Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ
Ọ̀ Bụ Ihe Meworo Ochie
Dị ka otu onye ụkọchukwu Anglican n’Adelaide, Australia si kwuo, ịdọ aka ná ntị megide mmadụ iji aka na-akpali ahụ nke onwe ya, bụ́ nke pụrụ iduje n’ịkwa iko na ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye bụ ihe mgbe ochie, bụrụkwa nke sitere n’ọnụ ndị na-abụghị ndị Kraịst. N’ihe ọmụmụ o mere na nso nso a banyere mmekọahụ, ọ sịrị na mmadụ abụọ nọ ná nkwekọrịta nke ịlụ di na nwunye adịghị eme mmehie ma ọ bụrụ na ha enwee mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye. Ihe ọmụmụ ahụ na-ekwusikwa ike na mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị bụ nke a pụrụ ịnabata n’ọnọdụ ụfọdụ. Dị ka akwụkwọ bụ Courier Mail nke Brisbane si kwuo, ọnụ na-ekwuru ndị Uniting Church nke Australia “kwenyere n’ụkpụrụ ndị bụ isi nke akụkọ ahụ.”
Otú ọ dị, Bible na-ekwu na ọ bụ uche Chineke ka onye ọ bụla “ghara ịkwa iko” nakwa na “ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:3, 4; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) N’ezie, ndị na-anakwere Bible dị ka Okwu Chineke nke e ji ike mmụọ nsọ dee na-amata na ụzọ o si ele mmekọahụ anya sitere n’aka Onye Okike ahụ nke nwere amamihe nile.
Mmetụta ọ na-enwe n’ahụ ndị na-ebi ndụ dị ka ụkpụrụ Bible si di na-egosipụta na ihe ahụ a siri na ọ bụ ụkpụrụ omume ndị meworo ochie ka nọgidekwa na-enye aka ime ka ezinụlọ guzosie ike ma na-enwe ihe nchebe pụọ n’oké mmerụ ahụ n’ụzọ mmetụta na ọrịa ndị jọgburu onwe ha, bụ ndị na-esite n’omume rụrụ arụ.
Ihe Mgbochi Kasị Mma
Iji ọgwụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nọgidere na-abụ nsogbu siri ike. Ya mere, olee ụzọ kasị mma isi chebe onye na-eto eto pụọ n’iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? N’otu ajụjụ ọnụ e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ ndị Brazil bụ O Estado de S.Paulo, onye profesọ si France, onye bụkwa onyeọkà n’ịgwọ ọrịa ịsị mgbaka, bụ́ Claude Olievenstein mesiri mkpa ọ dị ike maka ihe nduzi na nkwado ịhụnanya. O kwuru, sị: “Mgbe ndị mmadụ na-ekwu okwu banyere ọgwụ ọjọọ n’oge a, ọrụ nke ndị uwe ojii, usoro nke ikpe ikpe, na ụlọ akwụkwọ, na-apụta ìhè. Otú ọ dị, mkpa dị ukwuu dị n’igbochi ezinụlọ [iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe]. . . . Ọtụtụ ụmụntakịrị amaghị ihe bụ ikike ịchịisi nke onye bụ nna. Onye ahụ bụ nna anọghị n’ụlọ; o dokwara anya na ọ gbụrụwo onwe ya pụọ n’ọrụ ruuru ya.”
Mgbe ọ na-akọwa ihe mere igbochi iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ji dị mkpa n’ezinụlọ, Dr. Olievenstein kwukwara, sị: “Anyị na-ebi n’usoro ọha mmadụ nke oké ịchụso uru ebe ụkpụrụ omume ọma na-abụrụ ụmụ mmadụ ihe ihere. Mgbe ụmụ anyị na-amalite igosipụta omume ụfọdụ n’ihi ọgwụ ọjọọ, ọ bụ n’ihi na anyị akwụsịwo ime ka a mara ụkpụrụ omume ndị e nwere. Ọha mmadụ anyị abụwo nke kpọrọ ekwo nkụ, nke na-enweghị ọgụgụ isi, nke mepere emepe. Nanị ihe ndị mmadụ na-eche banyere ya bụ mgba nke ha na-agba iji dị ndụ.”
Dị ka magazịn bụ Superinteressante si kwuo, otu ihe ọmụmụ e mere na U.S. mesiri mkpa ọ dị ike banyere ikike ịchịisi nke ndị nne na nna. Akwụkwọ ahụ na-asị: “Ndị ka na-etoru ogo mmadụ, bụ́ ndị kasị mee nke ọma n’ule ụlọ akwụkwọ na ndị kakwa nọrọ n’ezi ọnọdụ n’ụzọ mmetụta sitere n’ezinụlọ ebe ndị nne na nna na-etinye ikike ịchịisi ha n’ọrụ n’iguzobe ụkpụrụ ndị doro anya banyere omume ma nye inwere onwe ruo n’ókè doro anya. N’ụzọ yiri nke ahụ, nkezi nke ndị ka na-etoru ogo mmadụ, bụ ndị ọgwụ ọjọọ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya riri ahụ dị nnọọ nta n’ezinụlọ ndị ahụ.”
N’ihi ihe ezi uche dị na ya, Bible na-agwa ndị nne na nna, sị: “Dọọ nwa gị aka ná ntị, ọ ga-emekwa ka i zuo ike; ee, ọ ga-enye mkpụrụ obi gị ihe ụtọ.” (Ilu 29:17) Ee, imezi ihe nke dabeere na Bible pụrụ inyere ndị nne na nna aka igbochi iji ọgwụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma meziwanye ụdịdị nke ndụ a na-adị n’ezinụlọ ahụ.