Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es25 p. 77-87
  • Ọgọst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgọst
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
  • Isiokwu Nta
  • Fraịdee, Ọgọst 1
  • Satọdee, Ọgọst 2
  • Sọnde, Ọgọst 3
  • Mọnde, Ọgọst 4
  • Tuzdee, Ọgọst 5
  • Wenezdee, Ọgọst 6
  • Tọzdee, Ọgọst 7
  • Fraịdee, Ọgọst 8
  • Satọdee, Ọgọst 9
  • Sọnde, Ọgọst 10
  • Mọnde, Ọgọst 11
  • Tuzdee, Ọgọst 12
  • Wenezdee, Ọgọst 13
  • Tọzdee, Ọgọst 14
  • Fraịdee, Ọgọst 15
  • Satọdee, Ọgọst 16
  • Sọnde, Ọgọst 17
  • Mọnde, Ọgọst 18
  • Tuzdee, Ọgọst 19
  • Wenezdee, Ọgọst 20
  • Tọzdee, Ọgọst 21
  • Fraịdee, Ọgọst 22
  • Satọdee, Ọgọst 23
  • Sọnde, Ọgọst 24
  • Mọnde, Ọgọst 25
  • Tuzdee, Ọgọst 26
  • Wenezdee, Ọgọst 27
  • Tọzdee, Ọgọst 28
  • Fraịdee, Ọgọst 29
  • Satọdee, Ọgọst 30
  • Sọnde, Ọgọst 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
es25 p. 77-87

Ọgọst

Fraịdee, Ọgọst 1

Ọtụtụ nsogbu na-abịara onye ezi omume, ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.​—Ọma 34:19.

Cheta ihe abụọ dị mkpa e kwuru n’amaokwu Baịbụl a: (1) Nsogbu na-abịara ndị ezi omume. (2) Jehova na-anapụta anyị ná nsogbu ndị na-abịara anyị. Olee otú Jehova si anapụta anyị? Otu ụzọ o si enyere anyị aka bụ ime ka anyị na-ele ndụ anyị dị n’ụwa ochie a anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụ eziokwu na Jehova kwere nkwa na anyị ga-eji ọṅụ na-ejere ya ozi, o kweghị anyị nkwa na anyị agaghị enwe nsogbu ọ bụla ugbu a. (Aịza. 66:14) Ọ na-agwa anyị ka anyị lekwasị anya n’ọdịnihu mgbe anyị ga-enweta ụdị ndụ ọ chọrọ ka anyị nweta ruo mgbe ebighị ebi. (2 Kọr. 4:16-18) Ma, ka ọ dị ugbu a, ọ na-enyere anyị aka ịna-efe ya kwa ụbọchị. (Ákwá 3:22-24) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ụfọdụ ndị ji obi ha niile fee Jehova ma n’oge a na-ede Baịbụl ma n’oge anyị a? Nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ịbịara anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, o nweghị mgbe ọ na-agaghị akwado anyị.​—Ọma 55:22. w23.04 14-15 ¶3-4

Satọdee, Ọgọst 2

Na-erubere ndị ọchịchị isi.​—Rom 13:1.

Anyị ga-amụta ihe n’aka Josef na Meri. Ha rubeere ndị ọchịchị isi, ma mgbe o siiri ha ike. (Luk 2:1-6) Mgbe ọ fọrọ obere ka Meri mụọ nwa, ndị ọchịchị gwara ya na Josef ka ha mee ihe siri ike. Eze Ukwu Ọgọstọs nyere iwu na ndị niile nọ n’ebe ndị Rom na-achị ga-aga n’obodo ha ka e deba aha ha n’akwụkwọ. Josef na Meri gara Betlehem, bụ́ ebe dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise (150). Ebe ahụ bụkwa ugwu ugwu. Njem ahụ agaghị adịrị ha mfe. Ọ ga-akacha esiri Meri ike. O nwere ike ịbụ na Meri na Josef nọ na-echegbu onwe ha gbasara ihe njem ahụ nwere ike ime Meri na nwa o bu n’afọ. Gịnị ka ha ga-eme ma ime mewe Meri n’ụzọ? Onye o bu n’afọ bụ onye ga-emecha bụrụ Mezaya. Ihe ndị a hà kwesịrị ime ka ha ghara irubere ndị ọchịchị isi? Josef na Meri ekweghị ka nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ mee ka ha ghara irubere ndị ọchịchị isi. Jehova gọziri ha maka na ha rubere isi. Meri rutere na Betlehem n’udo, mụọ nwa nwoke gbasiri ike. Ihe a o mere nyekwara aka mezuo otu amụma dị na Baịbụl.​—Maị. 5:2. w23.10 8 ¶9; 9 ¶11-12

Sọnde, Ọgọst 3

Ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume.​—Hib. 10:25.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe? Ịkwadebe nke ọma nwere ike inyere gị aka. (Ilu 21:5) Ọ bụrụ na ihe a na-amụ edoo gị anya, ọ ga-eme ka ọ dịrị gị mfe iweli aka ịza ajụjụ. Ihe ọzọ bụ ịza ajụjụ dị nkenke. (Ilu 15:23; 17:27) Ọ bụrụ na ihe ị chọrọ ịza dị nkenke, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị. Ọ bụrụ na i si n’obi gị zaa ajụjụ dị nkenke, ọ ga-egosi na ị kwadoro nke ọma nakwa na ị ghọtara ihe a na-amụ. Ọ bụrụkwanụ na i meela ụfọdụ n’ime ihe ndị a e kwuru, mana ụjọ ka na-atụ gị ịza ajụjụ karịa otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ? Ka obi sie gị ike na obi ga-atọ Jehova ụtọ maka otú i si agba mbọ ịza ajụjụ otú i nwere ike. (Luk 21:1-4) Ime ike gị niile apụtaghị na ị ga-eme karịa ihe i nwere ike ime. (Fil. 4:5) Chọpụta ihe ị ga-emeli. Gbaa mbọ mee ya. Kpeekwa ekpere ka Jehova mee ka ụjọ kwụsị ịtụ gị. Na mbụ, ihe i nwere ike ịgba mbọ mee bụ ịza otu ajụjụ dị nkenke n’ọmụmụ ihe. w23.04 21 ¶6-8

Mọnde, Ọgọst 4

Yiri ihe e ji echebe obi . . . , kpurukwa okpu agha.​—1 Tesa. 5:8.

Pọl onyeozi ji anyị tụnyere ndị agha mụ anya ma jikere maka agha. Ezigbo onye agha kwesịrị ịdị njikere maka agha mgbe niile. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Otú anyị ga-esi gosi na anyị dị njikere maka ụbọchị Jehova bụ iyiri ihe mgbochi obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa okpu agha bụ́ olileanya. Ihe mgbochi obi na-echebe obi onye agha. Ịhụnanya na okwukwe na-echebekwa obi anyị. Ha ga-enyere anyị aka ịna-efe Jehova na ịna-eso Jizọs. Okwukwe anyị nwere ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-achọ ya. (Hib. 11:6) Ọ ga-emekwa ka anyị na-eso Onye Ndú anyị, bụ́ Jizọs, ọ bụrụgodị na ihe esiere anyị ike. Ihe ga-enyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sie ike, anyị ediekwa nsogbu ndị na-abịara anyị bụ ịmụta ihe n’aka ụmụnna anyị n’oge a, ndị na-erubere Chineke isi n’agbanyeghị mkpagbu ma ọ bụ ụkọ ego. Anyị ga-agbara ịhụ akụnụba n’anya ọsọ ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ụmụnna anyị ndị kwụsịrị ibi ndụ okomoko ka ha nwee ike iji ndụ ha na-achụ Alaeze Chineke. w23.06 10 ¶8-9

Tuzdee, Ọgọst 5

Onye na-elekwa ígwé ojii anya agaghị ewe ihe ubi.​—Ekli. 11:4.

Onye na-ejide onwe ya anaghị eme ihe ọjọọ na-agụ ya agụụ. Anyị kwesịkwara ịna-ejide onwe anyị ka anyị nwee ike ime ihe anyị kpebiri ime, karịchaa ma ọ bụrụ na ime ihe ahụ siiri anyị ike ma ọ bụ na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ya. Cheta na mmadụ ijide onwe ya so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. N’ihi ya, rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya ka o nyere gị aka ịna-akpa àgwà a dị ezigbo mkpa. (Luk 11:13; Gal. 5:22, 23) Echela ka ihe niile dị otú ha kwesịrị ịdị. N’ụwa ochie a, e nwere ike o nweghị mgbe ihe niile ga-adị otú ha kwesịrị ịdị. Ọ bụrụ na anyị echewe ka ihe dịrị otú o kwesịrị, e nwere ike anyị agaghị eme ihe anyị kpebiri ime. Ihe ga-eme ka ihe anyị kpebiri ime ghara ịna-agụ anyị agụụ nwere ike ịbụ na o yiri ihe siiri anyị ike omume. Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, gbalịa kebie ya obere obere. Ọ bụrụ na e nwere àgwà ị chọrọ ịmụta ịna-akpa, gbalịa bido ịkpa ya obere obere. Ọ bụrụ na ihe i kpebiri ime bụ ịgụcha Baịbụl, hazie ka ị malite iji obere oge na-agụ ya. w23.05 29-30 ¶11-13

Wenezdee, Ọgọst 6

Ma ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè na-enwu mgbe chi bọrọ, nke na-enwusikwu ike ruo mgbe chi bọchara.​—Ilu 4:18.

N’oge ikpeazụ a niile, Jehova ji nzukọ ya na-eme ka anyị nweta ntụziaka si n’Okwu ya nke ga-enyere anyị niile aka ịna-aga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ.’ (Aịza. 35:8; 48:17; 60:17) Anyị nwere ike ikwu na mgbe ọ bụla mmadụ kwetara ka a mụwara ya Baịbụl, onye ahụ enwetala ohere ịmalite gawa ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ.’ Ụfọdụ nwere ike ịgatụ ije n’ụzọ ahụ, mechaakwa hapụ ya. E nwekwara ndị nke kpebisiri ike ịna-aga ije n’ụzọ ahụ ruo mgbe ha ruru ebe ha na-aga. Olee ebe ha na-aga? “Ụzọ Dị Nsọ” ga-eduga ndị nwere olileanya ịga eluigwe na “paradaịs Chineke” dị n’eluigwe. (Mkpu. 2:7) “Ụzọ Dị Nsọ” ga-eduga ndị nwere olileanya ibi n’ụwa n’oge ha ga-ezu okè ná ngwụcha otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị. Ọ bụrụ na ị nọ n’ụzọ ahụ taa, elekwala anya n’azụ. Ahapụkwala ya ruo mgbe ị garuru ebe ị na-aga, ma ọ bụ n’eluigwe ọhụrụ ma ọ bụ n’ụwa ọhụrụ. w23.05 17 ¶15; 19 ¶16-18

Tọzdee, Ọgọst 7

Anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.​—1 Jọn 4:19.

Ị gaghịzi egbu oge inyefe Jehova onwe gị ma ọ bụrụ na ị na-eche banyere ihe ọma niile o meere gị. (Ọma 116:12-14) Ọ dabara adaba na Baịbụl kpọrọ Jehova onye na-enye anyị “onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.” (Jems 1:17) Nke kacha n’ime onyinye ndị ahụ bụ Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst nwụrụ n’ihi anyị. Chegodị echiche. Ihe mgbapụta ahụ emeela ka gị na Jehova dị n’ezigbo mma. Jehova emeekwala ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (1 Jọn 4:9, 10) Inyefe Jehova onwe gị so n’ụzọ ị ga-esi gosi ya na obi dị gị ụtọ maka ịhụnanya kachanụ o gosiri anyị nakwa maka ihe ndị ọzọ o ji gọzie gị.​—Diut. 16:17; 2 Kọr. 5:15. w24.03 5 ¶8

Fraịdee, Ọgọst 8

Onye na-akwụwa aka ọtọ na-atụ egwu Jehova.​—Ilu 14:2.

Anyị hụ otú omume ndị mmadụ si retọọ taa, ọ na-adị anyị otú ọ dị Lọt. “Obi nọ na-agbawa [ya] maka ihe ọjọọ ndị na-enweghị ihe ha ji iwu kpọrọ na-eme n’asọghị anya” maka na ọ ma na Nna anyị nke eluigwe kpọrọ omume ọjọọ asị. (2 Pita 2:7, 8) Otú Lọt si na-atụ egwu Chineke ma hụ ya n’anya mere ka ọ jụ omume ọjọọ ndị gbara ya gburugburu na-eme. Ndị gbara anyị gburugburu n’ụwa taa enweghị ihe ha ji iwu Jehova kpọrọ. Ma ihe ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ọma bụ ịhụ Jehova n’anya na ịna-atụ egwu ya. Ọ bụ ya mere Jehova ji si n’akwụkwọ Ilu na-agba anyị ume ma na-enye anyị ndụmọdụ. Ndị Kraịst niile, ma nwoke ma nwaanyị, ma nwata ma okenye, nwere ike irite uru n’ezigbo ndụmọdụ dị n’akwụkwọ Ilu. Ọ bụrụ na anyị na-atụ egwu Jehova, anyị ga-akpachara anya ka anyị ghara imeta ndị na-eme ihe ọjọọ enyi. w23.06 20 ¶1-2; 21 ¶5

Satọdee, Ọgọst 9

Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya ma buru osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị na-eso m.​—Luk 9:23.

O nwere ike ịbụ na ndị ezinụlọ gị emegidela gị ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị hapụla ịchụ akụnụba ka i nwee ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:33) Ọ bụrụ otú ahụ, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova na-ahụ ihe niile ị na-emere ya. (Hib. 6:10) O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ihe Jizọs kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “E nweghị onye hapụrụ ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị nwoke ma ọ bụ ụmụnne ndị nwaanyị ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ubi n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma, nke na-agaghị enweta okpukpu otu narị (100) ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwaanyị, nne, ụmụ, ubi, nakwa mkpagbu n’oge a, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.” (Mak 10:29, 30) Ngọzi ndị i nwetarala karịrị ihe ndị ị hapụrụ.​—Ọma 37:4. w24.03 9 ¶5

Sọnde, Ọgọst 10

Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.​—Ilu 17:17.

Mgbe oké ụnwụ kpara ụmụnna nọ na Judia aka, ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị n’Antiọk “kpebiri izigara ụmụnna ha bi na Judia ihe enyemaka otú aka onye nke ọ bụla n’ime ha hà.” (Ọrụ 11:27-30) Ọ bụ eziokwu na ụmụnna ndị ụnwụ ahụ kpara aka bi ebe dị anya, ụmụnna ndị nọ n’Antiọk kpebisiri ike inyere ha aka. (1 Jọn 3:17, 18) Anyị nwekwara ike inwere ụmụnna anyị obi ebere taa ma anyị hụ na ọdachi dakwasịrị ha. Anyị na-ewepụta onwe anyị inyere ha aka ngwa ngwa. Anyị nwere ike ịjụ ndị okenye ma ànyị nwere ike iso gaa rụzie ihe ndị mebiri emebi. Anyị nwere ike inye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, na-etinyekwa ndị ọdachi dakwasịrị n’ekpere. O nwekwara ike ịdị mkpa ka e nyere ụmụnna anyị aka inweta ihe ndị dị ha mkpa. Mgbe Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst ga-abịa ikpe ndị ọjọọ ikpe, anyị chọrọ ka ọ hụ na anyị na-enwere ụmụnna anyị obi ebere, nakwa ka ọ kpọọ anyị ka anyị ‘keta Ala-eze.’​—Mat. 25:34-40. w23.07 4 ¶9-10; 6 ¶12

Mọnde, Ọgọst 11

Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.​—Fil. 4:5.

Jizọs na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ka Jehova. Ndị e zitere ya ka ọ bịa kwusaara ozi ọma n’ụwa bụ “atụrụ furu efu, bụ́ mba Izrel.” Ma, o gosiri na ọ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị mgbe ọ na-arụ ọrụ ahụ. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị na-abụghị onye Izrel rịọrọ ya ka ọ gwọọ nwa ya nwaanyị ‘mmụọ ọjọọ ji aka ọjọọ.’ Jizọs meteere nwaanyị ahụ ebere ma gwọọ nwa ya otú ahụ ọ rịọrọ ya. (Mat. 15:21-28) Leekwa ihe atụ ọzọ. Mgbe Jizọs na-eje ozi ya, o bula ụzọ sị: “Onye ọ bụla nke na-agọnahụ m . . . , m ga-agọnahụkwa ya.” (Mat. 10:33) Ma, ọ̀ gọnahụrụ Pita, bụ́ onye gọnahụrụ ya ugboro atọ? Mba. Jizọs ma na ihe Pita mere wutere ya nakwa na o nwere okwukwe. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu Pita. O nwere ike ịbụ ka o mee ka obi sie ya ike na ọ gbagharala ya nakwa na ọ hụrụ ya n’anya. (Luk 24:33, 34) Jehova Chineke na Jizọs Kraịst na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Anyịnwa kwanụ? Jehova chọrọ ka anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. w23.07 21 ¶6-7

Tuzdee, Ọgọst 12

Ọnwụ agaghịzi adị.​—Mkpu. 21:4.

Olee ihe anyị nwere ike ịgwa ndị ọzọ iji mee ka obi sie ha ike na ihe a ga-emerịrị? Nke mbụ, ọ bụ Jehova n’onwe ya kwere nkwa ahụ. Akwụkwọ Mkpughe sịrị: “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara: ‘Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’” Jehova ma otú ọ ga-esi mezuo nkwa ya. O nwere ikike ime ya, chọọkwa ime ya. Nke abụọ, Jehova ma na ihe ọ bụla o kwuru ga-emerịrị. Ọ bụ ya mere o ji sị: “E kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu. . . . Ha emezuola.” Nke atọ, Jehova bido ime ihe, ọ na-eme ya ruo n’isi. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Abụ m Alfa na Omega.” (Mkpu. 21:6) Jehova ga-egosi na Setan bụ onye ụgha nakwa na ọ gaghị egbochili ya imezu nzube ya. N’ihi ya, mmadụ sị: “Ihe a yichara ihe na-agaghị ekwe omume,” gụọrọ ya Mkpughe 21:5, 6. Gosi ya ihe Jehova mere nke yiri ịbịanyere anyị aka n’akwụkwọ iji gosi na ihe o kwuru ga-emerịrị.​—Aịza. 65:16. w23.11 7 ¶18-19

Wenezdee, Ọgọst 13

M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba.​—Jen. 12:2.

Jehova kwere Ebreham nkwa a mgbe ọ na-amụtabeghị nwa n’oge ọ dị afọ iri asaa na ise. Ebreham ọ̀ hụrụ ka nkwa ahụ mezuru? Ọ hụchaghị ya. Mgbe Ebreham gafere Osimiri Yufretis, afọ iri abụọ na ise agaakwa, ọ hụrụ ka a mụụrụ ya nwa nwoke bụ́ Aịzik. Ihe a bụ ọrụ ebube. Mgbe afọ iri isii ọzọ gachara, a mụrụ ụmụ ụmụ ya abụọ bụ́ Ịsọ na Jekọb. (Hib. 6:15) Ma, Ebreham ahụghị mgbe ụmụ ya ghọrọ nnukwu mba ma nweta ala ahụ e kwere ha ná nkwa. Ma, ya na Onye kere ya dị n’ezigbo mma. (Jems 2:23) Mgbe a ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ, obi ga-atọgbu ya atọgbu ịmata na okwukwe ya na otú o si nwee ndidi mere ka a gọzie mba niile. (Jen. 22:18) Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ a? O nwere ike anyị agaghị eji anya anyị hụ ka Jehova ga-emezu nkwa ya niile. Ma, ọ bụrụ na anyị nwee ndidi ka Ebreham, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị ugbu a, gọziekwa anyị karịchaa n’ụwa ọhụrụ o kwere anyị ná nkwa.​—Mak 10:29, 30. w23.08 24 ¶14

Tọzdee, Ọgọst 14

N’oge ọ nọ na-ejere Jehova ozi, ezi Chineke mere ka ihe gaziere ya.​—2 Ihe 26:5.

Mgbe Eze Ọzaya na-eto eto, ọ dị umeala n’obi. Ọ mụtara “ịtụ egwu Chineke.” Ọ dịrị ndụ afọ iri isii na asatọ. Jehova gọziri ya n’ọtụtụ n’ime afọ ndị ahụ. (2 Ihe 26:1-4) Ọzaya meriri ọtụtụ ndị iro ha, meekwa ka e chebe Jeruselem. (2 Ihe 26:6-15) O doro anya na obi dị Ọzaya ụtọ maka ihe niile Chineke nyeere ya aka ime. (Ekli. 3:12, 13) Ọ bụ Eze Ọzaya na-agwa ndị ọzọ ihe ha ga-eme. O nwere ike ịbụ na ihe ahụ mere ka o chee na o nwere ike ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Otu ụbọchị, mpako mere ka Ọzaya banye n’ụlọ nsọ Jehova ka ọ mụnye insens ọkụ. E nyeghị ndị eze ikike ime ihe ahụ. (2 Ihe 26:16-18) Nnukwu onye nchụàjà bụ́ Azaraya gbalịrị ịgbazi Ọzaya, ma ezigbo iwe were ya. Ọ dị mwute na Ọzaya erubereghị Jehova isi, Jehova ataakwa ya ahụhụ maka ya mee ka ọ rịawa ekpenta. (2 Ihe 26:19-21) Ndụ ya gaara aka mma ma a sị na ọ kwụsịghị ịdị umeala n’obi. w23.09 10 ¶9-10

Fraịdee, Ọgọst 15

Ọ kwụsịrị . . . iso ha akpa, maka na ọ na-atụ egwu ndị ahụ e biri úgwù.​—Gal. 2:12.

Mgbe Pita onyeozi ghọchadịrị Onye Kraịst e tere mmanụ, a ka nwere ihe ndị ọ na-emejọ. N’afọ 36 Oge Ndị Kraịst, Pita nọ ya mgbe e ji mmụọ nsọ tee Kọnịliọs na-abụghị onye Juu mmanụ. Ihe a gosiri na “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu” nakwa na ndị na-abụghị ndị Juu nwere ike iso n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 10:34, 44, 45) Mgbe ihe a mechara, Pita na ndị na-abụghị ndị Juu na-erikọzi nri, nke bụ́ ihe ọ na-agaghị echetụdị n’echiche ime n’oge mbụ. Ma, ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst chere na ha na ndị na-abụghị ndị Juu ekwesịghị ịna-erikọ nri. Mgbe ụfọdụ n’ime ha bịara Antịọk, Pita kwụsịrị iso ndị na-abụghị ndị Juu na-eri nri. Ọ ga-abụ na ụjọ ya bụ ka ọ ghara ịkpasu ụmụnna ya bụ́ ndị Juu iwe. Mgbe Pọl hụrụ omume ihu abụọ a Pita mere, ọ baara ya mba n’ihu ọha. (Gal. 2:13, 14) N’agbanyeghị ihe a merenụ, ike agwụghị Pita. w23.09 22 ¶8

Satọdee, Ọgọst 16

[Ọ ga-eme] ka unu kwụrụ chịm.​—1 Pita 5:10.

Ịgwa onwe gị eziokwu nwere ike ime ka ị chọpụta na e nwere ebe ndị ị na-anaghị emetacha. Mana, adala mbà. “Onyenwe anyị dị obiọma,” ọ ga-enyekwara gị aka imekwu nke ọma. (1 Pita 2:3) Pita onyeozi mesiri anyị obi ike mgbe o kwuru, sị: “Chineke . . . ga-azụru unu n’isi. Ọ ga-eme ka unu kwụsie ike.” E nwere mgbe Pita chere na ya erughị eru ịnọ n’ihu Ọkpara Chineke. (Luk 5:8) Mana, Jehova na Jizọs nyeere ya aka n’ihi na ha hụrụ ya n’anya, ya emee ka ọ nọsie ike na-eso ụzọ Jizọs. Ihe a mere ka Jehova kwe ka Pita nwee ike ‘ịbanye n’Alaeze ga-adịru ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.’ (2 Pita 1:11) Ihe a bụ ngọzi na-enweghị atụ. Ọ bụrụ na gịnwa anọsie ike n’ozi Jehova otú ahụ Pita mere, ma kwe ka Jehova zụọ gị, ọ ga-enye gị ndụ ebighị ebi. ‘Okwukwe gị ga-eme ka a zọpụta gị.’​—1 Pita 1:9. w23.09 31 ¶16-17

Sọnde, Ọgọst 17

Feenụ Chineke, onye kere eluigwe na ụwa.​—Mkpu. 14:7.

Ụlọikwuu ahụ nwere otu ebe a gbara ogige, ebe ndị nchụàjà na-anọ arụ ọrụ ha. Nnukwu ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ a na-anọ achụ àjà a na-esu ọkụ dịkwa n’ogige ahụ. Ihe ọzọ dị na ya bụ nnukwu ite e ji ọla kọpa rụọ e ji agbanye mmiri ndị nchụàjà na-eji asacha onwe ha tupu ha agawa ịrụ ọrụ dị nsọ. (Ọpụ. 30:17-20; 40:6-8) Taa, ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ na-eji obi ha niile na-efe Chineke n’ogige dị n’ime ụlọ nsọ ihe atụ ahụ. E nwere ihe dị mkpa nnukwu ite ahụ e ji agbanye mmiri n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ ahụ na-echetara ma hanwa ma ndị niile bụ́ Ndị Kraịst. Ọ na-echetara ha na ha kwesịrị ịdị ọcha ma n’ofufe ha na-efe Chineke ma n’àgwà ha. Ma, olee ebe “oké ìgwè mmadụ” na-anọ efe Chineke? Jọn onyeozi hụrụ ka ha “guzo n’ihu ocheeze ahụ,” ebe bụ́ ogige dị n’èzí nke dị n’ụwa, ebe ha ‘na-ejere Chineke ozi n’ụlọ nsọ ya ehihie na abalị.’ (Mkpu. 7:9, 13-15) Obi dị anyị ụtọ na anyị niile nwere ebe anyị nọ na-efe Chineke ezigbo ofufe. w23.10 28-29 ¶15-16

Mọnde, Ọgọst 18

N’ihi nkwa Chineke kwere, . . . okwukwe ya mere ka o sie ike. ​—Rom 4:20.

Otu n’ime ndị Jehova ji eme ka anyị dị ike bụ ndị okenye. (Aịza. 32:1, 2) N’ihi ya, mgbe ọ bụla ị na-echegbu onwe gị, kọsara ndị okenye ihe na-echegbu gị. Ha chọọ inyere gị aka, jiri obi ụtọ nabata enyemaka ha. Jehova na-esi n’aka ha eme ka i nweta ike. Olileanya Baịbụl mere ka anyị nwee na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi, ma ọ̀ bụ na paradaịs ga-adị n’ụwa ma ọ̀ bụ n’eluigwe, nwekwara ike ime ka anyị dị ike. (Rom 4:3, 18, 19) Olileanya a anyị nwere na-enye anyị ike anyị na-eji edi nsogbu, na-ekwusa ozi ọma, na-arụkwa ọrụ dị iche iche e nyere anyị n’ọgbakọ. (1 Tesa. 1:3) Ọ bụkwa otu olileanya ahụ mere ka Pọl onyeozi dị ike. E nwere oge ndị ‘nsogbu bịaara ya,’ ‘ihe agbagwojuo ya anya,’ ‘a kpagbuo ya,’ ‘kwadakwa ya.’ E nwedịrị ụfọdụ oge ọ gaara anwụ. (2 Kọr. 4:8-10) Ihe nyeere Pọl aka idi nsogbu ndị a bụ ilekwasị anya n’olileanya o nwere. (2 Kọr. 4:16-18) Pọl lekwasịrị anya n’olileanya o nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe n’ọdịnihu. Ọ tụgharịrị uche n’olileanya ahụ, nke mere ka ọ ‘na-esikwu ike kwa ụbọchị.’ w23.10 15-16 ¶14-17

Tuzdee, Ọgọst 19

Jehova ga-enye ndị ya ume. Jehova ga-agọzi ndị ya, mee ka ha nọrọ n’udo.​—Ọma 29:11.

I kpewe ekpere, chee ma oge ahụ ọ̀ bụ oge Jehova chọrọ imere gị ihe ị na-arịọ ya. Anyị nwere ike iche na e kwesịrị imere anyị ihe anyị na-ekpe n’ekpere ozugbo. Ma, n’eziokwu, Jehova ma oge kacha mma ọ ga-eji enyere anyị aka. (Hib. 4:16) Ọ bụrụ na e mereghị anyị ihe anyị na-arịọ ozugbo, anyị nwere ike iche na Jehova azaghị ekpere anyị. Ma, o nwere ike ịbụ na oge erubeghị ka ọ za anyị ekpere ahụ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwoke kpere ekpere ka Jehova gwọọ ya ọrịa ya. Ma, ọ gbakeghị. Ọ bụrụ na Jehova arụọ ọrụ ebube gwọọ ya, Ekwensu nwere ike ịsị na ihe mere nwanna ahụ ji na-efe Jehova bụ naanị n’ihi na Jehova gwọrọ ya. (Job 1:9-11; 2:4) Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ewepụtala oge ọ ga-eji gwọọ ọrịa niile. (Aịza. 33:24; Mkpu. 21:3, 4) Ruokwa oge ahụ, anyị agaghị atụ anya ka Jehova rụọ ọrụ ebube gwọọ anyị ọrịa. N’ihi ya, nwanna nwoke ahụ nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye ya ike ọ ga-eji die nsogbu ahụ nakwa ka o mee ka obi ruo ya ala ka o nwee ike iji obi ya niile na-efe Jehova. w23.11 24 ¶13

Wenezdee, Ọgọst 20

Ọ naghị emeso anyị ihe otú anyị si emehie, ọ naghịkwa akwụ anyị ụgwọ otú ihe ọjọọ anyị na-eme hà. ​—Ọma 103:10.

Samsịn mere ihe dị oké njọ, ma ọ kwụsịghị ife Jehova. Ọ chọtara ohere ọ ga-eji rụọ ọrụ Jehova chọrọ ka ọ rụọ, ya bụ, ibibi ndị Filistia. (Ikpe 16:28-30) Samsịn rịọrọ Jehova, sị: “Ka m bọọ ọbọ n’isi ndị Filistia.” Ezi Chineke zara ekpere ya, ma rụọ ọrụ ebube mee ka ọ dịkwa ike ọzọ. Ihe ahụ mere ka Samsịn gbuo ọtụtụ ndị Filistia n’oge ahụ karịa otú o gbutụrụla. Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe ụfọdụ na-adịghị mma mere Samsịn n’ihi ihe o mejọrọ, ọ kwụsịghị ịgbalị ime uche Jehova. Ọ bụrụgodị na anyị emejọọ ihe, a dọọ anyị aka ná ntị ma ọ bụ kwụsị anyị ọrụ ụfọdụ anyị na-arụ, anyị ekwesịghị ịkwụsị ife Jehova. Cheta na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị. (Ọma 103:8, 9) N’agbanyeghị ihe anyị mejọrọ, anyị ka nwere ike ịbara Jehova uru otú ahụ Samsịn mere. w23.09 6 ¶15-16

Tọzdee, Ọgọst 21

Ịtachi obi na-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma; anyị na Chineke ịdị ná mma na-eme ka anyị nwee olileanya.​—Rom 5:4.

Ị tachie obi, ọ ga-eme ka gị na Jehova dịrị ná mma. Ihe a apụtaghị na ọ na-atọ Jehova ụtọ ma ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu bịara anyị. Ihe na-eme Jehova obi ụtọ bụ gịnwa, ọ bụghị ahụhụ ị na-ata. Otú i si tachie obi na-eme ka gị na ya dịrị ná mma. Ihe a bụ ngọzi magburu onwe ya. (Ọma 5:12) Cheta na Ebreham tachiri obi mgbe ọnwụnwa bịaara ya, nke mere ka ya na Jehova dịrị ná mma. Jehova weere ya ka enyi ya ma kpọọ ya onye ezi omume. (Jen. 15:6; Rom 4:13, 22) Jehova nwere ike iwere anyị otú ahụ. Ihe na-eme ka anyị na Jehova dịrị ná mma abụghị otú ọrụ anyị na-arụ n’ozi ya hà ma ọ bụkwanụ ụdị ọrụ e nyere anyị ná nzukọ ya. Ihe na-eme ka anyị na ya dịrị ná mma bụ ma anyị tachie obi na-efe ya ma nsogbu bịara anyị. N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, otú ihe si dịrị anyị, ma ọ bụ ihe ndị anyị ga-emeli, anyị niile nwere ike ịtachi obi. È nwere nsogbu ị na-edi ugbu a ma ka na-efe Jehova? Ọ bụrụ na e nwere, ka obi sie gị ike na ị na-eme Jehova obi ụtọ. Ịmata na ihe anyị na-eme dị Jehova mma nwere ike ịkpa ezigbo ike ná ndụ anyị. O nwere ike ime ka olileanya anyị sikwuo ike. w23.12 11 ¶13-14

Fraịdee, Ọgọst 22

Gosikwa na ị bụ dimkpa.​—1 Eze 2:2.

Nwoke bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịmụta otú ya na ndị ọzọ ga-esi na-akparịta ụka nke ọma. Ọ pụtara na o kwesịrị ịna-ege ntị nke ọma ma na-aghọta ihe ndị ọzọ chere na otú obi dị ha. (Ilu 20:5) Ọ ga-enwekwa ike isi n’ụda olu mmadụ na otú o dowere ihu nakwa ihe ndị ọzọ onye ahụ na-eme ghọta ihe o chere. Ị gaghị enwe ike ime ihe ndị a ma ọ bụrụ na gị na ndị mmadụ anaghị anọrị. Ọ bụrụ na ihe ị na-eme mgbe niile bụ ịna-apị ekwentị gị ma ọ bụ ihe yiri ya, jiri ya na-eziga ozi iimel, ma ọ bụ na-ezigara mmadụ ozi n’ekwentị, o nwere ike ime ka o siere gị ike ịna-agwa ndị mmadụ okwu ihu na ihu. N’ihi ya, wepụta oge ka gị na ndị ọzọ na-akparịta ụka ihu na ihu. (2 Jọn 12) Nwoke tozuru etozu bụ́ Onye Kraịst kwesịkwara inwe ike ịna-akpa afọ ya na ezinụlọ ya. (1 Tim. 5:8) Ọ dị mma ka ị mụta ihe ga-enyere gị aka inweta ọrụ. (Ọrụ 18:2, 3; 20:34; Efe. 4:28) Gbasie mbọ ike ka a mara gị ka onye na-arụsi ọrụ ike na onye na-arụru ọrụ ya n’isi. I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka i nweta ọrụ ma nọsie ike na ya. w23.12 27 ¶12-13

Satọdee, Ọgọst 23

Ụbọchị Jehova ga-abịa nnọọ otú onye ohi si abịa n’abalị.​—1 Tesa. 5:2.

Mgbe Baịbụl kwuru “ụbọchị Jehova,” ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ mgbe Jehova ga-ebibi ndị iro ya ma zọpụta ndị ya. Jehova tara mba ụfọdụ ahụhụ n’oge gara aga. (Aịza. 13:1, 6; Ezik. 13:5; Zef. 1:8) N’oge anyị a, “ụbọchị Jehova” ga-amalite mgbe ndị ọchịchị ga-ebibi Babịlọn Ukwu. Ọ ga-akụrụkwa ọnụ n’agha Amagedọn. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a zọpụta anyị ‘n’ụbọchị’ ahụ, anyị kwesịrị ijikere ejikere ugbu a. Jizọs kụziiri anyị na anyị kwesịrị ‘ịdị njikere’ maka “oké mkpagbu,” ya bụ, na anyị kwesịrị ịdị njikere mgbe niile. (Mat. 24:21; Luk 12:40) N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ degara ndị Tesalonaịka, o ji ihe atụ dị iche iche nyere Ndị Kraịst aka ijikere maka oké ụbọchị Jehova. Pọl ma na ụbọchị Jehova agaghị abịa n’oge ahụ. (2 Tesa. 2:1-3) N’agbanyeghị ya, ọ gbara ụmụnna ya ume ka ha jikere maka ụbọchị ahụ ka à ga-asị na ọ na-abịa n’echi ya. Anyịnwa kwesịkwara ime ihe ahụ Pọl kwuru. w23.06 8 ¶1-2

Sọnde, Ọgọst 24

Ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike, kwụrụnụ chịm.​—1 Kọr. 15:58.

N’afọ 1978, a rụrụ ụlọ elu dị okpukpu iri isii na Tokio dị na Japan. Ndị mmadụ nọ na-eche otú ụlọ elu ahụ ga-esi kwụrụ n’enweghị ihe mere ya n’ihi na ala ọma jijiji na-emekarị n’obodo ahụ. Olee ihe mere na ụlọ elu ahụ adaghị? Ọ bụ n’ihi na ndị rụrụ ya rụrụ ya ka o sie ike. Ha rụkwara ya otú ọ ga-abụ, ala ọma jijiji mee, ụlọ ahụ arọgharịtụ ka ọ ghara ịda. Ndị Kraịst dị ka ụlọ elu ahụ. Olee otú ha si dịrị ka ya? Onye Kraịst kwesịrị ịna-akwụsi ike n’ezi ihe. Mana, e nwekwara oge ọ ga-eru, ya egosi na ọ naghị esi ọnwụ. A bịa n’ihe gbasara iwu Jehova, Onye Kraịst kwesịrị ịkwụrụ chịm, kpebisie ike irubere ya isi. Ọ “na-eji obi ya niile erube isi,” ọ naghịkwa ekwe eme ihe na-adịghị mma. Ma, Onye Kraịst kwesịrị ‘ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,’ ya bụ, ikwe ka e mee ihe otú ndị ọzọ chọrọ mgbe ọ bụla o kwesịrị ime otú ahụ ma ọ bụ mgbe o kwere omume. (Jems 3:17) Onye Kraịst na-eme otú a agaghị na-emefe ihe ókè. Ọ gaghị na-ejisi ihe aka ike mgbe niile ma ọ bụ na-ekweta ka onye ọ bụla mewe otú sọrọ ya. w23.07 14 ¶1-2

Mọnde, Ọgọst 25

Ọ bụ eziokwu na unu ahụtụbeghị Kraịst, ma unu hụrụ ya n’anya.​—1 Pita 1:8.

Jizọs ekweghị ka Setan bụ́ Ekwensu nwata ya. Otu n’ime ọnwụnwa ndị Setan nwara ya bụ na ọ gwara ya hoo haa ka ọ kwụsị irubere Chineke isi. (Mat. 4:1-11) Setan kpebisiri ike ime ka Jizọs mehie, ka ọ ghara inwe ike ịgbapụta ụmụ mmadụ. N’oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, o diri ọnwụnwa ndị ọzọ. Ndị iro ya kpagburu ya, chọọkwa igbu ya. (Luk 4:28, 29; 13:31) O dikwara ihe ndị na-eso ụzọ ya mejọrọ. (Mak 9:33, 34) Mgbe a nọ na-ekpe ya ikpe, e mekpọrọ ya ọnụ ma kwaa ya emo. E mechaziri gbuo ya otú e si egbu ndị omekome, ahụ́ fụkwara ya ezigbo ụfụ. (Hib. 12:1-3) Jehova echebeghị ya mgbe ọ na-edi ihe ikpeazụ mere ya n’ụwa. (Mat. 27:46) O doro anya na Jizọs tara ezigbo ahụhụ ka ọ gbapụta anyị. Ọ̀ bụ na anyị anaghị ahụkwu Jizọs n’anya ma anyị chebara otú o si nwụọ n’ihi anyị echiche? w24.01 10-11 ¶7-9

Tuzdee, Ọgọst 26

Ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.​—Ilu 21:5.

Inwe ndidi ga-eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma. Ọ na-enyere anyị aka ige ndị ọzọ ntị nke ọma ma ha na-ekwu okwu. (Jems 1:19) Ọ na-emekwa ka udo dịrị. Ọ na-eme ka anyị ghara iji ọkụ ọkụ kwuo ma ọ bụ mee ihe na-adịghị mma mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi, anyị agaghị ewe iwe ngwa ngwa ma mmadụ mee ihe wutere anyị. Kama imegwara onye ahụ, anyị ga ‘na-ediri ibe anyị ihe, na-agbagharakwa ibe anyị kpamkpam.’ (Kọl. 3:12, 13) Inwe ndidi nwekwara ike inyere anyị aka ikpebi ihe ndị dị mma. Kama ime ihe ọkụ ọkụ ma ọ bụ n’echeghị echiche, anyị ga-ewetu obi mee nchọnchọ, chebara ihe ndị anyị nwere ike ime echiche ma họrọ nke ga-akacha mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-achọ ọrụ, o nwere ike ịdị anyị ka ọ̀ bụ anyị nara ọrụ mbụ e nyere anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị nwee ndidi, anyị ga-eweda obi, chebara otú ọ ga-esi akpa ezinụlọ anyị na ofufe anyị na-efe Jehova aka echiche. Inwe ndidi nwere ike ime ka anyị ghara ikpebi ihe na-adịghị mma. w23.08 22 ¶8-9

Wenezdee, Ọgọst 27

Ana m ahụ na e nwere iwu ọzọ na-akpa ike n’ahụ́ m. Iwu a na-alụso iwu na-achị obi m agha. Ọ na-adọrọkwa m n’agha, mee ka m gbawara iwu mmehie nke dị n’ahụ́ m ohu.​—Rom 7:23.

Ọ bụrụ na ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ emee ka obi daa gị mbà, icheta nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị ga-eme ka i kpebisie ike imeri ọnwụnwa. Olee otú ọ bụ? Mgbe i nyefere Jehova onwe gị, ị jụrụ onwe gị. Ọ pụtara na ị jụrụ ọchịchọ ndị na-adịghị mma nakwa ihe ndị ọzọ ị chọrọ ime na-agaghị amasị Jehova. (Mat. 16:24) N’ihi ya, ọnwụnwa bịara gị, ị gaghị echewe ihe ị ga-eme. I bula ụzọ kpebie ihe ị ga-eme, ya bụ, irubere Jehova isi. Ị ga-ekpebisi ike ime ihe na-amasị Jehova. I mee otú ahụ, ị na-eme ka Job. N’agbanyeghị na ọtụtụ ọnwụnwa ndị siri ezigbo ike bịaara ya, o ji obi ya niile sị: “M ga-ejisi Chineke aka ike.”​—Job 27:5. w24.03 9 ¶6-7

Tọzdee, Ọgọst 28

Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile ji obi ha niile na-akpọku ya.​—Ọma 145:18.

Jehova, bụ́ ‘Chineke hụrụ anyị n’anya,’ nọnyeere anyị. (2 Kọr. 13:11) Ihe gbasara onye nke ọ bụla n’ime anyị na-emetụ ya n’obi. Obi siri anyị ike na “ịhụnanya Jehova na-echebe” anyị. (Ọma 32:10) Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharịkwu uche n’otú Jehova si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya, ọ ga-eme ka anyị na-achọpụtakwu na ọ na-elekọta anyị, meekwa ka anyị na-abịarukwu ya nso. Ọ ga-eme ka ọ dịkwara anyị mfe ikpe ekpere gwa ya otú ịhụnanya ya dịruru anyị mkpa. Anyị nwere ike ịkọrọ ya ihe niile na-echegbu anyị, obi esie anyị ike na ọ na-aghọta anyị, nakwa na ọ chọsiri ike inyere anyị aka. (Ọma 145:19) Ọ bụrụ na oyi ana-atụ, ọ na-amasị anyị ịga ebe a kwanyere ọkụ. Otú ahụ ka ịhụnanya Jehova si amasịkwa anyị. Ọ bụ eziokwu na ịhụnanya Jehova na-akpa ezigbo ike, ọ na-emekwa ka obi ruo anyị ala. N’ihi ya, ka obi na-adị gị ụtọ maka na Jehova hụrụ gị n’anya. Ka anyị niile gosikwa na anyị hụrụ Jehova n’anya ma kwuo, sị: “M hụrụ Jehova n’anya.”​—Ọma 116:1. w24.01 31 ¶19-20

Fraịdee, Ọgọst 29

Emeela m ka ha mara aha gị. ​—Jọn 17:26.

Ihe Jizọs mere abụghị naanị ịgwa ndị mmadụ na aha Chineke bụ Jehova. Ndị Juu Jizọs kụziiri ihe ma aha Chineke. Ma, Jizọs Kraịst butere ụzọ ‘n’ịkọwa onye Nna ya bụ.’ (Jọn 1:17, 18) Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Nsọ Hibru gosiri na Jehova na-eme ebere ma na-enwe ọmịiko. (Ọpụ. 34:5-7) Jizọs mere ka eziokwu ahụ dokwuo anya mgbe o mere ihe atụ gbasara nwa mmefu na nna ya. Anyị gụwa ihe nna nwa ahụ mere mgbe ọ hụrụ nwa ya ahụ chegharịrị echegharị “mgbe ọ ka nọ ebe dị anya,” otú o si gbara ọsọ gakwuru ya, makụọ ya, jirikwa obi ya niile gbaghara ya, ọ na-eme ka anyị ghọtakwuo otú Jehova si emere anyị ebere ma na-enwere anyị ọmịiko. (Luk 15:11-32) Jizọs nyeere ndị mmadụ aka ịghọta ụdị onye Nna ya bụ n’eziokwu. w24.02 10 ¶8-9

Satọdee, Ọgọst 30

Ka anyị . . . si otú ahụ o si akasi anyị obi kasie ndị [ọzọ] . . . obi.​—2 Kọr. 1:4.

Jehova na-akasi ndị nsogbu bịaara obi, meekwa ka ha nweta onwe ha. Olee otú anyị nwere ike isi na-enwere ndị mmadụ ọmịiko ma na-akasi ha obi ka Jehova? Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịmụta ịna-akpa àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịna-enwere ndị mmadụ ọmịiko ma na-akasi ha obi. Olee ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ? Olee ihe ga-enyere anyị aka inwe ịhụnanya nke ga-eme ka anyị nwee ike ‘ịna-akasi ibe anyị obi’ kwa ụbọchị? (1 Tesa. 4:18) Anyị kwesịrị ịmụta ịkpa àgwà ndị dị ka ihe gbasara ndị ọzọ imetụ anyị n’obi, ịhụ ụmụnna anyị n’anya, na inwere ha obiọma. (Kọl. 3:12; 1 Pita 3:8) Olee otú àgwà ndị a nwere ike isi nyere anyị aka? Ọ bụrụ na anyị amụta inwere ndị mmadụ ọmịiko, mụtakwa àgwà ndị yiri ya, ọ ga-enyere anyị aka ịkasi ndị nọ ná nsogbu obi. Jizọs sịrị: “Ihe juru mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu. Ezigbo mmadụ na-esi n’ezigbo akụ̀ ya ewepụta ihe ọma.” (Mat. 12:34, 35) Ịkasi ụmụnna anyị obi bụ ụzọ dị ezigbo mkpa anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya. w23.11 10 ¶10-11

Sọnde, Ọgọst 31

Ndị ma ihe ga-aghọta ha. ​—Dan. 12:10.

Anyị kwesịrị ịchọ ka e nyere anyị aka ka anyị nwee ike ịghọta amụma ndị e dere na Baịbụl. Legodịnụ ihe atụ a. Ka e were ya na ị chọrọ ịga ebe ị na-amaghị, mana ya enwee enyi gị ma ebe ahụ nke ọma gị na ya so na-aga. Ọ ma ebe unu nọ nakwa ebe ụzọ nke ọ bụla ga-eduga unu. O doro anya na obi ga-adị gị ụtọ na enyi gị ahụ kwetara iso gị. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Jehova ma nke ọma oge anyị nọ na ya, nakwa ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmụta amụma ndị e dere na Baịbụl, anyị kwesịrị iwetu onwe anyị ala rịọ Jehova ka o nyere anyị aka. (Dan. 2:28; 2 Pita 1:19, 20) Jehova na-eme ka ezigbo nne ma ọ bụ nna. Ọ chọrọ ka ihe dịrị ụmụ ya ná mma n’ọdịnihu. (Jere. 29:11) Ndị nne na nna enweghị ike ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma, Jehova nwere ike ịmata kpọmkwem otú ihe ga-adị n’ọdịnihu. E nwere amụma ndị o mere ka e dee n’Okwu ya ka anyị nwee ike ịmata ihe ndị dị mkpa ga-emenụ tupu ha emee.​—Aịza. 46:10. w23.08 8 ¶3-4

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya