Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lmd ihe ọmụmụ 11
  • Mee Ka Ihe Ị Na-akụzi Dị Mfe Nghọta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Ka Ihe Ị Na-akụzi Dị Mfe Nghọta
  • Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jizọs Mere
  • Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
  • Na-eme Ka Jizọs
  • Nyere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka O Mee Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Otú E Si Eji Akwụkwọ “Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi” Amụrụ Mmadụ Baịbụl
    Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Na-elezi “Nkà Izi Ihe” Gị Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Kwadebe nke Ọma Tupu Ị Gawa Ịmụrụ Mmadụ Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
lmd ihe ọmụmụ 11

IME KA HA BỤRỤ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

Ebe Jizọs nọ n’ebe dị nso ná mmiri na-akụziri ndị mmadụ ihe. Ụmụ nnụnụ na-efegharị n’elu, okooko osisi dịkwa ebe ahụ.

Mat. 6:25-27

IHE ỌMỤMỤ NKE 11

Mee Ka Ihe Ị Na-akụzi Dị Mfe Nghọta

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “[Na-ekwu] ihe dị mfe nghọta.”​—1 Kọr. 14:9.

Ihe Jizọs Mere

Ebe Jizọs nọ n’ebe dị nso ná mmiri na-akụziri ndị mmadụ ihe. Ụmụ nnụnụ na-efegharị n’elu, okooko osisi dịkwa ebe ahụ.

VIDIO: Jizọs Mere Ihe Atụ Gosiri na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Matiu 6:25-27. Zazie ajụjụ ndị a:

  1. Olee otú Jizọs si mee ihe atụ gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya?

  2. Ọ bụ eziokwu na Jizọs ma ọtụtụ ihe gbasara ụmụ nnụnụ, olee ihe dị mfe o lekwasịrị anya na ya? Olee ihe mere isi otú ahụ akụzi ihe ji dị mma?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Ọ bụrụ na ihe anyị na-akụzi adị mfe nghọta, ndị mmadụ ga na-echeta ya, ya eruokwa ha n’obi.

Na-eme Ka Jizọs

3. Ekwula ọtụtụ okwu. Kama ikwu ihe niile ị ma gbasara isiokwu unu na-amụ, lekwasị anya n’ihe dị n’akwụkwọ unu na-amụ. Ị jụọ ajụjụ, nwee ndidi ka onye ị na-amụrụ ihe zaa. Ọ bụrụ na ọ maghị azịza ya ma ọ bụ ya ekwuo ihe dị iche n’ihe Baịbụl na-akụzi, jụọ ya ajụjụ ndị ọzọ ga-enyere ya aka ichebara ya echiche. Ọ bụrụ na ọ ghọta isi ihe unu na-amụ, gafee n’ọzọ.

4. Jiri ihe ọ mabu nyere ya aka ịghọta ihe ọhụrụ ị na-akụziri ya. Dị ka ihe atụ, tupu gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl amụwa isiokwu kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ, i nwere ike iji obere oge mata ihe ọ mụtarala gbasara ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ.

5. Lezie anya n’ihe i ji eme ihe atụ. Tupu gị emee ihe atụ, jụọ onwe gị, sị:

  1. a. ‘Ihe atụ a ọ̀ dị mfe nghọta?’

  2. b. ‘Onye m na-amụrụ Baịbụl ọ̀ ga-aghọta ya ngwa ngwa?’

  3. ch. ‘Ọ̀ ga-enyere onye m na-amụrụ Baịbụl aka icheta isi ihe a na-amụ, ka ọ̀ bụ naanị ihe atụ ahụ ka ọ ga-echeta?’

I NWEKWARA IKE ỊGỤ

Mat. 11:25; Jọn 16:12; 1 Kọr. 2:1

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya