Moses Nke Nwere Mpì Ihe Osise nke Na-akpali Ajụju
Ọ BỤRỤ na i jewo Italy, ọ pụrụ ịbụ na ị hụwo ihe ọkpụkpụ Michelangelo a ma ama bụ Moses nke nọdụrụ ala, nke dị na Chọọchị nke St. Peter in Chains, nke dị na Rom. Lee nnọọ ihe na-akpali ajụjụ ihe ọkpụkpụ nke narị afọ nke iri na isii ahụ bụ, ka ọ na-egosịpụta Moses nke nwere mpì ndị pupụtara ya n’isi! N’ezie, ọtụtụ ndị na-ese ihe osise esepụtawo Moses nwere mpì. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ dị ihe mgbakwasị ụkwụ ọ bụla Bible nyere maka echiche ahụ?
Nsụgharị Bible nke Latin Vulgate na-agwa anyị na mgbe ya na Chineke kparịtasịrị ụka n’Ugwu Sainaị, ihu Moses pupụtara “mpì.” (Ọpụpụ 34:29, 30, 35; tụlee Douay Version.) A maara Vulgate nke ukwuu n’akụkụ dị ukwuu nke Krisendom, o wee si otú a nwee mmetụta n’ụzọ esi ghọta akwụkwọ nsọ. Otu ọ dị, okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “ipu mpì” pụtakwara ‘inwupụta ìhè’ ma ọ bụ ‘igbuke egbuke.’ (Lee ntụaka ala ala peji nke Douay Version n’Ọpụpụ 34:29.) Dị ka akwụ-kwọ ahụ bụ Theological Wordbook of the Old Testament, okwu ahụ “na-egosi ụdị nke mpì kama ibụ mpì n’onwe ya.” Ọ bụrụkwa na e lee ya anya n’ụdị ihe osise, mgbukepụ nke ìhè na-eyi mpì n’ezie.
Eziokwu ahụ bụ na ihu Moses gbukepụrụ ìhè pụrụ ikwe nkọwa, ebe ọ bụ na ebube Jehova ka gabigasiri nnọọ. (Ọpụpụ 33:22; 34:6, 7) Pọl na-akwado nke a ịbụ nghọta ziri ezi, site n’ide banyere “ebube” nke ihu Moses, ọ bụghị nke “mpì” ya.—2 Ndị Kọrint 3:7.
Otú a ezi nghọta nke asụsụ Bible na-eduga n’ihe ọmụma dị omimi karị nke akụkọ Bible ahụ. N’ụzọ kwesm ekwesi, mpì ndị ahụ dị n’ihe ọkpụkpụ Michelangelo ahụ a ma ama nke Moses bụ nnọọ ihe osise na-akpali ajụjụ nke si ná ndehie ihe e mere na nsụgharị nke e deziworo eri ogologo oge gara aga.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 7]
Based on Short History of Art