‘O Nyeere Ụmụ Anyị Ndị Nwanyị Aka Ịdị Anyị Nso Karị’
N’idegara alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society akwụkwọ ozi na 1988, otu onye nkụzi na Murewa, Zimbabwe, kwuru na nke a bụ ihe Akwukwọm nke Akukọ Bible rụzuru. O nwetara akwụkwọ ahụ site n’aka onye nkụzi ibe ya, kọọkwa, sị:
“Agbasoro m ndụmọdụ ya n’ụzọ e si enweta ihe kachasị mma n’akwụkwọ ahụ, nke mbụ n’ebe nwa m nwanyị nke kasị nta gbara afọ 8 nọ, e mesịakwa n’ebe abụọ ndị ọzọ gbara afọ 16 na 18 nọ, bụ́ ndị bi n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Kọleji dị n’obodo anyị. Enwere m obi ụtọ dị ukwuu ime ka unu mara na mmeghachi omume nke ụmụ m atọ nile abụwo nke na-enye ezi agbamume. Eri mgbe ahụ mgbanwe ha na-agbanwe n’omume abụwo nke a na-ahụta dị ka nke na-adịwanye mma.” Nne ha kwukwara, sị: “Akwụkwọ ahụ enwewo ihe ịga nke ọma n’inyere ụmụ anyị aka ịdị anyị, bụ́ ndị mụrụ ha, nso karịa ka ọ dịtụrụla mgbe ọ bụla na mbụ.”
Ị pụrụ inweta akwụkwọ nke a nwere 256 peji, nke obodobo peji ya hà ka peji magazin nke a, site n’idejupụta ma zite mpempe akwụkwọ a. Akụkọ Bible ndị ahụ dị 116 dị n’ime akwụkwọ ahụ na-enye onye na-agụ ya echiche nke ihe nile Bible na-ekwu. Akụkọ ndị a na-apụta n’usoro n’usoro dị ka ihe omume ndị ahụ si mee n’akụkọ ihe mere eme. Ị pụrụ ịchọpụta nke a dị ka ihe na-enye aka n’ezie n’ịmụta mgbe ihe dị iche iche mere n’akụkọ ihe mere eme, ma i jiri ha tụnyere ihe omume ndị ọzọ dị iche iche. Ihe osise dị n’akwụkwọ a mara mma, mkpụrụ akwụkwọ ya dịkwa okpotokpo.
Biko ziterenụ m ozi banyere otú m pụrụ isi nweta akwụkwọ ahụ bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible.