‘Ndị Nile Nọ n’Ime Ili Ncheta’
Ị̀ PỤRỤ ijide n’aka na ihe ka ọtụtụ ná ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ? Ee, ebe Jisọs kwuru, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị [n’ime ili ncheta, NW] ga-anụ olu ya, ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Rịba ama okwu ahụ nke bụ “ili ncheta,” bụ nke a na-ahụ nanị na New World Translaton. Ọ na-echetara anyị mkpa ike ncheta ihe nke Chineke dị ná mbilite n’ọnwụ ahụ.
N’ihi gịnị ka a na-ejighi okwu ahụ a na-ejikarị eme ihe bụ “ili,” mee ihe? Ọ bụ n’ihi na Jisọs ejighị okwu ìgwè nke okwu Grik ahụ bụ tá’phos, mee ihe, bụ́ nke pụtara “ili” ma ọ bụ “ebe ili ozu.” N’eziokwu, ọ bụghị ndị nile nwụworo anwụ ka e liri n’ime ili nkịtị dị iche iche ma ọ bụ ta’phoi. Otú ọ di, ndị ahụ Chineke ga-akpọghachi ná mbilite n’ọnwụ ahụ dị ná ncheta ya. E gosiri nke a site n’ojiji Jisọs jiri ụdị okwu ìgwè nke okwu ahụ bụ mnemeí on mee ihe, bụ́ nke nwere njikọ chiri anya n’etiti ya na okwu Grik ndị ahụ ihe bụ isi ihe ha pụtara bụ “icheta ihe.” (Matiu 16:9; Mak 8:18) Akwụkwọ bụ Greek-English Lexicon nke H. G. Liddell na R. Scott dere, sụgharịrị mne-meí’on dị ka “ihe ncheta, ncheta, ihe ndekọ nke mmadụ ma ọ bụ ihe, . . . ili, . . . n’ụzọ bụ isi, ihe e ji echeta ihe.”
Otú a, nsụgharị Bible New World Translation na-egosipụta ọdịiche dị n’etiti okwu ndị ahụ bụ táphos na mne-meíon. Ọ bụkwa ihe kwesịrị iriba ama na nsụgharị Bible dị iche iche na-ejikwa okwu abụọ di iche iche na-eme ihe na Matiu 23:29 ebe okwu Grik abụọ ndị ahụ pụtara. Nsụgharị Revised Standard Version dere ya n’ụzọ dị otú a: “Unu na-ewu ili [bụ́ otu ụdị nke táphos] nke ndị amụma, na-edozikwa ihe ncheta (bụ́ otu ụdi nke mne-meíon) nke ndị ezi omume.”
Onye Okike nke mmadụ adịghị echefu ụkpụrụ ndụ nke ọtụtụ puku nde ụmụ mmadụ ndị dịworo ndụ n’oge gara aga, (Abụ Ọma 139:16; 147:4; Matiu 10:30) Mgbe oge ya ruru, ọ ga-echeta ndị ahụ nọ n’ime “ili ncheta” wee weghachite ha ná ndụ n’elu ala nke e meworo ka ọ dị ọcha. Lee ka o si bụrụ ihe agbamume na nkasi obi nye anyị ịmara na ike ncheta ihe zuru okè nke Chineke apụghi ịda ada!—Mkpughe 20:11-13.