Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es25 p. 7-17
  • Jenụwarị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jenụwarị
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
  • Isiokwu Nta
  • Wenezdee, Jenụwarị 1
  • Tọzdee, Jenụwarị 2
  • Fraịdee, Jenụwarị 3
  • Satọdee, Jenụwarị 4
  • Sọnde, Jenụwarị 5
  • Mọnde, Jenụwarị 6
  • Tuzdee, Jenụwarị 7
  • Wenezdee, Jenụwarị 8
  • Tọzdee, Jenụwarị 9
  • Fraịdee, Jenụwarị 10
  • Satọdee, Jenụwarị 11
  • Sọnde, Jenụwarị 12
  • Mọnde, Jenụwarị 13
  • Tuzdee, Jenụwarị 14
  • Wenezdee, Jenụwarị 15
  • Tọzdee, Jenụwarị 16
  • Fraịdee, Jenụwarị 17
  • Satọdee, Jenụwarị 18
  • Sọnde, Jenụwarị 19
  • Mọnde, Jenụwarị 20
  • Tuzdee, Jenụwarị 21
  • Wenezdee, Jenụwarị 22
  • Tọzdee, Jenụwarị 23
  • Fraịdee, Jenụwarị 24
  • Satọdee, Jenụwarị 25
  • Sọnde, Jenụwarị 26
  • Mọnde, Jenụwarị 27
  • Tuzdee, Jenụwarị 28
  • Wenezdee, Jenụwarị 29
  • Tọzdee, Jenụwarị 30
  • Fraịdee, Jenụwarị 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
es25 p. 7-17

Jenụwarị

Wenezdee, Jenụwarị 1

E nwere onye nwụrụ anwụ a na-ebupụ. Ọ bụ nwa nwoke nne ya mụrụ naanị ya. Nne ya bụkwa nwaanyị isi mkpe.​—Luk 7:12.

Jizọs “hụrụ” nwaanyị ahụ na-eru uju ma ‘metere ya ebere.’ (Luk 7:13) Ma, ihe Jizọs mere abụghị naanị inwere nwaanyị ahụ ọmịiko, kama o mere ihe gosiri na o nweere ya ọmịiko. Ọ gwara nwaanyị ahụ okwu. Ọ ga-abụrịrị na o weturu obi gwa ya, sị: “Ebezila.” O nyeziiri ya aka. Ọ kpọlitere nwa ya nwụrụ anwụ ma ‘kpọnyezie ya nne ya.’ (Luk 7:14, 15) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ kpọlite nwa nwaanyị ahụ di ya nwụrụ? Anyị na-amụta na anyị kwesịrị ịna-enwere ndị mmadụ nwụnahụrụ ọmịiko. Dị ka Jizọs, anyị ga-enweliri ndị mmadụ nwụnahụrụ ọmịiko ma ọ bụrụ na anya ana-eru anyị ala. Otú anyị ga-esi gosi na anyị na-enwere ha ọmịiko bụ ikwu na ime ihe anyị nwere ike iji nyere ha aka ma kasie ha obi. (Ilu 17:17; 2 Kọr. 1:3, 4; 1 Pita 3:8) Ịgwa ha obere okwu ma ọ bụ imere ha obere ihe nwedịrị ike ịbara ha ezigbo uru. w23.04 5-6 ¶13-15

Tọzdee, Jenụwarị 2

Ihe ga-esi n’ọrịa a pụta abụghị ọnwụ, kama ọ bụ ka e too Chineke.​—Jọn 11:4.

Ọ bụ eziokwu na Jizọs ma na enyi ya anwụọla, ọ nọkwuru ebe ahụ ụbọchị abụọ, gawazie Betani. N’ihi ya, mgbe Jizọs rutere Betani, ụbọchị anọ agaala kemgbe Lazarọs nwụrụ. Jizọs bu n’obi ime ihe ga-abara ndị enyi ya uru ma tookwa Chineke. (Jọn 11:4, 6, 11, 17) E nwere ezigbo ihe akụkọ a na-akụziri anyị gbasara ịbụ enyi. Chegodị echiche. Mgbe Meri na Mata zigaara Jizọs ozi, ha agwaghị ya ka ọ bịa Betani. Naanị ihe ha gwara ya bụ na ezigbo enyi ya na-arịa ọrịa. (Jọn 11:3) Mgbe Lazarọs nwụrụ, Jizọs gaara anọ ebe ahụ ọ nọ kpọlite ya n’ọnwụ. Ma, kama ime otú ahụ, o kpebiri ịga Betani ka ọ gaa nọnyere ndị enyi ya, bụ́ Meri na Mata. Ì nwere enyi na-agbatara gị ọsọ enyemaka n’agbanyeghị na ị rịọghị ya? Ọ bụrụ na i nwere, obi siri gị ike na ọ ga-enyeliri gị aka “n’oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Dị ka Jizọs, ka anyị gosi ndị ọzọ na anyị bụ ụdị enyi ahụ. w23.04 10 ¶10-11

Fraịdee, Jenụwarị 3

Onye kwere anyị nkwa kwesịrị ka a tụkwasị ya obi.​—Hib. 10:23.

Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, o nwere ike ịdị anyị ka ụwa ọhụrụ Jehova kwere anyị ná nkwa agaghị abịa. Ihe a ọ̀ pụtara na okwukwe anyị esighịzi ike? Mba. Dị ka ihe atụ, n’oge udu mmiri, o nwere ike ịdị anyị ka ọkọchị agaghị emecha bịa. Ma, ọkọchị na-emecha bịa. Ọ bụrụkwa na nsogbu bịaara anyị emee ka anyị daa mbà, o nwere ike ịdị anyị ka ụwa ọhụrụ agaghịzi abịa. Mana ọ bụrụ na okwukwe anyị esie ike, obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ya. (Ọma 94:3, 14, 15; Hib. 6:17-19) Obi sie anyị ike otú ahụ, anyị ga-enwe ike iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị. Ka anyị kwuo ebe ọzọ anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ike. Ọ bụ n’ikwusa ozi ọma. Ọtụtụ ndị na-eche na “ozi ọma” anyị na-ekwusara ha gbasara ụwa ọhụrụ Chineke ga-abịanụ bụ akụkọ ifo. (Mat. 24:14; Ezik. 33:32) Anyị anaghị ekwe ka otú a ha si eche echiche mee ka nkwa Jehova mewe anyị obi abụọ. Ihe ga-enyere anyị aka bụ ịna-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. w23.04 27 ¶6-7; 30 ¶14

Satọdee, Jenụwarị 4

Anyị ma na anyị ga-enweta ihe anyị na-arịọ, ebe ọ bụ ya ka anyị rịọrọ ihe ndị ahụ.​—1 Jọn 5:15.

Ì chetụla ma Jehova ọ̀ na-aza ekpere gị? Ọ bụrụ na i chetụla otú ahụ, ọ bụghị naanị gị. E nwekwara ọtụtụ ụmụnna ndị kwuru na ha na-eche otú ahụ, karịchaa, mgbe nsogbu tara akpụ bịaara ha. Ọ bụrụ na anyị na-ata ahụhụ, o nwere ike isiri anyị ike ịchọpụta otú Jehova si aza ekpere anyị. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova na-aza ekpere ndị ohu ya? Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu nakwa na o ji anyị kpọrọ ihe. (Hag. 2:7; 1 Jọn 4:10) Ọ bụ ya mere o ji agwa anyị ka anyị na-arịọ ya ka o nyere anyị aka. (1 Pita 5:6, 7) Ọ chọrọ inyere anyị aka ka anyị na ya dịrị ná mma nakwa ka anyị die nsogbu ndị na-abịara anyị. Anyị gụọ Baịbụl, anyị na-agụtakarị ebe Jehova zara ekpere ndị ohu ya. È nwere onye nke i chetara? w23.05 8 ¶1-4

Sọnde, Jenụwarị 5

Meri wee sị: “Mkpụrụ obi m na-eto Jehova.”​—Luk 1:46.

Meri na Jehova dị n’ezigbo mma. Ihe mere ka ya na Jehova dị ná mma abụghị ihe Josef na-eme. Meri ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. O wepụtakwara oge na-atụgharị uche. (Luk 2:19, 51) O doro anya na otú Meri si jiri ife Chineke kpọrọ ihe mere ka ọ bụrụ ezigbo nwunye. Taa, ọtụtụ ndị nwunye na-agbasi mbọ ike ime ka Meri. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Emiko sịrị: “Mgbe m na-alụbeghị di, e nwere ihe ndị m na-eme ka mụ na Jehova na-adị ná mma. Ma, mgbe m lụchara di, m chọpụtara na ebe ọ bụ di m na-ekpe ekpere mgbe mụ na ya nọ ma na-ebute ụzọ n’ofufe ezinụlọ, m na-echerezi ka ọ na-emere m ihe ndị a. M bịara chọpụta na m kwesịrị ịgba mbọ n’onwe m ka mụ na Jehova na-adịkwu ná mma. N’ihi ya, m na-ewepụtazi oge mụ na Jehova ga-eji na-anọrị, ya bụ, oge ikpe ekpere, ịgụ Baịbụl, na ichebara ihe Jehova kwuru echiche.” (Gal. 6:5) Ndị nwunye, ka unu na-agba mbọ ka unu na Jehova dịrịkwuo ná mma, ndị di unu ga-ahụ ihe ndị ọzọ mere ha ga-eji hụkwuo unu n’anya ma na-eto unu.​—Ilu 31:30. w23.05 22 ¶6

Mọnde, Jenụwarị 6

M ga-akụziri unu ihe bụ́ ịtụ egwu Jehova.​—Ọma 34:11.

Anyị ebughị ịtụ egwu Chineke pụta ụwa. Anyị ga-agba mbọ mụta ya. Otu ụzọ anyị ga-esi mụta ya bụ ileru ihe ndị Chineke kere eke anya. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na Chineke ma ihe, dịrị ike, nakwa na “ihe ndị o kere” gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, anyị ga-esi n’ala ala obi anyị na-akwanyekwuru ya ùgwù ma hụkwuo ya n’anya. (Rom 1:20) Ụzọ ọzọ anyị si amụta ịtụ egwu Chineke bụ ikpe ekpere mgbe niile. Ka anyị na-ekpekwu ekpere ka anyị ga na-amatakwu Jehova nke ọma. Mgbe ọ bụla anyị rịọrọ ya ka o nye anyị ike anyị ga-eji edi nsogbu, anyị na-echeta na Jehova siri ezigbo ike. Mgbe ọ bụla anyị kelere ya maka Ọkpara ya o nyere anyị, anyị na-echeta na ọ hụrụ anyị n’anya. Mgbe ọ bụla anyị rịọkwara Jehova ka o nyere anyị aka ná nsogbu bịaara anyị, anyị na-aghọta na o nwere amamihe. Ụdị ekpere a na-eme ka anyị na-akwanyekwuru Jehova ùgwù. Ọ na-emekwa ka anyị kpebisie ike izere ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. w23.06 15 ¶6-7

Tuzdee, Jenụwarị 7

Jehova bụ Onye na-enye anyị iwu.​—Aịza. 33:22.

Jehova na-enye ndị ya iwu ndị doro anya mgbe niile. Dị ka ihe atụ, n’oge ndịozi Jizọs, òtù na-achị isi kwuru ihe atọ Ndị Kraịst ga-eme iji guzosie ike: (1) ha ga-ezere ikpere arụsị, na-efekwa naanị Jehova, (2) ha ga na-erubere iwu Jehova nyere gbasara ọbara isi, na (3) ha ga na-erubere iwu Baịbụl nyere ka anyị zere ịkwa iko isi. (Ọrụ 15:28, 29) Olee otú Ndị Kraịst ga-esi na-erubere Jehova isi n’ihe atọ ndị a taa? Anyị na-efe Jehova ma na-erubere ya isi. Jehova nyere ndị Izrel iwu ka ha na-efe naanị ya. (Diut. 5:6-10) Mgbe Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa, Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ naanị Jehova ka anyị kwesịrị ife. (Mat. 4:8-10) N’ihi ya, anyị anaghị efe ihe a kpụrụ akpụ. Anyị anaghịkwa ewere ndị mmadụ ka hà bụ chi, ma hà bụ ndị isi okpukpe, ndị ọchịchị, ma ọ bụ ndị a ma ama n’egwuregwu. Anyị na-efe naanị onye “kere ihe niile.”​—Mkpu. 4:11. w23.07 14-15 ¶3-4

Wenezdee, Jenụwarị 8

Ịtụ egwu Jehova na-emekwa ka mmadụ kwụsị ime ihe ọjọọ.​—Ilu 16:6.

Ihe gbasara omume rụrụ arụ na ile ndị gba ọtọ na-agbazi ụwa Setan ara. (Efe. 4:19) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-amụta ịtụ egwu Chineke ma na-agbara ihe ọjọọ ọsọ. N’Ilu isi 9, e kwuru banyere ụmụ nwaanyị abụọ. Otu n’ime ha nọchiri anya amamihe, nke ọzọ anọchie anya nzuzu. Onye nke ọ bụla n’ime ha na-akpọ ndị na-amaghị ihe òkù, ndị a kpọrọ “ndị na-enweghị uche.” Ọ dị nnọọ ka onye nke ọ bụla ọ̀ na-asị, ‘Batanụ n’ụlọ m rie nri.’ (Ilu 9:1, 4-6) Ma, ihe a na-erite n’ụlọ nwaanyị nzuzu dị ezigbo iche n’ihe a na-erite n’ụlọ nwaanyị ma ihe. Legodị òkù “nwaanyị nzuzu” na-akpọ. (Ilu 9:13-18) Ọ kara anya na-akpọ ndị na-enweghị uche òkù, na-asị ha, “Bata ebe a” bịa rie nri. Olee ihe a na-erite? “Ụlọ ya bụ ụlọ ndị nwụrụ anwụ.” Ọ dọrọ anyị aka ná ntị banyere “nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ” na “nwaanyị na-akwa iko.” Ebe ahụ sịrị: “Ịga n’ụlọ ya dị ka mmadụ ịgakwuru ọnwụ.” (Ilu 2:11-19) Ilu 5:3-10 dọrọ anyị aka ná ntị banyere nwaanyị ọzọ bụ́ “nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ,” onye “ụkwụ ya na-eduga n’ọnwụ.” w23.06 21-22 ¶6-7

Tọzdee, Jenụwarị 9

Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.​—Fil. 4:5.

Ndị okenye kwesịrị ịbụ ndị e ji ama atụ n’ihe gbasara ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị. (1 Tim. 3:2, 3) Dị ka ihe atụ, okenye ekwesịghị ịna-atụ anya na ndị ọzọ ga-anabata aro ọ tụrụ naanị n’ihi na ọ bụ ya tọrọ ndị okenye ndị ọzọ. Kama, ọ na-aghọta na mmụọ nsọ Jehova nwere ike ime ka okenye ọ bụla kwuo ihe ga-eme ka e kpebie ihe bara uru. Ọ bụrụkwa na ihe ọtụtụ ndị kwadoro emegideghị iwu Baịbụl, ndị okenye ma ihe na-eji obi ha na-akwado ihe ọtụtụ ndị okenye kpebiri, ọ bụrụgodị na ha gaara achọ ka e mee ihe dị iche. Ọ bụrụ na anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, e nwere ọtụtụ uru ọ na-abara anyị. Ọ na-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị ná mma, meekwa ka ọgbakọ dịrị n’udo. Ọ na-eme ka obi dị anyị ụtọ na e nwere ụdị mmadụ dị iche iche na ndị si n’ebe dị iche iche n’ọgbakọ Jehova dị n’otu. Nke kachanụ bụ na obi na-adị anyị ezigbo ụtọ n’ihi na anyị ma na anyị na-eme ka Chineke anyị bụ́ Jehova, onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. w23.07 25 ¶16-17

Fraịdee, Jenụwarị 10

Ndị ma ihe ga-aghọta ha. ​—Dan. 12:10.

Daniel bu ezigbo ihe n’obi mụọ amụma ndị dị na Baịbụl, ya bụ, ka ọ mata nke bụ́ eziokwu. Ihe ọzọkwa bụ na Daniel dị umeala n’obi. Ọ ma na Jehova ga-eme ka ndị ma ya nakwa ndị na-ebi ndụ otú ọ chọrọ ghọta amụma ya. (Dan. 2:27, 28) Daniel gosiri na ọ dị umeala n’obi. Otú o si mee ya bụ na ọ tụkwasịrị Jehova obi ka o nyere ya aka. (Dan. 2:18) Ihe ọzọkwa bụ na Daniel leziri ezigbo anya mụọ amụma ndị ahụ. O mere nchọnchọ n’Akwụkwọ Nsọ dị n’oge ya. (Jere. 25:11, 12; Dan. 9:2) Olee otú ị ga-esi eme ka Daniel? Buru ezigbo ihe n’obi. Ihe mere i ji na-amụ amụma ndị dị na Baịbụl, ọ̀ bụ na ị chọsiri ike ịma nke bụ́ eziokwu? Ọ bụrụ otú ahụ, Jehova ga-enyere gị aka. (Jọn 4:23, 24; 14:16, 17) Ụfọdụ ndị nwere ike ime ya ka ha chọta ihe ndị na-egosi na Baịbụl esighị n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ndị na-eme otú ahụ na-eche na ọ ga-eme ka ha nwee ike ịna-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, anyị kwesịrị ibu ezigbo ihe n’obi na-amụ amụma Baịbụl. w23.08 9-10 ¶7-8

Satọdee, Jenụwarị 11

Ọ bụrụ na obi adaa gị mbà . . . , ike ga-agwụ gị.​—Ilu 24:10.

Ọ bụrụ na anyị ejiri onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ, ihe ndị anyị tụrụ anya ime anyị na-emelighị nwere ike ịghọrọ anyị ibu. (Gal. 6:4) Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ mgbe niile, o nwere ike ime ka anyị nwewe anyaụfụ ma ọ bụ mawa ndị ọzọ aka. (Gal. 5:26) Anyị gbalịwa ime ihe ndị ọzọ mere n’agbanyeghị na anyị agaghị emeli ya, anyị nwere ike ịkpatara onwe anyị nsogbu. Ebe ọ bụ na “ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na ihe ọ na-atụ anya ya emezughị mgbe ọ tụrụ anya ya,” ọ ga-aka agbawa anyị obi ma ọ bụrụ na anyị agbalịwa ime ihe ndị anyị na-agaghị emeli. (Ilu 13:12) Ime otú ahụ nwere ike ime ka ike na-agwụ anyị, anyị adawa mbà n’ọsọ ndụ anyị na-agba. Atụla anya ka i mee ihe karịrị ihe Jehova chọrọ ka i mee. Jehova anaghị atụ anya ka i nye ihe ị na-enweghị. (2 Kọr. 8:12) Obi sie gị ike na Jehova anaghị eji ihe anyị na-eme atụnyere ihe ndị ọzọ na-eme. (Mat. 25:20-23) O ji ozi i ji obi gị niile na-ejere ya kpọrọ ihe, ma otú i si erubere ya isi, ma otú i si atachi obi. w23.08 29 ¶10-11

Sọnde, Jenụwarị 12

Agụụ mmiri ọ̀ ga-agụgbuzi m? ​—Ikpe 15:18.

Jehova zara ekpere Samsịn, rụọ ọrụ ebube mee ka o nweta mmiri. Mgbe Samsịn ṅụchara mmiri ahụ, “ike ya lọghachiri, ya enweta onwe ya.” (Ikpe 15:19) Ọ ga-abụ na iyi ọhụrụ a ka dị mgbe ọtụtụ afọ gachara, ya bụ, mgbe Samuel onye amụma si n’ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ Ndị Ikpe. Ọ ga-abụ na ndị Izrel hụ iyi a, ha na-echeta na Jehova ga-enyere ndị ji obi ha niile na-efe ya aka mgbe ihe siiri ha ike ma ọ bụrụ na ha atụkwasị ya obi. Anyịnwa kwesịkwara ịtụkwasị Jehova obi ka o nyere anyị aka n’agbanyeghị nkà ndị anyị nwere ma ọ bụkwanụ ihe ndị anyị rụrụ n’ozi ya. Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma kweta na naanị ihe ga-enyere anyị aka ịrụ ihe Jehova chọrọ ka anyị rụọ bụ ma anyị tụkwasị ya obi. Otú ahụ Samsịn si nweta ike mgbe ọ ṅụchara mmiri Jehova nyere ya, anyịnwa ga-enwetakwa ike anyị ga-eji na-efe Jehova ma ọ bụrụ na anyị ejiri ihe niile Jehova na-ewepụtara anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike.​—Mat. 11:28. w23.09 4 ¶8-10

Mọnde, Jenụwarị 13

Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi zaa ya okwu, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.​—Ilu 15:1.

Olee ihe anyị nwere ike ime ma ndị ọzọ kpasuo anyị iwe, dị ka mgbe mmadụ na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara Chineke ma ọ bụ Baịbụl? Anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya nakwa amamihe ya ka anyị nwee ike iji nwayọọ zaghachi onye ahụ. Ọ bụrụkwanụ na anyị emechaa chọpụta na anyị emedaghị obi zaa onye ahụ otú anyị kwesịrị? Anyị nwere ike ikpe ekpere ọzọ gbasara ya, cheekwa gbasara otú anyị ga-esi mee nke ọma n’oge ọzọ. Jehova ga-enyezi anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ijide onwe anyị ma dịrị nwayọọ. Amaokwu Baịbụl ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ikwu ihe na-adịghị mma ma a kpasuo anyị iwe. Mmụọ nsọ Chineke nwere ike inyere anyị aka icheta amaokwu Baịbụl ndị ahụ. (Jọn 14:26) Dị ka ihe atụ, ihe ndị e dere n’amaokwu ụfọdụ dị n’akwụkwọ Ilu nwere ike inyere anyị aka ịdị nwayọọ. (Ilu 15:18) Akwụkwọ Ilu gosikwara ihe mere o ji dị ezigbo mma ka anyị na-ejide onwe anyị mgbe ihe siri ike.​—Ilu 10:19; 17:27; 21:23; 25:15. w23.09 15 ¶6-7

Tuzdee, Jenụwarị 14

M chọrọ ịna-echetara unu ihe ndị a mgbe niile.​—2 Pita 1:12.

Pita onyeozi ji obi ya niile fee Jehova ruo ọtụtụ afọ. O so Jizọs kwusaa ozi ọma. Ọ bụ ya malitekwara ikwusara ndị na-abụghị ndị Juu ozi ọma, mechaakwa soro n’òtù na-achị isi. Mgbe ọ ma na oge ọ ga-anwụ eruwela, Jehova nyere ya ọrụ ọzọ ọ ga-arụ. N’ihe dị ka n’afọ 62 ruo n’afọ 64 Oge Ndị Kraịst, mmụọ nsọ mere ka o dee akwụkwọ ozi abụọ. Ha bụ Pita nke Mbụ na nke Abụọ. (2 Pita 1:13-15) Oge Pita dere akwụkwọ ozi abụọ a bụ oge “ọnwụnwa dị iche iche bịaara” Ndị Kraịst ibe ya. (1 Pita 1:6) Ndị ọjọọ nọ na-agba mbọ ka ọgbakọ Ndị Kraịst nabata nkụzi ụgha na omume ọjọọ. (2 Pita 2:1, 2, 14) N’oge na-adịghị anya, Ndị Kraịst nọ na Jeruselem ga-ahụ “ọgwụgwụ ihe niile,” ya bụ, mgbe ndị agha Rom ga-ebibi obodo ahụ na ụlọ nsọ dị na ya. (1 Pita 4:7) O doro anya na akwụkwọ ozi ndị ahụ Pita dere nyeere Ndị Kraịst ndị ahụ aka ịma ihe ha ga-eme iji die ọnwụnwa ndị bịaara ha n’oge ahụ, kwadebekwa ha maka ọnwụnwa ndị ga-abịara ha n’ihu. w23.09 26 ¶1-2

Wenezdee, Jenụwarị 15

[Kraịst] si n’ahụhụ ọ tara mụta irube isi.​—Hib. 5:8.

Dị ka Jizọs, anyị na-amụta irube isi ma ihe sie ezigbo ike. Dị ka ihe atụ, n’oge ọrịa koronavaịrọs malitere ọhụrụ, a gwara anyị ka anyị kwụsị ịna-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị amụ ihe nakwa ka anyị kwụsị ịga ozi ụlọ n’ụlọ. Ò siiri gị ike irube isi? Ma, otú i si rube isi chebere gị, mee ka gị na ụmụnna gị dịrị n’otu, meekwa Jehova obi ụtọ. Anyị niile ejikerela ugbu a irube isi ná ntụziaka ọ bụla a ga-enye anyị n’oge oké mkpagbu. O nwere ike ime ka anyị dị ndụ. (Job 36:11) Ihe mere anyị ji ekpebi irubere Jehova isi bụ na anyị hụrụ ya n’anya, chọọkwa ime ihe dị ya mma. (1 Jọn 5:3) Anyị agaghị akwụli Jehova ụgwọ ihe niile o meere anyị. (Ọma 116:12) Ma, anyị nwere ike irubere ya na ndị o nyere ikike isi. Ọ bụrụ na anyị erube isi, ọ na-egosi na anyị ma ihe. Ndị ma ihe na-eme Jehova obi ụtọ.​—Ilu 27:11. w23.10 11 ¶18-19

Tọzdee, Jenụwarị 16

Feenụ Chineke, onye kere eluigwe na ụwa.​—Mkpu. 14:7.

Ọ bụrụ na mmụọ ozi ana-agwa gị okwu, ị̀ ga-ege ya ntị? Taa, e nwere mmụọ ozi na-agwa “mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile na agbụrụ niile” okwu. Gịnị ka ọ na-ekwu? Ọ na-asị: “Tụọnụ egwu Chineke, tookwanụ ya . . . Feenụ Chineke, onye kere eluigwe na ụwa.” (Mkpu. 14:6, 7) Ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke, onye onye ọ bụla kwesịrị ịna-efe. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nwere ohere a magburu onwe ya ife Jehova ná nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ya. Gịnị bụ ụlọ nsọ ihe atụ a, oleekwa ebe anyị ga-ahụ ihe ndị e ji kọwaa ya? Ụlọ nsọ ihe atụ abụghị ụlọ nsọ nkịtị. Ọ bụ nhazi Jehova mere ka e nwee ike na-efe ya otú ọ ga-anabata n’ihi àjà Jizọs chụrụ iji gbapụta anyị. Pọl onyeozi kọwakwuru ihe a n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru bi na Judia. w23.10 24 ¶1-2

Fraịdee, Jenụwarị 17

“Ọ bụghị ìgwè ndị agha ga-eme ihe ndị a, ọ bụghịkwa ike mmadụ, kama ọ bụ mmụọ m ga-eme ha.” Ọ bụ ihe Jehova . . . kwuru.​—Zek. 4:6.

N’afọ 522 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị na-emegide ndị Juu mere ka ndị ọchịchị Peshia machie ha ịrụghachi ụlọ nsọ Jehova. Ma Zekaraya mere ka obi sie ndị Juu ike na Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya dị ike nyere ha aka ịna-arụ ọrụ ahụ n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha. N’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst, Eze Darayọs wepụrụ iwu ahụ a machiri ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ. O nyedịrị ndị Juu ego ha ga-eji arụghachi ya, nyekwa ndị gọvanọ iwu ka ha kwado ha. (Ezra 6:1, 6-10) Jehova kwere ndị ya nkwa na ọ ga-anọnyere ha ma ọ bụrụ na ha ewere ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ ka ihe kacha mkpa. (Hag. 1:8, 13, 14; Zek. 1:3, 16) Ume a ndị amụma gbara ndị Juu mere ka ha maliteghachi ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ n’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst ma rụchaa ya n’ihe na-erughị afọ ise. Jehova gbooro ndị Juu mkpa ha n’ihi na ha butere ọrụ ya ụzọ n’agbanyeghị nsogbu ndị ha nwere. Ihe a mere ka ha jiri ọṅụ na-efe Jehova.​—Ezra 6:14-16, 22. w23.11 15 ¶6-7

Satọdee, Jenụwarị 18

[Nwee] okwukwe ka . . . nna anyị Ebreham.​—Rom 4:12.

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị anụla gbasara Ebreham, ma e nweghị ezigbo ihe ọtụtụ ndị ma gbasara ya. Ma, ị ma ọtụtụ ihe gbasara Ebreham. Dị ka ihe atụ, ị ma na a kpọrọ ya “nna ndị niile nwere okwukwe.” (Rom 4:11) Ma, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘M̀ nwere ike inwe ụdị okwukwe Ebreham nwere?’ Ee. I nwere ike. Otu ụzọ anyị ga-esi nwee ụdị okwukwe Ebreham nwere bụ ịmụ gbasara ihe o mere. Ebreham mere ihe Chineke gwara ya mgbe niile. Dị ka ihe atụ, ọ kwagara mba dị anya, biri n’ụlọikwuu ruo ọtụtụ afọ, chọọkwa iji nwa ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Aịzik achụrụ Chineke àjà. Ihe ndị a o mere gosiri na o nwere okwukwe siri ike. Okwukwe Ebreham nwere na ihe dị mma o mere mere ka ihe ya masị Chineke, ya na ya abụrụ enyi. (Jems 2:22, 23) Jehova chọrọ ka anyị niile nweta ngọzi ndị a, ma gịnwa. N’ihi ya, o mere ka Pọl na Jems, bụ́ ndị so dee Baịbụl, kwuo gbasara ihe Ebreham mere. w23.12 2 ¶1-2

Sọnde, Jenụwarị 19

Onye ọ bụla kwesịrị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa.​—Jems 1:19.

Ụmụnna nwaanyị, mụtanụ otú unu na ndị ọzọ ga-esi na-akparịta ụka. Ọ dị ezigbo mkpa ka Ndị Kraịst mụta ime ihe a. Ọ bụ ya mere Jems ji nye anyị ndụmọdụ dabara adaba n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Ọ bụrụ na ị na-ege ntị nke ọma mgbe ndị ọzọ na-ekwu okwu, ọ na-egosi na ‘ihe banyere ha na-emetụ gị n’obi.’ (1 Pita 3:8) Ọ bụrụ na ị ghọtachaghị ihe mmadụ kwuru ma ọ bụ otú obi dị ya, jụọ ya ajụjụ ga-eme ka ị ghọta ihe o kwuru, gị echetụzie echiche tupu gị ekwuo okwu. (Ihe e dere n’ala ala peeji Ilu 15:28.) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe m chọrọ ikwu ọ̀ bụ eziokwu ma na-agba ume? Ọ̀ na-egosi na m na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma dị obiọma?’ Mụta ihe n’aka ụmụnna nwaanyị ndị ma otú e si akparịta ụka. (Ilu 31:26) Chebara ihe ndị ha na-ekwu na otú ha si ekwu ya echiche. Ị mụta ya, ọ ga-eme ka gị na ndị ọzọ na-adị ná mma. w23.12 21 ¶12

Mọnde, Jenụwarị 20

Onye na-anọ iche [anaghị] anabata ezigbo amamihe.​—Ilu 18:1.

Taa, Jehova nwere ike iji ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, ma ọ bụ ndị okenye nyere anyị aka. Ma, ọ bụrụ na obi adịghị anyị mma, o nwere ike ịdị anyị ka ndị ọzọ hapụtụ anyị aka ka anyị nọọrọ onwe anyị. O nweghị ihe o mere ma ọ bụrụ na ọ dị anyị otú ahụ. Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova kwado anyị? Gbasie mbọ ike ka ị ghara ịna-anọrọ onwe gị. Ọ bụrụ na anyị ana-anọrọ onwe anyị, o nwere ike ime ka anyị chewe naanị gbasara onwe anyị nakwa nsogbu ndị bịaara anyị. Iche ụdị ihe ahụ nwere ike ime ka anyị mee mkpebi na-adịghị mma. N’eziokwu, e nwere oge ụfọdụ anyị kwesịrị ịnọrọ onwe anyị, karịchaa ma ezigbo nsogbu bịara anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị na-anọrọ onwe anyị mgbe niile, o nwere ike ime ka anyị ghara ịnabata ụzọ ndị Jehova si na-akwado anyị. N’ihi ya, nabata aka ndị ezinụlọ gị, ndị enyi gị, na ndị okenye ga-enyere gị n’agbanyeghị na o nwere ike ọ gaghị adịchara gị mfe. Lee ha anya ka otú Jehova si na-akwado gị.​—Ilu 17:17; Aịza. 32:1, 2. w24.01 24 ¶12-13

Tuzdee, Jenụwarị 21

Agụba agaghị emetụ ya n’isi. ​—Ọnụ Ọgụ. 6:5.

Ndị Naziraịt na-ekwe nkwa na ha agaghị akpụ isi ha. Ihe a bụ ihe na-egosi na ha ji obi ha niile na-erubere Jehova isi. Ọ dị mwute na e nwere oge ụfọdụ ndị Izrel na-ejighị ndị Naziraịt kpọrọ ihe ma ọ bụkwanụ kwado ha. N’oge ụfọdụ, onye Naziraịt ga-akatarịrị obi ka o nwee ike imezu nkwa o kwere nakwa ka o nwee ike ịdị iche ná ndị ọzọ. (Emọs 2:12) Ebe ọ bụ na anyị kpebiri ime uche Jehova, anyị dịkwa iche ná ndị nọ gburugburu anyị. Anyị kwesịrị ịkata obi iji gwa ndị ọrụ ibe anyị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ihe ọzọ bụkwa na ebe ọ bụ na àgwà ndị mmadụ na-eretọ kwa ụbọchị, o nwere ike isiri anyị ezigbo ike ime ihe Baịbụl kwuru nakwa ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. (2 Tim. 1:8; 3:13) Ma, na-echeta mgbe niile na anyị ‘na-eme Jehova obi ụtọ’ ma anyị kata obi dịrị iche ná ndị na-anaghị efe ya.​—Ilu 27:11; Mal. 3:18. w24.02 16 ¶7; 17 ¶9

Wenezdee, Jenụwarị 22

Na-anabatanụ ibe unu.​—Rom 15:7.

Legodị ụdị ndị dị iche iche e nwere n’ọgbakọ dị na Rom. E nwere ndị bụ́ ndị Juu, ndị e ji Iwu Mosis zụọ, nweekwa ndị na-abụghị ndị Juu nwere omenala dị iche iche. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime Ndị Kraịst ndị ahụ bụbu ndị ohu, ụfọdụ abụrụ ndị nweere onwe ha. O nwedịrị ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha nwere ndị ohu. Olee otú Ndị Kraịst ndị a ga-esi na-ahụkwu ibe ha n’anya n’agbanyeghị ihe ndị a? Pọl onyeozi gbara ha ume ka ha ‘na-anabata ibe ha.’ Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Okwu a sụgharịrị “ịnabata” pụtara inwere mmadụ obiọma ma ọ bụ ile ya ọbịa nke ọma, otú ahụ mmadụ na-emere onye bịara n’ụlọ ya ma ọ bụ ndị enyi ya. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara Faịlimọn otú ọ ga-esi nabata Onesịmọs, bụ́ ohu ya gbapụrụ agbapụ. Ọ gwara ya, sị: “Nabata ya otú ị ga-esi anabata m.” (Faị. 17) Prisila na Akwịla nabatara Apọlọs, onye ha ka mara gbasara Ndị Kraịst. Otú ha si mee ya bụ ‘ịkpọpụ ya iche’ n’ebe ndị ọzọ nọ ma kọwakwuoro ya eziokwu. (Ọrụ 18:26) Ndị Kraịst ndị ahụ ekweghị ka ebe ndị ha dị iche kpatara ha nsogbu. Kama, ha nabatara ibe ha. w23.07 6 ¶13

Tọzdee, Jenụwarị 23

M ga-emezu nkwa m kwere Jehova.​—Ọma 116:14.

Isi ihe mere ị ga-eji nyefee Jehova onwe gị bụ na ị hụrụ ya n’anya. Ihe mere i ji hụ ya n’anya abụghị naanị na ị chọrọ ịhụ ya n’anya, kama ọ bụ n’ihi na ‘ị matala uche Chineke nke ọma,’ matakwa nzube ya. (Kọl. 1:9) Ịmụ Baịbụl emeela ka o doo gị anya (1) na Jehova bụ onye dị adị, (2) na Baịbụl bụ Okwu ya si n’ike mmụọ nsọ, nakwa (3) na ọ na-eji nzukọ ya emezu nzube ya. Ndị na-enyefe Jehova onwe ha kwesịrị ịma ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi, na-erubekwa isi n’iwu Chineke. Ha na-agbalịsi ike ịkọrọ ndị ọzọ eziokwu ndị ha na-amụta. (Mat. 28:19, 20) Ha na-ahụkwu Jehova n’anya. Ọ na-agụsikwa ha agụụ ike ife naanị Jehova. Ọ́ bụghị otú ọ dị gị? w24.03 4-5 ¶6-8

Fraịdee, Jenụwarị 24

Ha [ga-abụzi] otu anụ ahụ́. ​—Jen. 2:24.

Aha di Abigel bụ Nebal. Baịbụl kwuru na Nebal dị aka ike, na-akpakwa àgwà ọjọọ. (1 Sam. 25:3) O doro anya na o siiri Abigel ike ya na ụdị nwoke ahụ ibi. Abigel ò nwere ohere ịhapụ di ya? Ee. E nwere mgbe Devid, onye ga-abụ eze Izrel n’ọdịnihu, bịara ka o gbuo di ya n’ihi na ọ kparịrị ya na ndị so ya. (1 Sam. 25:9-13) Ọ bụrụ na Abigel chọrọ, ọ gaara agba ọsọ, hapụ Devid ka o gbuo di ya. Ma, o meghị otú ahụ. Kama, ọ rịọrọ Devid ka ọ hapụ igbu di ya. (1 Sam. 25:23-27) Gịnị mere o ji mee otú ahụ? Abigel hụrụ Jehova n’anya, jirikwa iwu Jehova nyere maka alụmdi na nwunye kpọrọ ihe. Ọ ma na Jehova na-ele alụmdi na nwunye anya ka ihe dị nsọ. Ọ chọrọ ime Jehova obi ụtọ. Ọ ga-abụ ya mere o ji mee ihe niile o nwere ike ime iji chebe ndị niile bi n’ụlọ ha, ma di ya. O mere ihe ozugbo ka o gbochie Devid igbu Nebal. w24.03 16-17 ¶9-10

Satọdee, Jenụwarị 25

M ga-eji okwu ọnụ m gbaa unu ume.​—Job 16:5.

È nwere ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ unu na-agbalị ịhapụ ihe ụfọdụ ha na-eme ka ha nwee ike wepụtakwuo oge na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova? Ị̀ ma ụfọdụ ndị na-eto eto na-akata obi na-anọpụ iche n’ụlọ akwụkwọ ha, ọ bụ eziokwu na ọ naghị adịrị ha mfe ime otú ahụ? È nwere ụfọdụ ndị ọ na-esiri ike ịnọsi ike n’ofufe Jehova n’ihi mmegide ndị ezinụlọ ha na-emegide ha? Ka anyị jiri ohere ọ bụla dapụtaara anyị na-agwa ụmụnna ndị a anyị hụrụ n’anya anyị na ha na-efekọ Jehova okwu ga-agba ha ume, na-egosi ha na obi dị anyị ụtọ maka otú ha si ahapụ ihe ụfọdụ nakwa otú ha si akata obi. (Faị. 4, 5, 7) Obi siri Jehova ike na anyị chọrọ ime ya obi ụtọ nakwa na anyị dị njikere ịhapụ ihe ọ bụla ọ dị mkpa ka anyị hapụ iji mezuo nkwa anyị kwere ya mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. Ọ na-akwanyere anyị ùgwù na-ahapụ anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie ụzọ anyị ga-esi gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya. (Ilu 23:15, 16) Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị akwụsị ife Jehova, dịrịkwa njikere inye ya ihe kacha mma anyị nwere. w24.02 18 ¶14; 19 ¶16

Sọnde, Jenụwarị 26

Ọ gazuru ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị [mmadụ ọrịa]. ​—Ọrụ 10:38.

Weregodị ya na ị na-ahụ ihe na-eme mgbe Jizọs malitere ozi ya n’ụwa ná ngwụcha afọ 29 Oge Ndị Kraịst. Jizọs na mama ya bụ́ Meri gara oriri agbamakwụkwọ a kpọrọ ha na Kena. Ọ ga-abụkwa na Meri so na-enye aka elekọta ndị ọbịa ha. Ma, n’oriri agbamakwụkwọ ahụ, mmanya ha gwụrụ. Meri gakwuuru nwa ya nwoke ozugbo, gwa ya, sị: “Ha enweghị mmanya.” (Jọn 2:1-3) Gịnị ka Jizọs mere? Ọ rụrụ ọrụ ebube mee ka mmiri ghọọ “mmanya dị mma.” (Jọn 2:9, 10) Jizọs rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ n’oge ọ na-eje ozi ya n’ụwa. Ọrụ ebube ya nyeere ọtụtụ puku mmadụ aka. Dị ka ihe atụ, n’abụọ n’ime ọrụ ebube ndị ahụ, o nyere puku ụmụ nwoke ise (5,000) nri, mechaakwa nye puku ụmụ nwoke anọ (4,000) nri. O nwere ike ịbụ na a gụkọta ndị o nyere nri n’ọrụ ebube abụọ a, ha karịrị puku iri abụọ na asaa (27,000) ma a gụnye ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka. (Mat. 14:15-21; 15:32-38) N’oge abụọ ahụ Jizọs rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ, ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ọrịa.​—Mat. 14:14; 15:30, 31. w23.04 2 ¶1-2

Mọnde, Jenụwarị 27

Mụnwa, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m na-asị gị, “Atụla egwu. M ga-enyere gị aka.”​—Aịza. 41:13.

Ọ bụrụ na ihe na-agbawa obi emee anyị, e nwere ike inwe ụbọchị ndị ike ga na-agwụ anyị, obi agaghịkwa adị anyị mma. Dịkwa ka Ịlaịja, o nwere ike isiri anyị ike ibili, naanị ihe ga na-agụ anyị abụrụ idina ala hiwe ụra. (1 Eze 19:5-7) O nwekwara ike ịdị mkpa ka e nyere anyị aka ịna-emechi ihe ndị gbasara ofufe Jehova anya. N’ụdị oge ahụ, Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka dị ka o kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Eze Devid nwetara ụdị enyemaka a. Mgbe ọtụtụ nsogbu bịaara ya, ndị iro ana-emegidekwa ya, ọ sịrị Jehova: “Aka gị siri ike na-akwado m.” (Ọma 18:35) Otú Jehova na-esikarị akwado anyị bụ imetụ ndị ọzọ aka n’obi ka ha nyere anyị aka. Dị ka ihe atụ, n’otu oge ike gwụrụ Devid, enyi ya bụ́ Jonatan bịara leta ya ma gbaa ya ume. (1 Sam. 23:16, 17) Jehova họkwaara Ịlaịsha ka o nyere Ịlaịja aka.​—1 Eze 19:16, 21; 2 Eze 2:2. w24.01 23-24 ¶10-12

Tuzdee, Jenụwarị 28

Ọ bụ Jehova na-eme ka mmadụ mara ihe. Ọ bụ okwu si n’ọnụ ya na-eme ka mmadụ mụta ihe ma ghọta ihe.​—Ilu 2:6.

Jehova na-emesapụ aka. Ọ na-egbokwara anyị mkpa anyị. Ihe ndị a bụ àgwà “ezigbo amamihe” nwere, nke e ji otu nwaanyị mee ihe atụ ya n’Ilu isi 9. Amaokwu nke 2 kwuru na nwaanyị ahụ egbuola anụ, gwaa mmanya, dọwakwa ihe dị iche iche na tebụl ya maka ndị ọ kpọrọ òkù. (Ilu 9:2) Amaokwu nke 4 na nke 5 kwukwara banyere ezigbo amamihe, sị: “Ọ na-agwa onye na-enweghị uche, sị: ‘Bịa rie nri m.’” Gịnị mere anyị ga-eji bata n’ụlọ amamihe ma rie nri o siri? Jehova chọrọ ka ụmụ ya bụrụ ndị ma ihe nakwa ka ihe ghara ime ha. Ọ chọghị ka anyị tinye aka n’ọkụ tupu anyị amata na ọ na-afụ ụfụ. Ọ bụ ya mere o ji “na-eme ka ndị ezi omume nwee ezigbo amamihe.” (Ilu 2:7) Ọ bụrụ na anyị ana-atụ egwu Jehova, anyị ga-achọ ịna-eme ihe ga na-eme ya obi ụtọ. Anyị na-anụ ezigbo ndụmọdụ ya. Obi na-adịkwa anyị ụtọ ime ya eme.​—Jems 1:25. w23.06 23 ¶14-15

Wenezdee, Jenụwarị 29

Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu.​—Hib. 6:10.

Ọ bụrụgodị na anyị chere na o nwechaghị oké ihe anyị ga-emeli n’ozi Chineke, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ji mbọ ọ bụla anyị na-agba ime ya obi ụtọ kpọrọ ihe. Olee otú anyị si mara? N’oge Zekaraya onye amụma, Jehova gwara ya ka o jiri ọlaedo na ọlaọcha ndị Juu nọ na Babịlọn zitere mee okpueze. (Zek. 6:11) ‘Okpueze ahụ pụrụ iche’ ga-abụ “ihe a ga-eji na-echeta” otú ndị Juu si mesapụ aka nye onyinye. (Ihe e dere n’ala ala peeji Zek. 6:14.) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agaghị echefu mbọ anyị ji obi anyị niile gbaa ife ya n’oge ihe siri ike. O doro anya na ọtụtụ nsogbu ka ga-abịara anyị n’oge ikpeazụ a. O nwekwara ike ịka njọ n’ọdịnihu. (2 Tim. 3:1, 13) Ma, o kwesịghị ime ka anyị chegbuwe onwe anyị. Cheta ihe Jehova gwara ndị ya n’oge Hagaị. Ọ sịrị: “M nọnyeere unu . . . Unu atụla egwu.” (Hag. 2:4, 5) Obi kwesịkwara isi anyị ike na Jehova ga-anọnyere anyị ma ọ bụrụhaala na anyị ana-agbasi mbọ ike ime uche ya. w23.11 19 ¶20-21

Tọzdee, Jenụwarị 30

Abụ m onye mmehie.​—Luk 5:8.

Chineke gaara eme ka a ghara ide ihe ndị Pita onyeozi mejọrọ na Baịbụl. Ma, o ji mmụọ nsọ ya mee ka e dee ha, ka anyị si na ha mụta ihe. (2 Tim. 3:16, 17) Pita nwere ihe ụfọdụ ọ na-emejọ dịkwa ka anyị. Obi na-adịkwa ya otú ọ na-adị anyị. N’ihi ya, ịmụ gbasara ya nwere ike inyere anyị aka ịghọta na Jehova anaghị atụ anya ka anyị zuo okè. Jehova chọrọ ka anyị nọsie ike na-efe ya, ya bụ, ka anyị na-agbasi mbọ ike, n’agbanyeghị ezughị okè anyị. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ike ghara ịgwụ anyị? Ọ bụrụ na anyị echee na anyị akwụsịla ihe anyị na-anaghị emetacha, e nwere mgbe ụfọdụ anyị nwere ike ime ya ọzọ. Ma, ike agaghị agwụ anyị ịgba mbọ na-emekwu nke ọma. Anyị niile na-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe anyị na-emecha kwaara mmakwaara. Ma, ọ bụrụ na ike agwụghị anyị, Jehova ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma. (1 Pita 5:10) Otú Jizọs si nweere Pita ọmịiko n’agbanyeghị ihe ndị o mejọrọ nwere ike ime ka ike ghara ịgwụ anyị ife Jehova. w23.09 20-21 ¶2-3

Fraịdee, Jenụwarị 31

Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.​—Jọn 11:21.

Jizọs nwere ike ịgwọ Lazarọs otú ahụ Mata kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Ma, o bu n’obi ime ihe ga-aka tụọ ndị mmadụ n’anya. O kwere Mata nkwa, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” O kwukwara, sị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.” (Jọn 11:23, 25) N’eziokwu, Chineke nyere Jizọs ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Tupu mgbe ahụ, Jizọs kpọlitere otu nwa agbọghọ obere oge ọ nwụchara. Ọ kpọlitekwara otu nwa okorobịa. Ọ dị ka ọ̀ bụ n’otu ụbọchị ahụ ọ nwụrụ. (Luk 7:11-15; 8:49-55) Ma, ọ̀ ga-enwe ike ịkpọlite onye nwụrụ kemgbe ụbọchị anọ, onye ọ ga-abụrịrị na ahụ́ ya erewela? Meri bụ́kwa nwanne Lazarọs gara izute Jizọs. O kwughachiri otu ihe ahụ nwanne ya nwaanyị kwuru. Ọ sịrị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” (Jọn 11:32) Mgbe Jizọs hụrụ ka Meri na ndị ọzọ so ya na-ebe ákwá, obi gbawara ya. Otú o si nweere ndị enyi ya ọmịiko mere ka anya mmiri gbaa ya. Ọ ghọtara otú obi si agbawa mmadụ ma e nwee onye nwụnahụrụ ya. N’eziokwu, ọ chọsiri ike iwepụ ihe ahụ kpataara ha anya mmiri. w23.04 10-11 ¶12-13

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya