Ndụ na Ije Ozi Jisọs
lhe Ịrịba Ama nke Mgbe lkpeazụ
Ọ BỤ ehihie ụbọchị Tuesday ugbu a. Ka Jisọs na-anọdụ n’elu Ugwu Olive, na-ele ụlọ ukwu ahụ nke dị na ndịda anya, Pita, Andru, Jemes, na Jọn bịakwutere ya iche. Ha nwere nchegbu banyere ụlọ ukwu ahụ, ebe ọ bụ na Jisọs ka busịrị nnọọ n’amụma na ‘a gaghị ahapụ otu nkume n’elụ ibe ya n’ime ya.’
Ma o doro anya na ha bu ihe karịrị nke ahụ n’uche mgbe ha na-abịkwute Jisọs. N’izu ole na ole gara aga, o kwuwo okwu banyere “onụnọ,” [NW] ya mgbe “a ga-ekpughe Nwa nke mmadụ.” N’otu oge gakwara aga, ọ gwawo ha banyere “ọgwụgwụ nke ụsoro ihe nke a” [NW]. Ya mere ndị ahụ na-eso ụzọ nwere ọtụtụ ajụjụ.
“Gwa anyị,” ka ha kwuru, “olee mgbe ihe ndị a ga-abụ [nke ga-arụpụta mbibi nke Jerụsalem na ụlọ ukwuu ya]? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke [ọnụnọ, NW] gị, na nke ọgwụgwụ [usoro ihe nke a, NW]?” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ajụjụ ha bụ nke nwere akụkụ atọ. Nke mbụ, ha chọrọ ịmara banyere ọgwụgwụ nke Jeru-salem na ụlọ ukwuu ya, mgbe ahụ banyere ọnụnọ Jisọs n’ike Alaeze, na n’ikpeazụ banyere ọgwụgwụ nke ụsoro ihe nile.
Ná nzaghachi ya dị ogologo, Jisọs zara akụkụ atọ nile nke ajụjụ ahụ. O nyere ihe àmà nke na-egosi mgbe usoro ihe nile nke ndị Juu ga-agwụ; ma o nyekwara ihe àmà ndị ọzọ. O nyekwara ihe àmà nke ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya n’ọdịnihu mara na ha na-ebi ndụ n’oge ọnụnọ ya, na ha na-ebikwa na nso nke ọgwụgwụ usoro ihe nile.
Ka afọ na-agabiga, ndị ozi malitere ịhụ mmezu nke amụma Jisọs. Ee, kpọmkwem ihe ndị ahụ o buru n’amụma malitere imezu n’ụbochị ha. Otú a, ndị Kraịst bụ́ ndị dịrị ndụ ruo 37 afọ n’ihu, na 70 O.A., abụghị ndị mbibi nke usoro ihe ndị Juu na ụlọ ukwuu ya bịara na mberede.
Otụ́ ọ dị, ọnụnọ Kraịst na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a ewereghị ọnọdụ na 70 O.A. Ọnụnọ ya n’ike Alaeze weere ọnọdụ mgbe ogologo oge gasịrị. Ma olee mgbe ọ bụ? Ntụle nke amụma Jisọs na-ekpughe nke a.
Jisọs buru amụma na “agha dị iche iche na akụkọ agha” ga-adị. “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ,” a ga-enwekwa ụkọ nri, ala ọma jijiji na ọrịa na-efe efe. A ga-akpọ ndị na-eso ụzọ ya asị, gbuokwa ha. Ndị amụma ụgha ga-ebili, duhiekwa ọtụtụ ndị. Mmebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi. N’otu oge ahụkwa, a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi dị ka ihe àmà nye mba nile.
Ọ bụ ezie na amụma Jisọs nwere mmezu a kpaara ókè tupu mbibi nke Jerusalem na 70 O.A., akụkụ dị ụkwụu nke mmezu ya na-ewere ọnọdụ n’oge ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Iji nlezi anya tụleghachi ihe ndị na-eme n’ụwa kemgbe 1914 na-ekpughe na amụma ahụ dị mkpa nke Jisọs anọwo na-emezu n’ụzọ ka ukwuu kemgbe afọ ahụ.
Akụkụ ọzọ nke ihe àmà ahụ Jisọs nyere bụ mpụta ìhè nke “ihe arụ ahụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” N’afọ 66 O.A., ihe arụ nke a pụtara n’ụdị nke “usuu ndị agha” nke Rom nke gbara Jerusalem gburugburu, gwupuokwa mgbidi ụlọ ukwuu ahụ. “Ihe arụ” ahụ guzoro n’ebe ọ na-ekwesịghị ịnọ.
Ná mmezu ka ukwuu nke ihe àmà ahụ, ihe arụ ahụ bụ Njikọ Mba Dị lche lche (League of Nations) na nke nọchiri ya, bụ́ Òtù Mba Ndị Dị n’Otu (United Nations). Krisendom na-ele òtù udo ụwa nke a anya dị ka ihe nnọchianya nke Alaeze Chineke. Lee nnọọ ka o si bụrụ ihe arụ! Otú ọ dị, ka oge na-aga, ike ọchịchị dị iche iche nke nọ n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu ga-atụgharị megide Krisendọm (Jerusalem nke oge a), bibiekwa ya.
Otu a Jisọs buru amụma, sị: “Mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya a ka adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” Ọ bụ ezie na mbibi Jemsalem n’afọ 70 O.A. bụ n’ezie oké mkpagbụ, nke a kọrọ na e gburu ihe karịrị otu nde mmadụ na ya, ọ bụghị oké mkpagbụ karịa Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ n’ụbọchị Noa. Ya mere, a ka ga-enwe mmezu ka ukwuu nke akụkụ nke a nke amụma Jisọs. Matiu 24:2-22; 13:40, 49; Mak 13: 3-20; Luk 21:7-24; 19:43, 44; 17:20-30; 2 Timoti 3:1-5.
◆ Gịnị kpalịrị ndị ahụ na-eso ụzọ ịjụ ajuju, ma gịnị ọzọ ka o yịrị ka hà bu n’uche?
◆ Akụkụ dị aṅaa nke amụma Jịsọs mezuru n’afọ 70 O.A., ma gịnị bụ ihe na-emeghị mgbe ahụ?
◆ Olee mgbe amụma Jisọs nwere mmezu nke mbụ, ma olee mgbe ọ ga-enwe mmezu ka ụkwuu?
◆ Gịnị bụ ihe arụ ahụ ná mmezu nke mbụ ya na na nke ikpeazụ?
◆ N’ịhị gịnị ka oké mkpagbu ahụ na-ejighị nwee mmezu ya nke ịkpeazụ ná mbịbị nke Jerusalem?