Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es25 p. 37-46
  • Eprel

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eprel
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
  • Isiokwu Nta
  • Tuzdee, Eprel 1
  • Wenezdee, Eprel 2
  • Tọzdee, Eprel 3
  • Fraịdee, Eprel 4
  • Satọdee, Eprel 5
  • Sọnde, Eprel 6
  • Mọnde, Eprel 7
  • Tuzdee, Eprel 8
  • Wenezdee, Eprel 9
  • Tọzdee, Eprel 10
  • Fraịdee, Eprel 11
  • ỤBỌCHỊ NCHETA ỌNWỤ JIZỌS
    Mgbe Anyanwụ Dachara
    Satọdee, Eprel 12
  • Sọnde, Eprel 13
  • Mọnde, Eprel 14
  • Tuzdee, Eprel 15
  • Wenezdee, Eprel 16
  • Tọzdee, Eprel 17
  • Fraịdee, Eprel 18
  • Satọdee, Eprel 19
  • Sọnde, Eprel 20
  • Mọnde, Eprel 21
  • Tuzdee, Eprel 22
  • Wenezdee, Eprel 23
  • Tọzdee, Eprel 24
  • Fraịdee, Eprel 25
  • Satọdee, Eprel 26
  • Sọnde, Eprel 27
  • Mọnde, Eprel 28
  • Tuzdee, Eprel 29
  • Wenezdee, Eprel 30
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
es25 p. 37-46

Eprel

Tuzdee, Eprel 1

Gịnị bụkwanụ ihe a i mere m? . . . Gịnịzi mere i ji ghọọ m aghụghọ?​—Jen. 29:25.

N’oge a na-ede Baịbụl, ndị na-efe Jehova nwere ọtụtụ nsogbu ndị ha na-atụghị anya ha. Chegodị banyere Jekọb. Papa ya nyere ya iwu ka ọ gaa lụọ nwa Leban bụ́ onye ikwu ya na-efe Jehova. O mekwara ka obi sie ya ike na Jehova ga-agọzi ya mmaji kwuru mmaji. (Jen. 28:1-4) N’ihi ya, Jekọb mere ihe o kwesịrị ime. Ọ hapụrụ ala Kenan gaa n’ụlọ Leban. Leban nwere ụmụ nwaanyị abụọ. Aha ha bụ Lia na Rechel. Ma onye Jekọb hụrụ n’anya bụ nke nta, bụ́ Rechel. O kwetakwara ịrụrụ nna ya ọrụ afọ asaa tupu ya alụọ ya. (Jen. 29:18) Ma, ihe agaghị otú Jekọb si tụọ anya ya. Leban ghọgburu ya mee ka ọ lụọ nke ada, bụ́ Lia. Leban kwetara ka Jekọb lụọ Rechel mgbe otu izu gachara ma ọ bụrụ na ọ ga-arụkwuru ya ọrụ afọ asaa ọzọ. (Jen. 29:26, 27) Leban rụsara Jekọb arụrụala mgbe ọ na-arụrụ ya ọrụ. Afọ niile Leban ji ghọgbuo Jekọb bụ afọ iri abụọ.​—Jen. 31:41, 42. w23.04 15 ¶5

Wenezdee, Eprel 2

Gwanụ ya ihe niile dị unu n’obi. ​—Ọma 62:8.

Ònye ka anyị nwere ike ịgakwuru ka o nyere anyị aka mgbe anyị chọrọ onye ga-akasi anyị obi ma ọ bụ duzie anyị? Anyị ma azịza ya. Anyị nwere ike ịgakwuru Jehova n’ekpere. Jehova gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere. Ọ chọrọ ka anyị ‘na-ekpe ekpere mgbe niile.’ (1 Tesa. 5:17) Anyị nwere ike ikpe ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ, rịọ ya ka o duzie anyị n’ihe ọ bụla anyị na-eme. (Ilu 3:5, 6) Jehova bụ Chineke na-emesapụ aka. N’ihi ya, ọ gwara anyị na anyị nwere ike ikpe ekpere ugboro ole ọ bụla anyị chọrọ. Jizọs ma na Jehova ji ekpere kpọrọ ihe. Ogologo oge tupu ya abịa n’ụwa, ọ hụrụ ka Nna ya zara ekpere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ji obi ha niile na-efe ya. Dị ka ihe atụ, Jizọs nọ n’akụkụ Nna ya mgbe ọ zara ekpere Hana, Devid, Ịlaịja, na ndị ọzọ si n’obi ha kpee. (1 Sam. 1:10, 11, 20; 1 Eze 19:4-6; Ọma 32:5) Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere mgbe niile, obi esiekwa ha ike na a ga-aza ekpere ha.​—Mat. 7:7-11. w23.05 2 ¶1, 3

Tọzdee, Eprel 3

Ịtụ mmadụ egwu na-eme ka mmadụ ma n’ọnyà, ma a ga-echebe onye tụkwasịrị Jehova obi.​—Ilu 29:25.

Jehoyada, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, tụrụ egwu Jehova. Ihe a doro anya mgbe nwa Jezibel aha ya bụ Atalaya weghaara ọchịchị, ghọzie eze nwaanyị na Juda. Ọ dị obi ọjọọ. Ọ chọsikwara ike inweta ọchịchị, nke mere ka ọ gbalịa igbuchapụ ụmụ eze niile, ya bụ, ụmụ ụmụ ya. (2 Ihe 22:10, 11) Mana, o gbutalighị Jehoash, bụ́ otu n’ime ụmụ ụmụ ya, n’ihi na Jehoshabịat nwunye Jehoyada chebere ya. Ya na di ya zoro nwa ahụ ma lekọta ya. Jehoyada na Jehoshabịat si otú ahụ mee ka e nwee onye si n’agbụrụ Devid nwere ike ịbụ eze. Jehoyada rubeere Jehova isi. O kweghị ka ịtụ Atalaya ụjọ mee ka ọ ghara ime ihe dị mma. Mgbe Jehoash dị afọ asaa, Jehoyada mere ihe ọzọ gosiri na ọ na-erubere Jehova isi. Ọ kpara nkata. Nkata ahụ gazie, Jehoash, onye si n’agbụrụ Devid kwesịrị ịbụ eze, ga-aghọ eze. Mana, ọ kụọ afọ n’ala, e nwere ike igbu Jehoyada. Ma Jehova mere ka ọ gaa nke ọma. w23.06 17 ¶12-13

Fraịdee, Eprel 4

[Mata] na ọ bụ Onye Kacha Elu na-achị n’alaeze ndị mmadụ, nakwa na ọ bụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ na-eme ka ọ chịwa.​—Dan. 4:25.

Eze Nebukadneza nwere ike iche na Daniel na-agba ya mgba okpuru. O nwedịrị ike iji maka ya gbuo Daniel. Ma, Daniel gosiri na o nwere obi ike, kọwaara eze nrọ ahụ n’agbanyeghị ihe o nwere ike ịkpatara ya. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya nyeere Daniel aka inwe obi ike n’oge niile ọ dị ndụ? Mgbe Daniel bụ nwata, ọ ga-abụrịrị na ọ mụtara ihe n’aka mama ya na papa ya. (Diut. 6:6-9) Ọ bụghị naanị na Daniel ma ihe ndị bụ́ isi dị n’Iwu e nyere ndị Izrel, dị ka Iwu Iri ahụ, ọ makwa ihe onye Izrel kwesịrị iri na ihe ọ na-ekwesịghị iri. (Lev. 11:4-8; Dan. 1:8, 11-13) Daniel mụkwara akụkọ gbasara ndị Chineke, matakwa ihe mere ha mgbe ha kwụsịrị irubere Jehova isi. (Dan. 9:10, 11) Ihe niile mere ná ndụ Daniel mere ka obi sie ya ike na Jehova na ndị mmụọ ozi ya dị ike na-akwado ya.​—Dan. 2:19-24; 10:12, 18, 19. w23.08 3 ¶5-6

Satọdee, Eprel 5

Onye dị umeala n’obi ma ihe. ​—Ilu 11:2.

Ribeka bụ nwaanyị ma ihe ná ndụ ya niile. Ọ katara obi mee mkpebi. Ọ makwa oge o kwesịrị ime ihe na otú o kwesịrị isi mee ya. (Jen. 24:58; 27:5-17) N’agbanyeghị ya, o rubere isi ma dịrị njikere iso ntụziaka. (Jen. 24:17, 18, 65) Ọ bụrụ na ị dịrị umeala n’obi ma kwado ndokwa Jehova mere otú ahụ Ribeka mere, ọ ga-abara ezinụlọ gị na ọgbakọ uru. Àgwà dị ezigbo mkpa Ndị Kraịst tozuru etozu kwesịrị inwe bụ ịma ebe ike ha ruru. Esta bụ nwaanyị na-atụ egwu Jehova, marakwa ebe ike ya ruru. Àgwà a nyeere ya aka ka onwe ya ghara ibu ya isi mgbe ọ ghọrọ nwunye eze. O gere ntị na ndụmọdụ nwa nwanne nna ya bụ́ Mọdekaị nyere ya ma mee ihe ọ gwara ya. (Esta 2:10, 20, 22) I nwere ike ịkpa àgwà a ma ọ bụrụ na ị na-agwa ndị ọzọ ka ha nye gị ezigbo ndụmọdụ ma na-eme ihe ha gwara gị. (Taị. 2:3-5) E nwekwara ụzọ ọzọ Esta si gosi na ọ ma ebe ike ya ruru. Ọ “mara mma, bụrụkwa asampete.” N’agbanyeghị ya, ọ chọwaghị ka ndị ọzọ hụchatawa ya.​—Esta 2:7, 15. w23.12 19-20 ¶6-8

Sọnde, Eprel 6

Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.​—1 Jọn 3:20.

Inwe obi amamikpe mgbe niile bụ ibu Chineke na-achọghị ka anyị buru. Ọ bụrụ na anyị ekwupụtala mmehie anyị, chegharịa, na-emekwa ihe anyị kwesịrị ime ka anyị ghara ime ya ọzọ, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agbagharala anyị. (Ọrụ 3:19) Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a anyị kwesịrị ime, Jehova achọghị ka obi na-ama anyị ikpe mgbe niile. Ọ ma na ọ bụrụ na obi na-ama anyị ikpe mgbe niile, ọ ga-akpatara anyị nsogbu. (Ọma 31:10) Anyị nwee mwute gafee ókè, o nwere ike ime ka anyị daa mbà n’ọsọ ndụ anyị na-agba. (2 Kọr. 2:7) Ọ bụrụ na obi na-ama gị ikpe mgbe niile, na-echeta na Chineke ‘na-agbaghara anyị mmehie anyị n’eziokwu.’ (Ọma 130:4) Ọ bụrụ na ọ gbaghara ndị ji obi ha niile chegharịa, o kwere nkwa, sị: “Agaghịzi m echeta mmehie ha.” (Jere. 31:34) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova agaghị emecha tawa gị ahụhụ maka mmehie i mere n’oge gara aga. Ewesakwala onwe gị iwe n’ihi na ị naghịzi arụ ọrụ ụfọdụ ị na-arụbu n’ọgbakọ. Jehova anaghị eche banyere mmehie gị mgbe niile, gịnwa ekwesịghịkwa ime otú ahụ. w23.08 30 ¶14-15

Mọnde, Eprel 7

Guzosienụ ike, kwụrụnụ chịm. ​—1 Kọr. 15:58.

N’oge ọrịa koronavaịrọs, Ndịàmà Jehova ndị gere ntị ná ntụziaka si ná nzukọ Jehova anọghị na-echegbu onwe ha otú ahụ ndị gere ntị n’ihe ndị a na-abụghị eziokwu nọ na-echegbu onwe ha. (Mat. 24:45) Anyị ekwesịghị ikwe ka uche anyị pụọ ‘n’ihe ndị ka mkpa.’ (Fil. 1:9, 10) Ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya nwere ike iwekọrọ oge na ike anyị ga-eji eme ihe ndị bara uru. Ihe ndị a na-eme ná ndụ, dị ka iri ihe, ịṅụ ihe, ikpori ndụ, na ịrụ ọrụ nwere ike imegharị anyị anya ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka ha ghọọ ihe ndị kacha anyị mkpa. (Luk 21:34, 35) Ihe ọzọ bụ na, kwa ụbọchị, anyị na-anụ akụkọ gbasara ngagharị iwe na esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ha megharịa anyị anya. Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike bido na-akwado otu ndị n’obi anyị. Setan na-eji ihe dị iche iche agbalị ka anyị ghara ime ihe anyị kpebisiri ike ime, ya bụ, ime ihe ziri ezi. w23.07 16-17 ¶12-13

Tuzdee, Eprel 8

Na-emenụ nke a iji na-echeta m. ​—Luk 22:19.

Ndị Jehova weere ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs ka ụbọchị kacha mkpa n’afọ. Ọ bụ naanị ya bụ ihe Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-echeta. (Luk 22:19, 20) Ọ na-echetara anyị ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà ahụ Jizọs chụrụ. (2 Kọr. 5:14, 15) Ọ na-emekwa ka anyị nwee ohere anyị na ụmụnna anyị ga-eji ‘gbaa ibe anyị ume.’ (Rom 1:12) Ọtụtụ ndị nwere mmasị na-ebidokwa ịga ije n’ụzọ nke ndụ n’ihi ihe ha hụrụ na ihe ha nụrụ. Cheekwa otú Ncheta Ọnwụ Jizọs si eme ka anyị na ụmụnna anyị n’ụwa niile dịrị n’otu. Ka a sịkwa ihe mere anyị niile ji were Ncheta Ọnwụ Jizọs ka ihe pụrụ iche. w24.01 8 ¶1-3

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 9) Luk 19:29-44

Wenezdee, Eprel 9

Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.​—Jọn 3:16.

Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ụgwọ Jehova na Jizọs kwụrụ iji nye ihe mgbapụta ahụ, ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo otú ha hụruru onye ọ bụla n’ime anyị n’anya. (Gal. 2:20) Ihe mere Jehova ji nye ihe mgbapụta ahụ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Jehova egosikwala na ọ hụrụ anyị n’anya, jiri Jizọs bụ́ onye ọ kacha hụ n’anya chụọ àjà. Jehova kwere ka Ọkpara ya taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. Ọ bụghị naanị na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ na-agwakwa anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. (Jere. 31:3) Jehova dọtara anyị n’ebe ọ nọ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (I nwere ike ịtụle Diuterọnọmi 7:7, 8.) O nweghị onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ga-emeli ka Chineke ghara ịhụ anyị n’anya. (Rom 8:38, 39) Olee otú obi dị gị maka ịhụnanya Chineke? w24.01 28 ¶10-11

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 10) Luk 19:45-48; Matiu 21:18, 19; 21:12, 13

Tọzdee, Eprel 10

E nwere olileanya na a ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya. ​—Rom 8:20, 21.

Ndị Kraịst e tere mmanụ ji olileanya ha nwere ịga eluigwe kpọrọ ihe. Otu n’ime ha bụ Nwanna Frederick Franz. O si n’obi ya kwuo na olileanya ha bụ ihe e ji n’aka, nke ga-emezuchara onye ọ bụla so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ndị so n’ìgwè atụrụ nta ahụ, nakwa na ọ ga-emezu karịadị otú ha chetụrụla n’echiche. N’afọ 1991, ọ sịrị na ha ka ji olileanya ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu, na ka ha na-eche ya ka ha na-ejikwu ya akpọrọ ihe. O kwuru na ha dị njikere ichere ya, nakwa na ya ji olileanya ha kpọrọ ihe karịa otú o jibu ya kpọrọ. Ma ànyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị nwere olileanya magburu onwe ya nke mere anyị ji kwesị ịna-aṅụrị ọṅụ. Olileanya a nwere ike ịna-esikwu ike n’obi anyị. w23.12 9 ¶6; 10 ¶8

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 11) Luk 20:1-47

Fraịdee, Eprel 11

Ọbara oké ehi na ọbara ewu enweghị ike iwepụ mmehie.​—Hib. 10:4.

E nwere ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa mee n’èzí ụlọikwuu ahụ, n’ọnụ ụzọ e si abanye ya. Ọ bụ ebe a na-anọ eji anụmanụ achụrụ Jehova àjà. (Ọpụ. 27:1, 2; 40:29) Ma, àjà ndị ahụ emeghị ka a gbaghara ndị mmadụ mmehie ha kpamkpam. (Hib. 10:1-3) Àjà ndị e ji ụmụ anụmanụ chụọ n’ụlọikwuu ahụ na-egosi na e nwere otu àjà a ga-achụ ga-eme ka a gbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha kpamkpam. Jizọs ma na Jehova zitere ya n’ụwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà maka ụmụ mmadụ. (Mat. 20:28) N’ihi ya, n’oge a na-eme Jizọs baptizim, o wepụtara onwe ya ime uche Jehova. (Jọn 6:38; Gal. 1:4) Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà “naanị otu ugboro” ka o mee ka a gbaghara onye ọ bụla nwere okwukwe na ya mmehie ya kpamkpam.​—Hib. 10:5-7, 10. w23.10 26-27 ¶10-11

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 12) Luk 22:1-6; Mak 14:1, 2, 10, 11

ỤBỌCHỊ NCHETA ỌNWỤ JIZỌS
Mgbe Anyanwụ Dachara
Satọdee, Eprel 12

Onyinye Chineke si n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị na-enye bụ ndụ ebighị ebi.​—Rom 6:23.

O nweghị otú anyị gaara esi gbapụta onwe anyị ná mmehie na ọnwụ. (Ọma 49:7, 8) N’ihi ya, o furu Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ezigbo ihe ịhazi ka Jizọs bịa nwụọ maka anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharịkwu uche n’ihe o furu Jehova na Jizọs, anyị ga-aghọtakwu uru ihe mgbapụta ahụ bara. Mgbe Adam mehiere, olileanya ịdị ndụ ebighị ebi kwara ma yanwa ma ụmụ ndị ọ ga-amụta. Iji zụtaghachi ihe ahụ Adam tụfuru, Jizọs ji ndụ ya zuru okè chụọ àjà. N’oge niile Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, “o meghị mmehie ọ bụla, o kwughịkwa ihe ga-eduhie onye ọ bụla.” (1 Pita 2:22) Mgbe Jizọs nwụrụ, ọ bụ mmadụ zuru okè otú ahụ Adam zuru tupu ya emehie. Ndụ ya o ji chụọ àjà kwụrụ ụgwọ ndụ ahụ Adam tụfuru.​—1 Kọr. 15:45; 1 Tim. 2:6. w24.01 10 ¶5-6

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 13) Luk 22:7-13; Mak 14:12-16 (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 14) Luk 22:14-65

Sọnde, Eprel 13

O jighị ọbara ewu na nke oké ehi banye, kama o ji ọbara nke ya banye n’ebe nsọ ahụ. Ọ banyere naanị otu ugboro ma napụta anyị. Nnapụta a na-adịru ebighị ebi.​—Hib. 9:12.

Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ banyere n’Ebe Kacha Nsọ nke ụlọ nsọ ihe atụ ahụ. Anyị ahụla na ndokwa Chineke mere ka a na-efe ya ezigbo ofufe n’ihi àjà Jizọs Kraịst chụrụ nakwa onye nchụàjà ọ bụ ka otú ndị Izrel si fee Chineke mma. Nnukwu onye nchụàjà n’oge ụmụ Izrel na-eji ọbara ụmụ anụmanụ abanye n’Ebe Kacha Nsọ e ji aka rụọ. Ma, Jizọs banyere “n’eluigwe” n’ihu Jehova, ebe kacha ebe niile nsọ. N’ebe ahụ, o gosiri Chineke uru àjà ahụ o ji ndụ ya zuru okè chụọ maka anyị bara ka o nwee ike “si n’àjà o ji onwe ya chụọ wepụ mmehie.” (Hib. 9:24-26) Ma ànyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị niile nwere ike ịna-efe Jehova n’ụlọ nsọ ihe atụ ya. w23.10 28 ¶13-14

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 14) Luk 22:66-71

Mọnde, Eprel 14

N’ihi ya, ka anyị bịa nso n’ocheeze Chineke onye na-eme amara ma jiri obi ike na-ekpe ekpere.​—Hib. 4:16.

Chee gbasara ihe Jizọs nọ n’eluigwe na-emere anyị ugbu a ọ bụ Eze anyị na Nnukwu Onye Nchụàjà nke na-enwere anyị ọmịiko. Anyị kpewe ekpere, anyị na-esi n’aka ya abịa nso “n’ocheeze Chineke onye na-eme amara,” na-arịọkwa ya ka o meere anyị ebere ma nyere anyị aka “n’oge anyị chọrọ ka e nyere anyị aka.” (Hib. 4:14, 15) N’ụbọchị ọ bụla, ka anyị na-echebara ihe Jehova na Jizọs meere anyị echiche nakwa ihe ha na-emere anyị. Otú ha si hụ anyị n’anya kwesịrị imetụ anyị n’obi, meekwa ka anyị chọọ iji obi anyị niile na-efe Jehova. (2 Kọr. 5:14, 15) Otu n’ime ụzọ ndị kacha mma anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ bụ inyere ndị ọzọ aka ka ha ghọọ Ndịàmà Jehova, bụrụkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:19, 20) Ọ bụ ihe a ka Pọl onyeozi mere. Ọ ma na ọ bụ uche Jehova ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha marakwa eziokwu nke ọma.”​—1 Tim. 2:3, 4. w23.10 22-23 ¶13-14

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 15) Matiu 27:62-66

Tuzdee, Eprel 15

Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.​—Mkpu. 21:4.

Ọtụtụ n’ime anyị na-agụrụ ndị mmadụ amaokwu Baịbụl a na-agba ume n’ozi ọma iji gosi ha otú ibi na Paradaịs ga-adị. Olee otú anyị ga-esi eme ka obi sie ndị ọzọ ike, siekwa anyịnwa ike, na ihe ndị e dere ná Mkpughe 21:3, 4 ga-emezu? Ihe Jehova mere abụghị naanị ikwe anyị nkwa na-eme anyị obi ụtọ, kama ọ gwakwara anyị ihe ndị mere anyị ga-eji tụkwasị ya obi na ọ ga-emezu nkwa ya. Amaokwu nke 5 na nke 6 na-eme ka anyị tụkwasị Jehova obi na nkwa o kwere na ụwa ga-aghọ Paradaịs ga-emezu. Ebe ahụ sịrị: “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara: ‘Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’ Ọ sịkwara: ‘Dee ha edee, n’ihi na e kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.’ Ọ sịkwara m: ‘Ha emezuola. Abụ m Alfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ.’”​—Mkpu. 21:5, 6a. w23.11 3 ¶3-5

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 16) Luk 24:1-12

Wenezdee, Eprel 16

Na-adụkwa ụmụ okorobịa ọdụ ka ha na-ele ihe anya otú dị mma.​—Taị. 2:6.

Otú nwanna nwoke na-eto eto ga-esi egosi na ọ na-eche echiche nke ọma bụ ime mkpebi dị mma n’ihe gbasara ụdị uwe ọ ga na-eyi na ụdị isi ọ ga na-akpụ. Ọtụtụ mgbe, ndị na-akwa uwe na-ewu ewu na ndị na-akpọsa ya bụ ndị na-anaghị asọpụrụ Jehova. Ha nwekwara ike ịna-eme omume rụrụ arụ. N’ihi ya, uwe ha na-akwa na-atapara n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ na-eme ka ụmụ nwoke dịrịzie ka ụmụ nwaanyị. Nwanna nwoke na-eto eto, nke na-agbalị ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu, kpebiwe ihe ọ ga-eyi, o kwesịrị ime ka Jizọs ma chee gbasara ihe ga-amasị Jehova. Ọ ga na-ejikwa ejiji ka ndị na-eji ejiji nke ọma n’ọgbakọ. O nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Ụdị uwe m kpebiri iyi ọ̀ na-egosi na m na-eche echiche nke ọma ma na-echebara ndị ọzọ echiche? Uwe m na-eyi ọ̀ na-eme ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ikweta na m bụ onye na-efe Chineke?’ (1 Kọr. 10:31-33) Ọ bụrụ na onye na-eto eto ana-eche echiche nke ọma, ụmụnna ga na-akwanyere ya ùgwù, ihe ya ga-amasịkwa Nna ya nke eluigwe. w23.12 26 ¶7

Tọzdee, Eprel 17

Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na Alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ.​—Jọn 18:36.

N’oge gara aga, “eze ndịda” kpagburu ndị ohu Jehova. (Dan. 11:40) Dị ka ihe atụ, n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ na Agha Ụwa nke Abụọ, a tụrụ ọtụtụ ụmụnna anyị mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị aga agha, chụọkwa ụfọdụ ụmụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ha ekweghị ekele ọkọlọtọ. Ma, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nwekwara ọnwụnwa ndị si n’ụzọ ndị ọzọ na-abịara ụmụnna anyị bi n’ebe “eze ndịda” na-achị. Dị ka ihe atụ, n’oge a na-achụ nta vootụ, Onye Kraịst nwere ike ichewe na otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ otu onye na-azọ ọchịchị ka ndị nke ọzọ mma. O nwere ike ọ gaghị aga soro tụọ vootu. Mana, n’ime obi ya, o nwere onye nke ọ na-akwado. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụghị naanị n’ihe ndị anyị na-eme, kamakwa n’ihe anyị na-eche nakwa n’otú obi na-adị anyị.​—Jọn 15:18, 19. w23.08 12 ¶17

Fraịdee, Eprel 18

Ka e too Jehova, onye na-eburu anyị ibu anyị kwa ụbọchị.​—Ọma 68:19.

Ka anyị na-agba ọsọ ndụ, anyị kwesịrị ịna-agba ya ‘otú ga-eme ka anyị merie.’ (1 Kọr. 9:24) Jizọs kwuru na “iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ” nwere ike ‘ịnyịgbu obi anyị.’ (Luk 21:34) Amaokwu ndị a na amaokwu ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ịmata ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe ka i nwee ike ịgbara ọsọ ndụ a na-aga. Ka obi sie anyị ike na anyị ga-emeri n’ọsọ ndụ anyị na-agba n’ihi na Jehova ga-enye anyị ike anyị kwesịrị inwe. (Aịza. 40:29-31) N’ihi ya, adala mbà. Na-eme ka Pọl onyeozi. O ji ike ya niile gbaa ọsọ ya iji nweta ụgwọ ọrụ a ga-enye ya. (Fil. 3:13, 14) O nweghị onye ga-agbara gị ọsọ ndụ a. Ma, ọ bụrụ na Jehova enyere gị aka, ị ga-emerili na ya. Jehova ga-enyere gị aka ibu ibu ndị i kwesịrị ibu ma tụfuo ibu ndị na-adịghị mkpa. Ebe ọ bụ na ọ na-akwado gị, ị ga-enwe ike ịtachi obi, gbara ọsọ a ruo n’isi ma merie. w23.08 31 ¶16-17

Satọdee, Eprel 19

Sọpụrụ nne gị na nna gị. ​—Ọpụ. 20:12.

Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, nne na nna ya hapụrụ ya na Jeruselem. (Luk 2:46-52) O doro anya na ọ bụ ọrụ Josef na Meri ịhụ na ụmụ ha niile so ha laghachi mgbe e mechara ememme ahụ. Mgbe Josef na Meri mechara hụ Jizọs, Meri tara Jizọs ụta maka nsogbu ọ kpataara ha. Jizọs gaara ekwu na ihe a ha mere adịghị mma. Kama ime otú ahụ, ọ zaghachiri nne na nna ya otú gosiri na ọ na-asọpụrụ ha. Ma, Josef na Meri “aghọtaghị ihe ahụ ọ gwara ha.” N’agbanyeghị ya, Jizọs “nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.” Ndị na-eto eto, è nwere mgbe ọ na-esiri unu ike irubere nne na nna unu isi ma ha mejọọ ihe ma ọ bụkwanụ ma ha ghọtahie unu? Gịnị ga-enyere unu aka? Chee otú obi na-adị Jehova. Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na i rubere nne na nna gị isi, “ọ na-amasị Onyenwe anyị.” (Kọl. 3:20) Jehova ma mgbe ndị nne na nna unu na-aghọtachaghị unu ma ọ bụkwanụ mgbe ha mere iwu ga-esiri unu ike idebe. Ma, ọ bụrụ na unu erubere ha isi n’agbanyeghị ya, unu na-eme Jehova obi ụtọ. w23.10 7 ¶5-6

Sọnde, Eprel 20

Na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, jiri obi nwayọọ na-emeso mmadụ niile ihe mgbe niile.​—Taị. 3:2.

Nwa klas anyị nwere ike ikwu na Ndịàmà Jehova kwesịrị ịgbanwe ihe ha kweere gbasara mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya. Anyị nwere ike ime ka ọ ghọta na anyị kwetara na onye ọ bụla ga-eji aka ya ekpebi ihe ọ ga-eme. (1 Pita 2:17) Anyị nweziri ike gwa ya ihe Baịbụl kwuru nakwa otú ime ihe ahụ si eme ka anyị na-enwekwu obi ụtọ. Mmadụ rụwa anyị ụka, anyị ekwesịghị iche ozugbo na anyị ma ihe o kweere. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwa akwụkwọ ibe gị kwuru na mmadụ ikweta na Chineke dị bụ ịda iberiibe. Ì kwesịrị iche ozugbo na o kwetara na ihe niile nọkatara dịrị ma ọ bụ na ọ ma ọtụtụ ihe gbasara ya? Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu ihe ọ nụrụ ndị ọzọ kwuru. I nwere ike ịsị ya gaa na jw.org ka ọ hụ ihe ndị kwuru gbasara isiokwu ahụ. O nwere ike ka oge na-aga, ya adị njikere ka gị na ya kwurịta otu isiokwu ma ọ bụ vidio ọ hụrụ ebe ahụ. Ịkwanyere ya ùgwù mgbe ị na-aza ya nwere ike ime ka ọ chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl na-akụzi. w23.09 17 ¶12-13

Mọnde, Eprel 21

Gịnwa bụ́ Jehova dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie. Ịhụnanya ị na-egosi ndị niile na-akpọku gị dị ukwuu.​—Ọma 86:5.

Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-eji anyị na-arụ ọrụ, gọziekwa anyị, ọ bụrụgodị na anyị mejọrọ ihe n’oge gara aga, ma ọ bụrụhaala na anyị na-agbasi mbọ ike ịgbanwe, na-atụkwasịkwa ya obi. (Ilu 28:13) Samsịn ezughị okè, ma ọ kwụsịghị ịgba mbọ ife Jehova ma mgbe ọ gwachara Delaịla ihe ọ na-ekwesịghị ịgwa ya. Jehova akwụsịghịkwa iji ya arụ ọrụ. Chineke mechakwara jiri Samsịn rụọ nnukwu ihe. Jehova ka na-ele ya anya ka onye nwere ezigbo okwukwe. O mere ka e tinye aha ya ná ndị nwere okwukwe n’akwụkwọ Ndị Hibru isi 11. Ọ na-eme anyị ezigbo obi ụtọ ịmata na anyị na-efe Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya, onye ọ na-agụsikwa agụụ ike ime ka anyị dị ike, karịchaa, n’oge anyị na-adịghị ike. N’ihi ya, ka anyị rịọ Jehova ihe ahụ Samsịn rịọrọ ya. Ọ sịrị: “Cheta m, biko, Chineke, nye m ike.”​—Ikpe 16:28. w23.09 7 ¶18-19

Tuzdee, Eprel 22

Na-echere ụbọchị Jehova, burukwa ya n’uche.​—2 Pita 3:12.

Ebe ọ bụ na anyị ma na ụbọchị Jehova ga-abịa n’oge na-adịghị anya, anyị chọrọ ime ike anyị niile ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ma o nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. N’ihi gịnị? Ọ bụ maka na ụjọ mmadụ nwere ike ịtụtụ anyị. Ụdị ihe ahụ mere Pita. N’abalị e kpere Jizọs ikpe, ụjọ ekweghị Pita kwuo na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ọ gọnahụkwara Jizọs ugboro ugboro. (Mat. 26:69-75) Ma onyeozi ahụ mechara jiri obi ike kwuo, sị: “Ka ihe na-atụ ndị ọzọ egwu ghara ịtụ unu egwu, obi amapụkwala unu.” (1 Pita 3:14) Ihe a Pita kwuru na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-akwụsịli ịtụ ụjọ mmadụ. Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ mmadụ? Pita gwara anyị, sị: “Jirinụ obi unu kweta na Kraịst bụ Onyenwe anyị nakwa na ọ dị nsọ.” (1 Pita 3:15) Anyị nwere ike ichetara onwe anyị na Jizọs Kraịst bụ Eze anyị nakwa na o nwere ike dị egwu. w23.09 27-28 ¶6-8

Wenezdee, Eprel 23

Unu ekwesịghịdị ịna-ekwurịta gbasara ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha niile.​—Efe. 5:3.

Anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ime “ihe ndị na-enweghị isi . . . , nke e ji mara ndị nọ n’ọchịchịrị.” (Efe. 5:11) Ihe ndị mere eme egosila na ọ bụrụ na mmadụ ana-ele, na-ege, ma ọ bụ na-ekwu ihe ndị rụrụ arụ, ọ ga-eme ka ọ dịrị onye ahụ mfe ime omume rụrụ arụ. (Jen. 3:6; Jems 1:14, 15) Ụwa Setan na-agbalị iduhie anyị. Ọ na-achọ ime ka anyị kweta na o nweghị ihe dị njọ n’ihe Jehova sịrị na ọ rụrụ arụ ma ọ bụ na ọ dịghị ọcha. (2 Pita 2:19) Ihe Setan na-eme kemgbe ụwa bụ imegharị ndị mmadụ anya ka ha ghara ịma ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. (Aịza. 5:20; 2 Kọr. 4:4) Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya na ọtụtụ fim, ihe omume tiivi, nakwa Ịntanet na-akwado ihe ndị Jehova kwuru na ha adịghị mma. Setan na-agbalị ịghọgbu anyị ka anyị chewe na ihe ndị Jehova sịrị na ha rụrụ arụ enweghị ihe ha ga-eme anyị.​—Efe. 5:6. w24.03 22 ¶8-10

Tọzdee, Eprel 24

Ozi dị nsọ ha na-eje bụ ihe atụ, ọ nọchikwara anya ihe ndị dị n’eluigwe.​—Hib. 8:5.

Ndị Izrel na-ebu ụlọikwuu ahụ Mosis rụrụ ma ha si otu ebe na-aga ebe ọzọ. Ha nọ na ya fee Chineke ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ ise (500) mgbe a rụrụ ụlọ nsọ na Jeruselem. (Ọpụ. 25:8, 9; Ọnụ Ọgụ. 9:22) Ụlọikwuu bụ ebe ndị Izrel na-achụrụ Chineke àjà, feekwa ya. (Ọpụ. 29:43-46) Ma, e nwere ihe ka mma ụlọikwuu ahụ nọchiri anya ya. Ọ ‘nọchiri anya ihe ndị dị n’eluigwe.’ Ọ nọchiri anya nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ Jehova. Pọl onyeozi kwuru na “ụlọikwuu a bụ ihe atụ maka oge a.” (Hib. 9:9) N’ihi ya, n’oge o degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi ahụ, ụlọ nsọ ihe atụ ahụ adịla adị. Mgbe ọ malịtere ịdị bụ n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst. Ọ bụ n’afọ ahụ ka e mere Jizọs baptizim, ya amalitekwa ịbụ “nnukwu onye nchụàjà kachanụ” n’ụlọ nsọ ihe atụ Jehova.​—Hib. 4:14; Ọrụ 10:37, 38. w23.10 25-26 ¶6-7

Fraịdee, Eprel 25

Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.​—Fil. 4:5.

Anyị chọọ ịna-eme nke ọma n’ofufe Chineke, anyị agaghị esiwe ọnwụ ka ihe gaa otú anyị chọrọ mgbe niile. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma nabata ihe ndị gbanwere ná ndụ anyị, gharakwa ịmanye ndị ọzọ ka ha gbanwee otú ha si ele ihe anya nakwa ihe ndị ha kpebiri ime. Ebe anyị na-efe Jehova, anyị kwesịrị ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Anyị kwesịkwara ịdị umeala n’obi ma na-enwere ndị mmadụ obi ebere. Baịbụl kpọrọ Jehova “Oké Nkume” n’ihi na o guzosiri ike, kwụrụkwa chịm. (Diut. 32:4) Ma, ọ na-elekwa ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ka ihe na-agbanwe n’ụwa a, Jehova na-agbanwekwa ihe ndị ọ na-eme iji jide n’aka na ihe niile o kwere ná nkwa mezuru. Jehova kere ụmụ mmadụ n’oyiyi ya. N’ihi ya, anyị ga-enwe ike ịgbanwe ma ọ bụrụ na ihe agbanwee. O si na Baịbụl kwuo ihe ndị doro anya ga-enyere anyị aka ime ezigbo mkpebi n’agbanyeghị nsogbu bịaara anyị. Ihe Jehova na-eme nakwa ihe ndị dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl na-egosi n’eziokwu na n’agbanyeghị na ọ bụ “Oké Nkume,” ọ na-elekwa ihe anya otú kwesịrị ekwesị. w23.07 20 ¶1-3

Satọdee, Eprel 26

Mgbe m nọ na-echegbu onwe m, ị kasiri m obi ma mee ka ahụ́ ruo m ala.​—Ọma 94:19.

Na Baịbụl, Jehova ji onwe ya tụnyere nne hụrụ nwa ya n’anya. (Aịza. 66:12, 13) Chegodị gbasara otú nne na-esi ahụ nwa ya dị obere n’anya ma na-elekọta ya. Ọ na-agba mbọ ịhụ na o meere ya ihe o kwesịrị imere ya. Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya. Ọ naghị akwụsị ịhụ anyị n’anya ma anyị mee ihe ọjọọ. (Ọma 103:8) Ụmụ Izrel mejọrọ Jehova ọtụtụ ugboro. Ma, ọ bụrụ na ha echegharịa, ọ na-agwa ha na ọ hụrụ ha n’anya. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ha, sị: “Ejighị m unu egwu egwu. Agụrụ m unu ná ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù. M hụkwara unu n’anya.” (Aịza. 43:4, 5) Ịhụnanya Chineke agbanwebeghị. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-ahụ anyị n’anya mgbe niile. Ọ bụrụgodị na ihe anyị mere dị ezigbo njọ, anyị chegharịa ma lọghachikwute ya, ọ ka ga-ahụkwa anyị n’anya. O kwere anyị nkwa na “ọ ga-agbaghara . . . kpamkpam.” (Aịza. 55:7) Baịbụl kọwara na Jehova gbaghara anyị, ‘ọ ga-eme ka obi ruo anyị ala.’​—Ọrụ 3:19. w24.01 27 ¶4-5

Sọnde, Eprel 27

Jehova bụ́ Chineke m nọnyeere m.​—Ezra 7:28.

Jehova nwere ike inyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị. Dị ka ihe atụ, anyị gwawa onye anyị na-arụrụ ọrụ na anyị chọrọ ka ọ hapụ anyị ka anyị gaa mgbakọ, ma ọ bụ ka a gbanwetụ oge anyị ji arụ ọrụ ka anyị nwee ike ịna-aga ọmụmụ ihe niile, anyị nwere ike ịhụ otú Jehova ga-esi nyere anyị aka. Ihe a ga-aza anyị nwere ike ịdị mma karịa ihe anyị tụrụ anya ya. O nwere ike ime ka anyị tụkwasịkwuo Jehova obi. Ezra weturu onwe ya ala kpee ekpere ka Jehova nyere ya aka. Mgbe ọ bụla Ezra nọ na-echegbu onwe ya maka ọrụ ndị ọ ga-arụ, ọ na-ewetu onwe ya ala ma kpee ekpere. (Ezra 8:21-23; 9:3-5) Ebe ọ bụ na Ezra tụkwasịrị Jehova obi, ndị ọzọ kwadoro ya, nweekwa okwukwe ka ya. (Ezra 10:1-4) Mgbe ọ bụla anyị chegbuwere onwe anyị gbasara ego ma ọ bụ ezinụlọ anyị, anyị kwesịrị ikpe ekpere, obi esie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. w23.11 18 ¶15-17

Mọnde, Eprel 28

[Ebreham] wee nwee okwukwe na Jehova, ya ejiri maka ya kpọọ ya onye ezi omume.​—Jen. 15:6.

Jehova ekwughị na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a kpọọ anyị ndị ezi omume, na anyị ga-eme ihe ndị ahụ Ebreham mere. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi si n’omume anyị gosi na anyị nwere okwukwe. Anyị nwere ike ịnabata ndị ọhụrụ n’ọgbakọ anyị, nyere ụmụnna nọ ná mkpa aka, meekwara ndị ezinụlọ anyị ihe ọma. Ihe ndị a niile na-adị Jehova mma, na-emekwa ka ọ gọzie anyị. (Rom 15:7; 1 Tim. 5:4, 8; 1 Jọn 3:18) Ọrụ kacha mkpa na-egosi na anyị nwere okwukwe bụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. (1 Tim. 4:16) Anyị niile nwere ike isi n’omume anyị gosi na anyị nwere okwukwe na nkwa Chineke ga-emezu nakwa na ụzọ ya kacha mma. Anyị mee otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-akpọ anyị ndị ezi omume na ndị enyi ya. w23.12 2 ¶3; 6 ¶15

Tuzdee, Eprel 29

Dị ike, gosikwa na ị bụ dimkpa. ​—1 Eze 2:2.

Obere oge tupu Eze Devid anwụọ, ọ gwara Solomọn ihe e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. (1 Eze 2:1, 3) Ndị Kraịst niile bụ́ ụmụ nwoke taa kwesịrị ime ihe ahụ Devid gwara Solomọn. Ihe ga-enyere ha aka ime ya bụ ịmụta ịna-erubere iwu Chineke isi na ịna-eme ihe Baịbụl kwuru n’ihe niile ha na-eme. (Luk 2:52) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka ụmụnna nwoke na-eto eto bụrụ Ndị Kraịst tozuru etozu? Onye Kraịst bụ́ nwoke na-arụ ọtụtụ ọrụ dị mkpa n’ezinụlọ nakwa n’ọgbakọ. Ụmụnna nwoke na-eto eto, o doro anya na unu echeela banyere ọrụ ndị unu nwere ike ịrụ n’ọdịnihu. I nwere ike ibu n’obi ịbanye n’ozi oge niile, ịbụ ohu na-eje ozi, nakwa okenye ọgbakọ ma e mechaa. I nwekwara ike ịchọ ịlụ nwaanyị, mụta ụmụ. (Efe. 6:4; 1 Tim. 3:1) Ihe ga-enyere gị aka ime ihe ndị a nke ọma bụ ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu. w23.12 24 ¶1-2

Wenezdee, Eprel 30

Oge ga-agwụnahụ m ma m kọwa banyere Gidiọn.​—Hib. 11:32.

Jehova nyere ndị okenye ọgbakọ ọrụ ilekọta atụrụ ya ọ na-anaghị eji egwu egwu. Obi dị ndị okenye ụtọ na Jehova tụkwasịrị ha obi, nye ha ọrụ ijere ụmụnna ha ozi. Ha na-arụsikwa ọrụ ike ịbụ “ndị ọzụzụ atụrụ . . . na-azụ ha nke ọma.” (Jere. 23:4; 1 Pita 5:2) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nwere ụdị ụmụ nwoke ndị a n’ọgbakọ anyị dị iche iche. Ndị okenye nwere ike ịmụta ihe n’aka onyeikpe bụ́ Gidiọn. (Hib. 6:12) Gidiọn chebere ndị Chineke ma zụọ ha ka atụrụ. (Ikpe 2:16; 1 Ihe 17:6) Dịkwa ka Gidiọn, a họpụtara ndị okenye ka ha na-elekọta ndị Chineke n’oge ihe siri ezigbo ike. (Ọrụ 20:28; 2 Tim. 3:1) Anyị nwere ike ịmụta ihe n’otú Gidiọn si dịrị umeala n’obi, mara ebe ike ya ruru ma na-erube isi. N’oge ọ na-arụ ọrụ ya, e nwere nsogbu ndị bịaara ya mere o ji dị mkpa ka ọ na-enwe ndidi. Ma ànyị bụ ndị okenye ma anyị abụghị, anyị nwere ike ịmụta ijikwu ndị okenye anyị akpọrọ ihe. Anyị nwere ike ịna-akwado ụmụnna ndị a na-arụsi ọrụ ike.​—Hib. 13:17. w23.06 2 ¶1, 3

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya