Okwu Chineke Bụ Eziokwu
“Were eziokwu doo ha nsọ: okwu gị bụ eziokwu.”—JỌN 17:17
1. Olee otú onye ọbụ abụ ahụ bụ onye Hibru si lee Bible anya, ma olee otú ọtụtụ ndị si ele ya anya taa?
“OKWU gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Otú ahụ ka onye ọbụ abụ ahụ bụ onye Hibru kwuru. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole taa nwere nsọpụrụ dị otú ahụ maka Okwu Chineke. N’ime narị afọ nke iri abụọ nke a, Okwu Chineke dị n’ụdị e dere ede dị ka Bible Nsọ. A sụgharịwo ya gaa n’ọtụtụ asụsụ, kesaakwa ya n’ụzọ sara mbara karị akwụkwọ ọ bụla ọzọ e nweworo n’akụkọ ihe mere eme. Ma, ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu na-ajụ ịnakwere ya dị ka oriọna dịịrị ụkwụ ha. N’akụkụ ka ukwuu, ọbụna ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst na-ahọrọkarị ịgbaso echiche nke onwe ha kama ikwere ka Bible nye ìhè n’okporo ụzọ ha.—2 Timoti 3:5.
2, 3. Olee ụzọ Ndịàmà Jehova si ele Bible anya, oleekwa abamuru ndị nke a wetawooro ha?
2 N’ụzọ na-eyighị nke a ma ọlị, anyị, bụ Ndịàmà Jehova kwere ihe onye ọbụ abụ ahụ kwuru. Nye anyị, Bible bụ ihe nduzi Chineke nyere. Anyị maara na “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) N’ụzọ na-eyighị ihe ọtụtụ mmadụ na-eme taa, anyị adịghị eme nnwale n’okwu ndị metụtara omume ọma na akparamagwa. Anyị maara ihe ziri ezi n’ihi na Bible na-agwa anyị.
3 Nke a ewetaworo anyị ọtụtụ abamuru dị ukwuu. Anyị amatawo onye Jehova bụ, anyị amụtawokwa oké nzube nile o nwere banyere elu ala na ihe a kpọrọ mmadụ, ya mere, obi siri anyị ike na ọ pụrụ ikwe anyị na ezinụlọ anyị dị iche iche omume inweta ọdịnihu dị mma. Anyị ji obi anyị nile kwenyere onye ọbụ abụ ahụ, onye sịrị: “Lee ka m siri hụ iwu gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche. Ihe nile i nyere n’iwu na-eme m ka m mara ihe karị ndị iro m; n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka nke ahụ dịịrị m.”—Abụ Ọma 119:97, 98.
Ịgba Àmà site n’Akparamagwa
4. Ịnakwere Bible dị ka Okwu Chineke na-atụkwasị ibu ọrụ dị aṅaa n’isi anyị?
4 Ya mere, anyị nwere ezi ihe mere anyị kwesịrị iji kwenyere okwu ahụ Jisọs gwara Nna ya, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ma ịnakwere eziokwu nke a na-atụkwasị ibu ọrụ n’isi anyị. Anyị aghaghị inyere ndị ọzọ aka ịghọta na Okwu Chịneke bụ eziokwu. N’ụzọ dị otú a, ha onwe ha ga-enwekwa ike inweta ngọzi ndị ahụ anyị na-enweta. Olee ụzọ anyị pụrụ isi nyere ha aka ime otúotú ahụ? Otu ihe bụ na anyị aghaghị ime mgbalị nile iji tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. N’ụzọ dị otú ahụ, ndị obi ha ziri ezi ga-ahụta na ụzọ nke Bible bụ ụzọ kasị mma n’ezie.
5. Ndụmọdụ dị anaa ka Pita nyere banyere ịgba àmà site n’akparamagwa anyị?
5 Nke a bụ isi ihe dị na ndụmọdụ ahụ Pita onyeozi nyere ụmụ nwanyị ndị Kraịst ndị di ha bụ ndị na-ekweghị ekwe. Ọ gwara ha, sị: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbụna a sị na ụfọdụ ekwenyeghị okwu Chineke, ka e wee sịte n’ibi obi nwunye ha rite ha n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu.” (1 Pita 3:1) Nke ahụ bụkwa ụkpụrụ na-akwado ndụmọdụ o nyere ndị Kraịst nilenile—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị—mgbe ọ sịrị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee sịte n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 2:12; 3:16.
Amamihe Ka Elu nke Bible
6. Olee ụzọ Pita si nyere anyị aka ịhụ na anyị kwesịrị inyere ndị ọzọ aka ịmata uru nke Bible?
6 N’ịga n’ihu, ndị Kraịst pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịmata abamuru nke Bible ma ọ bụrụ na ha emee dị ka Pita nyekwara ndụmọdụ ka ha mee, sị: “Doonụ Kraịst anyị nsọ n’ịme obi unu dị ka Onyenwe unu: bụrụkwanụ ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu, ma ka unu were nwayọọ na egwu gọpụ.” (1 Pita 3:15) Ndị ozi bụ ndị Kraịst kwesịrị inwe ike ịkwado Bible, kọwaakwara ndị ọzọ na ọ bụ Okwu Chineke. Olee ụzọ ha pụrụ isi mee nke ahụ?
7. Eziokwu dị aṅaa banyere Bible na-egosi na ọ ghaghị ịbụ Okwu Chineke?
7 Otu ụkpụrụ ntụgharị uche nke na-akwali akwalị dị n’akwụkwọ Ilu. N’ebe ahụ anyị na-agụ, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, . . . ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta. N’ihi na Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.” (Ilu 2:1-6) Amamihe nke Chineke dị n’ime Bible. Mgbe onye obi ya ziri ezi hụrụ amamihe ahụ dị omịmi, ọ pụghị ịhapụ ịghọta na Bible bụ ihe karịrị okwu nke mmadụ.
8, 9. Olee ụzọ e siworo gosipụta na o ziri ezi bụ́ ndụmọdụ Bible banyere ụzọ e kwesịrị isi lee inweta ihe onwunwe anya?
8 Tụlee ihe atụ ole na ole. Taa, a na-ejikarị otú mmadụ nwedebere n’ego na-emere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe ịga nke ọma o nwere. Ka mmadụ na-enwetakwu ego, otú a ka a na-agụ ya n’onye ihe na-agara nke ọma. Otú ọ dị, Bible na-adọ aka ná ntị megịde ilekwasịkarị anya n’ihe onwunwe. Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:9, 10; tụlee Matịu 6:24.
9 Ahụmahụ egosiwo na ịdọ aka ná ntị nke a kwesịrị nnọọ ekwesị. Otu onyeọkà n’ịgwọ ọrịa uche kwuru, sị: “Ịghọ Onye Mbụ na ịba ọgaranya adịghị eme ka i nwee echiche nke onye mezuworo ihe, nwee afọ ojuju, echiche nke ịbụ onye a na-asọpụrụ, onye a na-ahụkwa n’anya n’ezie.” Ee, ndị na-etinye ike ha nile n’ịchụso akụ na-aghọkarị ndị nwere obi ilu na nkụda aka. Akwụkwọ nsọ, ọ bụ ezịe na o kwenyere na ego bara uru, zoro aka n’ihe dị mkpa karị: “Amamihe bụ ndò, ego bụkwa ndọ̀: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onyenwe ya dị ndụ.”—Eklisiastis 7:12.
10. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iịi nakwere ndụmọdụ Bible banyere ilezi anya n’ihe metụtara mkpakọrịta anyị?
10 Bible nwere ọtụtụ ụkpụrụ ndị dị otu ahụ. Otu nke ọzọ bụ: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-eme-jọ.” (Ilu 13:20) Ahụmahụ egosiwokwa na nke a bụ eziokwu. Nrụgide ndị ọgbọ edubawo ọtụtụ ndị na-eto eto n’ịṅụbịga mmanya ókè, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na omume rụrụ arụ. Ndị ọ bụla nke na-eso ndị na-ekwu okwu rụrụ arụ na-akpakọrịta na-emesịa hụ na ha onwe ha na-amalitekwa ikwu okwu rụrụ arụ. Ọtụtụ ndị na-ezuru ihe ndị ha na-arụrụ ọrụ n’ihi na ‘onye ọ bụla na-eme ya.’ N’eziokwu, dị ka Bible kwukwara: “Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.”—1 Ndị Kọrint 15:33.
11. Olee ụzọ otu ihe ọmụmụ banyere akparamagwa mmadụ si gosi amamihe nke dị n’ịgbaso Ukpụrụ Ọma ahụ?
11 Otu n’ime ndụmọdụ ndị a kasị mara amara nke dị na Bible bụ ihe ahụ a na-akpọ Ụkpụrụ Ọma ahụ. “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu.” (Matiu 7:12) A sị na ihe a kpọrọ mmadụ na-agbaso ụkpụrụ nke a, ụwa gaara abụ nnọọ ebe dị mma karị. Ma ọbụna ma a sị na ụmụ mmadụ n’ozuzu ha adịghị agbaso ụkpụrụ ahụ, ọ dị mma karị ka gị onwe gị gbasoo ya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na e mere anyị ichebara ndị ọzọ echiche, nweekwa mmetụta banyere ha. (Ọrụ 20:35) Otu ihe ọmụmụ banyere akparamagwa mmadụ e mere na United States iji chọpụta otú ụmụ mmadụ na-esi emeghachi omume mgbe ha nyeere ndị ọzọ aka ruru ná nkwubi okwu nke a: “Ya mere, o yịrị ka ichebara ndị ọzọ echiche bụ nnọọ ihe dị n’ime mmadụ dị ka anyị ichebara onwe anyị echiche.”—Matiu 22:39.
Ndụmọdụ Bible—Nwere Amamihe n’Ụzọ Pụrụ Iche
12. Gịnị bụ otu ihe nke na-eme ka Bible bụrụ ihe pụrụ iche?
12 Otú ọ dị, e wepụkwa Bible e nwere ọtụtụ ebe a na-esi enweta ndụmọdụ taa. Akwụkwọ akụkọ dị iche iche na-enwe akụkụ ebe ndị na-enye ndị na-agụ ha ndụmọdụ, ebe ndị a na-ere akwụkwọ jupụtakwara n’akwụkwọ ndị na-enyere mmadụ aka ime ihe ụfọdụ n’onwe ya. Ọzọkwa, e nwere ndị ọkà mmụta akparamagwa mmadụ, ndị ọkà n’inye ndụmọdụ, na ndị ọzọ ndị na-enye ndụmọdụ n’akụkụ ihe omume dị iche iche. Ma Bible pụrụ iche, ma ọ dịghị ihe ọzọ, n’akụkụ atọ dị iche iche. Nke mbụ, ndụmọdụ ndị ọ na-enye na-aba uru mgbe nile. Ọ dịghị mgbe ọ na-abụ okwu ọnụ efu, ọ dịghịkwa mgbe ọ na-ewetara anyị mmerụahụ. Onye ọ bụla nke na-agbaso ndụmọdụ Bible aghaghị ikwenyere onye ọbụ abụ ahụ mgbe ọ gwara Chineke n’ekpere, sị: “Ihe àmà gị nile kwesịrị ntụkwasị obi nke ukwuu.”—Abụ Ọma 93:5.
13. Gịnị na-egosi na Bible bụ nnọọ ihe dị elu karị ebe dị iche iche e si enweta amamihe mmadụ?
13 Nke abụọ, Bible anọwo ogologo oge. (1 Pita 1:25; Aịsaịa 40:8) Ọ bụ ihe a ma nnọọ ama na ndụmọdụ ndị e nwetara n’aka mmadụ na-agba-nwe agbanwe, ihe ọha mmadụ nakweere n’otu afọ na-abụkarịkwa ihe a katọrọ n’afọ na-eso ya. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na e dezuru Bible n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, ihe dị n’ime ya ka bụkwa ndụmọdụ kasị nwee amamihe dịnụ, okwu ya nile metụtakwara ndị bị n’akụkụ ụwa nile. Okwu ndị dị na ya nwere otu ikike ahụ ma ànyị bị n’Afrịca, n’Asia, na Ndịda ma ọ bụ Ugwu America, na Europe, ma ọ bụ n’agwaetiti nile nke oké osimiri.
14. N’ụzọ dị aṅaa ka ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke si bụrụ ihe na-enweghị atụ?
14 Nke ikpeazụ, ọ dịghị ihe ọ bụla a pụrụ iji tụnyere otú ndụmọdụ Bible si emetụta ọtụtụ ihe dị iche iche. Otu ilu dị na Bible kwuru, sị: “Jehova na-enye amamihe,” n’agbanyeghịkwa ụdị ihe isi ike ma ọ bụ mkpebi anyị na-eche ihu, e nwere amamihe dị na Bible nke ga-enyere anyị aka. (Ilu 2:6) Ụmụntakịrị, ndị na-eto eto, ndị mụrụ ụmụ, ndị agadị, ndị e were n’ọrụ, ndị were mmadụ n’ọrụ, ndị nọ n’ọkwá ọchịchị, ha nile na-achọpụta na amamihe dị na Bible metụtara ha. (Ilu 4:11) Ọbụna mgbe anyị chere ihu ọnọdụ ndị a na-amaghị ama n’oge Jisọs na ndị ozi ya, Bible na-enye anyị ndụmọdụ dị ịrè. Dị ka ihe atụ, laa azụ na narị afọ mbụ ahụ, a maghị ihe ọ bụla banyere ise ụtaba n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Taa, ọ bụ ihe gbasazuru n’ebe nile. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, onye ọ bụla nke rịbara ama ndụmọdụ Bible ahụ bụ ka mmadụ zere ‘ikwe ka ihe ọ bụla chịa [ma ọ bụ duzie] ya,’ sachapụkwa n’onwe ya “mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ,” ga-ezere àgwà nke a, nke bụ ihe na-eri mmadụ ahụ, na-ebibikwa ahụ ike. —1 Ndị Kọrint 6:12; 2 Ndị Kọrint 7:1.
Maka Ọdịmma Anyị Ruo Ogologo Oge
15. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-ekwu na Bible bụ ihe mgbe ochie?
15 N’eziokwu, ọtụtụ ndị na-asị na Bible bụ ihe mgbe ochie, na ọ baghịkwa uru ọ bụla n’ime narị afọ nke iri abụọ nke a. Otú ọ dị, ihe mere ha ji na-eche otú a aghaghị ịbụ na Bible adịghị ekwu ihe ha chọrọ ịnụ. Ịgbaso ndụmọdụ Bible na-ewetara anyị abamuru na-adịrụ ogologo oge, ma ọtụtụ mgbe, nke a na-achọ inwe ndidi, inye onwe anyị ọzụzụ, na ịnapụ onwe anyị ihe ụfọdụ —bụ́ àgwà ndị na-adịghị amasị ọha mmadụ n’ime ụwa nke na-agba anyị ume ịchọ inweta ihe ụtọ ozugbo.—Ilu 1:1-3.
16, 17. Ụkpụrụ dị aṅaa nke dị elu banyere omume mmekọahụ ka Bible na-esetịpụ, oleekwa otú e siworo lefuru ha anya n’oge dị ugbu a?
16 Dị ka ihe atụ, were okwu metụtara ịdị ọcha n’omume mmekọahụ. Ụkpụrụ akwukwọ nsọ ndị metụtara nke a siri nnọọ ike. Nanị ebe e nyere ohere inwe mmekọahụ bụ ná njikọ alụmdi na nwunye, mmekọrịta nile dị otú ahụ na-abụghị n’alụmdi na nwunye bụkwa ihe a machibidoro iwu. Anyị na-agụ, sị: “Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, . . . ha agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6: 9, 10) Ọzọkwa, Bible chọrọ ka ndị Kraịst na-alụ nani otu di ma ọ bụ otu nwunye. (1 Timoti 3:2) Ọ bụkwa ezie na e hotara ọnọdụ ụfọdụ pụrụ iche ndị a pụrụ ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ mee nkewa na ha, Bible na-ekwu na nkekọ alụmdi na nwunye kwesịrị ịdịru ogologo ndụ nile. Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwanyị, wee sị, N’ihi nke a ka nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya; ha abụọ ewee ghọọ otu anụ ahụ . . . ya mere ha abụghịkwa mmadụ abụọ ọzọ, kama ọ bụ otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.”—Matiu 19:4-6, 9; 1 Ndị Kọrint 7:12-16.
17 Taa, a na-agbakụta ụkpụrụ ndị ahụ azụ n’ebe nile. A na-anakwere omume mmekọahụ ndị rụrụ arụ. A na-ele mmekọahụ n’etiti ndị na-eto eto, ndị na-eyi oge mkpapụ, anya dị ka ihe na-enweghị ihe ọjọọ ọ bụla dị na ya. A na-anakwere nwoke na nwanyị ibikọ n’alụghị dị na nwunye. N’etiti ndị lụworo di na nwunye, iso ndị na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha na-enwe mmekọahụ abụghị ihe ọhụrụ. Ịgba alụkwaghịm bụkwa ihe jupụtara ebe nile n’ọgbọ ọgbara ọhụrụ nke a. Otú ọ dị, ụkpụrụ omume ndị a e wedaworo ala ewetabeghị obi ụtọ. Ajọ ihe ndị na-esi n’ụzọ ndụ nke agbasoghị ụkpụrụ omume ọma dị otú a na-apụta egosipụtawo na Bible ziri nnọọ ezi n’ịrụgide ka a gbasoo ụkpụrụ omume ndị dị mma.
18, 19. Gịnị ka nlefuru anya zuru ebe nile nke ụkpụrụ omume ndị Jehova setipụrụ rụpụtaworo?
18 Akwụkwọ bụ Ladies’ Home Journal kwuru, sị: “Ndọrọ a dọọrọ uche onye ọ bụla gaa ná mmekọahụ n’afọ ndị 1960 na 1970 ewetabeghị obi ụtọ na-enweghị atụ nye ihe a kpọrọ mmadụ, kama o wetawo ita ahụhụ dị ukwuu.” “Ịta ahụhụ dị ukwuu” nke e zoro aka na ya n’ebe a gụnyere ụmụntakịrị ndị a kpataara oké nsogbu n’ihi ịgba alụkwaghị nke ndị mụrụ ha na ndị okenye ndị na-ata ahụhụ nke oké ihe mgbu ná mmetụta ha. Ọ gụnyekwara mmụba e nweworo n’ezinụlọ ebe ndị e nwere nanị nne ma ọ bụ nna na oké ịba ụba nke ụmụ agbọghọ na-alụbeghị di ndị nwere ụmụ mgbe a pụrụ ịsị na ha onwe ha ka bụkwa nnọọ ụmụntakịrị. Ọzọkwa, ọ gụnyere oké ntiwapụ nke ọrịa mmekọahụ, ndị dị ka ọrịa herpes nke na-eme n’akụkụ ahụ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, gonorrhea, syphilis, chlamydia, na AIDS.
19 N’iburu ihe a nile n’uche, otu onye prọfesọ nke ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya kwuru, sị: “Ma eleghị anya, anyị etolitewo ruo n’ókè nke ịtụle ma ọ̀ bụ na ọ gaghị abara anyị uru karị ịkwalite izere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye dị ka ụkpụrụ nke kasị mma n’imezu mkpa nke ndị ala anyị nakwa iji nweta ihe ruuru ha, bụ́ nnwere onwe: nnwere onwe pụọ n’ọrịa, nnwere onwe pụọ n’ịtụrụ ime ọkwa.” Bible kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “Onye [obi ụtọ, NW] ka ọ bụ, bụ nwoke nke meworo Jehova ka ọ bụrụ ihe ntụkwasị obi ya, o cheghịkwa ndị nganga ihu, ma ọ bụ ndị na-ejehie n’ụzọ okwu ụgha.” (Abụ Ọma 40:4) A dịghị eji okwu ụgha dị iche iche nke ndị na-adịghị ekwenyere Bible, ndị na-asịkwa na ibi ndụ nke mmadụ ime omume otú sọrọ ya na-eweta obi ụtọ, na-eduhie ndị na-atụkwasị obi n’amamihe Bible. Ụkpụrụ amamihe nile nke Bible, ọbụna ma a sị na ha siri ike nke ukwuu, bụ ihe kasị mma.
Nsogbu Ndị Siri Ike ná Ndụ
20. Ụkpụrụ Bible dịgasị aṅaa bụworo ihe enyemaka nye ndị ahụ na-aghaghị iche ọnọdụ ogbenye ọnụ ntụ ihu ná ndụ ha?
20 Amamihe nke dị na Bible na-enyekwara anyị aka n’iche ihe isi ike ndị anyị na-ezute ná ndụ ihu. Dị ka ihe atụ, Nọtụtụ ala, e nwere ndị Kraịst ndị bụ nnọọ ogbenye ọnụ ntụ́. Ma ha na-anagide ọnọdụ ịbụ ogbenye ha, na-enwetakwa obi ụtọ. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịgbaso Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ. Ha na-eji okwu nkasi obi ahụ dị n’Abụ Ọma 55:22 kpọrọ ihe nke ukwuu, nke na-asị: “Tụkwasị Jehova ihe o nyeworo gị dị ka ibu, ya onwe ya ga-anagidekwa gị.” Ha na-adabere n’ebe Jehova nọ maka ike iji wee nagide ọnọdụ ha. Mgbe ahụ, ha na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, na-ezerekwa àgwà ndị na-emerụ ahụ, ndị na-emefusịkwa ego, dị ka ise sịga na ịṅụbiga mmanya ókè. Ha na-arụsi ọrụ ike, dị ka Bible tụrụ aro ka e mee, ha na-achọpụtakwa na ọtụtụ mgbe, ha pụrụ inyeju ezinụlọ ha afọ ebe ndị umengwụ ma ọ bụ ndị ahụ na-ekwe ka obi ịda mbà rikpuo ha na-adịghị enwe ike ime nke a. (Ilu 6:6-11; 10:26) N’ịga n’ihu, ha na-ege ntị na ndụmọdụ Bible nke bụ: “Ekwosola ndị na-eme ajọ omume ekworo.” (Abụ Ọma 37:1) Ha adịghị etinye aka n’ịgba chaa chaa ma ọ bụ n’imempụ ndị dị ka ire ọgwụ ọjọọ. Ihe omume ndị dị otú a pụrụ iyi ka hà ga-enye “ngwọta” na-abịa ngwa ngwa nye nsogbu ha nile, ma mkpụrụ ha na-amịpụta n’ọdịnihu na-adị ilu nke ukwuu.
21, 22. (a) Olee ụzọ otu nwanyị bụ onye Kraịst si nweta enyemaka na nkasi obi site na Bible? (b) Eziokwu ọzọ dị aṅaa banyere Bible na-enyere anyị aka ịghọta na ọ bụ Okwu Chineke?
21 Ịgbaso ndụmdọdụ Bible ọ̀ na-enyere ndị ahụ bụ ogbenye ọnụ ntụ aka n’ezie? Ee, e nwekwara ọtụtụ ahụmahụ ndị na-akwado nke a. Otu onye Kraịst di ya nwụrụ nke bi n’Asia dere, sị: “Ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka m soro ná ndị a na-agụ ná ndị ogbenye, enweghị m mwute ma ọ bụ obi ilu. Eziokwu Bible na-eme ka m nwee ụzọ ziri ezi m si ele ihe anya.” Ọ kọrọ na e mezuwo otu nkwa kwesịrị ịrịba ama n’ọnọdụ ya, bụ́ nke Jisọs kwere. Jisọs sịrị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Matiu 6:33) Ọ na-agba akaebe na site n’idebe ozi ọ na-ejere Chineke n’ọnọdụ mbụ mgbe nile, na ya na-enweta, n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, ihe ndị dị ya mkpa ná ndụ. Ozi ndị Kraịst ọ na-eje na-enyekwa ya ùgwù na ihe mgbaru ọsọ ná ndụ, bụ́ nke na-eme ka o nwee ike ịnagide ọnọdụ ịbụ ogbenye ya.
22 N’eziokwu, ịdị omimi nke amamihe dị na ya na-egosi na Bible bụ n’ezie Okwu Chineke. Ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla nke ọ bụ nanị ụmụ mmadụ mepụtara nke pụrụ imetụta ọtụtụ akụkụ dị iche iche nke ndụ otú a, gosikwa nghọta dị omimi, nọgidekwa na-ekwu ihe ziri ezi mgbe nile. Ma e nwekwara eziokwu ọzọ banyere Bible nke na-egosi na o sitere n’ebe Chineke nọ. O nwere ike ịgbanwe ụmụ mmadụ gaa n’ọnọdụ ka mma. Anyị ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.
ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Olee ụzọ Ndịàmà Jehova si bụrụ ndị a gọziri agọzi n’ihi nnakwere ha nakweere Bible dị ka Okwu Chineke?
◻ Dị ka ndị kwere n’Okwu Chineke, ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere, oleekwa ụzọ akparamagwa anyị pụrụ isi mee ka anyị rụzuo ibu ọrụ ahụ?
◻ Gịnị mere ka ndụmọdụ amamihe dị na Bible dị mma karịa ndụmọdụ nke ndị mmadụ nkịtị?
◻ Olee ihe atụ ụfọdụ ndị na-egosi ịdị omimi nke amamihe Bible?