Okpukpe—n’Ihi Gịnị Ka A Na-enweghị Mmasị na Ya?
“MMADỤ nke na-enweghị okpukpe yiri ụlọ nke na-enweghị windo.” Nke ahụ bụ otú otu nwoke onye Japan si kọwaa mkpa ọ dị ka nwa ya nwoke bụ Mitsuo nweta ihe ọmụma nke okpukpe na-enye. Otú ọ dị, Mitsuo ejighị okwu nna ya kpọrọ ihe dị mkpa. Ọnụ ọgụgụ mmadụ na-abawanye ụba na Japan, dịkwa ka ọ dị n’ebe ndị ọzọ, na-enwekwa otu mmetụta ahụ. O juru ha afọ ịbụ ‘ụlọ ndị na-enweghị windo,’ na-enwe mmasị dị nta n’ikwe ka ìhè nke okpukpe nwubata ná ndụ ha.
Ya mere, mgbe Japan duziri Ihe Ọmụmụ nke Àgwà Mba ahụ, 69 pasenti nke ụmụ amaala mba ahụ kwuru na ha adịghị ele onwe ha anya dị ka ndị ji okpukpe kpọrọ ihe. N’etiti ndị na-eto eto, nkezi ahụ dị elu ọbụna karị. N’otu aka ahụ, ná mba ahụ nke jibu okpukpe Buddha kpọrọ ihe nke ukwuu, bụ Thailand, 75 pasenti nke ndị bi n’obodo ndị mepere emepe adịghị ejekwa n’ụlọ nsọ okpukpe Buddha dị iche iche ọzọ. N’England, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ asatọ nke ụlọ chọọchị Anglican dị iche iche emechiwo n’ime 30 afọ gara aga n’ihi ejikwaghị ha eme ihe.
Ma na Japan, ihe oyiyi dị iche iche metụtara okpukpe ka pụtara ìhè nke ukwuu. Ma dị nnọọ ka efere ọwụwa ndị dị oké ọnụ ahịa, a na-ewepụta ha nanị n’oge ememe pụrụ iche—dị ka n’oge agbamakwụkwọ na n’oge ememe ili ozu. A na-eji okpukpe kpọrọ ihe karị n’ihi ọrụ ọ na-arụ ichekwa ọdịbendị obodo na ihe nketa nke ezinụlọ dị iche iche karịa ịbụ n’ihi ihe ọmụma ime mmụọ ọ na-enye. Ọtụtụ ndị na-ele okpukpe anya nanị dị ka ọgwụ nkụjụ ahụ a na-enye ndị na-adịghị ike na ndị nwere nsogbu; ọ na-esiri ha ike ịhụta abamuru ọ bụla ọzọ gbara ọkpụrụkpụ a na-enweta site na ya. Ụfọdụ ndị na-asị, ‘Okpukpe dị nnọọ mma ma ọ bụrụ na i nwere ohere maka ya ma ọ bụ ọ bụrụ na i chee na ọ dị gị mkpa, ma ị ghaghị ịtụkwasị onwe gị obi iji chọta ihe ị ga-eri na iji kwụọ ụgwọ ndị i ji.’
Gịnị na-akpata enweghị mmasị nke a? A pụrụ ikwu ọtụtụ ihe na-akpata ya. Nke mbụ bụ ọnọdụ gburugburu ebe obibi. Ọtụtụ ndị ntorobịa enwetawo ọzụzụ dị nta nke ukwuu n’ihe banyere okpukpe ma ọ bụrụ na ọ dị nke ọ bụla ha nwetara. Ka a sịkwa ihe mere na ọtụtụ ndị bi n’ime ụwa nke na-edebe nchụso ihe onwunwe n’ọkwá dị elu na-eji etolite wee bụrụ ndị okenye ndị hụrụ ihe onwunwe n’anya nke ukwuu.
Ná mba ụfọdụ, àgwà ọjọọ nke ndị okwuchukwu TV nwere anyaukwu, ndị na-emekwa omume rụrụ arụ, na ndị ndú okpukpe ndị ọzọ a maara aha ha adọpụwokwa uche ụmụ mmadụ n’ihe banyere okpukpe, dịkwa ka ntinye aka okpukpe tinyeworo n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mgbalị a na-eme ibu agha. A na-ahụta ihe atụ nke a n’ihe mere banyere okpukpe Shinto na Japan. Akwụkwọ bụ Encyclopædia of the Japanese Religions kwuru, sị, “Mgbe agha ahụ [Agha Ụwa nke Abụọ] gwụsịrị ná mmeri n’August 1945, ihu arụsị dị iche iche nke ndị Shinto chere ihe isi ike dị ukwuu ihu.” Shinto, bụ́ nke kpaliri ịnụ ọkụ n’obi maka agha ahụ, kweekwa nkwa mmeri, mechuru ndị mmadụ ihu. Echiche ahụ nke bụ na e nweghị Chineke ma ọ bụ Buddha dịnụ gbasara ngwa ngwa.
Otú ọ dị, ànyị kwesịrị inwe afọ ojuju n’echiche ịchọ ọdịmma nanị onwe onye ndị a, ndị na-adịghị elepụ anya n’ọdịnihu—ndị na-elekwasị anya nanị n’oge dị ugbu a? Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nwere uche nke na-achọ ịmara ihe. Ha ga-achọ ịmara ebe ha si bịa, ebe ha na-eje, ihe mere ha ji dị ndụ, na ụzọ ha ga-esi dị ndụ. Ha na-adị ndụ site n’inwe olileanya. Iwezụga ajụjụ ndị metụtara ndụ n’ụsọ, ma ọ bụ iji echiche ahụ nke bụ na “ihe ndị a bụ ihe ndị a na-apụghị ịmata amata,” na-abịanyụ ha adịghị eju afọ. Ọbụna onye ahụ na-ekweghị na chi ọ bụla, bụ́ Bertrand Russell kwuru okwu banyere inwe “oké ihe mgbu—ịwagharị iji chọta ihe nke karịrị ihe dị n’ime ụwa.” Ezi okpukpe pụrụ iweta mwagharị dị otú ahụ ná njedebe. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na ọ dị okpukpe ọ bụla nke e kwesịrị iji nnọọ kpọrọ ihe?