Na-Agbasonụ Nsọpụrụ Chineke Dị Ka Ndị Kraịst Meworo Baptism
“Ma gị onwe gị, onye nke Chineke, . . . na-agbaso ezi omume, nsọpụrụ Chineke.”—1 TIMOTI 6:11.
1. Olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ ahụ bụ, Olee ụbọchị kasị dị mkpa ná ndụ gị? Gịnị mere i ji zaa otú ahụ?
OLEE ụbochị kasị dị mkpa ná ndụ gi? Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova nke meworo baptism, ihe ịrụ ụka adịghi ya na ị ga-aza, si, ‘Ee, ọ bụ ụbọchị m mere baptism!’ N’ezie, baptism bụ nzọụkwụ kasi mkpa ná ndụ gi. Ọ bụ ihe àmà pụtara ìhè na i rarawo onwe gi kpam kpam na n’ụzọ a na-akparaghi ókè nye Jehova ime uche ya. Baptism gị na-aka ụbọchị a họpụtara gị dị ka onye ozi nke Chineke Kasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova, akara.
2. (a) Olee ihe atụ a pụrụ iji mee ihe igosi na baptism abụghị nzọụkwụ ikpeazụ ị na-anakwere n’ibi obi ndị Kraịst gị? (b) Olee nzọụkwụ ndị mbụ ị gbasoro tupu i mee baptism?
2 Otú ọ dị, baptism ọ̀ bụ nzọụkwụ ikpeazụ ị ga-agbaso ná ndụ gị dị ka onye Kraịst? Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị! Iji maa atụ: N’ọtụtụ ala ememe agbamakwkwọ na-aka ọgwụgwụ nke oge ime atụmatụ na ime nkwadebe akara (nakwa ọtụtụ mgbe ime mbedó). N’otu oge ahụ, ọ na-aka mmalite nke ndụ mmadụ abụọ dị ka ndị lụrụ di na nwunye akara. N’ụzọ yiri nke ahụ, baptism gị bụ njedebe nke oge ime nkwadebe, bụ́ nke ị nọ n’ime ya gbasoo nzọụkwụ ole na ole dị mkpa ndị bụ isi. I nwetara ihe ọmụma banyere Chineke na Kraịst. (Jọn 17:3) Ị malitere inwe okwukwe n’ebe Jehova nọ dị ka ezi Chineke ahụ, n’ebe Kraịst nọ dị ka Onye Nzọpụta gị, na n’ebe Bible dị dị ka Okwu Chineke. (Ọrụ 4:12; 1 Ndị Tesalonaịka 2:13; Ndị Hibru 11:6) I gosipụtara okwukwe ahụ site n’isi n’ụzọ omume mbụ gị chegharịa ma gbanwee gaa n’ụzọ ezi omume. (Ọrụ 3:11) Mgbe ahụ i mere mkpebi ịrara onwe gị nye Jehova ime uche ya. (Matiu 16:24) N’ikpeazụ, e mere gị baptism.—Matiu 28:19, 20.
3. (a) Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na baptism anyị bụ mmalite nke ndụ ije ozi a raara nye Chineke? (b) Ajụjụ ndị dị anaa na-ebilite, n’ihi gịnịkwa ka anyị ga-eji nwee mmasị dị omimi n’azịza ha?
3 Otú ọ dị, baptism gi abụghi njedebe kama ọ bụ mmalite nke ndụ ije ozi dị nsọ a raara nye Chineke. Dị ka otu onye mmụta Bible kwuru, ndụ onye Kraịst agaghị abụ ‘oké mkpali mbụ nke oké ịjụ oyi sochiri.’ Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi gosipụta na n’ọnọdụ nke gị, baptism abụghị nani ‘oké mkpali mbụ’? Ọ bụ site n’ịgbaso ụzọ nke nsọpụrụ Chineke n’ogologo ndụ gi nile. Gịnị ka nsọpụrụ Chineke nke a bụ? Gịnị mere o ji dị mkpa ka a gbasoo ya? Olee otú ị pụrụ isi zụlite ya n’ụzọ zuru ezu ná ndụ gị? Anyi kwesịrị inwe mmasị dị omimi n’azịza ha, n’ihi na anyị aghaghị ịbụ mmadụ ndị e ji “nsọpụrụ Chineke nile” wee mara ma ọ bụrụ na anyi ga-alanarị ụbọchi ikpe Chineke nke na-abịanụ.—2 Pita 3:11, 12.
Ihe Nsọpụrụ Chineke Pụtara
4. Gịnị ka Pọl dụrụ Timoti ọdụ ka o mee, gịnịkwa bụ eziokwu banyere Timoti n’oge a?
4 N’ihe dị ka agbata afọ 61 na 64 O.A., Pọl onyeozi degaara onye Kraịst ahụ na-eso ụzọ bụ Timoti akwkwọ ozi mbụ ya e dere n’ike mmụọ nsọ. Mgbe ọ kọwasịrị ihe ize ndụ ndị ịhụ ego n’anya pụrụ iduba na ha, Pọl dere, sị: “Ma gị onwe gị, onye nke Chineke, na-agbanari ihe ndị a; ma na-agbaso . . . nsọpụ-rụ Chineke.” (1 Timoti 6:9-11) Ọ dị mma ịrịba ama na n’oge a, Tịmoti nọ, ma eleghị anya, ná mmalite afọ iri atọ na ụma ya. O sorowo Pọl onyeozi mee njem n’ọtụtụ ebe, e nyewokwa ya ikike ịhọpụta ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ dị iche iche. (Ọrụ 16:3; 1 Timoti 5:22) Ma, Pọl dụrụ onye Kraịst nke a raraworo onwe ya nye, meekwa baptism, onye tozuwokwara okè, ọdụ ka ọ gbasoo nsọpụrụ Chineke.
5. Gịnị ka okwu ahụ bụ “nsọpụrụ Chineke” pụtara?
5 Gịnị ka Pọl bu n’uche site n’okwu ahụ bụ “nsọpụrụ Chineke”? A pụrụ ịsụgharị okwu Grik mbụ ahụ (eu-se’bei-a) n’ụzọ nkịtị dị ka “ịkwanyere ihe ezi ùgwù.” Banyere ihe ọ pụtara, anyị na-agụ, sị: “Eusebeia na-apụta site n’oge ruo n’oge n’echiche nke na-egosipụta nsọpụrụ mmadụ nwere n’okpukpe nke ndị ọgbọ na-ekpe . . . ma ihe ọ pụtara karị n’asụsụ Grik nke oge Rom bụ ‘ikwesị ntụkwasị obi.’ . . . Nye ndị Kraịst, eusebeia bụ ụdị kasị elu nke nsọpụrụ e nyere Chineke.” (Christian Words, nke Nigel Turner dere) Ya mere dị ka e si jiri ya mee ihe n’Akwụkwọ nsọ, okwu ahụ bụ “nsọpụrụ Chineke” na-ezo aka ná nkwanye ùgwù ma ọ bụ nsọpụrụ nke nwere ikwesị ntụkwasị obi e nyere Jehova Chineke n’onwe ya.
6. Olee ụzọ onye Kraịst si enye ihe àmà nke nsọpụrụ Chineke ya?
6 Otụ́ ọ dị, nsọpụrụ Chineke nke a abụghị nanị mmetụta ife ofufe. Dị nnọọ ka “okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya,” otú a kwa, nsọpụrụ Chineke aghaghị ịpụta ìhè ná ndụ mmadụ. (Jemes 2:26) N’akwụkwọ bụ New Testament Words, William Barclay dere, sị: “Ọ bụghị nanị na [eu-se’bei-a na okwu ndị yiri ya] na-egosi mmetụta nke oké egwu na nkwanye ùgwù, kama ha pụtakwara ofufe nke kwesịịrị oké egwu ahụ, na ndụ nke nrubeisi siri ike nke kwesịịrị nkwanye ùgwù ahụ.” A kọwakwara eu-se’bei-a dị ka “nghọta kwesịrị ekwesị e nwere banyere Chineke n’akụkụ ọ bụla nke ndụ.” (The Second Epistle General of Peter and the General Epistle of Jude, nke Michael Green dere) Ya mere, onye Kraịst ahụ aghaghi inye ihe àmà nke mmekọrịta onwe onye o nwere n’ebe Jehova nọ site n’ụzọ o si ebi ndụ ya.—1 Timoti 2:2; 2 Pita 3:11.
Oké Mgbalị Dị Mkpa
7. Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ gbara Timoti ume ka ọ “na-agbaso” nsọpụrụ Chineke, ọ bụ ezie na o mewo baptism?
7 Otú ọ dị, gị ka ọ gụnyere iji zụlite ma gosipụta nsọpụrụ Chineke? Ọ̀ bụ nanị okwu banyere ime baptism? Cheta na Timoti, ọ bụ ezie na o mewo baptism, bụ onye a gbara ume ka ‘ọ na-agbaso [n’ụzọ nkịti, ‘gị nọgide na-agbaso’]’ ya.a (1 Timoti 6:11, Kingdom Interlinear) N’ụzọ doro anya, Pọl adịghị ekwu na onye ahụ na-eso ụzọ bụ́ Timoti enweghị nsọpụrụ Chineke. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka ọ ghọta mkpa ọ dị ya ịnọgide na-agbaso ya site ná mkpebi siri ike na ịnụ ọkụ n’obi. (Tụlee Ndị Filipaị 3:14.) O doro anya na mgbaso nke a bụ nke mmadụ ga-eme ogologo oge nile ọ dị ndụ. Timoti, dị ka ndị Kraịst nile meworo baptism, pụrụ ịnọgide na-enwe ọganihu n’igosipụta nsọpụrụ Chineke.
8. Olee otú Pita si gosi na a chọrọ oké mgbalị n’aka onye Kraịst raraworo onwe ya nye, meekwa baptism iji gbasoo nsọpụrụ Chineke?
8 Oké mgbali dị ndị Kraist raraworo onwe ha nye, ndị mere baptism mkpa iji gbasoo nsọpụrụ Chineke. N’idegara ndị Kraịst ndị meworo baptism akwkwọ bụ́ ndị nwere olileanya ‘ịghọ ndị na-enwekọ ihe o ji bụrụ chi,’ Pita onyeozi kwuru, si: “Ma n’ihi otu ihe a n’akụkụ unu tụkwasịnụ ịnụ ọkụ n’obi nile, nyezuokwanụ ịdị mma n’okwukwe unu; nyezuokwa ihe ọmụma n’ịdị mma unu; nyezuokwa ijisi onwe unu ike n’ihe ọmụma unu; nyezuokwa ntachi obi n’ijisi onwe unu ike; nyezuokwa nsọpụrụ Chineke n’ime ntachi obi unu.” (2 Pita 1:4-6) N’ụzọ doro anya, a chọrọ okwkwe n’aka anyị ka anyị wee nwee ike iwepụta onwe anyị maka baptism. Otú ọ dị, mgbe anyị mesịrị baptism anyị apụghị ịwere ihe n’ụzọ dị nnọọ mfe n’etinyeghi mgbalị ọ bụla, na-enwe afọ ojuju n’Iso Ụzọ Kraịst nke egbugbere ọnụ. Kama nke ahụ, ka anyi na-enwe ọganihu n’ibi obi ndị Kraist, ọ dị anyị mkpa inọgide na-azụlite àgwà ndị ọzọ dị mma, gụnyere nsọpụrụ Chineke, nke a pụrụ ịtụkwasi n’okwukwe anyị. Pita kwuru na nke a ga-ewe oké mgbali n’aka anyi.
9. (a) Olee otú okwu Grik ahụ dị maka ‘ịtụkwasị’ si akọwa ọ̀tụ̀tụ̀ nke mgbalị dị mkpa iji wee zụlite nsọpụrụ Chineke? (b) Gịnị ka Pita na-agba anyị ume ime?
9 Okwu Grik ahụ Pita ji mee ihe maka ‘ịtụkwasi’ (e-pi-kho-re-ge’o) nwere mmalite na-adọrọ mmasi ma na-akọwa ọ̀tụ̀tụ̀ nke mgbali a chọrọ. O sitere n’otu mkpọaha (kho-regos’) nke pụtara n’ụzọ nkiti “onyendú nke òtù ukwe.” Ọ na-ezo aka n’onye kwụrụ ụgwọ ihe nile e mefuru n’ịzụlite na n’ilekọta otu òtù ukwe maka ime ihe ngosi. Ndị dị otú ahụ na-anakwere ibu ọrụ nke a n’afọ ofufo n’ihi ịhụnanya ha nwere maka obodo ha ma kwụọ ụgwọ ihe nile e mefuru site n’akpa ha. Ọ bụ ihe ùgwù nye ndị dị otú ahụ imefu oké ego iji nweta ihe nile dị mkpa maka ihe ngosi nke mara mma. Okwu ahụ mụbara wee ghọọ “iwepụta ihe, inye ihe n’ụba.” (Tụlee 2 Pita 1:11.) Ya mere Pita na-agba anyị ume ka anyị nwee n’onwe anyị, ọ bụghị ọ̀tùtụ̀ dị nta nke nsọpụrụ Chineke, kama ọ̀tùtụ̀ kasi kwe mee nke àgwà nke a dị oké ọnụ ahịa.
10, 11. (a) N’ihi gịnị ka mgbalị ji dị mkpa iji zụlite ma gosipụta nsọpụrụ Chineke? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi merie na mgba ahụ?
10 Otú ọ dị, gịnị mere mgbalị dị otú ahụ ji dị mkpa iji zụlite ma na-egosipụta nsọpụrụ Chineke? Na nke mbụ, e nwere mgba a na-agba megide anụ ahụ na-adịghị ike. Ebe ọ bụ na “nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata,” ọ bụghị ihe dị mfe ibi ndụ nke ezi nrubeisi nye Chineke n’ụzọ nile. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 7:21-23) “A ga-esogbukwa ndị nile ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke n’ime Kraịst Jisọs,” ka Pọl onyeozi kwuru. (2 Timoti 3:12) Ee, onye Kraịst nke na-agba mbọ ịdị ndụ n’ụzọ nke na-atọ Chineke ụtọ aghaghị ịdị iche pụọ n’ụwa. O nwere ụkpụrụ ndị dị iche na nzube ndị dị iche. Dị ka Jisọs dọrọ aka ná nti, nke a na-akpali ịkpọasị nke ụwa ajọ omume nke a.—Jọn 15:19; 1 Pita 4:4.
11 Otú o sina dị, anyi pụrụ imeri na mgba ahụ, n’ihi na “[Jehova, NW] matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ ndị na-asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:9) Otú ọ dị, anyi aghaghị ime òkè nke anyi site n’inọgide na-agbaso nsọpụrụ Chineke.
Ịzụlite Nsọpụrụ Chineke
12. Olee otú Pita si gosipụta ihe dị mkpa iji zụlite nsọpụrụ Chineke n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karị?
12 Ya mere, olee otú ị pụrụ isi zụlite nsọpụrụ Chineke nke a n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karị? Pita onyeozi wepụtara ihe enyemaka. Na 2 Pita 1: 5, 6, mgbe ọ na-edepụta àgwà ndị na-aghaghị ịdị n’okwukwe anyị, o bu ụzọ depụta ihe ọmụma tupu nsọpụrụ Chineke. Ná mmalite n’otu isiakwụkwọ ahụ, o dere, sị: Ike o ji bụrụ chi enyewo n’aka anyị ihe nile dịịri ndụ na nsọpụrụ Chineke n’efu, site ná mmazu nke onye ahụ kpọrọ anyi.’ (2 Pita 1:3) Otú a Pita jikọtara nsọpụrụ Chineke na ezi ihe ọmụma banyere Jehova.
13. N’ihi gịnị ka ezi ihe ọmụma ji dị mkpa n’ịzụlite nsọpụrụ Chineke?
13 N’ezie, ọ bụrụ na ezi ihe ọmụma adịghi, ọ bụ ihe na-agaghi ekwe mee izụlite nsọpụrụ Chineke. N’ihi gịnị? Ee, cheta na nsọpụrụ Chineke bụ nke a na-enye Jehova n’onwe ya, ọ na-apụtakwa ìhè site n’ụzọ anyị si na-ebi ndụ anyị. Ezi ihe ọmụma banyere Jehova si otú a bụrụ ihe dị mkpa, ebe ọ bụ na o metụtara imara ya nke ọma, n’ụzọ chiri anya, na-aghọta àgwà na ụzọ ya nile nke ọma. Dị ka nke ka mkpa, o metụtara ịgba mbọ iṅomi ya. (Ndị Efesọs 5:1) Ka anyị na-enwe ọgani-hu n’ịmụta banyere Jehova nakwa n’igosipụta ụzọ na àgwà ya nile ná ndụ anyị, otú ahụ ka anyị na-amata onye ọ bụ n’ụzọ dị mma karị. (2 Ndị Kọrint 3:18; tụlee 1 Jọn 2:3-6.) Nke a na-emesịa rụpụta inwe nghọta miri emi banyere àgwà Jehova ndị dị oké ọnụ ahịa, inwe òtùtụ̀ zuru ezu karị nke nsọpụrụ Chineke.
14. Iji nweta ezi ihe ọmụma, gịnị ka usoro anyị ji enwe ọmụmụ ihe onwe onye kwesịrị ịgụnye, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
14 Olee otú ị ga-esi nweta ezi ihe ọmụma dị otú ahụ? Ọ bụghị site n’ụzọ ndị e mere ka ha dịri mfe. Iji nweta ezi ihe ọmụma, anyị aghaghị ịdị uchu n’ịmụ Okwu Chineke na akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Ọmụmụ ihe onwe onye dị otú ahụ kwesịrị ịgụnye usoro ihe omume nke ọgụgụ Bible, dị ka e si hazie ya n’ihe banyere Ụlọ Akwkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. (Abụ Ọma 1:2) Ebe ọ bụ na Bible bụ onyinye sitere n’aka Jehova, ihe anyị na-eme n’ihe banyere ọmụmụ Bible onwe onye bụ ngosipụta nke ókè anyị nwere ekele n’onyinye ahụ. Gịnị ka usoro ị na-eji enwe ọmụmụ ihe onwe onye na-egosi banyere ókè i nweruru ekele maka ndokwa ime mmụọ ndị Jehova mere?—Abụ Ọma 119:97.
15, 16. (a) Gịnị pụrụ inyere anyị aka iji zụlite agụụ ime mmụọ maka ọmụmụ Bible onwe onye? (b) Ọ bụrụ na ọmụmụ Bible onwe onye ga-eduba n’anyị ịzụlite nsọpụrụ Chineke, gịnị ka e kwesịrị ime mgbe a na-agụ otu akụkụ nke Okwu Chineke?
15 O kwere nghọta na ịgụ ihe na ịmụ ihe abụghị ihe dị mfe nye ndị ụfọdụ. Ma site n’iwepụta oge na mgbalị, ị pụrụ izụlite agụụ ime mmụọ maka inwe ọmụmụ Bible onwe onye. (1 Pita 2:2) Mgbe i jiri obi ekele tụgharịa uche n’ihe nile Jehova mewooro gị, na ndị ọ na-emere gị, nakwa ndị ọ gaje ịmere gị, obi gị ga-akpali gị ịmụ ịhe nile i nwere ike ịmụ banyere ya.—Abụ Ọma 25:4.
16 Ma ọ bụrụ na ọmụmụ Bible onwe onye dị otú ahụ gaje ịrụpụtara gị ịzụlite nsọpụrụ Chineke, nzube gị agaghị abụ nanị ịgụcha peji nile nke isiokwu ahụ ma ọ bụ imejupụta uche gị n’ihe ọmụma. Kama nke ahụ, mgbe ị gụrụ otu akụkụ nke okwu Chineke, ị ghaghị iwepụta oge iji tụgharịa uche n’isiokwu ahụ, na-ajụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị ka ọ na-akuziri m banyere àgwà na ụzọ nile nke Jehova ndị dị nro? Olee ụzọ m pụrụ ịsi yie Jehova karị n’akụkụ ndị a?’
17. (a) Gịnị ka anyị na-amụta banyere obi ebere nke Jehova site n’akwụkwọ Hosea? (b) Olee otú ịtụgharị uche n’obi ebere Jehova kwesịrị isi metụta anyị?
17 Tụlee otu ihe atụ. N’oge na-adịbeghị anya gara aga ọgụgụ Bible e depụtaara anyị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchi Chineke kpọtụrụ uche anyi n’akwụkwọ Hosea. Mgbe ị gụsirí akwụkwọ Bible nke a, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Gi ka m mụtara banyere Jehova dị ka Onye—àgwà ya nile na ụzọ ya nile—site n’akwụkwọ nke a?’ Ụzọ ndị so dee Bible si mesịa jiri ya mee ihe na-egosi na anyị mụtara ihe dị ukwuu banyere obi ebere nke Jehova site n’akwụkwọ Hosea. (Jiri Matiu 9:13 tụlee Hosea 6:6; Ndị Rom 9:22-26 na Hosea 1:10 nakwa 2:21-23.) E ji mmeso ndị Hosea mesoro nwunye ya, bụ́ Goma, maa atụ ịdị njikere Jehova dị imere ndị Israel ebere. (Hosea 1:2; 3:1-5) Ọ bụ ezie na ịwụfu ọbara, izu ohi, ịkwa iko, na ikpere arụsị jupụtara n’Israel, Jehova ‘gwara Israel okwu nke ga-aba ya n’obi.’ (Hosea 2:13, 14; 4:2) Ọ bụghị iwu na Jehova ga-egosi obi ebere dị otú ahụ kama ọ ga-eme otú ahụ “n’afo ofufo” ya, ma ọ bụrụhaala na ndị Israel gosipụtara nchegharị sitere n’obi ma site n’ụzọ mmehie ha chigharịa. (Hosea 14:4; tụlee Hosea 3:3.) Ka ị na-atụgharị uche n’ụzọ dị otú a banyere obi ebere Jehova nke na-enweghị atụ, ọ ga-akpali obi gị, na-emesi mmekọrịta onwe onye i nwere n’ebe ọ nọ ike.
18. Mgbe a tụgharịsịrị uche n’obi ebere Jehova dị ka e mesiri ya ike na Hosea, gịnị ka ị purụ ịjụ onwe gị?
18 Otú ọ dị, ihe ndị ọzọ dị mkpa. “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị ndị ebere: n’ihi na ndị ahụ ka ga-emere ebere,” ka Jịsọs kwuru. (Matiu 5:7) Ya mere, mgbe ị tụgharịsịrị uche n’obi ebere Jehova dị ka e mesiri ya ike n’akwụkwọ Hosea, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m pụrụ isi ṅomie obi ebere Jehova nke ọma ná mmeso m na-emeso ndị ọzọ? Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị bụ onye mehiere megide m ma ọ bụ mee ihe wutere m ma rịọ maka mgbaghara, àna m eji “obi ụtọ” na-agbaghara?’ (Ndị Rom 12:8; Ndị Efesọs 4:32) Ọ bụrụ na ị na-eje ozi n’ọgbakọ dị ka onye okenye a họpụtara ahọpụta, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Mgbe m ji okwu ikpe n’aka, olee otú m pụrụ isi ṅomie Jehova n’ụzọ ka mma, bụ onye ‘dị njikere igbaghara,’ karịsia mgbe onye mehierenụ gosirị ezi ihe àmà nke ncheghari sitere n’obi?’ (Abụ Ọma 86:5; Ilu 28:13) ‘Gini ka m ga-ele anya ya dị ka ihe ndabere maka igosipụta obi ebere?’—Tụlee Hosea 5:4 na 7:14.
19, 20. (a) Gịnị ka ọ na-arụpụta mgbe ọmụmụ Bible bụ nke e mere n’ụzọ ruru ala? (b) Gịnị bụ ihe enyemaka ọzọ e nwere n’ịzụlite nsọpụrụ Chineke?
19 Lee ihe na-akwụghachi ụgwọ ọmụmụ Bible nke onwe gị na-aghọ mgbe e mere ya n’ụzọ ruru ala otú a! Obi gị ga-ejupụta n’ekele maka àgwà Jehova ndị dị oké ọnụ ahia. Sitekwa n’ịnọgide na-agba mbọ iṅomi àgwà ndị a ná ndụ gị, ị ga-eme ka mmekọrịta i nwere n’ebe ọ nọ siwanye ike. Ị ga-esi otú a na-agbaso nsọpụrụ Chineke dị ka ohu Jehova nke raraworo onwe ya nye, meekwa baptism.—1 Timoti 6:11.
20 Enyemaka ọzọ dị n’ịzụlite àgwà nke a dị oké ọnụ ahia bụ nke a pụrụ ịchọta n’ebe Jisọs Kraịst nọ—bụ́ ihe nlereanya zuru okè nke nsọpụrụ Chineke. Olee otú ịgbaso ihe nlereanya Jisọs ga-esi nyere gị aka n’ịzụlite na igosipụta nsọpụrụ Chineke? Isiokwu nke dị na peji 18 ga-atụle nke a na ajụjụ ndị yiri ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a N’ihe banyere okwu Grik ahụ bụ di-o’ko (“na-agbaso”), akwụkwọ bụ The New International Dictionary of New Testament Theology na-akọwa na n’akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche, okwu ahụ “pụtara n’ụzọ [nkịtị] ịchụso, ịgbaso, ịchụgharị, . . . nakwa n’ụzọ [ihe atụ] iji ịnụ ọkụ n’obi na-achụso ihe, ịgbalị ịrụzu ihe, ịgbalị inweta ihe.”
Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?
◻ Gịnị mere na baptism abụghị nzọụkwụ ikpeazụ ị na-agbaso n’ibi obi onye Kraịst gị?
◻ Gịnị ka “nsọpụrụ Chineke” pụtara, oleekwa otú i si enye ihe àmà banyere ya?
◻ N’ihi gịnị ka oké mgbalị ji dị mkpa iji zụlite nsọpụrụ Chineke?
◻ Olee otú ị pụrụ isi zụlite nsọpụrụ Chineke n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karị?