Ọktoba
Wenezdee, Ọktoba 1
Amamihe nke si n’eluigwe . . . na-eji obi ya niile erube isi.—Jems 3:17.
È nwere mgbe ọ na-esiri gị ike irube isi? E nwere mgbe o siiri Eze Devid ike. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Chineke, sị: “Mee ka irubere gị isi na-agụ m agụụ.” (Ọma 51:12) Devid hụrụ Jehova n’anya. Ma, mgbe ụfọdụ, o siiri ya ike irube isi. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. N’ihi gịnị? Nke mbụ bụ na mmehie anyị bu pụta ụwa na-eme ka anyị na-achọkarị inupụ isi. Nke abụọ bụ na Ekwensu na-agbalị mgbe niile ka anyị na-enupụ isi otú ahụ yanwa mere. (2 Kọr. 11:3) Nke atọ, ndị gbara anyị gburugburu n’ụwa a bụ ndị na-enupụ isi, ya bụ, ndị nwere “ụdị echiche nke na-akpa ike ugbu a n’ime ndị nnupụisi.” (Efe. 2:2) Ihe anyị kwesịrị ịna-alụso ọgụ abụghị naanị mmehie anyị bu pụta ụwa, anyị kwesịkwara ịgbalịsi ike ka anyị ghara ịna-enupụ isi, bụ́ ihe Setan na ụwa ya chọrọ ka anyị na-eme. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị na-erubere Jehova na ndị o nyere ikike isi. w23.10 6 ¶1
Tọzdee, Ọktoba 2
Ị hapụrụ mmanya dị mma ruo ugbu a.—Jọn 2:10.
Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ọrụ ebube Jizọs rụrụ mee ka mmiri ghọọ mmanya? Ọ bụ ịdị umeala n’obi. Jizọs ejighị ọrụ ebube ahụ tuo ọnụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị mgbe ọ bụla o ji ihe ọ rụrụ tuo ọnụ. Kama ime otú ahụ, o weturu onwe ya ala nye Nna ya otuto na ekele niile. O mekwara otú ahụ ugboro ugboro. (Jọn 5:19, 30; 8:28) Ọ bụrụ na anyị emee ka Jizọs ma dịrị umeala n’obi, anyị agaghị eji ihe ndị anyị rụrụ na-etu ọnụ. Ka anyị ghara iji onwe anyị na-etu ọnụ. Kama ka anyị jiri Chineke anyị dị ịtụnanya anyị na-ejere ozi na-etu ọnụ. (Jere. 9:23, 24) Ka anyị na-enye ya otuto kwesịrị ya. A sị ka e kwuwe, ò nwere ihe ọ bụla anyị ga-arụli ma ọ bụrụ na Jehova enyereghị anyị aka? (1 Kọr. 1:26-31) Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, anyị agaghị anara otuto maka ihe ọma anyị meere ndị ọzọ. Obi ga-adị anyị ụtọ maka na anyị ma na Jehova na-ahụ ihe anyị na-eme, nakwa na o ji ya kpọrọ ihe. (I nwere ike ịtụle Matiu 6:2-4; Hib. 13:16) O doro anya na anyị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa ma ọ bụrụ na anyị amụta ịdị umeala n’obi ka Jizọs.—1 Pita 5:6. w23.04 4 ¶9; 5 ¶11-12
Fraịdee, Ọktoba 3
Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.—Fil. 2:4.
Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ gbaa Ndị Kraịst ume ka ha na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Olee otú anyị ga-esi eme ihe a o kwuru ma anyị gaa ọmụmụ ihe? Ọ bụ ịna-echeta na ndị ọzọ chọrọ ịza ajụjụ otú ahụ anyịnwa chọkwara. Chegodị ya otú a. Mgbe gị na ndị enyi gị na-ekwu okwu, ị̀ ga-achọ ikwucha ihe niile, ndị enyi gị agaghị etinyetụ ọnụ? Mbanụ. Ị ga-achọ ka hanwa tinyekwa ọnụ. Otú ahụkwa ka ọ dị n’ọmụmụ ihe. Anyị chọrọ ka ọtụtụ ndị zaa ajụjụ. N’eziokwu, otu n’ime ụzọ ndị kacha mma anyị si agba ụmụnna anyị ume bụ inye ha ohere ka ha kwuo ihe ha kweere. (1 Kọr. 10:24) Anyị kwesịrị ịza ajụjụ dị nkenke. Ọ ga-enye ndị ọzọ ohere ịza ajụjụ. Ị zawagodị ajụjụ dị nkenke, ekwula banyere ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na i kwuo ihe niile dị na paragraf a na-amụ, ọ ga-eme ka a ghara inwe oké ihe ndị ọzọ ga-ekwu. w23.04 22-23 ¶11-13
Satọdee, Ọktoba 4
Ana m eme ihe niile n’ihi ozi ọma, ka m wee na-ezisara ya ndị ọzọ.—1 Kọr. 9:23.
Anyị kwesịrị icheta na ọ dị ezigbo mkpa ịna-enyere ndị ọzọ aka, karịchaa, ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Anyị kwesịkwara ịna-adị njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ n’ozi anyị. Ndị anyị na-ahụkarị n’ozi ọma bụ ndị ebe ha si, àgwà ha, na ihe ndị ha kweere dị iche iche. Pọl onyeozi na-agbanwe ihe ụfọdụ n’ozi ya. Anyị nwekwara ike ịmụta ihe n’aka ya. Jizọs họpụtara Pọl ka ọ bụrụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” (Rom 11:13) N’ihi ya, Pọl kwusaara ndị Juu, ndị Grik, ndị gụrụ oké akwụkwọ, ndị nọ n’ime obodo, ndị nọ n’ọchịchị, na ndị eze ozi ọma. Ka Pọl nwee ike izi ụdị ndị a niile ozi ọma, o mere “ihe niile iji nyere ụdị mmadụ niile aka.” (1 Kọr. 9:19-22) O chebaara omenala ha, otú e si zụọ ha, nakwa ihe ndị ha kweere echiche, zizie ha ozi ọma otú ọ ga-eru ha n’obi. Anyịnwa nwere ike ịna-emekwu nke ọma n’ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-agbanwe ihe ụfọdụ ma na-agbalị na-eche gbasara otú ka mma anyị ga-esi enyere onye nke ọ bụla aka. w23.07 23 ¶11-12
Sọnde, Ọktoba 5
Ohu Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị iji nwayọọ na-emeso mmadụ niile ihe.—2 Tim. 2:24.
Ndị dị nwayọọ dị ike. Ha abụghị ndị na-adịghị ike. Ọ bụ onye dị ike ga-ewetu obi ala ma ihe sie ike. Ịdị nwayọọ bụ otu n’ime àgwà ndị so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) Mgbe ụfọdụ, a na-eji okwu Grik a sụgharịrị “ịdị nwayọọ” akọwa ịnyịnya ọhịa a zụrụ azụ. Were ya na ị na-ahụ ịnyịnya ọhịa malitere dịwa nwayọọ. N’agbanyeghị na ọ dị nwayọọ, ọ ka sikwara ezigbo ike. Ebe anyị bụ ụmụ mmadụ, olee otú anyị nwere ike isi mụta ịdị nwayọọ ma dịrịkwa ike? Anyị agaghị emeli ya n’onwe anyị. Otu ụzọ anyị ga-esi mụta ya bụ ikpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ịmụta àgwà a magburu onwe ya. E nweela ọtụtụ ndị mụtara ịdị nwayọọ. Ọtụtụ ụmụnna anyị ejirila nwayọọ zaghachi ndị na-agbalị ịkpasu ha iwe, ya emee ka ndị hụrụ ha lewe Ndịàmà Jehova anya ọma.—2 Tim. 2:24, 25. w23.09 15 ¶3
Mọnde, Ọktoba 6
M nọ na-arịọ Jehova . . . , ya enye m ya.—1 Sam. 1:27.
N’ọhụụ dị ịtụnanya Jọn onyeozi hụrụ, ọ hụrụ ndị okenye iri abụọ na anọ nọ n’eluigwe na-efe Jehova. Ha toro Chineke, kwuo na ọ bụ “onye dị ike” nakwa na ‘o ruru eru ka ndị niile too ya ma sọpụrụ ya.’ (Mkpu. 4:10, 11) Ndị mmụọ ozi na-efe Chineke nwekwara ọtụtụ ihe mere ha ga-eji na-eto Jehova ma na-asọpụrụ ya. Ha na ya nọ n’eluigwe, ha amatakwala ya nke ọma. Ha na-ahụ otú ihe ndị ọ na-eme si egosi ụdị onye ọ bụ. Ka ha na-ahụ otú Jehova si eme ihe, ọ na-eme ka ha na-eto ya. (Job 38:4-7) Anyịnwa chọkwara ịna-eto Jehova ma anyị na-ekpe ekpere, na-agwa ya ihe ndị na-amasị anyị banyere ya. Ka ị na-amụ Baịbụl, gbalịa ka ị chọpụta àgwà Jehova ndị kacha amasị gị. (Job 37:23; Rom 11:33) Gwa Jehova otú obi dị gị gbasara àgwà ndị ahụ. Anyị nwekwara ike ito Jehova maka otú o si enyere ma anyịnwa ma ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile aka.—1 Sam. 2:1, 2. w23.05 3-4 ¶6-7
Tuzdee, Ọktoba 7
Na-eme ihe otú ndị na-efe Jehova kwesịrị ịna-eme.—Kọl. 1:10.
N’afọ 1919, ndị Chineke si na Babịlọn Ukwu pụta ma nwere onwe ha. N’afọ ahụ, “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” malitere ọrụ ha ka ndị nwere ezi obi malite ịga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ.’ (Mat. 24:45-47; Aịza. 35:8) Ọrụ ndị ọzọ rụrụ n’oge gara aga iji kwadebe ụzọ ahụ nyeere ndị malitere ịga ije n’okporo ụzọ ahụ aka ịna-amụtakwu gbasara Jehova na nzube ya. (Ilu 4:18) O mekwara ka ha malite ibi ndụ otú Jehova chọrọ. Jehova atụghị anya na ndị ya ga-agbanwe ihe niile ha kwesịrị ịgbanwe otu mgbe. Kama, o mere ka ha na-emekwu nke ọma ka oge na-aga. Obi ga-adị anyị niile ụtọ mgbe ihe niile anyị ga na-eme ga-adị Jehova mma. E kwesịrị ịna-arụ ọrụ n’okporo ụzọ ọ bụla ka ọ ghara imebi. Kemgbe afọ 1919, a ka na-arụ ọrụ ‘n’Ụzọ Dị Nsọ’ ka ndị mmadụ nwee ike ịna-apụtakwu na Babịlọn Ukwu. w23.05 17 ¶15-16
Wenezdee, Ọktoba 8
E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị.—Hib. 13:5.
Òtù Na-achị Isi na-azụ ndị na-enyere ha aka nọ na kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi. Ndị a na-enyere ha aka ji obi ha niile na-eje ozi ugbu a, na-arụkwa ọtụtụ nnukwu ọrụ n’ọgbakọ Jehova. A na-azụ ha ugbu a ka ha nwee ike ịrụrụ ọrụ ilekọta atụrụ Jizọs na-aga. Mgbe a kpọọrọ onye nke ikpeazụ n’ime ndị e tere mmanụ gaa eluigwe ná ngwụcha oké mkpagbu, a ka ga na-efekwa Jehova otú ọ chọrọ n’ụwa ebe a. Obi dị anyị ụtọ na Jizọs Kraịst bụ Onye Ndú anyị. N’ihi ya, a gaghị akwụsị ife Jehova otú ọ chọrọ. N’eziokwu, n’oge ahụ, Gọg onye Megọg, ya bụ, ọtụtụ mba gbakọrọ aka ọnụ, ga-alụso anyị ọgụ. (Ezik. 38:18-20) Ma, ha ga-akụ afọ n’ala n’ọgụ ahụ dị mkpirikpi ha ga-alụso ndị Chineke. Ha agaghị emeli ka ndị Jehova kwụsị ife ya. Jehova ga-anapụta ndị ya. Jọn onyeozi hụrụ “oké ìgwè mmadụ,” ya bụ, atụrụ ọzọ Kraịst, n’ọhụụ. A gwara Jọn na “oké ìgwè mmadụ” a “si n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpu. 7:9, 14) N’eziokwu, e nweghị ihe ọ bụla ga-eme ha. w24.02 5-6 ¶13-14
Tọzdee, Ọktoba 9
Unu akwụsịla ọrụ mmụọ nsọ na-arụ n’ime unu.—1 Tesa. 5:19.
Olee ihe anyị ga-eme iji nweta mmụọ nsọ? Anyị ga na-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị ya, na-amụ Okwu Chineke bụ́ Baịbụl, na-esokwa ọgbakọ Chineke mmụọ nsọ na-eduzi na-aga ije ụkwụ na ụkwụ. Ime ihe ndị a ga-enyere anyị aka inwe “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) Ndị Chineke na-enye mmụọ nsọ ya bụ naanị ndị ihe ha na-eche na ihe ha na-eme dị ọcha. Ọ ga-akwụsị inye anyị mmụọ nsọ ya ma ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe na-adịghị mma ma na-eme ya. (1 Tesa. 4:7, 8) Anyị chọọ ka Chineke na-enye anyị mmụọ nsọ, anyị ekwesịghịkwa ‘ịna-eleda amụma anya.’ (1 Tesa. 5:20) “Amụma” e kwuru okwu ya ebe a bụ ozi Chineke si n’ike mmụọ nsọ ya zie. Ihe so na ya bụ ozi gbasara ụbọchị Jehova nakwa na oge agwụla agwụ. Anyị anaghị eme ka ụbọchị ahụ pụọ n’obi anyị, na-eche na Amagedọn agaghị abịa n’oge anyị dị ndụ. Kama, anyị kwesịrị iburu ya n’uche, na-atụ anya na ọ ga-abịa n’oge na-adịghị anya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-akpa àgwà ọma ma na-agbasi mbọ ike “na-efe Chineke.”—2 Pita 3:11, 12. w23.06 12 ¶13-14
Fraịdee, Ọktoba 10
Ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe bụ onye ahụ ịtụ egwu Jehova. —Ilu 9:10.
Gịnị ka anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ime ma ọ bụrụ na foto ndị gba ọtọ apụta n’ekwentị anyị ma ọ bụ na kọmputa anyị? Anyị kwesịrị iwepụ anya anyị ozugbo. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ icheta na akụ̀ kacha akụ̀ niile anyị nwere bụ adịm ná mma anyị na Jehova. N’eziokwu, e nwere ihe ụfọdụ a na-agaghị akpọcha foto ndị gba ọtọ, ma ya abụrụ ihe ndị nwere ike ime ka mmekọahụ rụrụ arụ gụwa mmadụ. Gịnị mere anyị kwesịrị iji zere ha? Ọ bụ n’ihi na anyị achọtụdịghị ime obere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị kwaa iko n’obi anyị. (Mat. 5:28, 29) Otu okenye bi na Taịland aha ya bụ David sịrị: “M na-ajụ onwe m, sị: ‘Ọ bụrụgodị na foto ndị a abụghị foto ndị gba ọtọ, obi ọ̀ ga-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na m na-ele ha?’ Iche ụdị ihe a na-enyere m aka ime ihe m kwesịrị ime.” Ịtụ ụjọ ime ihe ga-ewute Jehova ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ka ndị ma ihe. Ịtụ egwu Chineke bụ “ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe.” w23.06 23 ¶12-13
Satọdee, Ọktoba 11
Ndị m, gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime.—Aịza. 26:20.
‘Ọnụ ụlọ ahụ dị n’ime’ nwere ike ịbụ ọgbakọ anyị dị iche iche. N’oge oké mkpagbu, Jehova kwere nkwa na ọ ga-echebe anyị ma ọ bụrụ na anyị esoro ụmụnna anyị nọsie ike n’ofufe ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ugbu a ka anyị na ụmụnna anyị dịrị ná mma, anyị ahụkwa ha n’anya. Ọ bụ ihe nwere ike ime ka a zọpụta anyị. “Oké ụbọchị Jehova” ga-abụrụ mmadụ niile oge tara ezigbo akpụ. (Zef. 1:14, 15) Ihe ga-esikwara ndị Jehova ike n’oge ahụ. Ma, ọ bụrụ na anyị akwadebe ugbu a, obi ga-eru anyị ala, anyị enweekwa ike inyere ndị ọzọ aka. Anyị ga-enwe ike ịtachi obi ma nsogbu bịara anyị. Ụmụnna anyị tawa ahụhụ, anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ha aka ma ọ bụrụ na anyị ana-enwere ha obi ebere ma na-enye ha ihe ndị dị ha mkpa. Ọ bụrụkwa na anyị amụta ịhụ ụmụnna anyị n’anya ugbu a, anyị ga-ahụ ha n’anya n’ọdịnihu. Ọ ga-eme ka Jehova gọzie anyị, mee ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa, ebe a na-agaghịzi echeta ọdachi na nsogbu niile.—Aịza. 65:17. w23.07 7 ¶16-17
Sọnde, Ọktoba 12
[Jehova] ga-eme ka unu kwụsie ike. Ọ ga-eme ka unu sie ike, meekwa ka unu kwụrụ chịm.—1 Pita 5:10.
Okwu Chineke na-ekwukarị na ndị ji obi ha niile fee Chineke dị ike. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ha chere na ha dị ike. Dị ka ihe atụ, n’oge ụfọdụ, Eze Devid chere na ya ‘siri ike ka ugwu,’ mana e nwekwara oge ndị “ụjọ jidere” ya. (Ọma 30:7) Ọ bụ eziokwu na Samsịn siri ezigbo ike mgbe mmụọ Chineke na-enyere ya aka, ma, ọ makwa na ọ bụrụ na Chineke enyeghị ya ike, ‘ike ga-agwụ ya, ya adịrị ka ụmụ nwoke niile ọzọ.’ (Ikpe 14:5, 6; 16:17) Ihe mere ụmụ nwoke ndị a rubeere Chineke isi ji sie ike bụ na Jehova mere ka ha dị ike. Pọl onyeozi ma na ọ bụ Jehova ga-eme ka ọ dị ike. (2 Kọr. 12:9, 10) E nwere ọrịa ndị ọ rịara. (Gal. 4:13, 14) Mgbe ụfọdụ, o siiri ya ike ime ihe dị mma. (Rom 7:18, 19) O nwekwara oge ndị o chegburu onwe ya, ụjọ atụọkwa ya gbasara ihe nwere ike ime ya. (2 Kọr. 1:8, 9) Ma, mgbe ike gwụrụ Pọl, ọ na-adị ike. Olee ihe mere ka ọ dị ike? Jehova nyere Pọl ike o ji die nsogbu ndị bịaara ya. w23.10 12 ¶1-2
Mọnde, Ọktoba 13
Jehova na-ahụ ihe dị n’obi. —1 Sam. 16:7.
Ọ bụrụ na e nwere mgbe ụfọdụ anyị na-eche na anyị abaghị uru, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova n’onwe ya dọtara anyị n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:44) Ọ hụrụ àgwà ọma anyị nwere, nke o nwere ike ịbụ na anyị anaghị ahụ. Ọ makwa obi anyị. (2 Ihe 6:30) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi mgbe ọ sịrị na anyị bara ezigbo uru n’anya ya. (1 Jọn 3:19, 20) Tupu anyị amụta eziokwu, ụfọdụ n’ime anyị mere ihe ndị nwere ike ime ka akọnuche anyị na-ama anyị ikpe ruo ugbu a. (1 Pita 4:3) E nwedịrị Ndị Kraịst ji obi ha niile na-efe Jehova na-agbasi mbọ ike ka ha ghara ime ihe na-adịghị mma. Ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na Jehova agaghị agbagharali gị? Ọ bụrụ otú ahụ, icheta na e nweela ndị ji obi ha niile fee Jehova chere otú ahụ ga-akasi gị obi. Dị ka ihe atụ, obi anaghị adị Pọl onyeozi mma ma o cheta ihe ndị ọ na-anaghị emeta. (Rom 7:24) Ma, n’eziokwu, Pọl echegharịala ná mmehie ya ma mee baptizim. N’agbanyeghị ya, ọ kpọrọ onwe ya onye “kacha nta” n’ime ndịozi nakwa ‘onye kacha bụrụ onye mmehie.’—1 Kọr. 15:9; 1 Tim. 1:15. w24.03 27 ¶5-6
Tuzdee, Ọktoba 14
Ha hapụrụ ụlọ Jehova.—2 Ihe 24:18.
Otu ihe anyị na-amụta n’ihe na-adịghị mma Eze Jehoash mere bụ na ndị anyị kwesịrị imeta enyi bụ ndị ezigbo mmadụ hụrụ Jehova n’anya, nakwa ndị chọrọ ịna-eme ya obi ụtọ. Ọ bụghị naanị ndị ọgbọ anyị ka anyị kwesịrị ịna-emeta enyi. Cheta na Jehoyada tọgburu Jehoash bụ́ enyi ya atọgbu. A bịa n’ihe gbasara ndị ị na-emeta enyi, jụọ onwe gị, sị: ‘Hà na-enyere m aka ka okwukwe m nwere na Jehova sikwuo ike? Hà na-agba m ume ịna-eme ihe Jehova chọrọ? Hà na-ekwu gbasara Jehova na eziokwu ndị ọ na-akụziri anyị? Hà ji iwu Jehova kpọrọ ihe? Hà na-agwa m ihe m chọrọ ịnụ, ka hà na-akata obi gbazie m ma m mewe ihe na-adịghị mma?’ (Ilu 27:5, 6, 17) N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị enyi gị ahụghị Jehova n’anya, gị na ha ekwesịghị ịbụ enyi. Ma, ọ bụrụ na ndị enyi gị hụrụ Jehova n’anya, jisie ha ike. Ha ga na-enyere gị aka.—Ilu 13:20. w23.09 9-10 ¶6-7
Wenezdee, Ọktoba 15
Abụ m Alfa na Omega.—Mkpu. 1:8.
Ihe bidoro abịịdịị ndị Grik bụ alfa, nke ikpeazụ ya abụrụ omega. Mgbe Jehova kwuru “Alfa na Omega,” ihe ọ na-ekwu bụ na mgbe ọ bụla ọ malitere ime ihe, ọ na-emecharịrị ya. Mgbe Jehova kechara Adam na Iv, ọ sịrị ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, junụ n’ụwa, na-elekọtakwanụ ya.” (Jen. 1:28) N’oge ahụ, e nwere ike ikwu na Jehova sịrị “Alfa.” O mere ka nzube ya doo anya, ya bụ, na oge na-abịa mgbe ụmụ Adam na Iv na-erube isi ma zuo okè ga-eju n’ụwa, mee ka ọ ghọọ paradaịs. Mgbe Jehova mezuchara nzube ya a, ọ ga-adị ka ebe ọ sịrị “Omega.” Mgbe o kechara “eluigwe na ụwa na ihe niile dị na ha,” o kwuru ihe gosiri na nzube ya ga-emezurịrị. Jehova mere ka obi sie anyị ike na e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara imezu nzube ya maka ụmụ mmadụ na ụwa. Ọ ga-emezucha ya ná ngwụcha ụbọchị nke asaa ahụ.—Jen. 2:1-3. w23.11 5 ¶13-14
Tọzdee, Ọktoba 16
Dozienụ ụzọ Jehova! Sinụ n’ọzara waara Chineke anyị okporo ụzọ kwụ ọtọ.—Aịza. 40:3.
Isi Babịlọn gaa Izrel adịghị mfe. O nwere ike iwe ihe dị ka ọnwa anọ. Ma, Jehova kwere ha nkwa na ọ ga-ewepụrụ ha ihe ọ bụla nwere ike ime ka ha ghara ịlaghachi Izrel. Ndị Juu ji obi ha niile na-efe Chineke ma na uru ha ga-erite ma ha laghachi Izrel ga-akarị ihe ọ bụla ha ga-ahapụ. Uru ọ ga-akacha baara ha bụ n’ofufe ha na-efe Chineke. E nweghị ụlọ nsọ Jehova na Babịlọn. E nweghị ebe a na-achụ àjà ndị Izrel nwere ike ịchụ àjà Iwu Mosis kwuru ka ha na-achụ. E nweghịkwa ndị nchụàjà a haziri ahazi ịchụ àjà ndị ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na ndị na-efe arụsị karịrị ndị na-efe Jehova n’obodo ahụ. Ndị ahụ na-efe arụsị enweghị ihe ha ji Jehova ma ọ bụ iwu ya kpọrọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu hụrụ Jehova n’anya na-atụsi anya ike mgbe ha ga-alaghachi n’obodo ha fewekwa Jehova otú ọ chọrọ. w23.05 14-15 ¶3-4
Fraịdee, Ọktoba 17
Na-akpanụ àgwà ka ụmụ nke ìhè.—Efe. 5:8.
Ọ dịkwa mkpa ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka ka anyị nwee ike ịna-akpa àgwà ka “ụmụ nke ìhè.” Maka gịnị? Ọ bụ maka na ịdị ọcha n’ụwa a rụrụ arụ adịghị mfe. (1 Tesa. 4:3-5, 7, 8) Mmụọ nsọ nwere ike inyere anyị aka ịghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa na-anaghị ele ihe anya otú Chineke si ele ya. Mmụọ nsọ nwekwara ike inyere anyị aka ‘ịna-eme ezi omume, na-akpakwa àgwà dị mma.’ (Efe. 5:9) Otu ụzọ anyị ga-esi enweta mmụọ nsọ bụ ikpe ekpere maka ya. Jizọs kwuru na Jehova ‘ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ ha na-arịọ ya.’ (Luk 11:13) Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị ana-eto Jehova n’ọmụmụ ihe, anyị na-enwetakwa mmụọ nsọ. (Efe. 5:19, 20) Ike mmụọ nsọ Chineke ga-akpa ná ndụ anyị ga-enyere anyị aka ịna-ebi ndụ otú na-amasị Chineke. w24.03 23-24 ¶13-15
Satọdee, Ọktoba 18
Na-arịọnụ, a ga-enye unu. Na-achọnụ, unu ga-achọta. Na-akụnụ aka n’ụzọ, a ga-emeghere unu ya. —Luk 11:9.
Ị̀ chọrọ ịna-enwekwu ndidi? Ọ bụrụ otú ahụ, rịọ Jehova maka ya. Ndidi so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) N’ihi ya, anyị nwere ike ikpe ekpere ka Jehova nye anyị mmụọ nsọ ya ka o nyere anyị aka ịmụta àgwà a. Ọ bụrụ na ọnwụnwa nke ga-eme ka o siere anyị ike inwe ndidi abịara anyị, anyị ga ‘na-arịọ’ Chineke ka o jiri mmụọ nsọ ya nyere anyị aka ịna-enwe ndidi. (Luk 11:13) Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịna-ele ihe anya otú yanwa si ele ya. Anyị kpechaa ekpere, anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka anyị na-enwe ndidi kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na anyị ana-ekpekwu ekpere ka Jehova nyere anyị aka inwe ndidi ma na-agba mbọ ịna-enwe ndidi, anyị ga na-enwekwu ndidi, ya abụrụkwa ihe e ji mara anyị ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe e jibu mara anyị. Iche gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ga-abakwara anyị uru. Anyị gụọ Baịbụl, anyị ga-ahụ ọtụtụ ndị nwere ndidi. Ọ bụrụ na anyị echebara akụkọ ha echiche, anyị ga-amụta ụzọ ndị anyị ga-esi na-enwekwu ndidi. w23.08 22-23 ¶10-11
Sọnde, Ọktoba 19
Wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu gbute azụ̀.—Luk 5:4.
Jizọs mere ka obi sie Pita onyeozi ike na Jehova ga-akwado ya. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ rụrụ ọrụ ebube ọzọ, mee ka Pita na ndị na-eso ụzọ ibe ya gbute azụ̀. (Jọn 21:4-6) O doro anya na ọrụ ebube a Jizọs rụrụ mere ka obi sie Pita ike na ọ gaghị esiri Jehova ike ịna-egboro ya mkpa ya. Ọ ga-abụ na onyeozi a chetara ihe Jizọs kwuru na Jehova ga-egboro ndị bu “ụzọ na-achọ Alaeze Chineke” mkpa ha. (Mat. 6:33) Ihe a mere ka Pita mee ka ozi ya bụrụ ihe kacha ya mkpa, ọ bụghị ọrụ igbu azụ̀. O ji obi ike gbaa àmà n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33, nyere ọtụtụ puku mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 2:14, 37-41) O mechakwara nyere ndị Sameria na ndị na-abụghị ndị Juu aka ịmụta banyere Kraịst ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. (Ọrụ 8:14-17; 10:44-48) Jehova ji Pita rụọ ezigbo ọrụ, mee ka ụdị mmadụ niile bata n’ọgbakọ ya. w23.09 20 ¶1; 23 ¶11
Mọnde, Ọktoba 20
Ọ bụrụ na unu akọrọghị m nrọ ahụ na ihe ọ pụtara, a ga-abọkasị unu.—Dan. 2:5.
Ihe dị ka afọ abụọ ndị Babịlọn bibichara Jeruselem, Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn rọrọ nrọ tụrụ ya ụjọ gbasara otu nnukwu ihe a kpụrụ akpụ. O kwuru na ọ ga-egbu ndị niile ma ihe, ma Daniel, ma ọ bụrụ na ha enweghị ike ịgwa ya ihe ọ rọrọ ná nrọ, kọwaakwara ya nrọ ahụ. (Dan. 2:3-5) Daniel kwesịrị ime ihe ngwa ngwa, ma ọ́ bụghị ya, a ga-egbu ọtụtụ ndị. Ọ “gakwuuru eze rịọ ya ka o nyetụ ya oge ka o wee kọọrọ ya ihe nrọ ya pụtara.” (Dan. 2:16) Ihe a o mere gosiri na o nwere ezigbo obi ike na okwukwe. Olee otú anyị si mara? O nweghị ebe Baịbụl kwuru na Daniel akọwatụla nrọ tupu mgbe ahụ. Ọ gwara ndị enyi ya ka ha “rịọ Chineke nke eluigwe ka o meere ha ebere ma mee ka ha mata ihe nzuzo a.” (Dan. 2:18) Jehova zara ekpere ahụ. O nyeere Daniel aka ya akọwaa nrọ Nebukadneza ahụ. Ihe a zọrọ Daniel na ndị enyi ya ndụ. w23.08 3 ¶4
Tuzdee, Ọktoba 21
Ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.—Mat. 24:13.
Chee gbasara uru inwe ndidi ga-abara gị. Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi, ọ na-eme ka obi na-atọkwu anyị ụtọ, obi ana-erukwu anyị ala. Inwe ndidi nwekwara ike ime ka ahụ́ na-agbasi anyị ike, isi ana-akpakọkwa anyị ọnụ. Ọ bụrụ na anyị ana-enwere ndị ọzọ ndidi, ọ na-eme ka anyị na ha dịrị ná mma, ọgbakọ ana-adịkwukwa n’otu. Ọ bụrụ na anyị eweghị iwe ọsọ ọsọ ma mmadụ kpasuo anyị iwe, o nwere ike ime ka nsogbu ahụ ghara ịka njọ. (Ihe e dere n’ala ala peeji Ọma 37:8; Ilu 14:29) Ma, nke kachanụ bụ na anyị na-eme ka Nna anyị nke eluigwe. Ọ ga-emekwa ka anyị na ya dịkwuo ná mma. N’eziokwu, ndidi bụ ọmarịcha àgwà bara ezigbo uru. O nwere ike ọ gaghị adịrị anyị mfe mgbe niile ịna-enwe ndidi. Ma, Jehova ga-enyere anyị aka ịna-amụtakwu inwe ndidi. Ka anyị na-enwe ndidi na-eche ka ụwa ọhụrụ bịa, obi kwesịrị isi anyị ike na “anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ, bụ́ ndị na-atụ anya ịhụnanya ya.” (Ọma 33:18) Ka anyị niile kpebisie ike na anyị ga-eyiri àgwà a bụ́ ndidi ka uwe. w23.08 22 ¶7; 25 ¶16-17
Wenezdee, Ọktoba 22
Ọ bụrụ na mmadụ anaghị eme ihe dị mma, okwukwe ya abaghị uru ọ bụla.—Jems 2:17.
Jems kwuru na mmadụ nwere ike ikwu na ya nwere okwukwe, mana ihe ndị o mere egosighị ya. (Jems 2:1-5, 9) Jems kwukwara gbasara onye hụrụ “nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị na-enweghị uwe na ihe oriri,” mana, o nyereghị ya aka. Ọ bụrụgodị na onye ahụ na-ekwu na o nwere okwukwe, ihe o mere egosighị ya. N’ihi ya, okwukwe ya enweghị isi. (Jems 2:14-16) Jems kwuru na Rehab mere ihe gosiri na o nwere okwukwe. (Jems 2:25, 26) Ọ nụrụ gbasara Jehova, chọpụtakwa na Jehova na-enyere ndị Izrel aka. (Josh. 2:9-11) O mere ihe gosiri na o nwere okwukwe. O chebere ndị Izrel abụọ bịara inyopụta otú obodo ha dị mgbe a chọrọ igbu ha. Ihe a mere ka a kpọọ nwaanyị a na-ezughị okè, na-abụghịkwa onye Izrel, onye ezi omume, otú ahụ a kpọrọ Ebreham. Ihe Rehab mere na-egosi na ihe na-eme ka a mara na mmadụ nwere okwukwe bụ ihe ọma ọ na-eme. w23.12 5-6 ¶12-13
Tọzdee, Ọktoba 23
Ka unu kwụsie ike, gbanyesiekwa mgbọrọgwụ ike na ntọala okwukwe unu.—Efe. 3:17.
Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, ihe anyị kwesịrị ịghọta abụghị naanị ihe ndị dị mfe Baịbụl na-akụzi. Anyị chọrọ ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka ka anyị mụta “ọbụnadị amamihe Chineke nke dị omimi.” (1 Kọr. 2:9, 10) I nwere ike ime ezigbo nchọnchọ ka ị mụta ihe ndị ga-enyere gị aka ịbịaru Jehova nso. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịmụ otú Jehova si gosi ndị fere ya n’oge ochie na ọ hụrụ ha n’anya na otú akụkọ ahụ si egosi na Jehova hụkwara gị n’anya. I nwekwara ike ịmụ gbasara otú Jehova si hazie ka e si na-efe ya n’Izrel oge ochie nakwa otú o si yie otú Ndị Kraịst si efe ya taa. I nwekwara ike imekwu nchọnchọ gbasara amụma ndị Jizọs mezuru mgbe ọ nọ n’ụwa. Ịmụ gbasara isiokwu ndị ahụ ga-atọgbu gị atọgbu. Ihe ga-enyere gị aka ịmụ ha bụ Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Ịmụ Baịbụl nke ọma nwere ike ime ka okwukwe gị sikwuo ike, nyekwara gị aka ‘ịmụta banyere Chineke.’—Ilu 2:4, 5. w23.10 18-19 ¶3-5
Fraịdee, Ọktoba 24
Nke ka nke, jirinụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya, n’ihi na onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-adị njikere mgbe niile ịgbaghara ha ma ha mejọọ ya. —1 Pita 4:8.
Okwu Grik Pita onyeozi ji kọwaa ‘iji obi anyị niile’ pụtara “ịgbasa ihe.” Ihe ọzọ e kwuru n’amaokwu ahụ kọwara ihe ga-eme ma anyị jiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Ọ ga-ekpuchi mmehie ụmụnna anyị. Anyị nwere ike iji ihe atụ a kọwaa ya. Ka e were ya na ihe kawasịchara elu tebụl anyị. Anyị nwere ike were ákwà gbasaa n’elu tebụl ahụ. Ákwà ahụ ga-ekpuchi ọtụtụ ihe na-adịghị mma na tebụl ahụ, ọ bụghị ihe ole na ole. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Anyị ga-adị njikere ịgbaghara ha ma ha mejọọ anyị. Otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya kwesịrị isi ike nke na anyị ga na-agbaghara ha mmehie ha ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike mgbe ụfọdụ. (Kọl. 3:13) Anyị gbaghara ndị ọzọ, ọ na-egosi na anyị ji obi anyị niile hụ ha n’anya nakwa na anyị chọrọ ime Jehova obi ụtọ. w23.11 11-12 ¶13-15
Satọdee, Ọktoba 25
Shefan maliteziri ịgụrụ ya eze. —2 Ihe 34:18.
Mgbe Eze Josaya gbara afọ iri abụọ na isii, ọ malitere ịrụzi ụlọ nsọ. Ka a na-arụ ọrụ ahụ, a hụrụ “akwụkwọ e dere Iwu Jehova si n’aka Mosis nye.” Mgbe Josaya nụrụ ihe e kwuru na ya, ọ malitere ozugbo ịgbanwe ihe iji mee ihe e dere na ya. (2 Ihe 34:14, 19-21) Ị̀ ga-achọ ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị? Ọ bụrụ na ị malitela ịgụ ya, ọ̀ na-atọ gị ụtọ? Ị̀ na-ede amaokwu Baịbụl ndị i chere ga-abara gị uru? Mgbe Josaya dị ihe dị ka afọ iri atọ na itoolu, o mejọrọ ihe tara isi ya. Ọ tụkwasịrị onwe ya obi kama ịrịọ Jehova ka o duzie ya. (2 Ihe 35:20-25) E nwere ihe anyị ga-amụta na ya. N’agbanyeghị afọ ole anyị dị ma ọ bụ afọ ole anyị mụrụla Baịbụl, anyị ekwesịghị ịkwụsị ịchọ Jehova. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga na-ekpe ekpere mgbe niile na-arịọ Jehova ka o duzie anyị, na-amụ Baịbụl, na-egekwa ntị na ndụmọdụ Ndị Kraịst ma nke a na-akọ na-enye anyị. Ime ihe ndị a nwere ike ime ka anyị ghara ime ihe dị oké njọ, meekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ.—Jems 1:25. w23.09 12 ¶15-16
Sọnde, Ọktoba 26
Ihe ndị mpako anaghị amasị Chineke, ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.—Jems 4:6.
Baịbụl kwuru gbasara ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị hụrụ Jehova n’anya ma fee ya. Ha “na-emeru ihe n’ókè,” bụrụkwa “ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihe niile.” (1 Tim. 3:11) Ụmụnna nwaanyị nwekwara ike ịchọta ụmụnna nwaanyị tozuru etozu n’ọgbakọ ha ndị ha ga na-akpa àgwà ka ha. Ụmụnna nwaanyị na-eto eto, ọ ga-adị mma ka unu chọpụta ụfọdụ ụmụnna nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst tozuru etozu ndị unu ma unu nwere ike ịna-akpa àgwà ka ha. Chọpụta àgwà ọma ndị ha nwere. Chezie otú i nwere ike isi na-akpa àgwà ndị ahụ. Àgwà dị ezigbo mkpa ga-enyere anyị aka ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu bụ ịdị umeala n’obi. Ọ bụrụ na nwaanyị adịrị umeala n’obi, ya na Jehova na ndị ọzọ ga-adị ná mma. Dị ka ihe atụ, nwaanyị hụrụ Jehova n’anya na-adị umeala n’obi ma na-akwado ndokwa Nna ya nke eluigwe mere ka e nwee onyeisi. (1 Kọr. 11:3) Ihe a ga-abara ya uru ma n’ọgbakọ ma n’ezinụlọ. w23.12 18-19 ¶3-5
Mọnde, Ọktoba 27
Ndị bụ́ di kwesịkwara isi otú ahụ hụ nwunye ha n’anya otú ha si hụ ahụ́ nke ha n’anya.—Efe. 5:28.
Jehova chọrọ ka di hụ nwunye ya n’anya, na-egboro ya mkpa ya, na-emekwa ka obi dị ya mma nakwa ka ya na Jehova dịrị ná mma. Ịna-echebara ihe echiche nke ọma, ịna-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù, na ịbụ onye a ga-atụkwasịli obi, ga-enyere gị aka ịbụ ezigbo di. Ọ bụrụ na ị lụọ nwaanyị, i nwere ike ịghọ nna. Olee ihe i nwere ike ịmụta n’aka Jehova gbasara ịbụ ezigbo nna? (Efe. 6:4) Jehova gwara Ọkpara ya Jizọs n’ebe ndị ọzọ nọ na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na ihe ya masịrị ya. (Mat. 3:17) Ọ bụrụ na ị ghọọ nna, gbalịsie ike ka ị na-emesi ụmụ gị obi ike mgbe niile na ị hụrụ ha n’anya. Na-aja ha mma mgbe niile maka ihe ndị ha na-emeta. Ọ bụrụ na ndị nna ana-eme ka Jehova, ha ga-enwe ike inyere ụmụ ha aka ịghọ Ndị Kraịst tozuru etozu. Ị ga-enwekwa ike ibido ugbu a na-akwadebe maka ọrụ ahụ dị mkpa. Otú ị ga-esi na-eme ya bụ iji obiọma na-elekọta ndị ezinụlọ gị na ndị nọ n’ọgbakọ, mụtakwa ịna-egosi ha na ị hụrụ ha n’anya nakwa na i ji ha kpọrọ ihe.—Jọn 15:9. w23.12 28-29 ¶17-18
Tuzdee, Ọktoba 28
[Jehova] ga-eme . . . ka unu kwụrụ chịm.—1 Pita 5:10.
Ọ bụ eziokwu na anyị na-efe Jehova, anyị na-enwekwa nsogbu ma na-arịa ọrịa otú ọ na-adị ndị ọzọ. Ndị kpọrọ ndị Chineke asị nwekwara ike ịna-emegide anyị. Ọ bụ eziokwu na Jehova anaghị ewepụrụ anyị ụdị nsogbu ndị a, ma o kwere nkwa na ọ ga-enyere anyị aka. (Aịza. 41:10) O nwere ike inyere anyị aka anyị ana-enwe ọṅụ, na-eme mkpebi dị mma ma na-efe ya ọ bụrụgodị na nsogbu siri ezigbo ike abịara anyị. Jehova kwere nkwa inye anyị ihe Baịbụl kpọrọ “udo Chineke na-enye.” (Fil. 4:6, 7) Ụdị udo a na-ekwu okwu ya ebe a bụ otú obi si eru anyị ala ma anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma. Udo a “karịrị nghọta mmadụ.” Ọ na-akpa ezigbo ike karịa otú anyị nwere ike iche n’echiche. È nwetụla mgbe obi ruru gị ala otú ị na-atụghị anya ya mgbe i kpesiri ekpere ike? Ọ bụ ya bụ “udo Chineke na-enye.” w24.01 20 ¶2; 21 ¶4
Wenezdee, Ọktoba 29
Ka m too Jehova. Ka ihe niile dị n’ime m too aha nsọ ya.—Ọma 103:1.
Ndị hụrụ Jehova n’anya na-eji obi ha niile na-eto aha ya. Eze Devid ghọtara na ito aha Jehova bụ ito Jehova n’onwe ya. Anyị nụ aha Jehova, anyị na-eche gbasara ụdị onye ọ bụ. Anyị na-echekwa gbasara àgwà ọma niile o nwere nakwa ọrụ ọma ndị ọ na-arụ. Devid chọrọ iwere aha Nna ya ka ihe dị nsọ, chọọkwa ito ya. Ọ chọrọ iji “ihe niile dị n’ime” ya mee ya, ya bụ, iji obi ya niile mee ya. Otú ahụkwa ka ọ dị ndị Livaị na-ebute ụzọ n’ito Jehova. Ha dị umeala n’obi ma kwuo na ọnụ ha enweghị ike itochali aha nsọ Jehova otú o kwesịrị. (Nehe. 9:5) Obi siri anyị ike na otú a ha si wetuo onwe ha ala si n’obi ha too Jehova mere ka obi Jehova ṅụrịa. w24.02 9 ¶6
Tọzdee, Ọktoba 30
Otú ọ bụla anyị merurula nke ọma, ka anyị si otú ahụ mere nke ọma na-aga.—Fil. 3:16.
Jehova agaghị ewere ya na i meela ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na i meghị ihe i kpebiri ime, bụ́kwanụ ihe ị na-agaghị emeli. (2 Kọr. 8:12) Mụta ihe n’ihe ndị mere ka o siere gị ike. Na-eche gbasara ihe ndị i merela. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu.” (Hib. 6:10) N’ihi ya, gịnwa ekwesịghịkwa ichefu ihe ndị i merela. Na-eche banyere ha. O nwere ike ịbụ na i mere ka gị na Jehova bido ịdị ná mma, na ị na-agwa ndị ọzọ gbasara ya, ma ọ bụkwanụ na i meela baptizim. Ị ka nwere ike ịna-agba mbọ na-eme ihe ndị i kpebiri ime ugbu a otú ahụ ị gbara mbọ mee n’oge gara aga. N’enyemaka Jehova, ị ga-emeli ihe i kpebiri ime. Ka ị na-agbasi mbọ ike ime ihe ndị i kpebiri ime n’ofufe Jehova, i kwesịkwara ịgbalị na-ahụ otú Jehova si enyere gị aka. I mee otú ahụ, obi ga-adị gị ụtọ ka ị na-agbalị ime ihe ndị i kpebiri ime n’ofufe ya. (2 Kọr. 4:7) Ọ bụrụ na ike agwụghị gị, Jehova ga-agọzikwu gị n’ọdịnihu.—Gal. 6:9. w23.05 31 ¶16-18
Fraịdee, Ọktoba 31
Nna m hụrụ unu n’anya maka na unu hụrụ m n’anya, unu ekwerekwala na m bịara ka onye nnọchiteanya Chineke.—Jọn 16:27.
Ọ na-amasị Jehova ịgwa ndị ọ hụrụ n’anya na ihe ha masịrị ya. Baịbụl kwuru ugboro abụọ ọ gwara Jizọs na ọ bụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị ya. (Mat. 3:17; 17:5) Ị̀ ga-achọ ka Jehova gwa gị na ihe gị masịrị ya? Jehova anaghị esi n’eluigwe agwa anyị okwu. Ma, ọ na-esi n’Okwu ya bụ́ Baịbụl agwa anyị okwu. Ọ bụrụ na anyị agụọ okwu Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gosiri na ọ hụrụ ha n’anya, ọ ga-adị ka ànyị na-anụ ka Jehova na-agwa anyị okwu ndị ahụ. Jizọs mere nnọọ ka Nna ya. N’ihi ya, anyị gụọ otú Jizọs si gwa ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi na-ezughị okè na ihe ha masịrị ya, anyị ga-ewere ya na ọ bụ anyị ka Jehova na-agwa okwu ndị ahụ. (Jọn 15:9, 15) Anyị tawa ahụhụ, ọ pụtaghị na ihe anyị amasịghịzi Jehova. Kama, ọ bụ ohere anyị ga-eji gosi na anyị ji obi anyị niile hụ Jehova n’anya nakwa na anyị tụkwasịrị ya obi.—Jems 1:12. w24.03 28 ¶10-11