Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ha Tụkwasịrị Jehova Obi
JEHOVA nyere Ndịàmà Jehova iwu ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’elu ụwa dum ka ndị nke mba nile wee nwee ohere ịmara banyere ụwa ọhụrụ nke Chineke. Ná mba ụfọdụ, ọtụtụ mgbe site ná mkpali nke ndị ndú Krisendọm, a na-egbochi ọrụ anyị. Otú ahụ ka ọ dị n’otu mba dị n’Africa. Ma Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ na-eme dị ka Eze Devid mere. Ọ sịrị: “Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịworo obi, m gaghị atụ egwu.” (Abụ Ọma 56:11) Ahụmahụ nke ụmụnna anyị ndị bi n’ala ahụ na-egosi na ha tụkwasịri Jehova obi, nọgidekwa n’ọrụ ya dị mkpa.
Otu Onyeàmà nke na-arụ ọrụ dị ka onye isi ụlọ akwụkwọ n’otu ụlọ akwụkwọ nta nọgidesiri ike n’irubere ‘Chineke isi dị ka onye ọchịchị karịa mmadụ,’ na-ekwupụta nnọpụiche ya n’ihe metụtara Ọchịchị. (Ọrụ 5:29) E tiri ya ihe nke ukwuu, na-atụkwa anya na a ga-ekpe ya ikpe dị ka onye na-agba obodo mgba okpuru. Onye ọ bụla chere na a ga-egbu ya. Otú ọ dị, Onyeàmà ahụ tụkwasịrị Jehova obi. Ọ nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi, ma kọwaa ihe metụtara akọ na uche ya ndị mere o ji were ọnọdụ ahụ o weere. Gịnị si na nke a pụta? A tọhapụrụ ya, o wee laghachikwa n’obodo ya, ebe ndị ọrụ Obodo ndị ahụ tiri ya ihe rịọrọ ya mgbaghara. A nabataghachiri Onyeàmà nke a kwesịrị ntụkwasị obi n’ọrụ nkụzi, buliekwa ya gaa n’ọkwá onye nlekọta nke ụlọ akwụkwọ dị iche iche!
Otu onye nchịkọta ọrụ nke otu ụlọ akwụkwọ mere ka a chụọ otu onye nkụzi bụ Onyeàmà n’ọrụ. Mgbe otu ọnwa gasịrị, onye nchịkọta ọrụ nke a natara akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala site n’aka otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, kwerekwa ka e duziere ya ọmụmụ Bible. Mgbe ọ mụsịrị isi 6, ọ gbara arụkwaghịm dị ka onye nchịkọta ọrụ ụlọ akwụkwọ ahụ, ya na nwunye ya malitekwara ije nzukọ nile nke Ndịàmà Jehova. N’otu ụtụtụ Sunday, ọ bụụrụ onye nkụzi ahụ a chụrụ achụ ihe ijuanya na-enye ọṅụ izute nwoke ahụ nke chụrụ ya n’ọrụ, nakwa ịmata na ya onwe ya nọkwa n’ụzọ nke ịghọ nwanna ya n’ime mmụọ.
Otu ahụmahụ ọzọ sitere n’otu mba nke a na-enye ihe atụ nke ụzọ Ndịàmà Jehova na-esi akụnye n’ime ụmụ mmadụ nsọpụrụ maka ndokwa nile nke Jehova, na-arụkwa ọrụ idebe nzukọ ahụ ọcha. Otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nke na-arụ ọrụ n’otu ókèala dịpụrụ adịpụ nwetara mmegide dị ukwuu. Ebe ọ bụ onye sitere n’agbụrụ ọzọ nke dị n’akụkụ ọzọ nke mba ahụ, ndị iro nke eziokwu ahụ chọrọ ịchụpụ ya site n’obodo ahụ. Otú ọ dị, onye chiifu obodo ahụ kwupụtara ezi àgwà ya na ezi ihe ndị ije ozi ya rụpụtaworo, o kweghịkwa ka a chụpụ ya. Onye chiifu ahụ hotara na kemgbe onye ọsụ ụzọ ahụ pụrụ iche bịara, ndị mmadụ na-asọpụrụzi ndị na-achị achị site n’ịkwụ ụtụ isi ha na ịrụ ọrụ okporo ụzọ a na-arụ n’obodo ahụ otu ugbo n’izu.—Ndị Rom 13:1, 7.
Mgbe ahụ, n’otu anyasị e jidere otu Onyeàmà ọzọ ebe ọ na-akwaso nwanyị na-abụghị Onyeàmà iko. Akụkọ ọjọọ gbasara, a kpọkwara onye ọsụ ụzọ ahụ pụrụ iche ka ọ bịa n’ihu onye chiifu ahụ, bụ́ onye baara ya mba, na-asị: “Lee na ọ bụ nwanna gị ka e jidere ebe ọ na-akwa iko. Unu, bụ́ Ndịàmà Jehova, adịghị iche n’ebe ndị okpukpe ndị ọzọ dị.” Otú ọ dị, onye ọsụ ụzọ ahụ pụrụ iche kọwara, sị: “Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị dị iche n’okpukpe ndị ọzọ n’ihi na anyị adịghị agbachi nkịtị ka ndị mere mmehie ndị dị oké njọ nọgide n’etiti anyị.”
Onyeàmà ahụ nke kwara iko jere mkpọrọ ruo oge ụfọdụ, kwụọkwa nhá. Tụkwasị na nke ahụ, a chụpụrụ ya n’ọgbakọ dị ka onye mmehie nke na-enweghị nchegharị. Ihe omume nke a kpaliri mmasị onye chiifu ahụ, mechiekwa ọnụ ndị na-akwa Ndịàmà Jehova emo. Onye chiifu ahụ kwuru, sị: “Unu ekwula okwu ọjọọ banyere Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ha nwere eziokwu ahụ. Okpukpe ndị ọzọ adịghị eme otú ahụ.”
Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi n’ala ahụ gbasoro agbamume ahụ dị n’Abụ Ọma 37:3: “Tụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe; biri n’ala, na-azụkwa onwe gị n’ikwesị ntụkwasị obi.” Ànyị ga-atụkwasị Jehova obi dị ka ndị Kraịst ndị a na-eme?