Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 12/1 p. 3-5
  • Olee Chi nke Ị Na-efe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Chi nke Ị Na-efe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngwakọta Ofufe
  • “Cheenụ Onwe Unu Nche Ka Unu Ghara Ikpere Arụsị”
  • Ife Ego Ofufe
  • Olee Chi Nke A ga-efe Ofufe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ofufe Ole Ndị Ka Chineke Na-anakwere?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Olee Chi nke I Kwesịrị Ife?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • È Nwere Nanị Otu Ezi Chineke?
    Teta!—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 12/1 p. 3-5

Olee Chi nke Ị Na-efe?

GBURUGBURU ụwa, ndị mmadụ ga-aza ajụjụ ahụ n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọtụtụ chi na ọtụtụ ndị nwe mmadụ dị,” taa, chi ndị a na-efe efe eruwokwa ọtụtụ nde. (1 Ndị Kọrint 8:5) Otú ọ dị, ị̀ maara na ọtụtụ ndị na-efe chi na-abụghị nke ha chere na ha na-efe? Ị̀ matakwara na ọtụtụ ndị na-ekwenyeghị na chi ọ bụla na-eji ihe ha kwere kpọrọ ihe nke ukwuu karịa ndị kweere na chi? Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

Otu ihe ife ofufe pụtara bụ “iji oké nkwanye ùgwù, ọbụna nke gabigara ókè, nsọpụrụ, ma ọ bụ nraranye, na-ele ihe anya.” N’asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible, okwu ndị e ji mee ihe maka ofufe na-enwe echiche nke ije ozi ma ọ bụ ịkpọ isiala n’ihu mmadụ. N’iburu nke a n’uche, ka anyị hụ ụzọ ụmụ mmadụ pụrụ isi mehie ihe n’ihe banyere onye ma ọ bụ ihe ha na-efe ofufe n’ezie.

Ngwakọta Ofufe

Were, dị ka ihe atụ, ndị Sameria oge ochie. Ọtụtụ n’ime ndị a bụbu ndị mba ọzọ, ndị ndị Asiria kpọbatara na Palestine iji dochie anya ndị si n’ebo iri nke ebe ugwu Israel ahụ e si n’ala ha chụpụ. Tupu mgbe ahụ, ha na-agbasobu chi arụsị dị iche iche, ma ugbu a, ha mere mgbalị ịmụta ihe banyere Jehova, bụ́ Chineke nke Israel. Mgbe ahụ, hà gbakụtara okpukpe ochie ha azụ? Ee e. Bible na-akọ, sị: “Dị ka ikpe [“okpukpe,” Nw] mbụ ha si dị ka ha onwe ha na-eme. Mba ndị a wee na-atụ egwu Jehova, ma ọ bụ arụsị nile ha a pịrị apị ka ha na-efe.” (2 Ndị Eze 17:40, 41) Ya bụ, ndị Sameria, ọ bụ ezie na ha matara Jehova n’ọnụ, ka nọ na-efe chi ha nile ndị ochie ofufe, wee si otú a na-agbaso otu ụdị nke ngwakọta okpukpe.

Otu ihe yiri nke ahụ mere mgbe ndị ozi ala ọzọ webatara okpukpe Roman Katọlik na South America. Ha tọghatara ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ebe ahụ, ma, dị ka ndị Sameria oge ochie ahụ, ndị bi n’ebe ahụ echefughị chi ha ndị ochie. Otú a, na Brazil, “ndị Kristian” ka na-eme ememe ikpere arụsị nile nke voodoo, tinyekwara ememe dị iche iche e ji enye chi oge ochie dị iche iche nsọpụrụ, dị ka chi nwanyị bụ Iemanjá. Ihe ndị yiri nke ahụ na-emekwa ná mba ndị ọzọ dị na South America.

Ọzọkwa, okpukpe ahụ ndị ozi ala ọzọ webatara na South America bụkwa n’onwe ya okpukpe a gwakọtara agwakọta. Ọtụtụ n’ime ozizi ya, ndị dị ka Atọ n’ime Otu, ọkụ ala mmụọ, na anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, sitere n’okpukpe na ọkà amamihe oge ochie nke ndị na-ekpere arụsị. O doro nnọọ anya na ha adịghị na Bible. N’otu aka ahụ, oriri ya nile—gụnyere Krismas na Ista—bụcha ndị na-amaliteghị n’etiti ndị Kraịst.a Ò kwere omume ime ememe ndị na-ekpere arụsị ndị dị otú ahụ, na ikwenye n’ozizi ndị dị otú ahụ na-abụghị nke ndị Kraịst ma nọgide na-efe Chineke nke Bible ofufe, bụ́ onye sịrị: “Gị enwela chi ọzọ tinyere m”? (Ọpụpụ 20:3) N’ezie, o kweghị omume!

“Cheenụ Onwe Unu Nche Ka Unu Ghara Ikpere Arụsị”

Tụlee ụzọ ọzọ a na-esi eduhie ụmụ mmadụ n’ihe banyere ofufe. Jọn onyeozi dere, sị: “Ụmụntakịrị m, cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị.” (1 Jọn 5:21) E depụtara aha ihe dị ka otu puku nde ndị mmadụ dị ka ndị nọ na Krisendọm, ndị a na-ewekwa onwe ha na ha na-efe otu Chineke ahụ nke Jọn fere. Ma, ọtụtụ narị nde n’ime ha na-akpọ isiala nye ihe oyiyi dị iche iche nke “ndị senti,” nke Jisọs, na nke Meri nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.

E nwere ụdị ikpere arụsị ndị ọzọ na-apụtachaghị ìhè karị. N’afọ 44 O.A., Eze Herọd Agrippa kwuru okwu ihu ọha, a kpalikwara ndị mmadụ nke ukwuu nke na ha tiri mkpu, sị: “Ọ bụ olu chi, ọ bụghịkwa olu nke mmadụ.” (Ọrụ 12:21, 22) Ee, ha nyere Herọd ofufe, na-eme ya ka ọ ghọọ chi. Ihe ndị yiri nke ahụ na-emekwa taa. N’oge ndị ahụ nke ime ihe ike, mgbe òtù Nazi na-arịgo n’ọkwá ọchịchị na Europe, iti mkpu ahụ bụ “Heil Hitler!” bụ n’ezie iti mkpu nke inye ofufe. Ọtụtụ ndị dị njikere ịlụ ọgụ ma nwụọ maka Fuhrer (Onye ndú) ahụ dị ka à ga-asị na ọ bụ chi, onye nzọpụta nke mba ahụ. Ma, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-efe ofufe dị otú ahụ bụkwa ndị nọ na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm!

Tupu oge Hitler nakwa mgbe oge ya gasịrị, ndị isi ọchịchị ndị ọzọ esiwokwa otú ahụ welie onwe ha elu dị ka ndị nzọpụta, wee na-ekwu ka a rara ofufe nye nanị ha. Ndị kwenyeere ha mere ka ndị a ghọọ chi, n’agbanyeghị okpukpe nke “ndị na-efe ofufe” ndị ahụ nọ na ha ma ọ bụ ọbụna ma ọ bụrụ na ha na-asị na ha bụ ndị na-ekweghị na chi ọ bụla. Oké nsọpụrụ nke ndị a ma ama n’egwuregwu, ndị na-eme ihe nkiri, na ndị na-eme ihe ntụrụndụ ndị ọzọ na-enweta site n’aka ndị nwere mmasị n’ebe ha nọ yikwara ife ofufe.

Ife Ego Ofufe

N’ịga n’ihu, chee echiche banyere ihe okwu Jisọs ndị ahụ pụtara mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbụ ohu nke nna abụọ: n’ihi na ọ ga-akpọ otu onye n’ime ha asị, hụ ibe ya n’anya; ma ọ bụghị otú a ọ ga-ejide otu, lelịa ibe ya anya. Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na akụ.” (Matiu 6:24) Ị̀ maara onye ọ bụla nke nọ n’otu okpukpe, ma onye mmasị bụ isi o nwere ná ndụ bụ inweta ego? Mgbe ahụ, ònye n’ezie ka onye dị otú ahụ na-efe ofufe, ọ̀ bụ Chineke ka ọ̀ bụ akụ? Mmadụ ole ndị na-ekweghị ekwe ka ị maara, bụ́ ndị oké nchụso ego rikpuru? N’ezie, ha onwe ha bụkwa ndị na-efe ego ofufe, ma eleghị anya, bụrụ ndị na-anụ ọkụ n’obi karịa ọtụtụ ndị kwere ekwe.

Pọl onyeozi kọwara otu ụkpụrụ yiri nke a mgbe o dere, sị: “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị” (Ndị Kọlọsi 3:5) Ọ bụrụ na anyị nwere anyaukwu maka otu ihe n’ụzọ siri ike nke na anyị na-etinye mgbalị anyị nile gaa n’inweta ya, ma eleghị anya ọbụna na-emebi iwu mgbe anyị na-achụso ya, mgbe ahụ, ihe ahụ aghọworo anyị arụsị, ma ọ bụ chi. (Ndị Efesọs 5:5) N’akwụkwọ ozi ọzọ, Pọl dere banyere ụfọdụ ndị na-eme ihe ọjọọ, sị: “Chi ha bụ afọ ha.” (Ndị Filipaị 3:19) Ọ bụrụ na ihe bụ nzube anyị nile ná ndụ bụ ime ihe na-atọ onwe anyị ụtọ, imejupụta afọ anyị dị ka a pụrụ ikwu ya, mgbe ahụ, anyị bụ chi nke onwe anyị. Mmadụ ole ka ị maara bụ́ ndị na-efe ụdị chi nke a ofufe?

Ee, dị ka Pọl onyeozi dere: “Ọtụtụ chi na ọtụtụ ndị nwe mmadụ dị.” N’ọtụtụ ọnọdụ kwa, ndị na-efe ha yiri ndị Sameria oge ochie ahụ, ndị ji okwu ọnụ ha na-efe otu chi, ma jiri omume ha na-efe chi ọzọ. Ma n’ezie, e nwere nanị otu Chineke onye kwesịrị ka anyị fee ya ofufe. Ị̀ maara onye ọ bụ? Ọzọkwa, e nwere otu ihe nke na-ejikọta ofufe a na-efe chi ndị ọzọ nile na-abụghị ya. Gịnị bụ ihe ahụ? Anyị ga-ahu nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Iji matakwuo ihe banyere nke a, lee akwukwọ ahu bu Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, peji 212-213, nke ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya