • Tọzdee, Disemba 14
  • Fraịdee, Disemba 15
  • Satọdee, Disemba 16
  • Sọnde, Disemba 17
  • Mọnde, Disemba 18
  • Tuzdee, Disemba 19
  • Wenezdee, Disemba 20
  • Tọzdee, Disemba 21
  • Fraịdee, Disemba 22
  • Satọdee, Disemba 23
  • Sọnde, Disemba 24
  • Mọnde, Disemba 25
  • Tuzdee, Disemba 26
  • Wenezdee, Disemba 27
  • Tọzdee, Disemba 28
  • Fraịdee, Disemba 29
  • Satọdee, Disemba 30
  • Sọnde, Disemba 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2023
es23 p. 118-128

Disemba

Fraịdee, Disemba 1

Ha ga-ege m ntị.—Jọn 10:16.

Jizọs ji otú ya na ndị na-eso ụzọ ya si dịrị ná mma tụnyere otú atụrụ na onye na-azụ ha si adị ná mma. (Jọn 10:14) Ihe atụ ahụ dabara adaba. Atụrụ na-ama olu onye na-azụ ya ma na-ege ya ntị. E nwere otu nwoke chọpụtara na ọ bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Anyị chọrọ ka atụrụ ụfọdụ bịa anyị nso ka anyị see ha foto. Ma, ha ekweghị abịa n’ihi na ha amaghị olu anyị. Ma, ozugbo otu obere nwa na-azụ atụrụ bịara kpọọ ha, ha sowere ya.” Ihe a nwoke a kọrọ chetaara anyị ihe Jizọs kwuru gbasara atụrụ ya, ya bụ, ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Ha ga-ege m ntị.” Ma, ebe ọ bụ na Jizọs nọ n’eluigwe, olee otú anyị si na-ege ya ntị? Ụzọ kachanụ anyị si ege ya ntị bụ ime ihe ndị ọ kụziri.—Mat. 7:24, 25. w21.12 16 ¶1-2

Satọdee, Disemba 2

Mmadụ niile emehiela, ha anaghịkwa akpa àgwà na-eme ka ebube Chineke pụta ìhè.—Rom 3:23.

Pọl onyeozi ji ịnụ ọkụ n’obi na-emegide Ndị Kraịst. Mgbe e mechara, ọ ghọtara na ihe o mere adịghị mma. Ọ dịkwa njikere ịgbanwe otú o si eche echiche na ihe ndị ọ na-eme. (1 Tim. 1:12-16) Jehova nyeere Pọl aka ya aghọọ okenye hụrụ ụmụnna ya n’anya, na-enwere ha ọmịiko, dịkwa umeala n’obi. Ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-agbaghara ya. (Rom 7:21-25) Ọ nọghị na-atụ anya na ọ ga-ezu okè. Kama, ọ gbasiri mbọ ike ịna-akpa àgwà ka ezigbo Onye Kraịst, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-enyere ya aka ịrụzu ọrụ o nyere ya. (1 Kọr. 9:27; Fil. 4:13) Ihe mere e ji họpụta ndị okenye abụghị n’ihi na ha zuru okè. Ma, Jehova na-atụ anya ka ha ghọta na ha ezughị okè ma gbalịa na-akpakwu àgwà ndị e ji mara Ndị Kraịst. (Efe. 4:23, 24) Okenye kwesịrị ịna-amụ Baịbụl ka o nyere ya aka ịhụ ebe ndị ọ ga-emekwu nke ọma. Ọ bụrụ na ọ na-eme ya, Jehova ga-enyere ya aka ịna-enwe obi ụtọ ma bụrụ ezigbo okenye.—Jems 1:25. w22.03 29-30 ¶13-15

Sọnde, Disemba 3

Kwụsịnụ ikpe ikpe.—Mat. 7:1.

Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere nwanna anyị na-ele anya ọjọọ? Ka anyị cheta na anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya. (Jems 2:8) Anyị kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị kwụsị ịna-ekpe ndị ọzọ ikpe. Iji mee ihe ahụ anyị na-arịọ Jehova, anyị kwesịrị iwepụta oge ka anyị na onye ahụ anyị na-ele anya ọjọọ kwurịta. Anyị nwekwara ike ịgwa ya ka anyị na ya rụọ n’ozi ọma ma ọ bụkwanụ ka ọ bịa na nke anyị rie nri. Ọ bụrụ na anyị amata nwanna ahụ nke ọma, ọ ga-eme ka anyị ṅomie ihe ahụ Jehova na Jizọs na-eme, ya bụ, ilekwasị anya n’ebe ndị ọ na-emeta. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị na-edebe iwu onye ọzụzụ atụrụ ọma ahụ nyere anyị nke bụ́ ka anyị kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe. Otú ahụ atụrụ si ege onye ọzụzụ atụrụ ntị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs si ege ya ntị. Ma ànyị so ‘n’ìgwè atụrụ nta’ ma ọ bụ ‘n’atụrụ ọzọ,’ ka anyị nọgide na-ege onye ọzụzụ atụrụ ọma ahụ ntị ma na-erubere ya isi.—Luk 12:32; Jọn 10:11, 14, 16. w21.12 19 ¶11; 21 ¶17-18

Mọnde, Disemba 4

Ọ nabataghị aro a ndị okenye ahụ tụụrụ ya.—1 Eze 12:8.

Mgbe Rehoboam ghọrọ eze Izrel, ndị ọ na-achị bịakwutere ya ma rịọ ya arịrịọ. Ha rịọrọ ya ka o mee ka ihe katụrụ ha mfe karịa otú ọ dị n’oge nna ya bụ́ Solomọn na-achị. Rehoboam gara jụọ ndị okenye Izrel ihe ọ ga-eme. Ihe a o mere dị mma. Ndị okenye ahụ gwara ya na ọ bụrụ na o mee ihe ndị Izrel rịọrọ ya, na ha ga na-akwado ya mgbe niile. (1 Eze 12:3-7) Ọ ga-abụ na ihe ahụ ha gwara Rehoboam adịghị ya mma. N’ihi ya, ọ gakwuuru ụmụ okorobịa ndị ha na ya tokọrọ ka ha nye ya ndụmọdụ. Ha gwara ya ka o mee ka ihe sikwuoro ndị Izrel ike. (1 Eze 12:9-11) Rehoboam gaara ekpe ekpere rịọ Jehova ka o nyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme. Kama ọ nabatara ndụmọdụ ndị ọgbọ ya. Ihe ahụ Rehoboam mere kpataara ma yanwa ma ndị Izrel nsogbu. Taakwa, ndụmọdụ a na-enye anyị nwere ike ịbụ ihe anyị na-achọghị ịnụ. Ma, ọ bụrụhaala na o si n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl, anyị kwesịrị ịnabata ya. w22.02 9 ¶6

Tuzdee, Disemba 5

Mma ụmụ okorobịa bụ ike ha.—Ilu 20:29.

Onye dị umeala n’obi ma mara ebe ike ya ruru na-elekwasị anya n’ihe ndị na-eto eto ma kama ilekwasị anya n’ihe ndị ha na-amaghị. Ọ ga-ewere ha ka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ, ọ bụghị ndị ya na ha na-ama aka. Ndị agadi kwesịrị iwere ndị na-eto eto ka ngọzi Jehova. Ha kwesịrị igosi na obi dị ha ụtọ maka ya. Ka ike ha na-agbada, obi na-atọ ha ụtọ na e nwere ndị na-eto eto ike dị n’ahụ́, dịkwa njikere ịrụ ọrụ n’ọgbakọ. Naomi a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl gosiri otú ndị agadi kwesịrị isi gosi na obi dị ha ụtọ n’otú ndị na-eto eto si enyere ha aka. Na mbụ, Naomi gwara nwunye nwa ya di ya nwụrụ aha ya bụ Rut ka ọ laghachikwuru ndị ya. Ma, Rut ekweghị ahapụ Naomi, kama, o so ya laghachi Betlehem. Obi dị Naomi ezigbo ụtọ na Rut so ya. Ọ nabatakwara aka o nyeere ya. (Rut 1:7, 8, 18) Ihe a baakwara ha abụọ uru. (Rut 4:13-16) Ịdị umeala n’obi ga-enyere ndị agadi aka ime ka Naomi. w21.09 10-11 ¶9-11

Wenezdee, Disemba 6

Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe.—Hib. 6:10.

Nna anyị nke eluigwe makwa otú ihe si dịrị onye nke ọ bụla n’ime anyị. O nwere ike ịbụ na ị ga-ejeliri ya ozi karịa ọtụtụ ndị ị ma ma ọ bụkwanụ ndị gị na ha dị ná mma. O nwekwara ike ịbụ na ị gaghị emeli ka ha n’ihi afọ ole ị dị, ọrịa ị na-arịa, ma ọ bụkwanụ ibu ezinụlọ. Ya emekwala ka ị daa mbà. (Gal. 6:4) Jehova agaghị echefu ọrụ gị. Ọ bụrụhaala na ị na-enye Jehova ihe kacha mma i nwere ike inye ya, burukwa ezi ihe n’obi na-enye ya, ọ ga-anabata ya. Jehova ma ihe ị ga-achọ ime n’ozi ya. Ma, ọ chọrọ ka obi na-atọ gị ụtọ n’ihe ndị i nwere ike ime n’ofufe ya. Obi na-eru anyị ala ugbu a n’ihi na anyị ma na Jehova na-enyere ndị na-efe ya aka mgbe ihe siiri ha ike. (Aịza. 41:9, 10) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ ma anyị na-efe Nna anyị hụrụ anyị n’anya bụ́ onye ruru eru ka ihe niile o kere ‘too ma sọpụrụ.’—Mkpu. 4:11. w22.03 24 ¶16; 25 ¶18

Tọzdee, Disemba 7

M na-edebe iwu gị ngwa ngwa. Anaghị m egbu oge idebe ya.—Ọma 119:60.

Anyị chọrọ ịna-eme ka Jizọs, ma ike ekwesịghị ịgwụ anyị ma ọ bụrụ na anyị anaghị emetacha ihe niile ka Jizọs. (Jems 3:2) Nwa akwụkwọ anaghị aka onye nkụzi ya. Ma, ọ bụrụ na nwa akwụkwọ esi n’ihe ndị ọ na-emetaghị na-amụta ihe, na-agbakwa mbọ ka ọ na-eme ka onye nkụzi ya, ọ ga na-emekwu nke ọma. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị anyị na-amụta ma anyị na-amụ ihe, gbalịsiekwa ike ịna-emezi ihe ndị anyị na-anaghị emeta, anyị nwere ike ịna-emekwu ka Jizọs. (Ọma 119:59) Anyị bi n’ụwa ọtụtụ ndị na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Ma, ndị Jehova dị iche. Otú Jizọs si dị njikere inyere ndị ọzọ aka na-emetụ anyị n’obi. Anyị kpebisikwara ike na anyị ga na-eme ka ya. (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike inyere ndị ọzọ aka ka Jizọs, anyị ga-enwe obi ụtọ n’ihi na anyị na-eme ihe dị Jehova mma. w22.02 24 ¶16; 25 ¶18

Fraịdee, Disemba 8

Ụfọdụ ihe o dere siri ike nghọta.—2 Pita 3:16.

Taa, Jehova na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl eduzi ndị ya. Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-atụgharị uche n’ihe Jehova na-akụziri anyị, ọ ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịna-eso ntụziaka ndị ọ na-enye anyị, nweekwa ike ijezu ozi anyị. (1 Tim. 4:15, 16) Jehova na-esikwa n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” enye anyị ntụziaka. (Mat. 24:45) Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike inye anyị ntụziaka anyị na-agaghị aghọtacha. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịgwa anyị ihe anyị ga-eme iji kwadebe maka ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ma anyị nwere ike iche na ụdị ọdachi ahụ emekataghị mee n’ebe anyị bi. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma anyị chee na ntụziaka ha nyere adabaghị adaba? Chee banyere akụkọ ndị ọzọ dị na Baịbụl anyị gụrụla. E nwere oge ndị a gwara ndị Chineke ka ha mee ihe ndị ha chere na ọ dabaghị adaba, ma ime ihe ndị ahụ zọrọ ha ndụ.—Ikpe 7:7; 8:10. w22.03 18-19 ¶15-16

Satọdee, Disemba 9

Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.—Luk 23:46.

Jizọs ji obi ike kwuo ihe e dere n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si. Jizọs ma na ndụ ọ ga-adị n’ọdịnihu dị n’aka Jehova. Ọ makwa na Nna ya ga-echeta ya. Gịnị ka anyị nwere ike ịmuta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Dị njikere inyefe ndụ gị n’aka Jehova. Ka i nwee ike ime otú ahụ, i kwesịrị iji “obi gị dum tụkwasị Jehova obi.” (Ilu 3:5) Ka anyị tụlee gbasara otu nwa okorobịa dị afọ iri na ise aha ya bụ Joshua. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. E nwere ọrịa ọjọọ ya na ya na-alụ. O kweghị ka e si ụzọ megidere iwu Chineke gwọọ ya. Obere oge tupu ya anwụọ, ọ gwara mama ya, sị: “Mama, anọ m n’aka Jehova. . . . Obi sikwara m ike ịgwa gị na ama m na Jehova ga-akpọlite m n’ụbọchị mbilite n’ọnwụ. Ọ ma obi m. Ọ makwa na m hụrụ ya n’anya nke ukwuu.” Anyị niile kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ anọrọ n’ọnụ ọnwụ, m̀ ga-enyefe ndụ m n’aka Jehova ma nwee obi ike na ọ ga-echeta m?’ w21.04 12-13 ¶15-16

Sọnde, Disemba 10

Onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.—Ilu 11:25.

Ozi ọma na-eme ka ndị Jehova dị ike. Anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara eziokwu dị na Baịbụl, obi na-adị anyị mma, ma hà gere anyị ntị ma ha egeghị anyị ntị. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na o nweghị oké ihe ha nwere ike ime n’ozi ọma n’ihi otú ihe si dịrị ha. Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, cheta na obi na-adị Jehova ụtọ ma i mee ike gị niile. Jehova na-ahụ otú o si agụ anyị agụụ ikwusa ozi ọma, ọ bụrụgodị na anyị enweghị ike ịpụ apụ. O jikwa ya kpọrọ ihe. O nwere ike ime ka anyị nwee ohere izi ndị na-elekọta anyị ma ọ bụ ndị dọkịta na ndị nọọsụ ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị anyị na-eme ugbu a tụnyere ihe ndị anyị mere n’oge gara aga, o nwere ike ime ka anyị daa mbà. Ma, ọ bụrụ na anyị amata na Jehova na-enyere anyị aka ugbu a, anyị ga-enweta ike ma jiri ọṅụ die ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị. Anyị amaghị mkpụrụ nke eziokwu anyị kụrụ nke nwere ike ịgbanye mgbọrọgwụ ma malite ito.—Ekli. 11:6. w21.05 24-25 ¶14-17

Mọnde, Disemba 11

Gịnị mere i ji leda Jehova anya, gaa mee ihe ọ sị emela?—2 Sam. 12:9.

Anyaukwu mere ka Eze Devid chefuo ihe ndị Jehova meere ya. Jehova mere ka ọ baa ọgaranya, bụrụ onye a ma ama, meekwa ka o merie ọtụtụ ndị iro ya. Obi dị Devid ụtọ, ya ekwuodị na ihe Chineke meere ya dị ‘nnọọ ọtụtụ nke na ya enweghị ike ikwucha ha.’ (Ọma 40:5) Ma, e nwere mgbe o ruru, Devid echefuo ihe niile Jehova meere ya. N’agbanyeghị na Devid nwere ọtụtụ ndị nwunye, o kwere ka nwunye nwoke ọzọ gụwa ya agụụ. Aha nwaanyị ahụ bụ Bat-shiba, aha di ya abụrụ Yuraya, onye Het. Devid na Bat-shiba kwara iko, ya adịrị ime. O nweghị ihe ihe ọjọọ ahụ bụ n’anya Devid, ya ahazie ka e gbuo Yuraya. (2 Sam. 11:2-15) Gịnị ka Devid nọ na-eche? Ọ̀ nọ na-eche na Jehova enweghị ike ịhụ ihe ahụ o mere? Ohu Jehova a na-erubeburu ya isi kwere ka anyaukwu rafuo ya. Ọ kwụkwara ụgwọ ya. Ma, obi dị anyị ụtọ na Devid mechara kweta na o mejọrọ ihe ma chegharịa. Obi dịkwa ya ụtọ na Jehova gbaghaara ya.—2 Sam. 12:7-13. w21.06 17 ¶10

Tuzdee, Disemba 12

Anyị erughị eru n’onwe anyị ịrụ ọrụ Chineke, kama, Chineke mere ka anyị ruo eruo ịrụ ọrụ ya.—2 Kọr. 3:5.

Anyị nwere ike iche na anyị agaghị eduzili ọmụmụ Baịbụl. Anyị nwere ike iche na anyị kwesịrị ịmatakwu ihe ma ọ bụ bụrụ ezigbo ndị nkụzi tupu anyị enwee ike ịmụrụ mmadụ ihe. Ọ bụrụ otú a ka ọ dị gị, lee ihe atọ ga-eme ka obi sie gị ike na ị ga-eduziliri mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Nke mbụ, Jehova weere ya na i ruru eru ịkụziri ndị ọzọ ihe. Nke abụọ, Jizọs bụ́ onye nwere ike niile “n’eluigwe na n’ụwa” nyere gị iwu ka ị kụziere ndị ọzọ ihe. (Mat. 28:18) Nke atọ, ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka. Ihe Jizọs kụziiri ndị mmadụ bụ ihe nna ya kụziiri ya. Gịnwa nwekwara ike ime otú ahụ. (Jọn 8:28; 12:49) Ihe ọzọ i nwekwara ike ime bụ ịgwa onye nlekọta ìgwè ozi ubi unu, ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa bụ́ aka ochie ka o nyere gị aka ịmalite ọmụmụ Baịbụl na iduzi ya. Ihe ọzọ ga-enyere gị aka ka obi sie gị ike bụ iso otu n’ime ụmụnna ndị a mụọrọ mmadụ ihe. w21.07 5-6 ¶12

Wenezdee, Disemba 13

Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kacha nta kwesịkwara ntụkwasị obi n’oké ihe. Onye bụ́ onye ajọ omume n’ihe kacha nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.—Luk 16:10.

Ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-eru nso, ọ dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịtụkwasị Jehova obi na ọ na-eme ihe dị mma mgbe niile. Maka gịnị? Ọ bụ maka na n’oge oké mkpagbu, e nwere ike inye anyị ntụziaka ndị nwere ike isiri anyị ike ịghọta ma ọ bụ ime. O doro anya na Jehova agaghị esi n’eluigwe gwa anyị okwu. O nwere ike isi n’aka ndị o ji eduzi nzukọ ya mee ka anyị mata ihe anyị ga-eme. Ọ bụrụ na ha agwa anyị ihe anyị ga-eme n’oge ahụ, anyị ekwesịghị ịbịa chewe ma ọ̀ bụ ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụ na ọ bụghị, ma ọ bụkwanụ na-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ ihe a ka Jehova chọrọ ka anyị mee? Ka ọ̀ ga-abụ na ụmụnna ndị a na-agwa anyị ihe dị ha mma?’ Ị̀ ga-atụkwasị Jehova na nzukọ ya obi n’oge ahụ? Ihe ị na-eme ugbu a ma nzukọ Jehova gwa anyị ihe anyị ga-eme ga-egosi ihe ị ga-eme n’oge ahụ. Ọ bụrụ na ị na-atụkwasị ntụziaka ndị ha na-enye anyị ugbu a obi ma na-eme ihe ha gwara anyị mee ozugbo, ọ ga-adịrị gị mfe ime ya n’oge oké mkpagbu. w22.02 6 ¶15

Tọzdee, Disemba 14

Ihe m mere ò ruru ka ihe unu mere?—Ikpe 8:2.

Jehova nyeere Gidiọn na narị ụmụ nwoke atọ ya na ha so aka ha emerie n’agha, bụ́kwanụ ihe gaara eme ka ha dịwa mpako ma ọ bụrụ na ha chọrọ. Ụmụ nwoke si n’ebo Ifrem bịakwutere Gidiọn ka ha sesa ya okwu kama ịja ya mma n’ihi na Gidiọn akpọghị ha ka ha soro ya lụọ agha ahụ. (Ikpe 8:1) Gidiọn chetaara ha ụzọ ndị Jehova si nyere ha aka ime ọtụtụ ihe. Ihe a meziri ka ‘obi jụrụ’ ha. (Ikpe 8:3) Gidiọn dị njikere iwetu onwe ya ala ka udo nwee ike ịdị n’etiti ndị Chineke. Anyị na-amụta n’aka ụmụ nwoke si n’ebo Ifrem na ihe kwesịrị ịka anyị mkpa abụghị ka a kwanyere anyị ùgwù, kama ka e too Jehova. Ndị isi ezinụlọ na ndị okenye ga-amụta ihe n’aka Gidiọn. Ọ bụrụ na ihe ha mere akpasuo nwanna iwe, ha kwesịrị ịgbalị ghọta ihe mere nwanna ahụ ji wee iwe. Ha nwekwara ike ịja onye ahụ mma maka ihe ndị ọ na-emeta. Umeala n’obi dị mkpa iji mee ihe a. Ma. ihe kacha mkpa bụ ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo, ọ bụghị igosi na ihe anyị mere dị mma. w21.07 16-17 ¶10-12

Fraịdee, Disemba 15

Ka anyị kee mmadụ n’oyiyi anyị.—Jen. 1:26.

Jehova kere anyị n’oyiyi ya iji gosi na o ji anyị kpọrọ ihe. Ebe ọ bụ na e kere anyị n’oyiyi Chineke, anyị nwere ike ịna-akpa àgwà ya ndị magburu onwe ha, dị ka, ịhụnanya, ọmịiko, ikwesị ntụkwasị obi, na ezi omume. (Ọma 86:15; 145:17) Ọ bụrụ na anyị na-agbalị ịkpa àgwà ndị ahụ, anyị na-akwanyere Jehova ùgwù ma na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị. (1 Pita 1:14-16) Ọ bụrụ na anyị akpaa àgwà otú mere Nna anyị nke eluigwe obi ụtọ, anyị ga-enwe obi ụtọ. Ebe Jehova kere anyị n’oyiyi ya, o mere ka anyị nwee ike ịbụ ụdị ndị ọ chọrọ ka ha nọrọ n’ezinụlọ ya. Jehova kwadebeere anyị ebe obibi pụrụ iche. Ogologo oge tupu Chineke ekee Adam, ọ kwadebere ụwa maka ụmụ mmadụ. (Job 38:4-6; Jere. 10:12) Jehova nyere ụmụ mmadụ ọtụtụ ihe ga-eme ha obi ụtọ n’ihi na ọ dị obiọma, na-emesapụkwa aka. (Ọma 104:14, 15, 24) E nwere oge ndị o lere ihe ndị o kere ma “hụ na ha dị mma.”—Jen. 1:10, 12, 31. w21.08 3 ¶5-6

Satọdee, Disemba 16

Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ndidi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, mmadụ ijide onwe ya.—Gal. 5:22, 23.

E nyere anyị niile ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20; Rom 10:14) Ị̀ ga-achọ ịna-emekwu nke ọma n’ọrụ a kacha mkpa? Ị gụọ broshọ Izi Ihe, gbalịa ka e nwee ihe ndị ị mụtara na ya ị ga-achọ ime. Gbaakwa mbọ na-eme ha. I kwesịghị ichefu na otu n’ime ihe ndị kacha mma ị ga-agba mbọ mee bụ ịmụta àgwà ndị ga-eme Jehova obi ụtọ. (Kọl. 3:12; 2 Pita 1:5-8) O doro anya na onye ọ bụla n’ime anyị ga-achọ ime karịa otú ọ na-eme n’ofufe Jehova ugbu a. N’ụwa ọhụrụ, anyị ga-enwe ohere ife Jehova otú ọ bụla anyị si chọọ. Ma ka ọ dịgodị, anyị nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emee ike anyị niile n’ihe ndị anyị nwere ike ime ugbu a. Anyị agaghịkwa na-adakarị mbà. Nke ka mkpa bụ na anyị ga-eme ka e too Jehova bụ́ “Chineke, onye obi ụtọ.” (1 Tim. 1:11) N’ihi ya, ka anyị na-enweta ọṅụ n’ọrụ ọ bụla anyị nwere ike ịrụ ugbu a. w21.08 24-25 ¶18-20

Sọnde, Disemba 17

Onye ọ bụla na-abịakwute Chineke ga-ekwetarịrị na ọ dị adị.—Hib. 11:6.

Ọ bụrụ na nne gị na nna gị bụ Ndịàmà Jehova, o nwere ike ịbụ na ị mụtara gbasara Jehova mgbe ị ka dị obere. Ha kụziiri gị na ọ bụ ya kere ihe niile, na o nwere àgwà ndị magburu onwe ha, nakwa na ọ chọrọ ime ka ụwa a ghọọ paradaịs. (Jen. 1:1; Ọrụ 17:24-27) Ma, ọtụtụ ndị ekwetaghị na Chineke dị, ma ya fọdụzie na ọ bụ ya kere ihe niile. Kama, ha kwetara na obere ihe ndị dị ndụ nọkatara dịrị, jirizie nwayọọ nwayọọ ghọọ nnukwu ihe ndị ọzọ dị ndụ. Ụfọdụ ndị kweere ihe a gụkwara ezigbo akwụkwọ. Ha nwere ike ịna-ekwu na ihe sayensị kwuru na-egosi na ihe Baịbụl na-akụzi abụghị eziokwu, nakwa na ndị kweere na e nwere Onye kere ihe niile bụ ndị na-agụghị akwụkwọ, ndị na-amaghị ihe, ma ọ bụ ndị e nwere ike ịghọgbu ngwa ngwa. N’agbanyeghị afọ ole anyị bụrụla Ndịàmà Jehova, anyị kwesịrị ịna-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị agaghị ekwe ka e jiri “amamihe ụwa na ihe ndị na-abụghị eziokwu” gbasara Baịbụl ghọgbuo anyị.—Kọl. 2:8. w21.08 14 ¶1-3

Mọnde, Disemba 18

Jehova Chineke anyị, onye dị ike, i ruru eru ka ndị niile too gị ma sọpụrụ gị.—Mkpu. 4:11.

Ebel, Noa, Ebreham, na Job gosiri na ha hụrụ Jehova n’anya ma kwanyere ya ùgwù. Otú ha si mee ya bụ irubere Jehova isi, nwee okwukwe na ya, ma chụọkwara ya àjà. O doro anya na ha gbalịsiri ike sọpụrụ Jehova. Ọ nabatakwara ofufe ha. Jehova mechara si n’aka Mosis nye ndị Izrel Iwu. Iwu ahụ kwuru ụzọ dị iche iche Jehova chọrọ ka ha si na-efe ya. Mgbe Jizọs nwụchara, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, Jehova achọghịzi ka a na-efe ya otú ahụ e kwuru n’Iwu Mosis. (Rom 10:4) Ndị Kraịst ga-esowezi iwu ọhụrụ, ya bụ, “iwu Kraịst.” (Gal. 6:2) Iwu nke Kraịst a adịghị ka Iwu Mosis e depụtachara ihe ndị a ga-eme na ihe ndị a na-agaghị eme. Otú Ndị Kraịst si erube isi n’iwu a bụ ịna-eme ka Jizọs ma na-eme ihe niile ọ kụziri. Taa, ọtụtụ Ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịna-eme ka Jizọs iji mee ihe dị Jehova mma nakwa iji ‘nweta ume.’—Mat. 11:29. w22.03 20-21 ¶4-5

Tuzdee, Disemba 19

Ọ na-agakarị ikpe ekpere ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.—Luk 5:16.

Jehova na-ege ụmụ ya ntị. Ọ nụrụ ọtụtụ ekpere Ọkpara ya kpere mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ nụrụ ekpere Jizọs kpere mgbe ọ chọrọ ime mkpebi ndị dị ezigbo mkpa, dị ka mgbe ọ chọrọ ịhọta ndịozi iri na abụọ ya. (Luk 6:12, 13) Jehova nụkwara ekpere Jizọs mgbe ọ na-echegbu onwe ya. Tupu a rara Jizọs nye, o kpesiri ekpere ike ka Nna ya nyere ya aka n’ọnwụnwa tara akpụ na-aga ịbịara ya. Ọ bụghị naanị na Jehova nụrụ ekpere ahụ Jizọs kpere, o zitekwara mmụọ ozi ka ọ gbaa Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ume. (Luk 22:41-44) Taa, Jehova ka na-anụkwa ekpere ndị ohu ya. Ọ na-aza ya n’oge kwesịrị ekwesị nakwa otú kacha mma. (Ọma 116:1, 2) Otu nwanna nwaanyị bi n’India hụrụ otú Jehova si za ekpere ya. Ọ nọ na-arịa ezigbo ọrịa na-eme ka ọ na-echegbu onwe ya. O kpesikwara ekpere ike ka Jehova nyere ya aka. O dere, sị: “Ihe omume tiivi anyị nke Mee 2019 nke kwuru gbasara ihe mmadụ nwere ike ime ma ọ na-echegbu onwe ya bụ nnọọ ihe dị m mkpa mgbe ahụ. Jehova ji ya za ekpere m.” w21.09 21-22 ¶6-7

Wenezdee, Disemba 20

[Gbaga] n’ugwu.—Luk 21:21.

Chegodị ihe ọ dị ka ya Ndị Kraịst nọ n’oge ndịozi ịhapụ ihe niile ha nwere ma bido ụwa n’isi. Ọ bụ okwukwe ha nwere ga-eme ka ha tụkwasị Jehova obi na ọ ga-egboro ha mkpa ha. Ma, e nwere ihe ga-enyere ha aka. Afọ ise tupu ndị Rom agbaa Jeruselem gburugburu, Pọl onyeozi nyere ndị Hibru ndụmọdụ dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị: “Ka otú unu si ebi ndụ gosi na unu ahụghị ego n’anya, kama ka ihe ndị dị ugbu a ju unu afọ. N’ihi na o kwuru, sị: ‘E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.’ Ka anyị wee nwee obi ike ma sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?’ ” (Hib. 13:5, 6) O doro anya na ọ ka dịrị ndị mere ihe Pọl kwuru mfe ihe ha nwere iju ha afọ n’ebe ọhụrụ a ha kwagara. Obi siri ha ike na Jehova ga-enye ha ihe ndị dị ha mkpa. w22.01 4 ¶7, 9

Tọzdee, Disemba 21

Ọrụ [Jehova] niile na-egosi na ọ na-eme ebere.—Ọma 145:9.

Ọ bụrụ na a sị anyị kọwaa onye na-emere mmadụ ebere, anyị nwere ike ịsị na ọ bụ onye dị obiọma, onye na-enwere mmadụ ọmịiko, nakwa onye na-emere ndị ọzọ ihe ọma. O nwere ike ime ka anyị cheta akụkọ Jizọs kọrọ gbasara onye Sameria ahụ bụ́ ezigbo onye agbata obi. Nwoke ahụ bụ́ onye mba ọzọ “meteere” onye Juu ndị ohi kụrụ ihe ma napụ ihe ya ebere. Onye Sameria ahụ ‘meteere ya ebere’ n’ihi ahụ́ e merụrụ ya ma hazie otú a ga-esi elekọta ya. (Luk 10:29-37) Ihe atụ a na-akụziri anyị gbasara ebere bụ́ àgwà magburu onwe ya Jehova nwere. Ebere bụ otu ụzọ Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Otú o si emeso anyị ihe kwa ụbọchị na-egosi na ọ na-emere anyị ebere. E nwere ụzọ ọzọ mmadụ nwere ike isi meere ibe ya ebere. Ọ bụ ịghara ịta ya ahụhụ mgbe o mere ihe e kwesịrị iji taa ya ahụhụ. Jehova na-esikwa otú ahụ emere anyị ebere. Otu ọbụ abụ sịrị: “Ọ naghị emeso anyị ihe otú anyị si emehie.” (Ọma 103:10) Ma, e nwere oge ndị Jehova nwere ike ịdọsi onye mere mmehie aka ná ntị ike. w21.10 8 ¶1-2

Fraịdee, Disemba 22

M gaghị akwụsị igosi gị ịhụnanya pụrụ iche.—Aịza. 54:10, ihe e dere n’ala ala peeji ya.

Ndị Jehova na-egosi ịhụnanya pụrụ iche bụ naanị ndị ya na ha dị n’ezigbo mma. Ihe Eze Devid na Daniel onye amụma kwuru gosiri na nke a bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, Devid sịrị: “Akwụsịla ịhụ ndị ma gị n’anya.” “Jehova na-ahụ ndị na-atụ egwu ya n’anya ruo mgbe ebighị ebi.” Daniel kwuru, sị: “Jehova bụ́ ezi Chineke, . . . onye na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ya na ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya gbara, onye na-egosikwa ha na ọ hụrụ ha n’anya.” (Ọma 36:10; 103:17; Dan. 9:4) Ihe ndị a ha kwuru na-egosi na Jehova na-egosi ndị ohu ya ịhụnanya pụrụ iche n’ihi na ha ma ya, na-atụ egwu ya, hụ ya n’anya ma na-edebe iwu ya. Naanị ndị Jehova na-ahụ n’anya otú a bụ ndị na-efe ya otú ọ chọrọ. Tupu anyị ebido ife Jehova, ọ hụrụ anyị n’anya otú o si hụ mmadụ niile n’anya. (Ọma 104:14) Ma, ugbu a anyị na-efe ya, ọ na-egosi anyị ịhụnanya pụrụ iche. w21.11 4 ¶8-9

Satọdee, Disemba 23

Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe.—Mat. 4:10.

Mee elu mee ala, anyị kpebisiri ike ime ihe a Jizọs kwuru. Taa, ọtụtụ ndị na-ege ndị isi okpukpe a ma ama ntị. Otú ihe ha si amasị ha na-emedị ka ọ fọ obere ka ha fewe ha. Ọtụtụ ndị na-aga chọọchị ha, na-azụ akwụkwọ ha, na-enyekwa nnukwu ego n’onyinye. Ụfọdụ na-ekwere n’ihe ọ bụla ndị isi okpukpe ndị ahụ kwuru, na-eweredị ha ka hà bụ Jizọs. Ma, ezigbo Ndị Kraịst enweghị ndị isi. Ọ bụ eziokwu na anyị na-akwanyere ndị na-edu ndú ùgwù, anyị kwetara ihe Jizọs kwuru nke bụ́: “Unu niile bụ ụmụnna.” (Mat. 23:8-10) Anyị anaghị efe mmadụ, ma ndị isi okpukpe ma ndị ọchịchị. Anyị anaghịkwa akwado ihe ndị ha na-eme na chọọchị ma ọ bụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Kama, anyị dị iche n’ụwa. Ihe ndị a mere ka anyị dịrị iche n’okpukpe ndị ọzọ na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst.—Jọn 18:36. w21.10 20 ¶6-7

Sọnde, Disemba 24

Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu . . . Enwela chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m.—Ọpụ. 20:2, 3.

Onye Kraịst ọ bụla chọrọ ịdị nsọ kwesịrị ịkpachara anya ka ihe ọ bụla ghara ịka ya mkpa karịa adịm ná mma ya na Jehova. Ebe ọ bụkwa na anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị kpebisiri ike izere ime ihe ọ bụla ga-emechu Jehova ihu ma ọ bụkwanụ mee ka e kwutọọ aha nsọ ya. (Lev. 19:12; Aịza. 57:15) Ndị Izrel rubere isi n’iwu ndị Chineke nyere ha iji gosi na Jehova bụ Chineke ha. Levitikọs 18:4 kwuru, sị: “Unu ga na-eme ihe niile m kpebiri, na-edebekwa iwu m niile ma na-eso ha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.” Ụfọdụ n’ime “iwu” ndị ahụ Jehova nyere ụmụ Izrel dị na Levitikọs isi nke iri na itoolu. Dị ka ihe atụ, amaokwu nke ise ruo nke asatọ, nke iri abụọ na otu, na nke iri abụọ na abụọ kwuru gbasara iji anụmanụ achụ àjà. A ga-achụ ha otú ha na-agaghị ‘emerụ àjà dị nsọ a chụụrụ Jehova.’ Ịgụ amaokwu ndị ahụ kwesịrị ime ka anyị chọọ ime ihe ndị dị Chineke mma, chụọkwara ya àjà otuto otú ahụ Ndị Hibru 13:15 gwara anyị mee. w21.12 5-6 ¶14-15

Mọnde, Disemba 25

Ka gị na nwunye ị lụrụ n’okorobịa na-aṅụrị ọṅụ.—Ilu 5:18.

Ndị ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị di na nwunye ọzọ tụkwasịrị Jehova obi. Ụfọdụ n’ime ha ejirila ọtụtụ afọ jeere Jehova ozi oge niile. Ọ́ gaghị adị mma ka unu gakwuru ha ka ha nye unu ndụmọdụ ma ọ bụrụ na unu chọrọ imekwu ihe n’ozi Jehova? Ihe a bụ otu ụzọ unu ga-esi egosi na unu tụkwasịrị Jehova obi. (Ilu 22:17, 19) Cheta na alụmdi na nwunye bụ onyinye si n’aka Jehova. (Mat. 19:5, 6) Ọ chọkwara ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ. Ndị ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ, chebaranụ ihe unu ji ndụ unu eme echiche. Ùnu na-eme ihe niile unu nwere ike ime iji gosi Jehova na unu ji onyinye o nyere unu kpọrọ ihe? Kọsaranụ Jehova obi unu. Gaanụ n’Okwu ya bụ́ Baịbụl chọta ihe ndị ga-enyere unu aka. Mezienụ ihe unu mụtara na Baịbụl. Obi sie unu ike na unu ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ebute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ ná ndụ unu. w21.11 19 ¶16, 18

Tuzdee, Disemba 26

Anyị niile na-emejọ ihe ọtụtụ ugboro.—Jems 3:2.

Jems lere onwe ya anya otú kwesịrị ekwesị. Jems echeghị na ọ ka Ndị Kraịst ndị ọzọ n’ihi na Jizọs bụ nwanne ya ma ọ bụkwanụ n’ihi na e nwere ọrụ dị mkpa ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ọ kpọrọ ndị ya na ha na-efe Jehova “ụmụnna m m hụrụ n’anya.” (Jems 1:16, 19; 2:5) O meghị ka ndị ọzọ lewe ya anya ka onye na-enweghị ike imejọ ihe. Ihe anyị na-amụta bụ: Cheta na anyị niile bụ ndị mmehie. Anyị ekwesịghị iche na anyị ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl mma. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka onye anyị na-amụrụ Baịbụl chee na anyị enweghị ike imehie ihe, o nwere ike ime ka o chee na ya agaghị edebeli iwu Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị ekweta na ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adịrị anyị mfe ime ihe Baịbụl kwuru, kọwaakwara ya otú Jehova si nyere anyị aka ịgbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ anyị, anyị ga-enyere ya aka ịhụ na yanwa ga-efelikwa Jehova. w22.01 11-12 ¶13-14

Wenezdee, Disemba 27

Na-echenụ echiche otú a ka Kraịst Jizọs.—Fil. 2:5.

Ọ bụrụ na anyị ana-eche echiche ka Jizọs, ọ ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ka ya, meekwa ka ọ dịrị anyị mfe iyiri àgwà ọhụrụ. (Hib. 1:3) Anyị nwere ike iche, sị: ‘Jizọs zuru okè. Agaghị m emetacha ihe niile ka ya.’ Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, chebara ihe ndị a echiche. Nke mbụ, Jehova kere gị ka i nwee ike ime ka ya na Jizọs. N’ihi ya, i nwere ike ikpebi na ị ga na-eme ka ha. Ị ga-emelikwa ya, ọ bụ eziokwu na ị gaghị emetacha ihe niile ka ha. (Jen. 1:26) Nke abụọ, mmụọ nsọ Chineke bụ ike kacha ike nille n’eluigwe na n’ụwa. Ọ ga-enyere gị aka ime ihe ndị ị na-agaghị emeli n’onwe gị. Nke atọ, Jehova anaghị atụ anya na anyị ga-akpatacha àgwà niile so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ugbu a. Nna anyị hụrụ anyị n’anya kwudịrị na ọ ga-eji otu puku afọ nyere ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa aka izu okè. (Mkpu. 20:1-3) Ihe Jehova chọrọ n’aka anyị ugbu a bụ ka anyị mee ike anyị niile ịna-akpa àgwà ndị ahụ ma tụkwasị ya obi ka o nyere anyị aka. w22.03 9 ¶5-6

Tọzdee, Disemba 28

Jehova, tupu mụ ekwuo ihe ọ bụla, ị ma ihe niile m chọrọ ikwu.—Ọma 139:4.

Ọ bụghị naanị ekpere ga-eme ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Ịmụ Okwu Chineke na ịga ọmụmụ ihe nwere ike inyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso. È nwere ihe i nwere ike ime ka oge i ji amụ ihe na oge i ji nọrọ n’ọmụmụ ihe bakwuoro gị uru? Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ndị na-eme ka uche m ghara ịdị n’ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ mgbe m na-amụ ihe n’onwe m?’ O nwere ike ịbụ ịza ekwentị gị, ile ozi e ziteere gị n’iimel ma ọ bụkwanụ n’ekwentị gị, ma ọ bụ ihe ndị yiri ya. Ọ bụrụ na ị chọpụta na uche gị na-awagharị ma ị na-amụ ihe n’onwe gị ma ọ bụkwanụ n’ọmụmụ ihe, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka uche gị dịrị n’ihe ị na-eme. Ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị, o nwere ike ọ gaghị adịrị gị mfe ịhapụ ihe ndị ahụ na-echegbu gị ma mee ka uche gị dịrị n’Okwu Chineke. Ma, ọ dị mkpa ka i mee otú ahụ. Rịọ Jehova ka o nye gị udo nke ga-eche ma obi gị ma “echiche” gị nche.—Fil. 4:6, 7. w22.01 29-30 ¶12-14

Fraịdee, Disemba 29

Tọọ ntị n’ala nụrụ, geekwa ntị n’ihe onye ma ihe na-ekwu.—Ilu 22:17.

Eze Ọzaya jụrụ ndụmọdụ e nyere ya. Ọ banyere n’ebe naanị ndị nchụàjà na-abanye n’ụlọ nsọ Jehova, chọọkwa ịmụnye insens ọkụ. Ndị nchụàjà Jehova sịrị ya: “Ọzaya, ọ bụghị gị kwesịrị ịmụnyere Jehova insens ọkụ. Ọ bụ naanị ndị nchụàjà kwesịrị ịna-amụnye insens ọkụ.” Gịnị ka Ọzaya mere? Kama ige ha ntị, “Ọzaya were ezigbo iwe.” A sị na o gere ha ntị si n’ụlọ nsọ ahụ pụọ ozugbo, o nwere ike ịbụ na Jehova gaara agbaghara ya. Gịnị mere Ọzaya ji jụ ndụmọdụ ahụ? O nwere ike ịbụ na o chere na ebe ọ bụ eze, na o nwere ikike ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ma ọ bụghị otú Jehova si were ya. Jehova mere ka Ọzaya rịawa ekpenta n’ihi na o mere ihe a na-enyeghị ya ikike ime. Ọ “rịagidere ekpenta ruo ụbọchị ọ nwụrụ.” (2 Ihe 26:16-21) Ihe mere Ọzaya na-akụziri anyị na n’agbanyeghị ndị anyị bụ, ọ bụrụ na anyị ajụ ndụmọdụ e si na Baịbụl nye anyị, anyị na Jehova agaghị adị ná mma. w22.02 9 ¶7

Satọdee, Disemba 30

N’ihi ya, chegharịanụ, lọghachikwutekwanụ Jehova ka o wee hichapụ mmehie unu, meekwa ka obi ruo unu ala.—Ọrụ 3:19.

Onye yi “àgwà ochie” ahụ na-eche ihe na-agụ anụ ahụ́ ya agụụ, na-emekwa ya. (Kọl. 3:9) O nwere ike ịbụ na ọ na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru, na-ewe iwe ọkụ, ọ naghị ekele ndị meere ya ihe ọma, dịrịkwa mpako. Onye dị otú ahụ nwere ike ịna-ele ndị gba ọtọ, na-elekwa fim ebe a na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ tigbuo zọgbuo. Onye a na-akpa àgwà ụfọdụ dị mma. O nwekwara ike ịbụ na ihe ọjọọ ọ na-eme na-ewute ya mgbe ụfọdụ, ma ọ katabeghị obi kwụsị ịna-eche ihe ọjọọ ma ọ bụ ịna-eme ya. (Gal. 5:19-21; 2 Tim. 3:2-5) Anyị ezughị okè. N’ihi ya, anyị agaghị emeli ka ihe ọjọọ ghara ịgụ anyị agụụ ma ọ bụ ghara ịbata anyị n’uche kpamkpam. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike kwuo ma ọ bụ mee ihe anyị ga-emecha kwaara mmakwaara. (Jere. 17:9; Jems 3:2) Ma ọ bụrụ na anyị eyipụ àgwà ochie, anyị agaghịzi na-eme ihe na-adịghị mma anyị na-emebu. Ọ bụghịzi ihe a ga-eji mara anyị.—Aịza. 55:7. w22.03 3 ¶4-5

Sọnde, Disemba 31

Dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.—Fil. 2:3.

Ndị okenye, na-elekwasịnụ anya n’ebe ụmụnna unu na-eme nke ọma. O nweghị onye zuru okè. Ma onye ọ bụla n’ime anyị nwere ebe ọ na-eme nke ọma. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka ndị okenye nye nwanna ndụmọdụ, ma ha chọọ ime ya, ha ga-eme ka Pọl onyeozi. Ha kwesịrị ịgba mbọ lekwasị anya n’ebe nwanna ahụ na-eme nke ọma, ọ bụghị n’ihe na-adịghị mma o kwuru ma ọ bụ mee. Ha kwesịkwara ilekwasị anya n’otú nwanna ahụ si hụ Jehova n’anya, otú o si jiri ntachi obi na-efe Jehova, nakwa ihe ọma ndị o nwere ike ime n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-elekwasị anya n’ebe ndị ụmụnna ha na-eme nke ọma, ụmụnna ga-ama na a hụrụ ha n’anya. Chetanụ na Jehova anaghị atụ anya na unu ga-ezu okè. Naanị ihe ọ chọrọ n’aka unu bụ ka unu na-arụ ọrụ unu nke ọma. (1 Kọr. 4:2) Obi kwesịkwara isi unu ike na Chineke ji ọrụ unu na-arụ kpọrọ ihe. Jehova “agaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe n’ihi na unu jeere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi.”—Hib. 6:10. w22.03 31 ¶19, 21

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya